Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ndị Na-achọ Eziokwu Azaghachi nke Ọma n’Ịgba Àmà Mberede
Bible na-eme ka anyị mara na ndị yiri atụrụ ga-azaghachi n’olu nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ. (Jọn 10:27) Nke a abụwo otú o mere n’ọtụtụ ala dị iche iche, gụnyere Britain.
◻ Dị ka ihe atụ, na 1988, n’oge na-adịghị anya tupu Krismas, Pamela, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, zara telifon n’ọfịs ebe ọ na-arụ ọrụ, ya na otu onye na-achọtara otu ụlọ ọrụ ahụ ndị ahịa nke nọ n’akụkụ ọzọ nke England wee kwurịta okwu. Mgbe mkparịta ụka ahụ na-agwụsị, nwoke ahụ jụrụ ya, sị: “Ị̀ dịwokwa njikere maka Krismas?” Pamela sịrị: “Ee e!” “Ọ̀ bụ na oge aganarịbeghị gị?” ka onye ahụ kpọrọ ya na telifon jụrụ. “Anaghị m eme ememe Krismas,” ka Pamela zaghachiri. Nwoke ahụ kwuru na ya anụtụbeghị ihe yiri nke ahụ mbụ, wee jụọ ya ihe kpatara nke ahụ. Pamela gwara ya na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, wee gaa n’ihu ịkọwa na e nweghị iwu ọ bụla e nyere na Bible ka a na-eme ememe ụbọchị ọmụmụ Jisọs, ọzọkwa, na a mụghị Jisọs na December 25. Karịa nke ahụ, Krismas bụbu ememe ndị ọgọ mmụọ. Onye ahụ kpọrọ ya na telifon kwuru na ihe ya na-anụ masịrị ya nnọọ.
Mgbe ọnwa atọ gasịrị, Pamela zara telifon, onye kpọrọ ya wee sị: “Ị̀ chetara na mụ na gị kwurịtara okwu tupu Krismas i wee gwa m na ị dịghị eme ememe Krismas? Achọtawo m eziokwu ahụ!” Ọ bụ otu nwoke ahụkwa, o wee kọwaa na n’izu abụọ mgbe Krismas gasịrị, Ndịàmà abụọ bịara n’ụlọ ya. Ọ kpọbatara ha, wee malite ọmụmụ Bible. Ọ kọrọ na ya enwewo ọganihu dị ngwa n’ọmụmụ ihe ya. Ọ gwara enyi ya nwanyị nke ya na ya bi ebi na ụzọ ndụ ha amasịghị Jehova, ha wee kewaa, ma ha abụọ na-ejekwa nzukọ dị iche iche ugbu a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
N’ọgwụgwụ afọ ahụ, a nabatara ha dị ka ndị nkwusa na-emebeghị baptism, ná mmalite afọ 1990, ha lụkwara di na nwunye. Mgbe ahụ, ha abụọ mekọrọ baptism. Nke a bụ ezi ihe a rụpụtara site n’àmà mberede na-adịghị ogologo a gbara na telifon!
◻ Jehova gọziri otu nwanna nwanyị ọzọ onye gbara àmà mberede n’England. Mgbe otu onye inshọrans bịara n’ụlọ ya, nwanna nwanyị ahụ jụrụ ya ma ọ̀ ga-amasị ya ka e kwe ya nkwa inwe ezi ahụ ike, obi ụtọ, na ndụ ebighị ebi. Ọ sịrị ee, wee jụọ nwanna nwanyị ahụ akwụkwọ inshọrans nke ọ na-ekwu okwu banyere ya. Mgbe e gosiri ya na Bible nkwa Chineke nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala, ọ naara otu akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala ma gụchapụ akwụkwọ ahụ n’otu uhuruchi. Mgbe ọ bịara n’ụlọ nwanna nwanyị ahụ ọzọ, ọ gwara ya na ihe ọmụma dị n’akwụkwọ ahụ mara mma nke ukwuu—ma a sị nnọọ na ya nwere okwukwe iji kwere na ya. Nwanna nwanyị ahụ kọwara na ọ dị mkpa ka ọ mụọ Bible, na-abịakwa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. E mere ndokwa maka ọmụmụ Bible, ọ malitekwara ịbịa nzukọ dị iche iche. E mere ya baptism n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke otu afọ ahụ. Mgbe nanị otu afọ gasịrị, ọ lụrụ nwa nke nwanna nwanyị ahụ onye bu ụzọ gbaara ya àmà. “Ya mere,” ka nwanna nwanyị ahụ na-asị, “enwetara m ma nwanna ma ọgọ nwoke site n’ịgba àmà mberede m!”
Ọ bụ ihe mere eme na ndị na-achọ eziokwu na-azaghachi nke ọma mgbe ha nụrụ eziokwu Bible site n’ịgba àmà mberede. Dị ka Jisọs kwuru, atụrụ ya na-ege ntị olu ya.