“Ka Ịlụ Di Na Nwunye Bụrụ Ihe A Na-asọpụrụ N’etiti Unu Nile”
“Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ.”—NDỊ HIBRU 13:4.
1. Gịnị ka ọtụtụ ndị mmadụ mụtaworo banyere alụmdi na nwunye na-enwe ihe ịga nke ọma?
ỌTỤTỤ nde mmadụ, ọbụna n’ọgbọ nke a nke ịgba alụkwaghịm dị mfe, na-enwe alụmdi na nwunye na-adịgide adịgide. Ha achọtawo ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma, n’agbanyeghị ọdịiche ndị e nwere n’ọdịdị mmadụ na ụzọ e si zụlite mmadụ. A na-achọta alụmdi na nwunye ndị dị otú ahụ n’etiti Ndịàmà Jehova. N’ihe ka ọtụtụ n’ime ọnọdụ ahụ, di na nwunye ndị a ga-ekweta na ha enwewo oge ihe dị mma na oge ihe dị njọ, ọbụna ezi ihe mere ha ga-eji mee mkpesa megide ibe ha. Ma, ha amụtawo ịtachi obi ná ntakịrị ihe isi ike ha ma hapụ ụgbọ nke alụmdi na nwunye ka ọ na-aga. Olee isi ihe ndị nyewooro ha aka ịnọgide na-aga n’ihu?—Ndị Kọlọsi 3:13.
2. (a) Olee isi ihe ụfọdụ ziri ezi ndị na-ejigide alụmdi na nwunye? (b) Olee isi ihe ụfọdụ ndị pụrụ imebi alụmdi na nwunye? (Lee igbe dị na peji nke 14.)
2 Okwu sitere n’ọnụ ndị ụfọdụ alụmdi na nwunye ndị Kraịst ha bụworo nke obi ụtọ na nke na-adịgide adịgide na-ekpughe ọtụtụ ihe. Otu nwoke lụworo nwunye kemgbe 16 afọ kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla nsogbu bilitere, anyị etinyewo mgbalị ịṅa ntị n’ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ikwu.” Nke a na-ewepụta otu isi ihe na-eme ka ọtụtụ alụmdi na nwunye sie ike—iji obi ghere oghe na eziokwu na-enwe nkwurịta okwu. Otu nwunye, nke lụworo di kemgbe 31 afọ, kwuru, sị: “Ijide aka na ime ihe ndị na-enye ọṅụ iji jigide ịhụnanya dị n’etiti anyị anọgidewo na-abụ ihe anyị na-ebutere ụzọ.” Nke ahụ bụkwa akụkụ ọzọ nke nkwurịta okwu. Mmadụ abụọ ọzọ, ndị lụworo di na nwunye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 40 afọ, mesiri ike mkpa ọ dị ịdị na-eme ihe ọchị, inwe ike ịchị onwe ha ọchị na ịchịrịta ibe ha ọchị. Ha sịkwara na ọ na-enye aka inwe ike ịhụ ebe ha kasị eme nke ọma na ebe ha kasị dịrị njọ ma ka na-egosi ịhụnanya na-anọgidesi ike n’ihe. Onye nke bụ di kwuru banyere ịdị njikere ịnakwere mmejọ na ịrịọ mgbaghara. N’ebe e nwere mmụọ nke nkwenyere, alụmdi na nwunye ahụ ga-ekwe nchịkwata kama ịdakpọ.—Ndị Filipaị 2:1-4; 4:5, Kingdom Interlinear.
Ọnọdụ Na-agbanwe Agbanwe
3, 4. Mgbanwe àgwà ndị dị aṅaa werewooro ọnọdụ n’ihe banyere ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye? Ị̀ pụrụ inye ihe atụ?
3 Kemgbe iri afọ ole na ole gara aga, gbaa ụwa gburugburu, nghọta agbanwewo n’ihe banyere ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye. Ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye kwere na ọ dịghị ihe dị njọ ile anya n’èzí, bụ́ okwu ọgbara ọhụrụ e ji eme ka ịkwa iko yie ihe na-adịghị njọ, karịsịa ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ maara banyere ya ma nakwere ya.
4 Otu onye Kraịst bụ́ onye nlekọta kwuru okwu banyere ọnọdụ ahụ, sị: “Ụwa agbahapụwo nnọọ mgbalị ọ bụla dị mkpa a na-eme ibi ndụ dị ka ụkpụrụ omume ọma si dị. A malitewo ile omume dị ọcha anya dị ka ihe mgbe ochie.” Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị na-eme egwuregwu, na ndị na-eme ihe ntụrụndụ a ma ama na-emebi ụkpụrụ Bible banyere omume ọma n’ihu ọha, a nọgidewokwa na-emeso ndị dị otú ahụ dị ka ndị dị oké mkpa. Ọ dịghị ihe ihere ọ bụla e jikọrọ ya na ụdị ọ bụla nke ajọ omume na omume rụrụ arụ. Ịdị ọcha na iguzosi ike n’ezi ihe abụwo ndị a na-adịghị ejikarị akpọrọ ihe n’etiti ndị a sịrị na ha bara ọgaranya. Mgbe ahụ, site n’ụkpụrụ ahụ bụ ‘elu rie ala erie,’ ụmụ mmadụ na-agbaso ihe nlereanya ahụ ma na-anabata ihe Chineke megidere. Ọ bụ dị ka Pọl si kọwaa ya: “Ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ, ha raara onwe ha nye n’aka agụụ ịkwa iko, ịrụpụta adịghị ọcha nile n’ime anyaukwu.”—Ndị Efesọs 4:19; Ilu 17:15; Ndị Rom 1:24-28; 1 Ndi Kọrint 5:11.
5. (a) Gịnị bụ mkpebi Chineke banyere ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye? (b) Gịnị ka a gụnyere site n’ụzọ Bible si jiri okwu ahụ bụ “ịkwa iko” mee ihe?
5 Ụkpụrụ Chineke agbanwebeghị. Ọ bụ mkpebi ya na ibikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye bụ ibi n’ime ịkwa iko. Ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye ka bụkwa ịkwa iko.a Pọl onyeozi kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Ma ọ̀ bụ unu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom . . . agaghị eketa alaeze Chineke. Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
6. Agbamume dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta n’okwu Pọl ndị dị ná 1 Ndị Kọrint 6:9-11?
6 Isi ihe na-agba ume nke dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ bụ okwu Pọl bụ́, “Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu.” Ee, ọtụtụ ndị biworo ndụ n’ime “njubiga ókè ahụ nke ndụ ịla n’iyi” nke ụwa amatawo onwe ha, nabata Kraịst na àjà ya, bụrụkwa ndị e meworo ka ha dị ọcha. Ha ahọrọwo ime ihe na-atọ Chineke ụtọ site n’ibi ndụ dị ọcha, ha na-enwekwa obi ụtọ karị n’ihi nke ahụ.—1 Pita 4:3, 4.
7. Mmegiderịta dị aṅaa ka e nwere n’ụzọ e si aghọta “omume rụrụ arụ,” gịnịkwa bụ echiche Bible?
7 N’aka nke ọzọ, nkọwa ụwa nke oge a na-enye omume rụrụ arụ bụ nke a gwagburu agwagbu nke na ọ dịghị ekwekọ n’echiche Chineke. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa “ịrụ arụ” dị ka “ihe megidere omume ọma e guzobere eguzobe.” “Omume ọma e guzobere eguzobe” nke oge a, bụ́ nke na-akwado inwe mmekọahụ tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye na di ma ọ bụ nwunye isoro onye ọzọ nwee mmekọahụ tinyekwara idina ụdị onwe onye, bụ ihe Bible na-akatọ dị ka omume rụrụ arụ. Ee, site n’ụzọ Bible si ele ihe anya, omume rụrụ arụ bụ mmebi nke ụkpụrụ omume ọma Chineke.—Ọpụpụ 20:14, 17; 1 Ndị Kọrint 6:18.
O Metụtara Ọgbakọ Ndị Kraịst
8. Olee ụzọ omume rụrụ arụ pụrụ isi metụta ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst?
8 Omume rụrụ arụ taa jupụtara n’ebe nile nke na ọ pụrụ inwe nrụgide n’ahụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ pụrụ imetụta ha site n’ihe omume TV, vidio, na ihe ọgụgụ na-akpali mmekọahụ bụ́ ndị na-agbasa ebe nile. Ọ bụ ezie na ọ bụ nanị obere ọnụ ọgụgụ nke ndị Kraịst ka ọ na-emetụta, ọ bụ ihe e kwesịrị ịghọta na ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-achụpụ n’etiti Ndịàmà Jehova maka omume na-ekwesịghị ndị Kraịst nke ndị mere ha na-enweghị nchegharị metụtara ụdị ụfọdụ nke mmekọahụ rụrụ arụ. N’akụkụ nke na-enye obi ụtọ, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ na-emesị chọpụta ihe ọjọọ ha mere, maliteghachi ụzọ ndụ dị ọcha, mgbe oge na-agakwa a na-akpọbataghachi ha n’ọgbakọ.—Tụlee Luk 15:11-32.
9. Olee ụzọ Setan si enweta ndị na-anọghị na nche?
9 Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Setan na-agagharị dị ka ọdụm na-agbọ ụja, dị njikere ilomi ndị na-anọghị na nche. Nzupụta, ma ọ bụ “ụzọ akọ” ya, na-eme ka ndị Kraịst na-anọghị na nche ma n’ọnyà kwa afọ. Mmụọ nke nọgidere na-adị n’ime ụwa ya bụ ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ihe ụtọ, na ọchịchọ ọjọọ. Ọ na-emeju ọchịchọ anụ ahụ. Ọ na-ajụ njide onwe onye.—Ndị Efesọs 2:1, 2; 6:11, 12, NW, ntụaka ala ala peji; 1 Pita 5:8.
10. Olee ndị na-adabakarị n’ọnwụnwa, n’ihi gịnịkwa?
10 Olee ndị n’ọgbakọ ka a pụrụ ikpughe nye ọnwụnwa nke omume rụrụ arụ? Ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst, ma hà bụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ unu, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị Betel, ndị ọsụ ụzọ na-ekwusa ozi ọma ọtụtụ hour kwa ọnwa, ndị mụrụ ụmụ na-eji ọrụ n’aka ilekọta ezinụlọ, ma ọ bụ ndị na-eto eto na-eche nrụgide ndị ọgbọ ihu. Ọnwụnwa anụ ahụ na-abịara mmadụ nile. A pụrụ ịkpali ndọrọ mmekọahụ mgbe a na-atụghị anya ya ma ọlị. Otú a Pọl pụrụ ide, sị: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda. Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide.” Ọ bụ ihe mwute, ma ụfọdụ ndị Kraịst nọ n’ọnọdụ nke inwe ibu ọrụ adabawo ná nrụgide nke a nke omume rụrụ arụ.—1 Ndị Kọrint 10:12, 13.
Ndị A Nwatara wee Rafuo
11-13. Ọnọdụ ndị dị aṅaa dubaworo n’omume rụrụ arụ?
11 Olee ọnwụnwa na ọnọdụ ndị dugaworo ụfọdụ n’ụzọ nzuzu nke ịkwa iko ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na ịkwa iko ndị na-alụghị? Ha dị ọtụtụ, dịkwa mgbagwoju anya, ha pụkwara ịdịgasị iche iche site n’otu mba ma ọ bụ ọdịnala ruo n’ọzọ. Otú ọ dị, e nwere ọnọdụ ụfọdụ ndị bụ isi na-ebilite n’ọtụtụ mba. Dị ka ihe atụ, a kọwo na ụfọdụ akpọwo oriri ebe ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya dị aghara aghara. Ndị ọzọ enwewo mmasị n’egwú ụwa ndị na-agụ ihe rere ure na ịgba egwú na-akpali akpali. N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, e nwere ndị ikom bara ọgaranya—ndị na-ekweghị ekwe—ndị nwere iko nwanyị; a nwawo ụfọdụ ndị inyom ịchọ inweta ezi ọnọdụ akụ na ụba n’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ bụ ezie na o metụtara omume rụrụ arụ. N’ebe ndị ọzọ, ndị Kraịst bụ́ di ahapụwo ezinụlọ ha ije kpata ihe e ji adị ndụ n’ebe a na-egwupụta ihe ma ọ bụ n’ebe ọzọ. Mgbe ahụ a na-etinye ịnọgidesi ike n’ihe na ikwesị ntụkwasị obi ha n’ule ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ n’ụzọ ha na-agaghị enwe ahụmahụ ya n’ebe ha si bịa.
12 Ná mba ndị mepere emepe, ụfọdụ adabawo n’ọnyà Setan site n’ịnọnyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ọtụtụ mgbe n’enweghị onye nke atọ so ha nọrọ—dị ka isoro onye na-akụzi ka e si anya ụgbọ ala na-anọ mgbe mgbe n’ime ụgbọ ala.b Ndị okenye na-eme nleta ọzụzụ atụrụ kwesịkwara ilezi anya ka ha ghara iso nwanna nwanyị nọrọ nanị ya mgbe a na-enye ya ndụmọdụ. Nkwurịta okwu pụrụ ịghọ nke na-akpali mmetụta, kpatakwa ọnọdụ na-emechu ihu nye mmadụ abụọ ahụ.—Tụlee Mark 6:7; Ọrụ 15:40.
13 Ọnọdụ ndị ahụ e hotara n’elu emewo ka ụfọdụ ndị Kraịst kwụsị ịnọ na nche wee mee omume rụrụ arụ. Ọbụna dị ka o mere na narị afọ mbụ, ha ahapụwo onwe ha ịbụ ndị ‘a dọkpụfuru wee rafuo site n’agụụ ihe ọjọọ nke aka ha,’ bụ́ nke dugaworo ná mmehie.—Jemes 1:14, 15; 1 Ndị Kọrint 5:1; Ndị Galetia 5:19-21.
14. N’ihi gịnị ka ọdịmma onwe onye nanị ji bụrụ isi ihe pụtara ìhè n’ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye?
14 Iji nlezianya tụlee ịchụpụ n’ọgbakọ na-egosi na omume rụrụ arụ nwere isi ihe ụfọdụ zoro ezo ha nwekọrọ ọnụ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, e nwere ụdị ụfọdụ nke ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị. N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo nke ahụ? N’ihi na n’ọnọdụ ụfọdụ nke ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye, a ga-emerụ ụfọdụ ndị ma ọ bụ onye aka ya dị ọcha ahụ. Ọ pụrụ ịbụ di ma ọ bụ nwunye mmadụ n’ụzọ iwu kwadoro. N’ezie ọ ga-abụ ụmụaka, ma ọ bụrụ na ọ dị ndị a mụtara, n’ihi na ọ bụrụ na ịkwa iko akpata ịgba alụkwaghịm, ụmụaka ahụ, bụ́ ndị na-achọ ntụkwasị obi nke ezinụlọ dị n’otu, pụrụ ịta ahụhụ kasị ukwuu. Onye ahụ na-akwa iko na-eche echiche n’ụzọ bụ isi banyere obi ụtọ na abamuru nke ya. Nke ahụ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị.—Ndị Filipaị 2:1-4.
15. Gịnị pụrụ ịbụ ihe ụfọdụ na-akpata ịdaba n’ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye?
15 Dị ka ọ na-adịkarị, ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye abụghị omume mberede nke adịghị ike. E nwewo ndakpọ nke mere n’ụzọ dị nwayọọ, ọbụna nke na-ekweghị nghọta, n’alụmdi na nwunye ahụ n’onwe ya. Ma eleghị anya nkwurịta okwu aghọwo ihe e ji emezu iwu ma ọ bụ nke na-adịghị akpali akpali. Ọ pụrụ ịbụ na e nwewo mgbarịta ume dị ntakịrị. Ọ pụrụ ịbụ na nke ọ bụla n’ime ha adịghị egosipụta ekele maka onye nke ọzọ. Ọ pụrụ ịbụ na di na nwunye ahụ adịghị egbo mkpa mmekọahụ nke ibe ha ruo oge ụfọdụ. N’ezie mgbe di ma ọ bụ nwunye kwara iko, e nwewokwa mmekọrịta mebiri emebi n’ebe Chineke nọ. A dịghị elekwa Jehova anya dị ka Chineke dị ndụ bụ́ onye maara banyere echiche na omume nile anyị. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na n’uche nke di ma ọ bụ nwunye ahụ kwara iko, “Chineke” na-aghọ okwu nkịtị, ihe siri ike nghọta nke na-abụghị akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Mgbe ahụ ọ na-adị mfe karị ime mmehie megide Chineke.—Abụ Ọma 51:3, 4; 1 Ndị Kọrint 7:3-5; Ndị Hibru 4:13; 11:27.
Isi Ihe Na-enye Aka Iguzogide
16. Olee ụzọ onye Kraịst pụrụ isi guzogide ọnwụnwa nke ịbụ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi?
16 Ọ bụrụ na onye Kraịst ọ bụla ga-achọta onwe ya ka a na-anwa ya gaa n’ụzọ nke ekwesịghị ntụkwasị obi, isi ihe ndị dị aṅaa ka e kwesịrị ilebara anya? Na nke mbụ, e kwesịrị icheba echiche n’ihe ịhụnanya ndị Kraịst pụtara, bụ́ ndị gbara mkpọrọgwụ siri ike n’ụkpụrụ Bible. Ọ dịghị mgbe e kwesịrị ikwere ka ịhụnanya nkịtị ma ọ bụ nke mmekọahụ ahụ na-achịkwa mmetụta mmadụ ma kpata ịdaba n’ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, na-ewetara ndị ọzọ ntaramahụhụ. Kama nke ahụ, e kwesịrị ileba anya n’ọnọdụ ahụ site n’ụzọ Jehova si ele ihe anya. E kwesịrị ile ya anya n’ụzọ ọ ga-esi metụta ọgbakọ nke ukwuu nakwa nkọcha nke àgwà ọjọọ ahụ ga-ewetara ya nakwa n’aha Jehova. (Abụ Ọma 101:3) A pụrụ izere ọdachi site n’inwe uche Kraịst n’isiokwu ahụ ma na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ. Cheta, ịhụnanya yiri nke Kraịst nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị adịghị ada mgbe ọ bụla.—Ilu 6:32, 33; Matiu 22:37-40; 1 Ndị Kọrint 13:5, 8.
17. Ihe atụ ndị dị aṅaa na-ewuli elu nke ikwesị ntụkwasị obi ka anyị nwere?
17 Isi ihe na-enye aka n’inwe nguzogide bụ mmadụ imesi okwukwe na olileanya ya maka ọdịnihu ike. Nke a pụtara ime ka ihe kasị dịrị n’obi anyị bụrụ ihe atụ ndị pụrụ iche nke iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ikom na ndị inyom oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi, na Jisọs n’onwe ya, hapụworo. Pọl dere, sị: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndịàmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ Onyendú na Onye Mmezu nke okwukwe anyị, onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-elelị ihere anya, o wee nọdụ n’aka nrị nke ocheeze Chineke. N’ihi na, tụgharịanụ uche n’onye ahụ nke tachiworo obi ná nkwugide dị otú a, bụ́ nke ndị mmehie na-ekwugide onwe ha, ka ike ghara ịgwụ unu, unu wee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.” (Ndị Hibru 12:1-3) Kama ikpu ụgbọ mmiri nke alụmdi na nwunye, onye amamihe ga-echepụta ụzọ isi dozie ihe ọ bụla mebiri emebi iji nwetaghachi ya, si otú a na-ezere ọnyà nke aghụghọ na ihu abụọ.—Job 24:15.
18. (a) N’ihi gịnị ka aghụghọ ji ghara ịbụ okwu dị ike iji kọwaa ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye? (b) Olee ụzọ Chineke si ele ịkwụghachi ihe e kwere ná nkwa anya?
18 Aghụghọ, nke bụ mgba okpuru, ọ̀ bụ okwu dị ike karị n’ihe banyere omume rụru arụ? Mgba okpuru bụ mmebi nke ntụkwasị obi ma ọ bụ obi ike. N’ezie nkwa alụmdi na nwunye metụtara ntụkwasị obi na nkwa nke ịhụnanya na inwe mmasị, n’oge ihe isi ike nile, n’oge ihe dị mma na n’oge ihe dị njọ. Ọ gụnyere ihe ọtụtụ ndị na-ele anya dị ka ihe mgbe ochie n’oge anyị bi n’ime ya—mmadụ imezu ihe o kwupụtara ná nkwa alụmdi na nwunye. Imebi ntụkwasị obi ahụ bụ otu ụdị nke ịgba mgba okpuru megide onye mmadụ na-alụ. E kwupụtara echiche Chineke banyere nkwa n’ụzọ doro anya n’ime Bible: “Mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, alala azụ n’ịkwụghachi ya; n’ihi na ihe ndị nzuzu adịghị atọ ya ụtọ: ihe ị na-ekwe ná nkwa, kwụghachi ya.”—Eklisiastis 5:4.
19. N’ụzọ dị iche site na gịnị ka Setan na-enwe ọṅụ mgbe Onyeàmà dara?
19 Ka a ghara inwe obi abụọ ọ bụla banyere ya. Dị nnọọ ka a na-enwe oké ọṅụ n’eluigwe maka nzọpụta nke onye mmehie, otú ahụ ka a na-enwe oké ọṅụ n’elu ala n’etiti ìgwè ndị òtù Setan, ma ndị a na-ahụ anya ma ndị a na-adịghị ahụ anya, mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova dara n’ijigide iguzosi ike n’ezi ihe ya.—Luk 15:7; Mkpughe 12:12.
Ọnwụnwa Ndị Na-abịara Mmadụ Nile
20. Olee ụzọ anyị pụrụ isi guzogide ọnwụnwa? (2 Pita 2:9, 10)
20 Omume rụrụ arụ ọ̀ bụ ihe a na-apụghị izere mgbe ụfọdụ? Anụ ahụ na Setan hà dị ike nke ukwuu nke na ndị Kraịst apụghị iguzogide ha ma jigide iguzosi ike n’ezi ihe ha? Pọl na-enye agbamume n’okwu ndị a, sị: “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karị nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” N’ụwa nke oge a, ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị ezerecha ọnwụnwa nile, ma site n’ichigharịkwuru Chineke n’ekpere, n’ezie anyị pụrụ ịtachi obi ma merie ọnwụnwa ọ bụla.—1 Ndị Kọrint 10:13.
21. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a ga-aza n’ọmụmụ ihe anyị nke na-esonụ?
21 Gịnị ka Chineke na-enye anyị iji nyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa ma nwee mmeri? Gịnị dị anyị mkpa n’otu n’otu iji chebe alụmdi na nwunye anyị, ezinụlọ anyị, tinyekwara ezi aha nke Jehova na nke ọgbakọ? Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “‘Ịkwa iko’ n’ime nghọta sara mbara, na dị ka e ji ya mee ihe na Matiu 5:32 na 19:9, na-atụ aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ebe mmekọahụ nile megidere iwu ma ọ bụ mmekọahụ nile na-ezighị ezi nke na-abụghị n’ime ọlụlụ di na nwunye dị. Porneia [okwu Grik e ji mee ihe n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ] na-agụnyekọta iji akụkụ ahụ nwoke ma ọ bụ akụkụ ahụ nwanyị, ọ dịkarịa nta, nke otu mmadụ na-eme mmekọahụ nke na-adịghị ọcha (ma ọ bụ n’ụzọ e si eme ya ma ọ bụ n’ụzọ megidere ya); ọzọkwa, a ghaghị inwe onye ọzọ nke e soro nwee mmekọahụ ahụ na-adịghị ọcha—mmadụ ọ bụla nke bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ma ọ bụ anụmanụ.” (Ụlọ Nche, September 15, 1983, peji nke 30) Ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye: “Mmekọahụ e leziri anya nwee n’etiti onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye na onye ọzọ nke na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ọ lụrụ alụ.”—The American Heritage Dictionary of the English Language.
b N’ụzọ doro anya, a ga-enwe oge ndị kwesịrị ekwesị nwanna nwoke ga-eburu nwanna nwanyị n’ime ụgbọ ala, e kwesịghịkwa ịghọtahie ọnọdụ ndị dị otú ahụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Isi ihe ụfọdụ dị aṅaa na-enye aka ime ka alụmdi na nwunye siwanye ike?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jụ echiche ụwa banyere omume ọma?
◻ Olee ọnwụnwa na ọnọdụ ụfọdụ ndị pụrụ iduga n’omume rụrụ arụ?
◻ Gịnị bụ otu isi ihe nke na-enye aka iji guzogide mmehie?
◻ Olee ụzọ Chineke si enyere anyị aka n’oge ọnwụnwa?
[Igbe dị na peeji nke 14]
ISI IHE NDỊ NA-ADỊKARỊ N’ALỤMDI NA NWUNYE NA-ADỊGIDE ADỊGIDE
◻ Ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ nile nke Bible
◻ Di na nwunye ahụ nwere mmekọrịta siri ike n’ebe Jehova nọ
◻ Di na-asọpụrụ nwunye ya, mmetụta ya, na ihe bụ echiche ya
◻ Ọnọdụ nkwurịta okwu dị mma kwa
ụbọchị
◻ Ịchọ ime ka obi dị ibe ha ụtọ
◻ Echiche nke ime ihe ọchị; mmadụ inwe ike ịchị onwe ya ọchị
◻ Na-anabata mmejọ gị; na-agbaghara ngwa ngwa
◻ Mee ka ịhụnanya ahụ sie ike
◻ Dịrịnụ n’otu n’ịzụlite na ịdọ ụmụaka aka ná ntị
◻ Na-ekpekọnụ ekpere ọnụ nye Jehova
ISI IHE NA-EZIGHỊ EZI NDỊ NA-EMEBI ALỤMDI NA NWUNYE
◻ Ọdịmma onwe onye nanị na ime isi ike
◻ Adịghị emekọ ihe ọnụ
◻ Ọnọdụ nkwurịta okwu na-adịghị mma
◻ Adịghị ajụ ase n’etiti di na nwunye ahụ
◻ Ụzọ nchịkwa ego na-adịghị mma
◻ Inwe ọdịiche n’ụzọ isi mesoo ụmụaka nakwa/ma ọ bụ ụmụ nke otu n’ime ha nweburu
◻ Di ịrụ ọrụ ruo ime abalị ma ọ bụ ileghara ezinụlọ ya anya n’ihi ibu ọrụ ndị ọzọ
◻ Enweghị ike ilekọta mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ
[Foto dị na peeji nke 15]
Ime ka nsọpụrụ dị n’alụmdi na nwunye na-eweta obi ụtọ na-adịgide adịgide