Eziokwu Ejupụta n’Obodo Nta nke ọtụtụ Mmiri
LEE ka o si bụrụ ihe iju anya! Ala nke e ji ọtụtụ mmiri ya mara ka a chọpụtara na ọ nọ n’akpịrị ịkpọ nkụ! Ókèala ebe e nwere mmiri nke ọma ka a chọpụtara na ọ kpọrọ nkụ ma tọgbọrọ n’efu! Ọ bụ akpịrị ịkpọ nkụ nke a pụrụ iji nanị mmiri nke eziokwu ahụ sitere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible kwụsị. Ọ bụ akụkọ banyere Rahbeh, bụ́ obodo nta nke nwere 2,200 ndị bi n’ime ya, nke zoro n’ugwu ndị ahụ nke ebe ugwu Lebanon, ihe dị ka 130 kilomita site na Beirut.
Aha ahụ bụ Rahbeh pụtara “ebe nwere ọtụtụ ohere” n’asụsụ Arabic, o sitekwara na mkpọrọgwụ okwu nke asụsụ dị iche iche nke Esia, bụ́ nke pụtara “ihe buru ibu, ihe gbasapụrụ agbasapụ.” N’ụzọ kwesịrị ekwesị, obodo nta ahụ gbasapụrụ n’elu ugwu ukwu abụọ ji ihe dị ka 600 mita dị elu karịa elu oké osimiri. N’oge oyi na oge opupu ihe ubi, a pụrụ ịhụ snow n’elu ugwu ndị ahụ n’ebe ọwụwa anyanwụ, na-eme ka ọ maa oké mma. Ma karịsịa, Rahbeh bụ obodo nta nke nwere ọtụtụ mmiri. E nwere 360 iyi dị iche iche, ndị ukwu na ndị nta n’ógbè ebe ahụ, na-eme ka e nwee mmiri dị oké mkpa maka ubi ọka wheat, oroma apricot, ube, mkpụrụ osisi peach, na vine na ndagwurugwu ndị dị ya gburugburu.
Oge Ochie na Oge Ọhụrụ Zutere na Rahbeh
N’ọtụtụ ụzọ, ihe dị iche iche ka dịkwa otú ahụ ha dị kemgbe oge Bible, na Rahbeh. Ụlọ ndị dị n’ime obodo dịcha ibe ha oké nso. Okporo ámá dịcha warara, gbaa ngọ, ma jupụta ná ndị dị iche iche na-agagharị na ya—ịnyịnya ibu na ehi. Ọ bụ ezie na e nwere ụfọdụ ụgbọala moto, ọ bụ ụmụ anụmanụ nwe ụzọ n’ebe ahụ karị. Mgbe mgbe karị, ndị nwe ha na-ebokwasị ha ihe dị iche iche e wetara n’ubi ma zipụ ha ka ha lawa nanị ha. Ha na-esi n’okporo ámá ndị ahụ dị warara, na-abanye n’ebe ndị siri ike ịgafe na-apụtakwa, ma na-alaru n’ụlọ ha. Nke a ọ̀ pụrụ iyi ihe Aịsaịa bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Ehi maara onye nwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe ọzụzụ anụ nke onye nwe ya”?—Aịsaịa 1:3.
Rahbeh bụkwa ebe nwegasịrị ọdịiche. N’ebe a ị ga-ahụ ndị gara ụlọ akwụkwọ mahadum na ndị ọrụ ubi nkịtị bụ́ ndị na-azọtụbeghị ụkwụ n’obodo ukwu. E nwere nnukwu ebe obibi ndị e ji ubi a gbara ogige chọọ gburugburu ha mma, e nwekwara nkịrịka ụlọ nta ndị anụ ụlọ na-agbagharị na ha. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ngwa ọrụ ndị ji ike elektrik arụ ọrụ dị n’ụlọ nile, ma adịghị enwe ọkụ elektrik mgbe nile. N’ihi nke a, ọtụtụ ụlọ nwere ígwè na-emepụta ike elektrik. A rụziri okporo ụzọ ndị bụ isi dị n’obodo nta ahụ nke ọma, ọ bụrịị eziokwu na ihe ka ọtụtụ n’ụzọ ndị na-eduje n’ugbo bụ ndị a na-arụzighị arụzi ma dị ntụ́ ntụ́. Otú a, nanị ụzọ e si ebulata ihe ndị e wetara n’ubi bụ site n’iji anụ ụlọ mee ihe. Ị pụrụ ọbụna ịhụ ka ịnyịnya ibu bu ígwè e ji emepụta ike elektrik na-aga n’ubi iji nye ígwè ọrụ ndị e ji akọ ugbo ike, bụ́ ndị a na-ejikọ ha na ụmụ anụ ndị na-adọkpụ ngwa ọrụ e ji arụ ọrụ n’ubi.
N’ụzọ yiri nke ahụ, ndụ a na-adị n’obodo ahụ agbanwebeghị nke ukwuu. Ọ bụrụ na ị nọbọọ chi n’obodo ahụ, ị pụrụ ịbụ onye okéọ̀kpà ndị na-akwa n’elekere abụọ ma ọ bụ atọ nke ụtụtụ kpọtere n’ụra. Ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị na-amalite n’isi ụtụtụ, ya mere ya ejula gị anya ma ị nụ mkpọtụ nke ndị na-agwarịta ibe ha okwu n’olu dara ụda n’ọchịchịrị ka ha na-akwadebe ụmụ anụmanụ. Ka chi na-abọchala, ị pụrụ ịhụ ọtụtụ ndị obodo, ha na anụ ụlọ ha ndị e bokwasịworo ibu, ka ha na-aga n’ubi ma ọ bụ ahịa ire ngwa ahịa ha dị iche iche.
Ka ụbọchị ahụ na-aga, ụmụntakịrị ndị nwoke na nwanyị na-apụta igwurị egwu n’okporo ụzọ na n’ámá dị iche iche. Olu ha na ịchị ọchị ha na-ejupụta n’ikuku, dị nnọọ ka ọ dị na Jerusalem oge ochie dị ka onye amụma bụ Zekaraịa kọwara, sị: “Ámá nile nke obodo ahụ ga-ejupụtakwa n’ụmụntakịrị ndị ikom na ụmụntakịrị ndị inyom na-egwuri egwu n’ámá ya nile.” (Zekaraịa 8:5) Ị ga-ahụkwa ndị obodo ahụ dị ka ndị nwere àgwà enyi nke ukwuu ma bụrụ ndị na-achọkarị ịmata ihe. A na-atụ gị anya n’aka ikele onye ọ bụla si n’obodo ahụ nke i zutere, ebe ọ bụ na ha na-achọ ịmara onye ị bụ, ebe i si bịa, ihe mere i ji nọrọ n’ebe ahụ, na ebe ị na-aga. Ndị mmadụ na-amata ibe ha nke ọma.
Mmiri nke Eziokwu Erute Rahbeh
N’ógbè nke a ndị mmadụ dịrịta ibe ha nso, akụkọ na-agbasakarị ngwa ngwa. Nke a bụ ihe mere mgbe Asaad Younis si United States lọta na Rahbeh na 1923. Ebe ọ na-eche ma Asaad ọ̀ baala ọgaranya n’America, enyi ya bụ́ Abdallah Blal gara ịhụ ya. Kama ikwu okwu banyere ego, Asaad nyere ya otu mkpụrụ nke akwụkwọ ahụ bụ The Harp of God ma gwa ya, sị: “Nke a bụ akụ n’ezie.” Abdallah, nke bụbu onye Protestant, gụrụ akwụkwọ nke a dabeere na Bible ma bụrụ onye a kpaliri mmasị ya nke ukwuu. Ọ bụ ezie na Asaad emeghị oké ihe banyere ihe ọmụma ahụ, ihe Abdallah mụtara kpaliri ya, o kwupụtakwara n’ihu ọha na ya achọtawo eziokwu ahụ.
N’otu oge n’ọdịnihu, Abdallah kwagara Tripoli, bụ́ obodo bụ isi n’ebe ugwu Lebanon. N’ebe ahụ, o zutere ọtụtụ Ndị Mmụta Bible, bụ́ aha e ji mara Ndịàmà Jehova na mgbe ahụ, o nwekwara ọganihu ndị ọzọ n’ọmụmụ Bible ya. O mesịrị laghachi Rahbeh ije gbasaa ozi ọma ahụ nke ọ mụtaworo. Ọ na-esoro ndị obodo ibe ya nwee nkwurịta okwu n’isiokwu ndị dị ka Atọ n’Ime Otu, ma mmadụ ò nwere mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ala mmụọ, usoro nke ndị nchụàjà, Mas, na iji ihe oyiyi dị iche iche eme ihe, soro ha na-ekerịta ihe Bible na-akụzi n’ezie.
Ụfọdụ na ndị obodo ahụ gosiri mmasị. Atọ ma ọ bụ anọ n’ime ha sonyeere Abdallah n’ọrụ nkwusa ahụ. Mgbe ahụ ha malitere inwe nzukọ na Sunday. Ihe mejupụtara nke a bụ ige ntị n’okwu e tinyere na rekọd site n’ígwè okwu phonograph ma ọ bụ ihe ọgụgụ sitere na Bible, bụ́ nke nkwurịta okwu n’ihe ndị ha ka nụsịrị nnọọ na-esochi. Ka oge na-aga, e ji akwụkwọ ụfọdụ ndị e ji amụ Bible mee ihe, gụnyere akwụkwọ ndị ahụ bụ The Harp of God, Riches, na “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu.” Ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa adịghị akarị mmadụ iri, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha nwere mkpali nke ọchịchọ ịmara ihe kama inwe mmasị. O yiri ka ụfọdụ ọ̀ na-abịa nanị n’ihi nri ahụ a na-enye ná ngwụsị nke nzukọ ọ bụla.
N’afọ ndị 1940, e nyere Abdallah Blal ibu ọrụ nke ilekọta ìgwè ahụ na Rahbeh. O gosiri onwe ya ịbụ onye ji ịnụ ọkụ n’obi na iguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi, na-esetịpụ ezi ihe nlereanya nye ndị ọzọ. Otu n’ime ndị a, bụ́ Nwanna Mattar, chetaghachiri otú ha si aga ọrụ nkwusa ha: “Ebe ọ bụ na e nweghị ụgbọ ala na mgbe ahụ, Nwanna Blal na mụ onwe m ji ụkwụ eje ikwusa ozi ọma n’obodo nta ndị dị nso. M na-eburu ígwè okwu phonograph ahụ, ebe Nwanna Blal na-ebute ụzọ n’ikwu okwu. Anyị na-anọkarị ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ tupu anyị alọghachi n’ụlọ.” Nwanna Blal ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo ọnwụ ya na 1979 n’afọ ndụ nke 98.
Ọganihu Eweta Mmegide
Ka ọrụ ahụ na-aga n’ihu, ụmụnna ahụ malitere inweta mmegide. Na 1950, ná mkpali nke onye ụkọchukwu bi n’obodo ahụ, a malitere inye ụmụnna ahụ bi na Rahbeh mkpagbu. Onye ụkọchukwu ahụ boro ụmụnna ebubo nke ikwulu chọọchị na imerụ ihe dị nsọ. Ụfọdụ ndị obodo were iwe nke ukwuu nke na ha tụrụ ụmụnna ahụ nkume, e jidekwara ụfọdụ ụmụnna ma tụọ ha mkpọrọ. Otú ọ dị, nchọpụta nke sochiri gosiri na ebubo ndị ahụ bụ ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, a hapụrụ ụmụnna ahụ n’ụlọ mkpọrọ ruo ọtụtụ ụbọchị.
Onye mmegide ọzọ gbalịrị ime ka ndị obodo ahụ, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime ha amaghị agụ ihe nke ọma, bịanye aka n’akwụkwọ, na-ebo ụmụnna ahụ ebubo n’ọtụtụ ihe, gụnyere inye ụmụ mmadụ nsogbu site n’ịga n’ụlọ ha mgbe ọ bụla. Iji nwetakwuo ndị ga-abịanye aka n’akwụkwọ ahụ, ọ gwara ha na ọ bụ akwụkwọ a na-etinye maka iweghachite otu onye ọrụ n’obodo ahụ. Mgbe ndị mmadụ chọpụtara na n’ezie, ọ bụ ebubo megide Ndịàmà ahụ, ha hichapụrụ ebe ndị ha bịanyere aka n’akwụkwọ. Ihe omume ndị yiri nke a nyere aka n’ịgbara ọtụtụ ndị isi ọchịchị bi n’ógbè ahụ ezi àmà.
E wezụga ime ihe banyere mmegide ndị a pụtara ìhè, ụmụnna ahụ chekwara ihe mgbochi ọzọ ihu. N’otu ime obodo nta ebe mmadụ nile mazuuru onye ọ bụla, “egwu mmadụ na-eweta ọ́nyà,” dị ka Bible na-eme ka ọ pụta ìhè n’Ilu 29:25. Ọ na-achọ obi ike n’aka ụmụnna ahụ ikwusara ndị agbata obi ha, ndị enyi, na ndị ikwu ozi ọma, bụ́ ndị na-akọcha ma na-akwa ha emo mgbe nile. Otú a, a na-eme ka a ghọta ihe ha pụtara nke ọma bụ́ okwu Jisọs ndị ahụ dị na Matiu 10:36: “Ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya.” Ma, dị ka ilu ahụ gara n’ihu ikwu, “onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọọ n’elu.” Okwukwe na ntachi obi nke ụmụnna ahụ arụpụtawo ihe dị nnọọ ukwuu.
Eziokwu Ejupụta na Rahbeh
Kemgbe ọtụtụ afọ ndị ahụ ndị obodo ahụ amatawo banyere àgwà ọma nke Ndịàmà Jehova, ọtụtụ anabatawokwa eziokwu ahụ. Ụmụnna ahụ nwebigara ọṅụ ókè na 1969 mgbe e guzobere ọgbakọ nke abụọ na Rahbeh. Ha nọgidere na-arụsi ọrụ ike. Ọtụtụ weere ozi oge nile, ọbụna na ụfọdụ gara ije ozi n’ókèala ndị ọzọ, gụnyere Beirut. Jehova gọziri ịrụsi ọrụ ike ha, e guzobekwara ọgbakọ nke atọ na Rahbeh na 1983. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ụmụnna apụwo ma ọ bụ kwapụ ịga biri n’obodo ukwu dị iche iche. Ma, uto ahụ nọgidekwara na-aga n’ihu, e guzobekwara ọgbakọ nke anọ na Rahbeh na 1989, nke ise sochikwara ya na 1990.
Ka ọ dị ugbu a, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ezinụlọ nile n’obodo ahụ nwere onye ikwu ma ọ bụ enyi nke bụ Onyeàmà. Mbuso iro nke dịrị na mbụ ejiriwo nke nta nke nta danyụọ. Ndị mmadụ matara Ndịàmà ahụ nke ọma karị. N’ezie, okwu ndị ahụ bụ “okenye,” “ọsụ ụzọ,” “onye nlekọta sekit,” “mgbakọ,” na “Amagedọn” ghọrọ otu akụkụ nke asụsụ ndị obodo ahụ. N’oge ụfọdụ pụrụ iche, dị ka ná nleta nke onye nlekọta sekit ma ọ bụ Ememe Ncheta, okporo ụzọ dị iche iche na-atọgbọrọ chakoo, Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ejupụtakwa n’ọnụ. Ọbụna na ọgbakọ ụfọdụ na-etinye ígwè okwu na-eme ka okwu dapụta ụda nke ọma ná mpụta nke ụlọ nzukọ ha maka ntụsara ahụ nke ndị agbata obi.
Ugbu a e nwere ihe karịrị 250 ndị nkwusa Alaeze na Rahbeh. Nke ahụ pụtara na e nwere 1 Onyeàmà maka mmadụ 8 n’obodo nta ahụ! Otu ọgbakọ nke nwere 51 ndị nkwusa nwere ókèala nke 76 ụlọ dị na ya, ha na-arụzukwa ya kwa izu. Cheedị echiche ihe mere n’ọnwa March na April afọ gara aga mgbe 98 n’ime 250 ndị nkwusa weere ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, tinyere ndị ọsụ ụzọ oge nile dị 13 na Rahbeh. A rụzuru ókèala ahụ ọtụtụ ugbo kwa izu. Ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe na òtù ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ na-aga n’otu ulọ n’otu ụbọchị ma ọ bụ ọbụna n’otu mgbe. Ihe ka ọtụtụ ná ndị obodo ahụ abụrụwo ndị nleta ndị ahụ marawooro ahụ. Ma mgbe otu nwoke mere mkpesa, otu onye nkwusa zara, sị: “Mgbe i kwetara ka anyị na gị na-amụ Bible, mgbe ahụ anyị ga na-abịa nanị otu ugbo n’izu.” Ha na-agwakwa onye ọ bụla ha zutere n’ugbo okwu—bụ́ ndị na-akọ ala ubi, ndị na-akụ mkpụrụ, ndị na-agba mmiri n’ubi ma ọ bụ nọ n’elu ịnyịnya ibu.
N’eziokwu, eziokwu Bible ejupụtawo na Rahbeh, bụ́ obodo nta nke ọtụtụ mmiri. Ọ bụghị ebe ahụ ka ọ kwụsịrị. Dị nnọọ ka Rahbeh bụ ebe ọtụtụ obodo nta ndị dị ya gburugburu si enweta ezi mmiri, o nyewokwa ha mmiri na-enye ndụ nke eziokwu Bible. Ndị nkwusa si Rahbeh ji ụkwụ aga ileta ndị mmadụ n’obodo ndị dị nso, na-ahazikwa ìgwè ndị ji ugbọ ala ma na-eje njem otu ụbọchị ịga kwusaa ozi ọma n’obodo ndị dị anya karị. Ndị nkwusa ụfọdụ na-akwaga ije ozi n’obodo ukwu ndị ọzọ. Site ná ngọzi Jehova, a ka ga-enwekwa ịba ụba bụ́ nke ga-ewetakwuru Nna eluigwe ahụ, bụ́ Jehova Chineke otuto.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ihe a na-ahụ n’otu okporo ámá dị na Rahbeh