Ịgba Àmà na France—Ala nke Nwere Ụdị Ihe Dị Iche Iche
FRANCE bụ mba nke nwere ụdị ihe dị iche iche. Oké ugwu ndị mara oké mma, ugwu nta ndị dị n’usoro n’usoro, oké nkume ndị oké ifufe na-efekwasị, ụsọ oké osimiri ndị nwere ájá uzuzu na-ekpo ọkụ, mbara ala ebe ndị a kụrụ ụdị ọka dị iche iche, obere ubi ndị a gbara ogige, ubi vine ndị buru ibu, ala ebe ụmụ anụmanụ na-ata nri, oké ọhịa dị iche iche ndị nwere osisi ndị na-anọgide na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ mgbe nile na ndị na-agbụsị akwụkwọ ha mgbe oge ya ruru, ógbè nta, obodo nta, obodo ukwu, na nnukwu obodo ndị ọgbara ọhụrụ—France nwere ihe ndị a nile, ma ọ gwụchabeghị.
Ọ bụ ezie na akụkụ dị ukwuu n’ime ime obodo dị n’ebe ahụ anọgidewo n’ịma mma ya, ọnọdụ ọha mmadụ dị na France enwewo oké mgbanwe n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga. Mbipụta 1989 nke akwụkwọ bụ Francoscopie na-asị, “Ọnọdụ ọha mmadụ ndị France anọghị n’ihe isi ike, kama ha nọ n’oge oké mgbanwe n’ezie. Ndokwa dị iche iche nke ọha mmadụ, ụzọ e si ele ihe anya, ụkpụrụ omenala, na àgwà ndị mmadụ na-enwe oké mgbanwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké ngwa.”
Oké mgbanwe ndị a emetụtawokwa ihe banyere okpukpe. Ọ bụ ezie na okpukpe Katọlik ka bụ ihe ndị ka n’ọnụ ọgụgụ na-ekpe, ugbu a, ọ bụ ihe omume omenala karịa ịbụ okpukpe nke nwere ezi mmetụta ọ bụla ná ndụ ihe ka ọtụtụ ná ndị òtù ya. Enweghị mmasị na-amụbawanye amụbawanye nke ụmụ mmadụ n’ihe ime mmụọ akwụsịwo ito uto nke chọọchị dị iche iche.
N’ụzọ dị nnọọ iche na nke ahụ, ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ na France agawo n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké ngwa n’ime afọ ole na ole gara aga. Site n’Alsace nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ ruo Brittany nke dị n’ụsọ oké osimiri Atlantic, site n’ugwu Alps ndị ahụ dị oké elu ruo na Ndagwurugwu Loire ahụ dị nnọọ ala, ọbụna n’agwaetiti ahụ dị n’osimiri Mediterranean nke bụ Corsica, Ndịàmà ahụ na-eche ọnọdụ dị iche iche ihu, na-ezutekwa ndị nwere ụdị nzụlite dị iche iche. Ka anyị site n’ile anya n’ihe osise gaa njem n’ebe ahụ iji hụ ihe ọ dị ka ya ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na France, bụ́ ala nke nwere ụdị ihe dị iche iche.—Matiu 24:14.
ALSACE
N’ịbụ nke nwere agbata obi n’etiti ya na Germany, Alsace bụ ókèala a ma ama n’ihi ọtụtụ ubi vine ya na obodo nta ndị jupụtara n’okooko osisi ndị mara mma. Strasbourg, bụ́ isi obodo ya, abụwo ebe okpukpe Protestant nọsiri nnọọ ike eri oge Nhazigharị Okpukpe ahụ, ndị Alsace na-akwanyekwara nnọọ Bible ùgwù nke ọma. Ndịàmà Jehova anọwo na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ógbè nke a kemgbe mmalite narị afọ nke a. Taa, ọrụ ha abụwo nke guzosiri ike, dị ka e mere ihe atụ ya site n’ahụmahụ nke otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sylvie, onye weere ohere o nwere mee ihe ikwusa ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ.
N’otu mkparịta ụka ya na ọtụtụ ụmụ klasị ya nwere, Sylvie welitere okwu banyere nzube nke ndụ na olileanya e nwere maka ọdịnihu. A kpaliri mmasị nke otu nwa okoro ruo n’ókè na o kwere ka Sylvie na otu Onyeàmà ọzọ bịa leta ya n’ụlọ. Sylvie sịrị, “Ọ bụ ezie na nwa okoro onye Katọlik nke a abụwo onye na-eje ozi n’altar, o nwere ọtụtụ ajụjụ ndị a na-azabeghị mgbe ọ bụla. Anyị jiri Bible mee ihe ịza ụfọdụ n’ime ha, o kwenyekwara ka a na-eduziri ya ọmụmụ Bible mgbe nile.” Nwa okoro ahụ mere baptism mgbe otu afọ gasịrị, mgbe o rukwara eru, ọ malitere ije ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile. Sylvie n’onwe ya anarawokwarịị ihe ùgwù ije ozi ahụ.
BRITTANY
N’ịbụ nke gbatịrị banye n’ime osimiri Atlantic, Brittany bụ ógbè ebe omenala Katọlik siri ike. Otú ọ dị, site ná mgbalị Ndịàmà ahụ nọgidere na-eme, ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye nke ndị bi n’ógbè nke a na-anakwere ozi Alaeze ahụ. Nke a bụ otu ihe atụ nke ihe na-eme n’akụkụ ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke a nke France.
Otu Onyeàmà bi n’ógbè ahụ na-akọ, sị, “Otu di na nwunye ka lụrụ ọhụrụ kwabatara n’ụlọ nke dị n’elu nke anyị. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ezutere m nke nwanyị n’elu stepụ, ebe o ku nwa ya n’aka. Mgbe m nụrụ na aha nwa ya bụ Jonathan, ajụrụ m nwanyị ahụ ma ọ̀ maara ebe aha ahụ si bịa. Ọ zara, sị, ‘Echere m na o sitere na Bible, ma ọ gwụla ihe m maara banyere ya.’ O gere ntị ná nkọwa m nyere ya, o kwukwara na ya na di ya nwere oké mmasị na Bible. Ọ bụ ezie na anyị nwekwuru mkparịta ụka ndị ọzọ, ma ọ dịghị ezi ihe si na ya pụta mgbe ahụ.
“Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, di na nwunye ahụ rịọrọ m ka m tụọrọ ha aro banyere nsogbu ụfọdụ. Ejiri m Bible nye azịza, ihe ọmụma dị na ya kpalikwara mmasị ha. Akpọrọ m ha òkù ọzọ ịmụ Bible. N’echi ya, nwanyị ahụ nakweere. Mgbe izu ole na ole gasịrị, di ya sonyere n’ọmụmụ ihe ahụ. Ugbu a, ha abụọ bụ Ndịàmà meworo baptism.”
UGWU ALPS
Ugwu Alps ndị ahụ bụ ndị a maara nke ọma maka ịma mma ha. Ụmụ mmadụ na-eje ebe ahụ ikiri ọnụ ọnụ ha ndị mara oké mma, karịsịa nke a na-akpọ Mont Blanc, bụ́ nke ọnụ ọnụ ya kasị dịrị elu n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe. N’ógbè nke a kwa, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze ndị na-eto Onye Okike ahụ na-amụbawanye. Ndị nọ n’afọ ndụ nile, ndị nọ n’ọnọdụ dị iche iche ná ndụ, na-esonyere ha, dị ka akụkọ sonụ na-egosi.
Ndị ntorobịa anọ bi n’ógbè ahụ bụ nnọọ ndị a ma ama. Ha na-ezu ụgbọ ala na ngwongwo ndị ọzọ, ha na-aṅụbiga mmanya ókè ọtụtụ ugbo, ha na-eji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe, na-erekwa ha ere, aka ha dịkwa n’ịgba akwụna na ime mgbaasị. Ha enweghị ọrụ, ha na-abanyekarịkwa ná nsogbu ndị uwe ojii. Ha nile agatụwokwa mkpọrọ. Otú ọ dị, ha anọ anụtụwo banyere eziokwu ahụ mgbe ha bụ ụmụntakịrị n’ihi na ezinụlọ ha esorowo Ndịàmà Jehova mụọ ihe site n’oge ruo n’oge.
Mgbe afọ ole na ole nke ibi ndụ dị ka anụ ọhịa gasịrị, otu n’ime ndị ntorobịa ahụ gbanwere obi ya wee kpebie ijere Jehova ozi. Nke a kpatara ọtụtụ ihe ndị mere ná nsochi ná nsochi. Otu ụbọchị, ndị uwe ojii nọ na-elegharị anya otu ha si emebu, ha wee jụọ otu n’ime ụmụ okoro ahụ ka o mepee akpa ya. N’ịtụ anya ịhụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ihe ndị e zuru ezu, ọ bụụrụ ha ihe ijuanya ịhụ nanị otu Bible na akwụkwọ nta ole na ole. Nwa okoro ahụ jiri Bible mee ihe ịkọwa ihe kpataworo mgbanwe ndị o meworo ná ndụ ya. N’ịhụ nke ahụ dị ka ihe siri ike ikwere, otu n’ime ndị uwe ojii ahụ jụrụ, sị: “Ị̀ na-ekwu na ị dịghị ese sịga, na ị dịghị aṅụ mmanya, ma ọ bụ na ị dịghị ejikwa ọgwụ ọjọọ eme ihe?” Ndị uwe ojii ahụ mesịrị nakwere nkọwa ya, ma kwere ka ọ laa n’egbughị oge ọ bụla. Taa, ụmụ okoro anọ ndị a bụ ndị mere baptism, ha nile na-eje ozi n’ime ọgbakọ dị ka ndị ohu na-eje ozi, atọ n’ime ha bụkwa ndị ọsụ ụzọ oge nile.
NDAGWURUGWU LOIRE
A na-akpọ Ndagwurugwu Loire ubi a gbara ogige nke France. O si Orléans gbatịa 110 kilomita n’ebe ndịda nke Paris, ruo n’ọnụ ọnụ Osimiri Loire nke dị n’ụsọ oké osimiri Atlantic. A maara akụkụ nke a n’ihi ọtụtụ ụlọ ukwu ndị dị na ya, bụ́ ebe obibi oge ochie na ebe ndị eze na-anọ mgbe ha gara ịchụ nta. E nwere ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’obodo ukwu nile dị n’ógbè nke a.
Otu ụbọchị n’oge e nwere nkwụsịtụ ehihie n’ụlọ akwụkwọ, obere nwa bụ Emma, bụ́ nwa agbọghọ nta nke na-emeso ndị ọzọ omume enyi, na-adọtakwa mmasị, nke dị afọ isii, banyeghachiri n’ime klasị ya ikele onye nkụzi ya. N’ịbụ onye ibubo nwụrụ n’ahụ ịhụ ka onye nkụzi ya na-ese sịga, ọ malitere ịkwa ákwá ma gbapụ n’èzí. Onye nkụzi ahụ chụsoro ya wee jụọ ya ihe mere o ji na-ebe ákwá, ma Emma ekwughị ihe ọ bụla. Mgbe onye nkụzi ahụ jụsiri ya ike, Emma ji anya mmiri zaghachi, sị: “Ọ bụ n’ihi na ị na-ese sịga. Ị gaje ịda ọrịa ma nwụọ!”
N’echi ya onye nkụzi ahụ kpọrọ nne Emma ịkọ otú mmeghachi omume nke nwa ya nwanyị si metụta ya n’ahụ nke ukwuu. Ya mere, nne nwa ahụ kọwara ọnọdụ Ndịàmà n’ihe banyere ụtaba. Onye nkụzi ahụ kwuru na ezinụlọ nke ya agwawo ya rịị ka ọ kwụsị ise sịga, ma o nweghị isi. Otú ọ dị, n’oge nke a, ezi mmeghachi omume nke Emma metụrụ ya n’ahụ nke ukwuu nke na ọ kwụsịrị ise sịga n’ime nanị ụbọchị abụọ.
CORSICA
Agwaetiti nke Corsica, ọ bụ ezie na a na-akpọ ya “agwaetiti ahụ nke nwere ísìsì ọma,” bụkwa nke a maara n’ihi mmụọ siri ike nke ndị bi na ya, nke na-arụpụtakarị nlụrịta ọgụ ndị a na-awụfu ọbara dị ukwuu na ha. Ruo ọtụtụ afọ, e lere Ndịàmà anya dị ka okpukpe “nke sitere na Kọntinenti ahụ bịa.” Otú ọ dị, ike nke eziokwu Bible na-agbanwe obi ọtụtụ ndị n’ebe ahụ.
Otu Onyeàmà mere baptism ọhụrụ kọrọ na n’otu mgbe, o si ezumike lọghachi ịhụ na ndị mmadụ abịawo zukọrọ ngwongwo nile a pụrụ ibugharị ebugharị nke dị n’ubi ya. O ji ntụkwasị obi kwuo, sị, “Site n’ịtụkwasị Jehova obi, enwere m ike imeghachi omume n’ụzọ dị iche site n’ụzọ m gaara esiworị meghachi omume n’oge gara aga.” Mgbe ọ na-agwa ndị agbata obi ya okwu, o ji obi dị nwayọọ hota ihe ndị funarịrị ya.
“Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ụfọdụ ndị agbata obi m nwere nsogbu ụfọdụ. Ahapụrụ m ọrụ m wee jee inyere ha aka. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, otu n’ime ha kpọrọ m na telifon na-agwa m ka m bịa ngwa ngwa. N’iche na ọ banyewo ná nsogbu ọzọ, agara m na nke ya ozugbo ahụ. Ọ gwara m ka m nọdụ ala wee jụọ m, sị: ‘Ị̀ maara ihe mere m ji kpọọ gị ka ị bịa? Ọ bụ n’ihi ngwongwo gị. Ọ bụ m zuuru ya. Mgbe m hụrụ àgwà obi ọma na nke enyi i nwere, agwara m onwe m, sị, “Apụghị m ime ya ihe nke a!” Mgbe i nyesịkwaara anyị aka, apụghị m ihi ụra n’abalị.’” Itinye ezi iso ụzọ Kraịst n’ọrụ rụpụtara ezi ihe.
Mgbe agha ụwa nke abụọ gwụsịrị, mgbe ọrụ nkwusa Alaeze ahụ maliteghachiri ọzọ na France, e nwere nanị 1,700 Ndịàmà n’ime mba ahụ dum. Ibu ọrụ nke iji ozi Alaeze ahụ rute ndị nile bi ná mba ahụ yiri ihe a na-apụghị ime eme. Otú ọ dị, n’ime afọ ndị gabigaworonụ, Jehova ejiriwo ngwá ọrụ ndị dị mkpa gọzie ndị ya nọ na France—ígwè obibi akwụkwọ dị iche iche, Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na ihe ndị ọzọ—nakwa mmụọ mwepụta onwe onye iji rụzuo ọrụ ahụ. Taa, ebe e nwere ihe karịrị 117,000 ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike, ozi ahụ nke bụ na Alaeze Jehova nke dị n’aka Kraịst bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ bụ nke a na-ekwusazu n’ime mba nke a nke nwere ụdị ihe dị iche iche.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
FRANCE
BRITTANY
NDAGWURUGWU LOIRE
UGWU ALPS
ALSACE
OKÉ OSIMIRI ATLANTIC
OSIMIRI MEDITERRANEAN
ỌWA MMIRI ENGLAND
CORSICA