Ịnọgide Ná Nguzosi Ike n’Ezi Ihe Dị Ka Ndị Kraịst na Liberia nke Agha Tisasịworo
Dị ka otu onye ji anya ya hụ ihe mere si kọọ
“MGBE enyi abụọ na-alụ ọgụ, ahịhịa ga-atakwa ahụhụ.” Lee ka ilu Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa nke a si chikọta nke ọma ihe mere n’agha e buru n’isi nso a na Liberia! Ihe dị ka 20,000 tụfuru ndụ ha, a chụsasịkwara 2.6 nde mmadụ, bụ́ ọkara nke ụba mmadụ bi ná mba ahụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị tara ahụhụ abụghị ndị agha; ha bụ “ahịhịa”—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị bụ́ ndị na-adịghị achọ okwu.
Mgbe agha tiwapụrụ na December 1989, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 Ndịàmà Jehova na Liberia na-enwe ịrị elu nọgidere na-aga n’ihu n’ọnụ ọgụgụ, ha jikwa obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu. Ọ bụ ihe mwute na ha bụ akụkụ nke ‘ahịhịa ahụ nke tara ahụhụ.’
Mgbasa nke Agha
Agha ahụ malitere n’ókèala Liberia na Côte d’Ivoire, mgbe na-adịghị anya ndị na-agba ọsọ ndụ malitere ịgbaga n’isi obodo, bụ́ Monrovia, bụ́ obodo nwere ihe karịrị ọkara nde mmadụ ndị bi na ya. Site March ruo May 1990, ka e buuru agha ahụ gaa n’ebe ndịda, a chụpụrụ ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova na nke mbụ ya site na Ganta, e mesịakwa site na Gbarnga. Ha so ná ndị ikpeazụ n’etiti ndị bi n’ebe ahụ bụ́ ndị hapụrụ obodo ndị a. Agha ahụ ruru nsọtụ ya mgbe òtù ndị agha zọọrọ ije bata Monrovia na July 2, 1990.
Ọ dịghị onye dị njikere maka ihe ụjọ ndị sochirinụ. Usuu ndị agha atọ dịcha iche iche lụrịtara ọgụ n’okporo ụzọ nile na-eji ụgbọ agha ndị ukwu, rọketi, na ihe ndị e ji atụ bọmbụ grenade eme ihe. E menyere ndị a na-egbughị egbu egwu n’akwụsịghị akwụsị n’ihi ịbụ ndị sitere n’otu agbụrụ a kpọrọ asị, na-enyochagharịkwa ha. N’otu abalị n’ọnwa August otu ìgwè ndị mgbukpọ nke agha ahụ riworo isi gbusịsịrị ihe karịrị 600 ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị bụ́ ndị gbabara n’ụlọ chọọchị St. Peter’s Lutheran Church maka nchebe.
Ọtụtụ narị mmadụ ji nanị uwe ha yi n’ahụ gbalaga site n’agha ahụ. E kewara ezinụlọ dị iche iche, ruokwa ọtụtụ ọnwa mgbe nke ahụ gasịrị ha enweghị ike ịdịghachi n’otu. Ìgwè mmadụ nile nọ na Monrovia yiri ka ha kwagharịrị, ebe ndị agha na ndị na-agba ọsọ ndụ, bụ́ ndị si n’akụkụ ndị ọzọ nke obodo ahụ gbapụ na-ebichi n’ụlọ ndị tọgbọ chakoo. A chụsasịrị ihe karịrị ọkara ndị bi na Monrovia. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ tụfuru ihe nile ha nwere nakwa ma ọ dịkarịa ala otu onye ikwu ha n’ọnwụ. Ụfọdụ tụfuru ihe dị ukwuu karịa nke ahụ.
Ọnọdụ ahụ ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ọdachi dị ukwuu nke na mba ise ndị ọzọ dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa zitere ndị agha ha ka ha gbalịa iweghachi udo. Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke October 1990, ihe ka ukwuu n’agha ahụ ejiworị nke nta nke nta kwụsịlata. Ma mgbe ahụ, ọnọdụ ụnwụ nri bịakwasịrị obodo ahụ gbara ọchịchịrị dị ka ákwà mkpe. Ndị ozi enyemaka kọrọ na n’otu oge ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụaka ndị Monrovia bụ́ ndị na-erubeghị afọ ise adịghị eri nri na-edo ahụ, ihe karịkwara otu narị mmadụ na-anwụ kwa ụbọchị. Ndị na-achọ uru emeghị ka ọnọdụ ka mma; ọtụtụ zuuru osikapa e bubatara maka enyemaka wee ree ya n’ọnụ ego 20 dollar ma ọ bụ karịa maka otu iko. Nrịanrịa jupụtara ebe nile, karịsịa otoro, ebe ọ bụ na e bibisịrị usoro e ji enweta mmiri, idebe ihe ọcha, na ike eletrik nke obodo ahụ kpam kpam.
Ihe dị ka otu puku Ndịàmà Jehova bụ́ ndị bi na Monrovia takwara ahụhụ nke ukwuu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ gbapụrụ n’obodo ahụ ma gaa n’ime ime obodo nta, ebe ndị ọzọ ji ụgbọ mmiri pụọ gaa Ghana na Nigeria ma ọ bụ si okporo ụzọ gaa Côte d’Ivoire ma ọ bụ Sierra Leone. Site na July ruo December 1990, ihe karịrị 30 Ndịàmà tụfuru ndụ ha. E ji égbè gbagbuo ụfọdụ, ebe ndị ọzọ nwụrụ site ná mmetụta nile nke ọrịa na agụụ. Ihe àmà na-egosi na Alan Battey na Arthur Lawson, ndị ozi ala ọzọ si America bụ́ ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi so ná ndị e gburu. Oo, lee ka olileanya ahụ dabeere na Bible nke mbilite n’ọnwụ si bụrụ ihe nkasi obi nye ndị nọ n’etiti anyị bụ́ ndị tụfuru ndị ikwu ma ọ bụ ndị enyi ha n’oge ahụ dị njọ!—Ọrụ 24:15.
Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst Na-arụ Ọrụ
Ka agha ahụ na-aga n’ihu, ọtụtụ Ndịàmà a chụsasịrị gbagara n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ n’akụkụ ọzọ nke obodo ahụ maka nchebe. Ụfọdụ chọrọ nchebe n’ihi na ha sitere n’otu agbụrụ nke ndị agha nọ n’ógbè ahụ na-egbusịsị. E nyere ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, ha nyekwara aka nke ukwuu n’isi nri na ihichasị ụlọ, ebe e kenyere ndị ọzọ ọrụ ịkpata akwụkwọ nri n’ọdọ mmiri ndị dị nso mgbe ọnọdụ dị n’èzí nyere ohere ya.
Ndị mmadụ na-ehi ụra n’ebe ọ bụla, n’ime ọnụ ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ, na paseji, ná Ngalaba Na-ahụ Maka Mbupụ na Mbubata Ihe, na n’ime ọfịs nile. Anyị gwuru ma na-elekọta ebe mposi dị iche iche. E kenyere ndị inyom ọrụ ije ozi dị ka ndị nọọsụ, ha nwekwara ihe ịga nke ọma n’ilekọta ọtụtụ ndị nwere ọrịa ịba na ahụ ọkụ. Afọ ọsịsa na-abụkarị nsogbu a na-enwe.
Anyị haziri usoro ime ihe ndị pụrụ iche n’ụlọ, gụnyere ịmụ otú e si eze mgbọ. N’ihi ya, mgbe ndị agha bụ́ ndị iro kwarịtara mgbọ ndị ukwu, a zụrụ anyị iru n’akụkụ dị iche iche nke alaka ụlọ ọrụ ahụ ngwa ngwa, bụ́ ebe ndị e nwere nchebe. Ọ bụ ezie na mgbidi ájá anyị dị elu ruo mita 3 na-enye nchebe ụfọdụ, o zughị ezu igbochi mgbọ ndị na-atụli elu. N’oge na-adịghị anya elu ụlọ anyị yiri ihe e ji ayọ ose n’ihi oghere nile ndị a tụpuru na ya!
Ọtụtụ ndị tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji chebe Ndịàmà ibe ha site n’aka ndị na-achọ igbu ha n’ihi na ha sitere n’otu agbụrụ a kpọrọ asị. N’otu ụbọchị otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst nke anya mmiri jupụtara n’anya bịarutere n’alaka ụlọ ọrụ ya na ụmụ ya ndị ka nọ ndụ, otu bụ nwa ọhụrụ dị izu abụọ. A ka ji égbè gbagbuo di ya na nwa ya nwoke nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu n’ihu ya. Onyeàmà ọzọ enwewo ihe ịga nke ọma n’izobe ya na ụmụ ya ndị nke ọzọ mgbe ndị ogbu mmadụ ahụ lọghachiri ịchọ ha.
Ezinụlọ ọzọ bịarutere n’alaka ụlọ ọrụ ahụ ha na otu onye nkwusa a na-emebeghị baptism bụ́ onye nyeworo aka ichebe ha ka ndị agbụrụ ya ghara igbu ha. Mgbe ahụ, mgbe ọnọdụ ahụ gbanwere, onye nkwusa ahụ a na-emebeghị baptism wee nọrọkwa n’ihe ize ndụ, ezinụlọ ahụ zọpụtara ya site n’aka ndị agbụrụ ha.
Ugboro ugboro, ndị ozi ala ọzọ ga-esoro ndị agha kwurịta okwu n’ọnụ ụzọ ámá e si abata n’alaka ụlọ ọrụ ahụ iji nwaa ime ka ha ghara ịbịa nyochasịa ma ọ bụ kwara ngwongwo dị n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. N’otu oge otu ìgwè ndị iwe ji nubatara n’ike, tụdo anyị égbè n’ihu ma nọgide na-ekwu na anyị na-ezobe ndị sitere n’otu agbụrụ kpọmkwem. O juru ha anya ịhụ otú Ndịàmà ógbè ahụ si meghachi omume, na-anọdụ ala jụụ ma na-ege ntị ná nzukọ ndị Kraịst anyị na-enwe. Ha nyochasịrị ụlọ ahụ ma ha achọtaghị ihe ha na-achọ. Mgbe nile anyị na-enwe ike ime ka ndị mwakpo ahụ jide n’aka na anyị adịghị ezobe ndị agha ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ndị iro ha. Dị ka ndị Kraịst anyị nọpụrụ iche.
N’otu oge mgbe e nwere oké iburịta agha, otu ìgwè Ndịàmà bu otu nwanna nke nwere ọrịa cancer a na-apụghị ịgwọta agwọta bịaruo n’alaka ụlọ ọrụ. Ọ bụ ihe mwute na ọ nwụrụ ngwa ngwa mgbe nke a gasịrị. E gwuru ili n’ala alaka ụlọ ọrụ ahụ, anyị nwekwara ememe ili ozu nke na-akpali mmetụta! Nwanna nwoke ahụ abụwo otu n’ime ndị okenye kasị mma sitere n’ógbè ahụ, na-enwe ọtụtụ afọ nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Ihe dị ka narị mmadụ a chụsasịrị achụsasị zukọrọ n’ebe nnabata ndị ọbịa maka okwu ememe ncheta ahụ, bụ́ nke e kwuru mgbe mkpọtụ nke ụda égbè jupụtara ebe nile.
Inweta Nri na Mmiri
Nri e nwere dị ntakịrị nke ukwuu. Ọbụna tupu agha ahụ amalite, ndị ahịa akwụsịwo ibubata nri. N’ihi ya, nri e nwere n’obodo ahụ dị nnọọ ntakịrị. Nri anyị nwere n’alaka ụlọ ọrụ gaara ezuruworị mmadụ 12 nọ n’ezinụlọ anyị ruo ọtụtụ ọnwa, ma mgbe ụfọdụ anyị nwere ihe ruru 200 mmadụ so anyị biri, gụnyere ndị agbata obi na-abụghị Ndịàmà bụ́ ndị nọ n’oké mkpa maka enyemaka. E mere ka onye ọ bụla na-eri nanị otu ugbo nri dị nta n’ụbọchị; anyị ji ọ̀tụ̀tụ̀ nri dị otú ahụ bie ndụ ruo ọtụtụ ọnwa. Agụụ ji onye ọ bụla. Ụmụaka bụ nanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ, na-ekosa ka eriri n’aka ndị mụrụ ha.
N’oge na-adịghị anya nri anyị nwere malitere ịgwụ. Olee ebe anyị pụrụ isi nwetakwuo ọzọ? Ọ dịghị ụlọ ahịa mepere emepe na Monrovia. A kpọchisịrị ebe nile, ndị agụụ na-agụgbu na-enugharị n’okporo ụzọ na-achọ nri. Ndị mmadụ riri ihe ọ bụla—gụnyere nkịta, nwa mba, na òké. Ndị ozi ala ọzọ abụọ sitere n’alaka ụlọ ọrụ ahụ kpebiri ịnwa ịga Kakata, bụ́ obodo ji 60 kilomita dịpụ anya, bụ́ ebe a kwụsịworo ịlụ agha.
Ha ji magazin Ụlọ Nche na ihe àmà dị iche iche fụjuo na window nile nke ụgbọ ala ahụ iji kọwapụta onwe ha dị ka Ndịàmà Jehova. Mgbe ha gafesịrị ọtụtụ ebe a na-enyocha ndị mmadụ, otu nwoke buru ibu, nke gbara dimkpa bụ́ onye ọtụtụ bọmbụ grenade dịkwasịrị n’obi ya, o bukwa otu égbè na-awụpụ mgbọ n’akụkụ ya, kwụsịrị ha ma jụọ ha ajụjụ. Ha kọwapụtara onwe ha dị ka Ndịàmà Jehova ma gwa ya na ha na-achọ iru Kakata maka inweta nri.
“Sonụ m,” ka ọ sịrị. “Ọ bụ m bụ ọchịagha n’ebe a.” Ọ kpọọrọ ha gaa n’isi ụlọ ọrụ ya. Mgbe ọ matara na ha na-elekọta ndị a chụsasịrị achụsasị, o nyere ndị agha ya iwu ka ha bunye alaka ụlọ ọrụ anyị 20 akpa osikapa, nke ọ bụla n’ime ha dị 45 kilogram n’arọ! Ọzọ, o nyere ikike ka ha gaa Kakata, e kenyekwara otu onye nche ndị agha ọrụ iduru ha gabiga n’ebe nnyocha ndị fọdụrụnụ ka ha ghara inwe mmerụ ahụ ọ bụla.
Na Kakata ha chọtara nwanna anyị nwoke bụ onye Kraịst bụ́ Abraham, onye nwere otu ụlọ ahịa. Ọ kwakọbaworo anyị ọtụtụ katọn nri, gụnyere mmiri ara ehi ndị e mere n’ụdị ntụ, shuga, akwụkwọ nri ndị a gbanyere ná mkpọ, na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ọ dị ebube ịhụ otú e si lekọta ụmụnna anyị ná njem ha. Ọ ghaghị ịbụ na Jehova nwere obi ụtọ na anyị sooro ndị enyi na ndị agbata obi anyị kerịta nri anyị, n’ihi na ugbu a a na-enyeghachi anyị ihe ndị anyị nwere.—Ilu 11:25.
N’akụkụ nke ọzọ nke Monrovia, ndị ozi ala ọzọ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ nọkwa na-elekọta ndị a chụsasịrị achụsasị, ha nwetakwara enyemaka site n’ebe ndị a na-atụghị anya ha. Dị ka ihe atụ, otu onye ozi ala ọzọ natara akpa osikapa atọ site n’aka otu onye soja nke chetara ya site n’oge o jere ozi n’ebe obibi ndị soja ihe dị ka afọ 16 gara aga. Onye ọzọ bụ onye ozi ala ọzọ natara akpa osikapa anọ mgbe onye ndú nke otu n’ime ìgwè ndị ahụ na-eburịta agha gbasịrị ya ajụjụ n’onwe ya.
N’otu oge o yiri ka ọ bụ na anyị aghaghị ịkwapụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ihi ụkọ mmiri. Ruo oge ụfọdụ, ọdọ mmiri anyị bụ nanị ebe e si enweta mmiri ọṅụṅụ nye ọtụtụ ndị bi n’ógbè ahụ. Otú ọ dị, petrol anyị nwere maka ígwè na-enye ike eletrik nke pọmpụ anyị na-adọgolite mmiri ji arụ ọrụ malitere ịgwụ. Mgbe otu nwoke nke nwetaworo nchebe n’alaka ụlọ ọrụ anyị n’ụbọchị ndị mbụ nke ibu agha ahụ nụrụ banyere nsogbu anyị, ọ chọtaara anyị petrol n’ihi obi ekele maka ihe anyị mewooro ya, ya mere ọ dịghị mgbe mmiri anyị gwụsịrị.
Ịnọgide Na-enwe Ume n’Ụzọ Ime Mmụọ
Mgbe a gwara ndị ikpeazụ n’ime anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ ka anyị hapụ Liberia n’October 1990, ihe kasị dịrị anyị n’uche bụ, Olee otú ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom ga-esi nagide ihe na-emenụ? Site n’akụkọ ndị anyị nataworo eri oge ahụ, ihe àmà na-egosi na ha nọgidere na-arụ ọrụ n’ozi ahụ.
Tupu agha ahụ nkezi ọnụ ọgụgụ hour Onyeàmà nke ọ bụla na-etinye n’ozi bụ ihe dị ka 17 kwa ọnwa. Ma, n’oge agha ahụ, n’agbanyeghị mkpa a na-anọgide na-enwe ịdị na-awagharị n’ime ọhịa maka nri, Ndịàmà n’ọgbakọ ụfọdụ nwere ihe karịrị 20 hour ná nkezi maka onye nkwusa ọ bụla! E wezụga nke ahụ, n’ihi ụkọ magazin Ụlọ Nche, ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị inyom jiri aka depụtagharịa isiokwu ọmụmụ ihe ndị ahụ ka e wee nwee magazin ndị ọzọ ga-ezunụ maka ọmụmụ ihe ahụ na Sunday.
Ọgbakọ anọ ndị dịkarịsịrị Monrovia nso na-ejubiga ókè ná Ndịàmà bụ́ ndị gbalagara n’ihu agha ahụ bata n’ime obodo ukwu ahụ. Ndị enyi ndị a tụfuru ihe nile ha nwere, ebe ọ bụ na ha enweghị ike ịlaghachi n’ebe obibi ha iwere ihe ọ bụla. N’ezie, ruo ọtụtụ ọnwa ọbụna na ụfọdụ nọ n’akụkụ dị iche nke ndị na-emegiderịta onwe ha n’ọgbọ agha ahụ site n’ebe ụmụ ha na ndị nne na nna ha nọ! Maka Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs na March 30, ọgbakọ anọ ndị a nwere ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị bịara ya bụ́ 1,473.
Ndịàmà dị 300 mmadụ ma ọ bụ karịa bụ́ ndị fọdụrụ na Monrovia tinyere mgbalị pụrụ iche n’ije ozi ọsụ ụzọ inyeaka n’ime ọnwa Ememe Ncheta ahụ, ọ bụ ezie na nanị n’izu ole na ole gara aga, ha enwewo oké ike ọgwụgwụ n’ihi agụụ nke na o siiri ha ike ịga ije. Ha rụsiri ọrụ ike ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa Ememe Ncheta ahụ, 1,116 bịakwara.
Otu okenye ndị Kraịst na Monrovia kọwara, sị: “Anyị kpebiri ịmalite nzukọ ọzọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị malite na December 1990. Ọnụ ọgụgụ ndị bịara nke mbụ bụ 17. E mesịa ọ rịrị elu ruo 40, Ọnụ ọgụgụ ahụ nọgidekwara na gburugburu 40 ruo oge ụfọdụ. Mgbe ahụ na February 24, ọnụ ọgụgụ anyị rịrị elu ruo 65, mgbe otu izu gasịkwara o ruru 85. Ọzọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ nile nakweere òkù ahụ a kpọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na March.”
Ilekọta Ndị Ọzọ
“Ụmụnna anyị bụ́ ndị chọọchị nọ na-egburịta ibe ha [site n’agbụrụ ndị na-emegiderịta ibe ha] n’oge agha ahụ,” ka otu onye ikwu na-abụghị Onyeàmà nke otu Onyeàmà rịbara ama, “n’enweghị mgbe ha nwere oge maka ndị kwere ekwe ibe ha.” Ma lee ka ọnọdụ ahụ si dị iche n’ebe ndị Jehova nọ!
Dị ka ihe atụ, onye isi oche nke otu òtù ndị na-agbata ọsọ enyemaka degaara ụmụnna na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ akwụkwọ ozi na February 1991, sị: “Akwụkwọ ozi nke a na-eje ozi dị ka ihe àmà nke ekele na nghọta nye unu na nzukọ unu n’ihi ebe ndọba ihe unu nọgidere na-enye anyị n’oge nkesa nri nye ndị nke anyị. Àgwà obi ebere unu na-egosi njikere unu dị ka otu Ọha Mmadụ ga-eweta udo na ihe ọma ná mba nke a. Biko nọgidenụ na-eje ozi dị mma unu na-eje.”
Ndịàmà Jehova ná mba ndị ọzọ dị ngwa n’ime ihe banyere mkpa nke ụmụnna ha nọ na Liberia. E butewo ihe enyemaka site ná mba ndị dị ka Sierra Leone na Côte d’Ivoire dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, Netherlands na Itali ndị dị na Europe, na site United States.
Otu nwatakịrị nwanyị, nke e gburu nne ya n’ihi na o sitere n’otu agbụrụ a kpọrọ asị, kwupụtara obi ekele ya n’ihi enyemaka ọ natara. O dere, sị: “Ekele dịrị unu n’ihi ihe nile unu ziteere m. Unu mere ka ọ dị m ka nne m ọ̀ nọ nso. Ya na nwanne m nwoke nke dị nta nwụnahụrụ m n’agha ahụ. M na-arịọ Jehova ka ọ gọzie unu nile. Adị m afọ 11.”
N’ihi inwekwa ekele maka enyemaka ọ natara, otu nwanna nke nwere ezinụlọ mmadụ isii nọ na ya, bụ́ onye nwunye ya na-aghaghị ịdị na-ezogharị ruo ọtụtụ ọnwa n’ihi agbụrụ o sitere na ya, dere, sị: “Anyị akụkabeghị ụlọ ndị mmadụ ịga zuru ma ree ngwongwo ha, ma n’adịghị ka ndị agbata obi anyị, anyị nwere ihe anyị ga-eri kwa ụbọchị n’ihi na anyị maara ụzọ isi jiri ntakịrị ihe anyị nwere mee ihe n’ụzọ amamihe. Anyị amụtawo nke a site n’aka Jehova.”
Ihe ọzọ na-akpali nnọọ akpali bụ mmụọ nke otu nwanna bụ́ onye ya na nwunye ya na ụmụ ya abụọ gbalagara Côte d’Ivoire. Ọ hapụwo n’azụ otu ụlọ mara mma nke e mesịrị sukpọọ n’ọkụ. Ma ọ sịrị na ihe kasị wute ya bụ mfu, ọ bụghị nke ụlọ ahụ, kama nke ebe ndebe akwụkwọ ọchịchị Chineke ya!
Ihe Mmụta Ndị Bara Uru E Nwetara
N’ileghachi anya azụ, apụrụ m ịghọta na Jehova kụziiri anyị ọtụtụ ihe mmụta ndị bara uru. Ịmata n’onwe m ọtụtụ ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe ma lanarị, nakwa ụfọdụ ndị nọgidere n’ezi ihe ma nwụọ, amụtara m ịghọta mkpa ọ dị inwe ụdị echiche nke Pọl onyeozi nwere, bụ́ onye dere, sị: “A sị na anyị dị ndụ, ọ bụ n’ebe Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ ka anyị dị ndụ; ma a sị na anyị nwụrụ, ọ bụ n’ebe Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ ka anyị nwụrụ: ya mere, ma ànyị dị ndụ, ma ànyị nwụrụ anwụ, anyị bụ ndị nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].”—Ndị Rom 14:8.
Onye ozi ala ọzọ nọworo ogologo oge rịbara ama, sị: “N’okpuru ihe a dum, anyị mụtara na Jehova bụ Onye Enyemaka na-enweghị atụ. Dị nnọọ ka Pọl sịrị: ‘Anyị onwe anyị enwewo ọzịza a zara n’ime onwe anyị na ọ bụ ọnwụ, ka anyị wee ghara ịtụkwasị obi n’onwe anyị, kama ọ bụ na Chineke onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie.’” (2 Ndị Kọrint 1:9; Abụ Ọma 30:10) O kwukwara, sị: “Agha ahụ mere ka o doo anyị anya nke ọma na ndị Jehova bụ n’ezie òtù ụmụnna, nke yikwasịrị ịhụnanya ji onwe onye achụ àjà nke Jisọs kọwapụtara, dị ka uwe.”—Jọn 13:35.
Otu akwụkwọ ozi sitere n’aka otu nwanna nwanyị na Liberia nye ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị na-aghaghị ịhapụ mba ahụ n’oge ịlụ ọgụ ahụ n’October 1990 na-akọwapụta nke ọma ume nke òtù ụmụnna anyị ndị Kraịst nwere. “Ọ bụ ekpere m na unu nile ga-alaghachite na Liberia ngwa ngwa, anyị enweekwa ike inwe mgbakọ,” ka o dere. “Oo! Ọ dị m ka ya bụrụ taa. Nanị iche echiche banyere ya na-enye m obi ụtọ.”
Ee, ọ ga-abụ ihe dị ebube ịhụ ka e weghachiri n’ụzọ zuru ezu usoro e ji eme ihe mgbe nile nke ịrụ ọrụ ndị Kraịst na Liberia. Nwanna anyị nwanyị kwuru ihe ziri ezi; mgbakọ mbụ a ga-enwe na Monrovia mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ na ndị ọzọ gbara ọsọ ndụ lọghachisịrị ga-abụ nke na-enye ọṅụ. Ihe ịrụ ụka adịghị na nke ahụ!
[Map dị na peeji 27]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
LIBERIA
Monrovia
Kakata
Gbarnga
Ganta
SIERRA LEONE
GUINEA
CÔTE D’IVOIRE
Atlantic Ocean
[Foto dị na peeji nke 28]
Ụmụ nke Ndịàmà a chụsasịrị achụsasị n’alaka ụlọ ọrụ n’oge agha ahụ
[Foto dị na peeji nke 31]
Ndị Liberia gbara ọsọ ndụ ka ha na-ahọpụta ihe ndị a na-eyi n’ahụ nke Ndịàmà nọ na Côte d’Ivoire tụtara