Gịnị Ga-eme Ebe Nsọ Nile nke Krisendọm?
NDỊ na-ebipụta akwụkwọ bụ Holy Places of Christendom, nke si n’aka onye ọkà n’ihe ọmụma nke ihe ndị e gwutere n’ala bụ́ Stewart Perowne jụrụ: “Ònye, n’agbanyeghị omenala ndị Kraịst o si n’ime ya pụta, pụrụ iguzo n’elu Calvary dị n’ime Church of the Resurrection [ma ọ bụ, Church of the Holy Sepulcher] na Jerusalem n’enweghị mmetụta ịtụ ụjọ: n’ihi na ebe a bụ́ ebe e nyeworo nsọpụrụ, ọbụna lụọ ọgụ n’ihi ya ruo ọtụtụ narị afọ, bụ ebe bụ isi nke Krisendọm.”
A ka enweghị onye ọ bụla nwere ike igosi na e wuru Chọọchị a n’elu Calvary, ebe Jisọs nwụrụ. N’ezie, tupu onye ọchịchị alaeze ukwuu ndị Rom bụ́ Constantine ekpebie iwu chọọchi ebe ahụ, ụlọ nsọ ndị ọgọ mmụọ dị n’ebe ahụ. Ọzọkwa, Jisọs kwuru: “Chineke bụ mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Ụdị ndị ahụ na-efe ofufe adịghị asọpụrụ ebe “dị nsọ” dị iche iche.
N’otu oge, Jerusalem bụ ebe ụlọ nsọ Chineke dị wee si otú ahụ bụrụ ebe bụ isi nke ofufe dị ọcha. Otú ọ dị, n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị bi n’ime obodo ahụ, Jehova Chineke hapụrụ ya, dị ka Jisọs buru n’amụma. (Matiu 23:37, 38) Jisọs bukwara amụma banyere mbibi nke ebe ahụ bụ isi nke okpukpe, bụ ebe ọtụtụ ndị nọgidere na-ele anya dị ka ebe dị nsọ. Okwu ya nile mezuru mgbe ndị Rom bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 70 O.A.—Matiu 24:15, 21.
Amụma Jisọs n’oge na-adịghị anya ga-enwe mmezu dị ukwuu karị n’isi akụkụ okpukpe nile nke Krisendọm, bụ́ ebe ọ na-ekwu na ọ bụ ebe dị nsọ. Krisendọm na ebe nile ya dị nsọ ugbu a na-eche ihu mbibi site n’aka ike na-emegide okpukpe a kpọrọ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Daniel 11:31) Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyekwu gị ihe ọmụma banyere otú ihe omume a na-ama ahụ jijiji ga-esi mee.
[Foto dị na peeji nke 32]
Chapel dị n’ime Church of the Holy Sepulcher
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.