N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Jiri Okpukpe Kpọrọ Ihe?
“MMADỤ apụghị ịdị ndụ nanị site n’iri achịcha.” (Matiu 4:4, The New English Bible) Okwu ndị a a na-ehota ọtụtụ mgbe na-emetụta mkpa ụmụ mmadụ nke ọtụtụ ndị chefuworo taa. Ha na-egosi na e nwere akụkụ ime mmụọ dị n’ime anyị nke ọ dị mkpa ka e mee ihe na-eju afọ banyere ya. Ọ bụ ya mere na onye kwuru okwu ndị ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, kwukwara, sị: “Lee nnọọ ka ha si bụrụ ndị a gọziri agọzi, bụ́ ndị maara mkpa Chineke dị ha.”—Matiu 5:3, NEB.
Ọ bụ nanị okpukpe pụrụ imejupụta “mkpa Chineke dị” anyị. Ọ bụ nanị okpukpe pụrụ ịza ajụjụ ndị bụ isi anyị nwere banyere mmalite, nzube, na isi ihe dị ná ndụ. Ọ bụkwa nanị okpukpe pụrụ ime ka ndụ anyị baa uru n’ezie. Ma, ọ bụghị nnọọ okpukpe ọ bụla ga-eme ihe a nile. Jisọs gwara otu nwanyị onye Sameria, sị: ‘Ezi ndị na-akpọ isiala ga-akpọ isiala nye Nna ahụ n’ime mmụọ na eziokwu.’ (Jọn 4:23) Ife ofufe ‘n’eziokwu’ pụtara ihe karịrị ịgbaso omenala na usoro ihe omume ndị e nyeworo nsọpụrụ ruo ogologo oge. Ihe ndị a na-emekarị bụ inye ndị na-agbaso ha ihe na-adịghị ukwuu karịa mmetụta na-adị nwa mgbe nke ahụ ịdị mma, ma na-eme ka ha nọgide n’agụụ nke ime mmụọ.
Dị ka ihe atụ, Edwin O. Reischauer, onye bụbu onye nnọchianya mba U.S. na Japan, kwuru, sị: “Okpukpe Shinto na nke Buddha bụkarịịrị ihe ka n’ọtụtụ mmadụ ihe metụtara omenala na ihe e ji mara ọha mmadụ karịa ihe metụtara nkwenkwe ndị dị mkpa.” N’eziokwu, o juru ọtụtụ ndị Japan afọ ka ọ dịrị otú ahụ. Ma mbilite nke “okpukpe ọhụrụ” dị iche iche na Japan na-egosipụta enweghị afọ ojuju na-arị elu n’okpukpe omenala.
“Okpukpe ọhụrụ” ndị ahụ yiri ka hà na-elekwasị anya ná ndị ndú na-akpali akpali—ọ bụghị na Chineke. Ọtụtụ n’ime ndị ndú okpukpe ndị a na-ekwu na ọ bụ Chineke kpaliri ha. Ma ozizi ha dị iche iche na-abụkarị ngwakọta nke nkwenkwe okpukpe Buddha, Shinto, na okpukpe ndị ọzọ—na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke echiche onye malitere ya. Ihe ndọrọ ha na-abụkarị nkwa nke ndụ ka mma na nzọrọ nke inwe ikike ndị dị omimi ma ọ bụ ndị e ji agwọ ọrịa. Ma okpukpe ndị dị otú ahụ hà na-enye ihe àmà na ha na-akụziri ndị na-agbaso ha ife ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu”? O yighị otú ahụ. Otu ihe bụ na òtù okpukpe ndị a yiri ka hà na-ebilite ngwa ngwa, pụọkwa n’anya ngwa ngwa. Ọdịdị ha nke ihe na-agafe ngwa ngwa na-eme ka a ghara inwe ihe dị ukwuu mmadụ nke na-eche echiche ga-eji jiri ha kpọrọ ihe dị mkpa.
Okpukpe nke A Ga-eji Kpọrọ Ihe
Otú ọ dị, e nwere otu okpukpe nke dịworo ogologo oge karịa ụdị ofufe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ okpukpe ahụ nke a kụziri n’ime Bible Nsọ. A malitere ide Bible ihe dị ka 35 narị afọ gara aga, ụfọdụ n’ime ‘akụkọ ihe mere eme’ ndị e chebere n’isiakwụkwọ ya ndị mbụ bụkwa banyere oge dịrị ihe karịrị otu puku afọ tupu mgbe ahụ.a Ihe ndekọ kasị ochie e nwere banyere mmalite nke okpukpe dị n’ime ya. Nanị nke ahụ bụ otu ihe mere a ga-eji lebasiere okpukpe nke Bible anya ike.
Akwụkwọ The Encyclopedia Americana na-ekwu banyere Bible, sị: “Ìhè ya ‘apụwo banye n’ime ụwa dum.’ A na-ele ya anya ugbu a dị ka akụ dị oké ọnụ ahịa nke ụkpụrụ omume na nke okpukpe nke ozizi ya na-adịghị agwụ agwụ na-ekwe nkwa ịbụ ọbụna ihe bara uru karịa ka olileanya nke mmepeanya ụwa na-amụbawanye.” Ma, ọ bụrụ na otu akwụkwọ bụ n’ezie ihe nduzi a pụrụ ikwere ekwere nke na-eduga n’ezi okpukpe ahụ, ọ̀ bụ na ị gaghị eche na ọ bụ nke a ga-akasị kesaa, na ọ ga-adị ebe ndị nile na-achọ eziokwu ahụ pụrụ inweta ya?
Otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere Bible. A sụgharịwo ya gaa na 1,928 asụsụ dị iche iche, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, ọ bụkwa akwụkwọ a kasị kesaa n’akụkọ ihe mere eme. Ọzọkwa, a nwapụtawo na ọ bụ nke ziri nnọọ ezi n’ụzọ akụkọ ihe mere eme nakwa n’ụzọ ọkà mmụta sayensị. Ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala na akụkọ ihe mere eme na-agba àmà nke mmezu ziri ezi nke amụma Bible dị iche iche. O nweere onwe ya pụọ n’ụdị nile nke mgbaasị na ọkà ihe omimi na nke ime anwansi. Ihe ndị a nile kwekọrọ n’ihe Bible n’onwe ya kwuru na ọ bụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke.b—2 Timoti 3:16.
“Mkpụrụ” nke Ezi Okpukpe
Ma, ọ́ bụghị eziokwu na ọtụtụ okpukpe na-ekwu na ha na-agbaso Bible? Ọ̀ bụkwa na esemokwu, ibu iro, na ihu abụọ apụtaghị ìhè n’etiti ọtụtụ ndị na-asị na ha bụ ndị Kristian? Ee, ma nke a abụghị ihe mere a ga-eji lefuru Bible anya. Jisọs n’onwe ya gosiri na ihe ka ọtụtụ n’etiti ndị ahụ kpọkwasịrị onwe ha aha ịbụ ndị Kraịst agaghị enweta nkwado nke Chineke. (Lee Matiu 7:13, 14, 21-23.) Ya mere, olee ụzọ mmadụ ga-esi nwee ike ịmata ndị na-agbaso ezi okpukpe ahụ nke a kụziri n’ime Bible? Jisọs zara, sị: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. Mmadụ [hà] na-ekpokọpụta mkpụrụ vine n’ogwu, ma ọ bụ fig n’uké? Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. Ya mere unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.”—Matiu 7:16, 17, 20.
Ee, ezi okpukpe kwesịrị ịbụ ihe mkpali dị ike ime ezi ihe, na-arụpụta mmetụta bara uru n’etiti ndị na-efe ofufe. Were, dị ka ihe atụ, Akinori, bụ́ nwoke onye Japan onye, dị ka ya onwe ya kwuru, “ghọrọ mmụọ nke ịsọ mpì n’onwe ya.” O nwere ihe ịga nke ọma n’iru ihe mgbaru ọsọ ya nke ịgụcha akwụkwọ na mahadum a kasị mara amara na inweta ọrụ n’ụlọ ọrụ nwere ùgwù. O nweghị mmetụta ọ bụla nke na ya nwere ihe mere ya ga-eji tinye okpukpe ná ndụ ya. O chere, sị, ‘Okpukpe bụ ihe dịịrị ndị na-adịghị ike na ndị chọrọ ihe ga-akwado ha ná ndụ.’
Ihe nile na-agara ya nnọọ nke ọma ruo mgbe, n’ihi oké nchekasị na ike ọgwụgwụ, otu ọrịa siri ike dakwasịrị ya. Olu ya hịkọrọ, àgbà ya wee “tapara” n’ubu aka ekpe ya. Ọtụtụ “ndị enyi” ndị nọ n’ụlọ ọrụ Akinori abụrụghị ya ezi ihe nkasi obi n’oge ihe isi ike ya. (Tụlee Ilu 17:17.) N’ihi ya, ọ malitere ịṅụbiga mmanya ókè, ọbụna chee echiche banyere igbu onwe ya.
Ma mgbe oge na-aga, nwunye Akinori malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Otu ụbọchị n’oge ha na-enwe mkparịta ụka, nwanyị ahụ gwara ya banyere ihe ahụ e dere ná Ndị Galetia 6:7, nke na-agụ, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” N’ịbụ onye okwu ndị a metụrụ n’ahụ, Akinori sonyeere ya n’ọmụmụ ihe ahụ, ihe ọ mụtara gbanwekwara ụzọ o si ele isi ihe dị ná ndụ anya. Ka ụzọ ile ihe anya nke Akinori na-adịwanye mma, ịta ahụhụ ya nke nchekasị kpatara malitere ịkwụsị! Dị ka otu ilu dị na Bible si kwuo ya: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” (Ilu 14:30) Ee, ezi okpukpe na-amịpụta ezi mkpụrụ!
Toshiro bụ onye Japan ọzọ onye hụkwara ụzọ ezi okpukpe pụrụ isi bụrụ ihe mkpali ime ezi ihe. Ọ bụ ezie na o kweere na e nwere abamuru dị n’inwe okpukpe mmadụ na-ekpe, o meghị ihe ọ bụla banyere ya. Mmasị ya nile lekwasịrị anya n’inweta ụlọ nke aka ya. Otú ọ dị, mgbe o ruru ihe mgbaru ọsọ ahụ, o nyeghị ya afọ ojuju nke ọ tụrụ anya ya. Ọzọkwa, ka ọ na-elegharị anya gburugburu ebe ọ na-arụ ọrụ, ọ hụrụ na emeghị ihe n’eziokwu jupụtara ebe nile, na mmekọrịta onwe onye na-ezighị ezi na-esikwa na ha apụta. Ihe Toshiro hụrụ wutere ya nke ukwuu.
Otu ụbọchị, nwunye ya kpọrọ otu onye okenye si n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ ka ọ bịa leta ya. Ozugbo ahụ, Toshiro hụtara na onye okenye ahụ dị iche n’ebe ndị enyi ya ndị ọzọ nọ. Gịnị kpatara ya? Onye okenye ahụ ji obi eziokwu na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ya. N’ịbụ onye nke a masịrị, Toshiro nakweere ọkpụkpọ òkù ahụ a kpọrọ ya ịmụ Bible, wee malite ime ka okpukpe nke Bible bụrụ ụzọ ndụ ya.
Anyị na-akpọkwa òkù ka ị mata Ndịàmà Jehova. “Mkpụrụ” ha na-amịpụta na-enye ihe àmà nke bụ na ha na-efe ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” Ha na-eme ihe nile ha pụrụ ime itinye nkụzi Bible n’ọrụ ná ndụ ha. Ọ bụkwa ezie na dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu ha abụghị ndị zuru okè ma ọlị, dị ka otu ìgwè, ha na-egosipụta ụzọ ezi okpukpe pụrụ isi bụrụ ihe mkpali ime mmụọ dị oké ike ime ezi ihe.
Ọtụtụ puku mmadụ n’etiti Ndịàmà bụbu ndị na-enweghị obi ụtọ n’ụzọ ndụ ha. Ma site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ọtụtụ n’ime ha enwewo ike ime oké mgbanwe dị iche iche. Site n’ịzụlite ihe Bible kpọrọ “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” ya bụ, àgwà nke ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe, imeru ihe n’ókè, ha achọtawo isi ihe na-eweta obi ụtọ nke onwe onye.—Ndị Galetia 5:22, 23.
Abamuru Ebighị Ebi Ndị Na-abịa Site n’Ikpe Ezi Okpukpe
Otú ọ dị, ezi okpukpe aghaghị ime ihe karịrị ịgbanwe ọdịdị mmadụ ma ọ bụ ibelata ihe isi ike onwe onye. Nsogbu zuru ụwa ọnụ ndị dị ka mmetọ ikuku na mmiri, ihe iyi egwu nke agha nuklia, na imebi gburugburu ebe obibi na-eyi egwu ibibi ọmarịcha mbara ala anyị. Nsogbu akụ na ụba na-akpagbu obi ụtọ na ahụ ịdị mma nke ọtụtụ nde mmadụ. Ọ dịghị okpukpe nke a pụrụ iji kpọro ihe ma ọ bụrụ na o nyeghị olileanya ụfọdụ banyere ihe ngwọta dịịrị nsogbu ndị a zuru ụwa ọnụ.
Okpukpe nke Bible na-enye olileanya dị otú ahụ. Chineke na-ekwe nkwa iwebata ụwa ọhụrụ nke ezi omume n’okpuru ọchịchị, ma ọ bụ “alaeze” nke eluigwe. (Matiu 6:9, 10; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) Alaeze nke a bụ ihe ngwọta dịịrị nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ihe banyere ịdịgide adịgide nke abamuru zuru ụwa ọnụ ndị dị otú ahụ, Bible na-ekwekwa anyị nkwa, sị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ee, ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ bụ olileanya dịịrị ezi onye Kraịst ọ bụla! (1 Jọn 2:17) Ma ọ bụ nanị ndị jiworo ikpe ezi okpukpe kpọrọ ihe ga-erite uru site n’Alaeze nke a nke na-abịanụ. Ya mere, anyị na-agba gị ume ka ị malite ịmụsi Bible ike.c (Jọn 17:3) Ka ị na-amalite ikwe ka ìhè nke Okwu Chineke nwubata n’ime ndụ gị, ị ga-enwe ahụmahụ nke oké ọṅụ ka “mkpa Chineke dị” gị ji nwayọọ nwayọọ na-abụ nke e mejuru. N’eziokwu, ngọzi ebighị ebi ga-abụ nke gị n’ihi na i jiri okpukpe—ezi okpukpe ahụ—kpọrọ ihe.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ, lee Jenesis 2:4; 5:1; 6:9.
b Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke a pụrụ inweta site n’aka ndị bipụtara magazin nke a.
c Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka n’ihe banyere nke a. A pụrụ ime ndokwa maka ọmụmụ Bible ebe obibi nke na-agaghị efu ego ọ bụla site n’idegara ndị bipụtara magazin nke a akwụkwọ ma ọ bụ n’ije n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị n’ógbè unu.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ọdịdị Bible dị n’ihe karịrị 1,900 asụsụ kwekọrọ n’ihe o kwuru nke bụ na o sitere ná mmụo nsọ Chineke
[Foto dị na peeji nke 7]
Okpukpe nke Bible na-enye olileanya nke ọnọdụ udo zuru ụwa ọnụ n’okpuru ọchịchị eluigwe