Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
N’ihi gịnị ka Noa ji zipụ ugoloọma site n’ime ụgbọ ahụ ma mesịa zipụ nduru?
Bible enyeghị nkọwa zuru ezu. Otú ọ dị, ọ dị ka e nwere ezi echiche dị n’ụzọ ahụ Noa ji mee ihe.
Ruo 40 ụbọchị ehihie na abalị, mmiri ozuzo dị ukwuu zoro n’elu ala, na-akpata oké iju mmiri nke rikpuru ọbụna elu nke elu ugwu nile ruo ọnwa ise. Mgbe ahụ “ụgbọ ahụ wee tọgbọrọ n’elu ugwu nke Ararat.” (Jenesis 7:6–8:4) Ọnwa ole na ole ka nke a gasịrị, mgbe “a hụrụ elu ugwu,” Noa wee “zipụ ugoloọma, nke pụrụ na-apụ na-alata.”—Jenesis 8:5, 7.
Gini mere o ji bụrụ ugoloọma? Nnụnụ a na-efesi ike, ọ pụkwara ịdịgide ndụ site n’iri ụdị nri dị iche iche, tinyere anụ nwụrụ anwụ. Ọ pụrụ ịbụ na Noa zipụrụ ugoloọma ahụ iji hụ ma ọ pụrụ ịlọta ma ọ bụ ịhapụ ụgbọ ahụ, eleghị anya na-eri ihe fọrọ afọ n’anụ nwụrụ anwụ a pụrụ ịhụ anya ka mmiri ahụ na-atalata, ala ana-apụtakwa. Otú ọ dị, ugoloọma ahụ anọgịdeghị n’èzí. Bible kwuru na ọ lọghachiri, ma o kwughị na ọ lọghachiri n’ebe Noa nọ. Eleghị anya ọ lọghachiri wee fekwasị n’elu ụgbọ ahụ mgbe o fegharịsịrị iji chọta nri na-esegharị n’elu mmiri ahụ ka dị ebe nile.
Mgbe e mesịrị, Noa họọrọ izipụ nduru. Anyị na-agụ sị: “Nduru ahụ ahụghị ebe izu ike nye ọbọ ụkwụ ya, o wee lọghachikwute ya ruo n’ụgbọ.” (Jenesis 8:9) Nke a na-egosi na n’ụzọ nke ya onwe ya, nduru ahụ pụrụ ije ozi n’ịmata ma mmiri iju mmiri ahụ ọ talatawo. Nduru na-egosipụta ezi ntụkwasị obi nke ụmụ mmadụ. Noa pụrụ ịtụ anya na nduru ahụ ga-alọghachị, ọ bụghị nanị ibere n’elu ụgbọ ahụ, kama n’ebe Noa n’onwe ya nọ.
E kwuru na nduru na-ebesa nanị n’ala akọrọ, a makwa ha ama ịdị na-efe n’ebe dị ala ala na ndagwurugwu, na-erikwa ahịhia ndụ. (Ezikiel 7:16) Akwụkwọ bụ Grzimek’s Animal Life Encyclopedia rịbara ama: “Dị ka o si bụrụ eziokwu banyere pijin na nduru nile na-eri mkpụrụ osisi dị iche iche, a na-enwe ihe isi ike iri ihe mgbe snow [ma ọ bụ mmiri] nọgidere ihe karịrị otu ụbọchị na-ekpuchi ala, ihe ka na nri ha na-eri na-adị n’elu ala.” Ya mere nduru ahụ pụrụ iweghachiri Noa ụfọdụ ihe àmà na-egosi na ya achọpụtawo ala akọrọ ma ọ bụ osisi na-epupụta epupụta. N’oge mbụ Noa zipụrụ ya, nduru ahụ gba aka lọghachikwute ya n’ime ụgbọ ahụ. Na nke ugbo abụọ ya, nduru ahụ ji akwụkwọ olive lọghachi. Na nke ugbo atọ ya, ọ lọghachighị ọzọ, si otú a na-egosi na ọ bụ ihe ga-ekwe mee na nke na-adịghị ize ndụ Noa ịhapụ ụgbọ ahụ.—Jenesis 8:8-12.
Ebe ụfọdụ nwere ike ile ihe ndị a anya dị ka ihe ndị mere ná ndabara, eziokwu nke bụ na ihe ndekọ ahụ gara kpọmkwem n’okwu ahụ, n’enweghị oké ndọlị iji nye nkọwa zuru ezu, na-egosipụta Bible dị ka ihe kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-enye anyị ihe ọzọ kpatara anyị ga-eji anakwere ihe ndekọ ahụ ịbụ ihe mere eme n’ezie kama ịbụ ihe e chepụtara wee kọọ. Enweghị akụkọ na nkọwa nke kọrọ ihe nile merenụ na-egosikwa ihe na-akpali mmasị ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ilepụ anya ịjụ Noa mgbe o bilitere n’ọnwụ, ma nwee ike ịkọwa ihe nile mere o ji mee ihe o mere.—Ndị Hibru 11:7, 39.