‘Jehova Bụ Chineke M, Onye M Ga-atụkwasị Obi’
DỊ KA WILLI DIEHL SI KỌỌ
“N’ihi gịnị ka i ji chọọ ije Betel?” Nke a bụ ajụjụ nna m jụrụ n’oge opupu ihe ubi nke 1931 mgbe m gwara ya banyere ọchịchọ m ịmalite ije ozi Betel. Ndị mụrụ m, bụ́ ndị bi na Saarland, anọwo n’eziokwu ahụ ihe dị ka afọ iri, ha esetịpụwokwara anyị bụ ụmụ ndị ikom atọ ezi ihe nlereanya. Eziokwu ahụ bụ ndụ ha dum, achọkwara m ime ka ọ bụrụ ndụ m dum.
MA OLEE ụzọ ndị mụrụ m si mụta ihe banyere Jehova na nzube ya dị nsọ? N’ịbụ ndị okpukpe ndị e nwere na-ejughị afọ, ọ dịwo ogologo oge ha na-achọ eziokwu ahụ. Ha nwalere ụdị chọọchị na òtù nta dị iche iche, na-achọpụta na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha bụ nke ziri ezi.
Otu ụbọchị, a hapụrụ otu mpempe akwụkwọ n’ọnụ ụzọ anyị, bụ́ nke na-ama ọkwa otu okwu a ga-eji ihe osise na otu ihe nkiri mee banyere nzube Chineke, nke a kpọrọ “Foto Ihe Nkiri nke Okike Ihe.” Nna m ga-anọ n’ọrụ mgbe a ga-egosi “Foto Ihe Nkiri” ahụ, ma ọ gbara Nne m ume ije. “Ma eleghị anya,” ka o kwuru, “ọ pụrụ ịdị ihe bara uru dị na ya.” Mgbe o kirisịrị ya n’anyasị ahụ, Nne m nwere ịnụ ọkụ n’obi. “Emesịwo m chọta ya!” ka o kwuru. “Bịa jiri anya gị hụrụ ya ná mgbede echi. Ọ bụ eziokwu ahụ nke anyị nọworo na-achọ.” Nke ahụ bụ na 1921.
Dị ka ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị mụrụ m nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ha nwụrụ, Nna m na 1944, mgbe ndị Nazi tụbasịrị ya n’ụlọ mkpọrọ ọtụtụ ugbo, Nne m kwa na 1970. Ya onwe ya nọkwara ogologo oge n’ụlọ mkpọrọ n’okpuru ọchịchị ndị Nazi.
Ezi Ihe Nlereanya nke Ịnụ Ọkụ n’Obi Ndị Mụrụ M
Tupu ha anwụọ, ndị mụrụ m na-arụsi nnọọ ọrụ ike n’ije ozi ubi. Nne m nwere ịnụ ọkụ n’obi pụrụ iche n’ikesa nkwupụta okwu ndị ahụ e mere ná mgbakọ dị iche iche site na 1922 ruo 1928. Ecclesiastics Indicted (E Kwuru na Ikpe Mara Ndị Ndú Okpukpe), bụ́ nke bu nkwupụta okwu nke a nabatara na 1924, nwere okwu nkatọ na-agba agba megide ndị ndú okpukpe. Ọ chọrọ obi ike iji kesaa ya. Ndị nkwusa na-ebili n’elekere anọ nke isi ụtụtụ wee malite ịfanye trakti n’okpuru ọnụ ụzọ dị iche iche. Ọ bụ ezie na adị m nanị afọ 12, ndị mụrụ m kwere ka m kere òkè. Anyị na-amlitekarị n’elekere ise nke ụtụtụ, na-agba ịnyịnya ígwè ihe dị ka hour atọ ma ọ bụ anọ iji ruo ókèala ndị dịpụrụ adịpụ. Anyị na-ezo ịnyịnya ígwè ndị ahụ n’ọhịa, ana m echegidekwa ha mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ime obodo nta ahụ. N’ehihie, anyị na-agbara ịnyịnya ígwè ndị ahụ wee laa, n’uhuruchi anyị na-ejikwa ụkwụ gaa ije otu hour iji jee nzukọ.
Mgbe oge gasịrị, a na-ahapụ onye bụ nwata karị ka o chegide ịnyịnya ígwè ndị ahụ, mụ na ndị nkwusa ahụ na-esokwa wee jee. Ma ọ dịghị onye chere echiche banyere inye m ọzụzụ. Ihe ha na-eme bụ nanị ịgwa m okporo ụzọ nke m ga-arụ ọrụ na ya! Mgbe obi m na-akụsi ike, ana m eji nwayọọ jee n’ụlọ nke mbụ, na-enwe olileanya ka mmadụ ghara ịnọ n’ụlọ. O wutere m ịhụ na otu nwoke meghere ụzọ. Amaghị m ihe m ga-ekwu. N’ikwugheri ọnụ, ezoro m aka n’akwụkwọ dị n’akpa m. “Ò si n’aka Ọkaikpe Rutherford?” ka nwoke ahụ jụrụ. Azaghachiri m n’olu na-ama jijiji. Ọ sịrị, “Ọ̀ bụ nke ọhụrụ, nke m na-enwebeghị?” “Ee, ọ bụ nke ọhụrụ,” ka m kwuru. Ọ sịrị, “Ya bụrụ otú ahụ, m ghaghị inweta ya. Ọ̀ bụ ego ole?” Nke a nyere m obi ike iji gaa n’ihu.
Na 1924, ndị toworo eto kwuru okwu hie nne banyere 1925. N’otu mgbe, anyị jere leta otu ezinụlọ nke Ndị Mmụta Bible, m wee nụ ka otu nwanna na-ajụ, sị: “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị akpọrọ anyị laa, gịnị ga-eme ụmụ anyị?” Nne m, bụ́ onye na-enwe echiche ziri ezi mgbe nile, zara, sị: “Onyenwe anyị ga-ama ụzọ ọ ga-esi lekọta ha.” Isiokwu ahụ kpaliri mmasị m. Gịnị ka ihe a nile pụtara? Afọ ahụ bụ 1925 bịarutere ma gafee, ọ dịghịkwa ihe merenụ. Otú ọ dị, ndị mụrụ m adaghị mbà n’ịnụ ọkụ n’obi ha.
Ndụmọdụ Amamihe nke Nna M
N’ikpeazụ, na 1931, agwara m nna m ihe m chọrọ iji ndụ m eme. “N’ihi gịnị ka i ji chọọ ije Betel?” Ka nna m jụrụ m ná nzaghachi. “N’ihi na achọrọ m ijere Jehova ozi,” ka m zaghachiri. “Ka a sị nnọọ na a nakwere gị na Betel,” ka ọ gara n’ihu ikwu. “Ị̀ maara na ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ abụghị ndị mmụọ ozi? Ha bụ ndị na-ezughị oke, ha na-emehiekwa ihe. Egwu na-atụ m na nke a pụrụ ime ka ị gbafuo, ọbụna hapụ okwukwe ahụ. Jide n’aka na i chere echiche nke ọma banyere ya.”
Ibubo nwụrụ m n’ahụ ịnụ ihe dị otú ahụ, ma mgbe m tụlesịrị okwu ahụ ruo ụbọchị ole na ole, ekwupụtaghachiri m ọchịchọ m itinye akwụkwọ maka Betel. “Gwaghachi m ihe mere i ji chọọ ije,” ka o kwuru. “N’ihi na achọrọ m ijere Jehova ozi,” ka m zaghachiri. “Nwa m, echefukwala nke ahụ. Ọ bụrụ na a kpọọ gị, cheta ihe mere iji na-eje. Ọ bụrụ na ị hụ ihe na-agazighị agazi, echegbubigala onwe gị ókè. Ọbụna ma a sị na e mesoo gị mmeso na-adịghị mma, agbafukwala. Echefukwala ihe mere i ji nọrọ na Betel—n’ihi na ị chọrọ ijere Jehova ozi! Lekwasị anya n’ọrụ gị ma tụkwasị ya obi.”
Otú ahụ ka o si bụrụ na n’ehihie nke November 17, 1931, abịarutere m na Betel nke dị na Bern, Switzerland. Mụ na mmadụ atọ ọzọ bikọrọ n’otu ọnụ ụlọ, arụkwara m ọrụ n’ebe obibi akwụkwọ, na-amụ iji otu ígwè obibi akwụkwọ nta nke a na-eji aka etinyere akwụkwọ na-arụ ọrụ. Otu n’ime ihe ndị mbụ e kenyere m ibipụta bụ Ụlọ Nche n’asụsụ Romanian.
Ozi nke Sitere n’Eluigwe!
Na 1933, Society bipụtara akwụkwọ nta bụ The Crisis, nke e nwere n’ime ya okwu atọ Nwanna Rutherford kwuru na redio na United Sates. Nwanna Habeck, bụ́ onye ohu alaka ụlọ ọrụ, gwara ezinụlọ Betel n’oge a na-eri nri n’otu ụtụtụ na a ga-ekesa akwụkwọ nta ahụ n’ụzọ pụrụ iche. A ga-esi n’otu obere ụgbọ elu a natara ná ngo nke ga na-efegharị n’elu Bern tụdasịa mpempe akwụkwọ ndị na-eme mkpọsa, ebe ndị nkwusa ga-eguzo n’akụkụ okporo ụzọ dị iche iche na-eche akwụkwọ nta ahụ n’ihu ndị mmadụ. “Olee onye n’ime unu bụ ụmụnna ụmụ okoro dị njikere iso ụgbọ elu ahụ?” ka ọ jụrụ. “Detanụ aha unu ozugbo.” Enyere m aha m, Nwanna Habeck mesịkwara maa ọkwa na a họpụtawo m.
N’ụbọchị oké ihe omume ahụ, anyị bu ọtụtụ katọn mpempe akwụkwọ n’ụgbọ ala wee jee n’ọdụ ụgbọ elu ahụ. Anọdụrụ m ala n’oche dị n’azụ onye na-akwọ ụgbọ elu ahụ ma chịpụtajuo mpempe akwụkwọ ahụ n’elu oche dị n’akụkụ m. Ntụziaka e nyere m bụ: Pịakọta mpempe akwụkwọ ndị ahụ n’otu narị otu narị ma jiri ike tụpụ ùkwù nke ọ bụla n’akụkụ ọ bụla nke ụgbọ elu ahụ. Elezighị anya pụrụ ime ka mpempe akwụkwọ ndị ahụ tụhịkọta n’ọdụdụ ụgbọ elu ahụ, na-akpata nsogbu. Ma ihe nile gara nnọọ nke ọma. Ụmụnna mesịrị kọọ otú o si bụrụ ihe na-akpali akpali ịhụ ‘ozi nke a sitere n’eluigwe.’ O nwere mmetụta a chọrọ ka o nwee, e tinyekwara ọtụtụ akwụkwọ nta, ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị kpọrọ na telifon ime mkpesa na mpempe akwụkwọ ekpuchikọtawo ebe ha kụrụ okooko osisi.
Enwere M Ekele maka Ihe Ùgwù Ije Ozi Ọ Bụla
Kwa ụbọchị, ana m ekele Jehova maka ọṅụ na afọ ojuju nke ije ozi Betel. N’ọgbakọ, e kenyere m ọrụ imeghe Ụlọ Nzukọ Alaeze, idozi oche n’ụzọ a haziri ahazi, na ịdọba otu iko mmiri dị mma n’elu ikpo okwu ahụ. Agụrụ m nke a n’ihe ùgwù dị ukwuu.
Na Betel, emesịrị m rụọ ọrụ ná nnukwu ígwè obibi akwụkwọ e ji na-ebipụta The Golden Age (nke a na-akpọ Teta! ugbu a) n’asụsụ Polish. Na 1934, anyị malitere iji ígwè e ji akpọ rekọd na-eme ihe, enyekwara m aka n’imepụta ha. Enwetara m ọṅụ dị ukwuu n’iji okwu Bible ndị a gụnyere na rekọd na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Obere ígwè nke a kpaliri mmasị nke ọtụtụ ndị nwe ụlọ, ọtụtụ mgbe, ezinụlọ dum na-ezukọtakwa ige ntị, ma na-apụsị otu otu. Mgbe ezinụlọ ahụ dum pụsịchara, ana m aga n’ụlọ ọzọ.
Ịnọ Na-arụsi Ọrụ Ike n’Oge Agha
Mgbe Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị, e kewapụrụ obodo nke m bụ Saarland site na Germany, a na-achịkwa ya n’okpuru nlekọta nke òtù League of Nations. Otú a, Saarland nyere ndị mmadụ akwụkwọ e ji amata ndị ha bụ. Na 1935, e mere nzukọ ọha mmadụ iji kpebie ma ụmụ amaala obodo ahụ hà chọrọ ka e jikọghachi ha na Germany. Ejiri m ohere ahụ jee leta ezinụlọ m, na-amara na m gaghị enwe ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na Saarland abịa n’okpuru ọchịchị ndị Nazi. N’eziokwu, ruo ọtụtụ afọ mgbe nke ahụ gasịrị, anụghị m ihe ọ bụla site n’ọnụ ndị mụrụ m na ụmụnne m.
Ọ bụ ezie na e meghị ka ha tinye aka kpọmkwem n’Agha Ụwa nke Abụọ, Switzerland ghọrọ nnọọ ebe nọpụrụ iche ka Germany na-awabanye ná mba ndị agbata obi ya n’otu n’otu. Anyị anọwo na-ebiri Europe dum akwụkwọ, e wezụgakwa Germany, ma ugbu a, a pụghị izijere ndị ọ bụla ihe ha chọrọ. Nwanna Zürcher, onye bụ ohu alaka ụlọ ọrụ n’oge ahụ gwara anyị na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghịkwa ego fọdụrụnụ, o wee kpọọ anyị òkù ka anyị jee chọrọ ọrụ n’ebe na-abụghị Betel ruo mgbe ọnọdụ dịrị mma. Otú ọ dị, e kwere ka m nọgide, ebe ọ bụ na e nwere ihe ole na ole a ka ga-ebiri ihe dị ka otu puku ụmụnna ndị ebe ahụ.
Ezinụlọ Betel enweghị ike ichefu July 5, 1940. Ozugbo e risịrị nri ehihie, otu ụgbọ ala ndị agha gbabatara. Ndị soja matusịrị ma wabata n’ime Betel. E nyere anyị iwu ka anyị kwụrụ kpọmkwem ebe anyị kwụ, onye soja bu égbè chegidekwara onye ọ bụla n’ime anyị. A chịịrị anyị banye n’ime ụlọ iri nri mgbe ha nọ na-awagharị n’akụkụ ndị ọzọ nke ụlọ ahụ. Ndị ọchịchị chere na anyị na-agwa ndị ọzọ ka ha jụ ije agha, ma ha ahụghị ihe àmà ọ bụla kwadoro nke a.
N’afọ ndị ahụ a lụrụ agha, abụ m ohu ọgbakọ ma na Thun ma na Frutigen. Nke ahụ pụtara na ndokwa oge m n’oge ọgwụgwụ izu jupụtara nnọọ ejupụta. Na Saturday ọ bụla, ozugbo e risịrị nri ehihie, ana m agbara ịnyịnya ígwè m gaa 50 kilomita iru Frutigen, bụ́ ebe m na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’uhuruchi. N’ụtụtụ Sunday, ana m eso ndị nkwusa jee ozi ubi. Mgbe ahụ, ná mmalite ehihie, ana m apụ jee Interlaken maka iduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, mgbe e mesịkwara n’ehihie ahụ, ana m eje iduziri otu ezinụlọ bi na Spez ọmụmụ Bible. Iji mechie ụbọchị ahụ, ana m eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Thun.
Mgbe chi jimiworo, mgbe m rụzuwokwara ọrụ nile dịịrị m, ana m abụrụ abụ, na-amakwa mkpọrọhịhị laghachi Bern, na-enwe afọ ojuju dị omimi. Ụgbọ ala e nwere n’oge ahụ dị ole na ole, ọ na-adịkwa anya tupu ahụ ọzọ mgbe a hụsịrị ibe ya. Mbara ebe ahụ jupụtara n’ugwu ugwu, n’ịbụ nke ọchịchịrị kpuchiri n’ihi iwu mmenyụ ọkụ e nwere n’oge agha ahụ, na-ada nnọọ jụụ n’enweghị nsogbu ọ bụla, na-egbukepụ mgbe ụfọdụ n’ìhè nke ọnwa. Lee nnọọ ka ọgwụgwụ izu ndị ahụ si mee ka ndụ m dịwanye mma, nyekwa m ume ọhụrụ!
Nleta nke Rụpụtara Ihe A Na-atụghị Anya Ya
N’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke afọ 1945, Nwanna Knorr bịara ileta anyị. Otu ụbọchị, ọ batara n’ebe obibi akwụkwọ mgbe m guzo n’elu ígwè obibi akwụkwọ rotary ahụ. “Rịdata,” ka ọ kpọrọ m òkù kwuo. “Ọ̀ ga-amasị gị ije Ụlọ Akwụkwọ Gilead?” Nke a enyeghị m ọnụ okwu. “Ọ bụrụ na i chere na m mpụrụ ime ya, ọ ga-amasị m ime otú ahụ,” ka m zaghachiri. A natara ọkpụkpọ òkù maka mụ na Nwanna Fred Borys, na Nwanna nwanyị Alice Berner n’oge opupu ihe ubi nke 1946. Ma n’ihi ịbụ onye a mụrụ na Saarland, abụ m onye na-enweghị mba o si na ya, ya mere ọ dịrị mkpa na m ga-edega akwụkwọ na Washington D.C., maka akwụkwọ visa pụru iche.
Ebe ndị ọzọ pụrụ mgbe oge ya ruru, echeere m ruo mgbe m natara azịza nye ndejupụta akwụkwọ m mere. Mgbe ụlọ akwụkwọ ahụ malitere na September 4, m ka nọ na Switzerland, ejikwa m nwayọọ nwayọọ na-akwụsị inwe olileanya. Mgbe ahụ, ụlọ ọrụ nnọchianya mba U.S. kpọrọ m, na-agwa m na akwụkwọ visa m abịarutewo. Agbalịrị m ozugbo ahụ ime ndokwa ịga njem, emesịrị m nweta ohere n’otu ụgbọ mmiri ndị agha nke si Marseilles na-aga New York. Lee nnọọ oké ahụmahụ nke a bụ! Ụgbọ ahụ bụ Athos II jubigara ókè na mmadụ. E nyere m otu ihe ndina nta dị n’ọnụ ụlọ ghere oghe. N’ụbọchị nke abụọ anyị nọ na njem, otu ihe gbawara n’ime ụlọ ebe injin na-adị mere ka ụgbọ mmiri ahụ kwụsị ịga. Ma ndị njem ma ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ enweghị nke ahụ ruru ala, na-atụ egwu na ụgbọ ahụ pụrụ iburu anyị nile mikpuo. Nke a nyere m ohere magburu onwe ya ịgba àmà banyere olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ.
O were ụbọchị abụọ iji rụzie ụgbọ mmiri ahụ, anyị wee gaa n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị ala karị. Anyị ruru New York mgbe ụbọchị 18 gasịrị, nanị ịbụ ndị a hapụrụ n’ime ụgbọ ahụ n’ihi na ndị na-arụ ọrụ n’ọrụ ụgbọ mmiri kwụsịrị ọrụ n’iwe. Mgbe a gbarịtasịrị izu, anyị mesịrị nwee ike ịhapụ ụgbọ mmiri ahụ. Akụjeworo m Society waya banyere ọnọdụ ahụ, ozugbo m gafetasịrị ndị na-enyocha ihe e bubatara ná mba na ndị na-enyocha ndị bịara abịa, otu nwoke jụrụ m, sị: “Ị̀ bụ Mazị Diehl?” Ọ bụ otu n’ime ndị na-enyere Nwanna Knorr aka, o tinyekwara m n’ụgbọ okporo ígwè na-agba n’abalị ije Ithaca, n’ebe dị nso Ụlọ Akwụkwọ Gilead, bụ́ ebe m rutere mgbe elekere asatọ ji ihe nta kụfesịa n’ụtụtụ echi ya. Lee nnọọ ka o si bụrụ m ihe mkpali imesị rute n’ebe ahụ, inwe ike ije klasị Gilead mbụ nke nwere ndị si mba dị iche iche na ya!
Inwe Ntachi Obi n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike
Ụbọchị ngụcha akwụkwọ nke klasị nke asatọ nke Gilead bụ February 9, 1947, Onye ọ bụla nọkwa na-echegbu onwe ya. Olee ebe a ga-ezije anyị? N’ihe banyere m, “ụdọ ọ̀tụ̀tụ̀ nile” daara m n’ụlọ obibi akwụkwọ ahụ Society meghere ọhụrụ na Wiesbaden, Germany. (Abụ Ọma 16:6) Alaghachiri m na Bern ije tinye akwụkwọ iji nweta akwụkwọ ndị dị mkpa, ma òtù ndị agha mba U.S., ndị nọ n’ebe ahụ na-enye nanị ndị biburu ebe ahụ tupu agha ahụ ohere ịbata. Ebe ọ bụ na ebibeghị m ebe ahụ mbụ, ọ dịrị mkpa ka isi ụlọ ọrụ Brooklyn kenye m ọrụ ọhụrụ. Ọ bụ ọrụ sekit na Switzerland, bụ nke m ji ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ wee nara. Ma mgbe m nọ na-echere ọrụ nke a, agwara m otu ụbọchị ka m duru ụmụnna nwanyị atọ bịara abịa jegharịa na gburugburu Betel ahụ. Otu n’ime ha bụ onye ọsụ ụzọ aha ya bụ Marthe Mehl.
Na May 1949, agwara m isi ụlọ ọrụ dị na Bern na achọrọ m ịlụ Marthe, na anyị chọkwara ịnọgide n’ije ozi oge nile. Gịnị bụ nzaghachi ha? Ọ dịghị ihe ùgwù ọ bụla a ga-enye anyị ma e wezụgakwa ọsụ ụzọ oge nile. Anyị malitere ime nke a na Biel mgbe anyị gbasịrị akwụkwọ na June 1949. E kweghị ka m kwuo okwu ná nzukọ dị iche iche, anyị enweghịkwa ike iso chọtara ndị ga-abịa otu mgbakọ a gaje inwe ụlọ, ọ bụ ezie na onye nlekọta sekit anyị ekwuwo na anyị ruru eru inweta ihe ùgwù ahụ. Ọtụtụ ndị adịghị ekelekwa anyị, na-emeso anyị dị ka ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ, ọ bụ ezie na anyị bụ ndị ọsụ ụzọ.
Otú ọ dị, anyị maara na ịlụ di na nwunye emegideghị akwụkwọ nsọ, ya mere, anyị ji ekpere mere ebe mgbaba, tụkwasịkwa Jehova obi. N’ezie, mmeso nke a egosipụtaghị echiche Society. Ọ bụ nanị itinye ụkpụrụ nduzi nzukọ n’ọrụ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.
Nwanna Knorr Alọghachi
Na 1951, Nwanna Knorr bịaghachikwara Switzerland ọzọ. Mgbe o kwusịrị otu okwu, a gwara m na ọ chọrọ ka mụ na ya kwurịta okwu. Ọ bụ ezie na ahụ eruchaghị m ala, enwere m obi ụtọ na ọ masịrị ya ịhụ m. Ọ jụrụ m ma ọ̀ ga-amasị anyị ịnara ọrụ n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ a na-achọ iwu na Geneva. O kwere nghọta na obi tọrọ anyị ụtọ, ọ bụ ezie na ịhapụ Biel amasịchaghị anyị. N’echi ya, arịrịọ ọzọ sitere n’aka Nwanna Knorr rutekwara anyị ntị. Ọ̀ ga-amasị anyị ịmaliteghachi ọrụ sekit, ebe ọ bụ na ọ dị mkpa ilebakwuru nke a anya na Switzerland? Anyị nakweere ozugbo ahụ. Omume m abụwo mgbe nile ịnara ọrụ ọ bụla e chere m n’ihu.
Ozi anyị n’ọrụ sekit n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Switzerland nwetara ngọzi dị ukwuu. Anyị na-eji ụgbọ okporo ígwè na-aga site n’ọgbakọ ruo n’ọgbakọ, na-ebu ngwongwo anyị nile n’ime igbe abụọ. Ụmụnna na-ejikarị ịnyịnya ígwè na-ezute anyị n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, n’ihi na ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha nwere ụgbọ ala n’oge ndị ahụ. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, otu nwanna mere ka anyị nwee otu ụgbọ ala, bụ́ nke mere ka ije ozi anyị dịtụkwuo mfe.
Ihe Ịtụnanya Ọhụrụ Ụfọdụ
Lee nnọọ ihe mkpali ọ bụ mgbe a kpọrọ mụ na nwunye m ịbịa klasị nke 40 nke Gilead na 1964, bụ́ usoro ọmụmụ ihe ikpeazụ nke zuru nnọọ ezu, nke na-ewe ọnwa iri, bụ́ nke e meworo ka ọ na-enwe nanị ọnwa asatọ ugbu a. Ọ dịrị mkpa ka Marthe mụta asụsụ Bekee ngwa ngwa, ma o mere nke a n’ụzọ dị nnọọ mma. E nwere olileanya dị ukwuu banyere ebe a ga-ezije anyị. Omume m bụ: ‘Ọ gaghị ewute m ebe ọ bụla e zijere m, ọ bụrụhaala na ọ bụghị ịnọ n’ọfis!’
Ma nke ahụ bụ kpọmkwem ihe merenụ! N’ụbọchị ngụcha akwụkwọ, bụ́ September 13, 1965, a họpụtara m dị ka onye ohu alaka ụlọ ọrụ nke Switzerland. Betel gaje ịbụrụ Marthe ahụmahụ ọhụrụ. Nye m, ọ bụ ijeghachi ‘n’Ụlọ nke Chineke,” ọ bụghị n’ebe obibi akwụkwọ ahụ, bụ́ ebe m rụrụ ọrụ site na 1931 ruo 1946, kama n’ọfis. E nwere ọtụtụ ihe ọhụrụ m ga-amụta, ma site n’enyemaka Jehova, enwere m ike ime otú ahụ.
Ileghachi Anya Azụ
N’ime 60 afọ dum nke ije ozi oge nile, atụkwasịwo m Jehova obi kpam kpam, dị nnọọ ka nna m gwara m na m kwesịrị ime. Jehova awụkwasịwokwa m ọtụtụ ngọzi. Marthe abụwo isi iyi nke agbamume dị ukwuu nye m n’oge nkụda aka ma ọ bụ mgbe ọrụ e kenyere m yiri egwu irikpu m, ọ bụwo n’ezie ezi enyi nke tụkwasịrị Jehova obi kpam kpam.
Otuto dịrị Jehova maka ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi ndị m nwetaworo! M ka na-eje ozi dị ka onye nchịkọta Kọmitii Alaka dị na Thun, ọtụtụ mgbe, agawokwa m njem dị ka onye nlekọta zoonu. N’agbanyeghị ihe a gwaworo m ka m mee, elekwasịwo m Jehova anya mgbe nile maka nduzi. N’agbanyeghị ọtụtụ mmehie ihe na emezighị emezi, ekwenyesiri m ike na Jehova agbagharawo m site na Kraịst. Ka m nọgidekwa na-eme ihe na-atọ ya ezi ụtọ. Ka ọ nọgidekwa na-eduzi nzọụkwụ m nile, ka m nọgidere na-elekwasị ya anya dị ka “Chineke m, onye m na-atụkwasị obi.”—Abụ Ọma 91:2.
[Foto dị na peeji nke 27]
Nwanna Diehl ná mmalite ije ozi Betel ya