Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Inyeju Ndị Agụụ Ihe Ime Mmụọ Na-agụ Afọ—N’ụlọ Akwụkwọ
“NGỌZI na-adịrị ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha,” ka Jisọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya. (Matiu 5:3) Akpịrị na-akpọ ọtụtụ ụmụ akwụkwọ nkụ maka ihe ọmụma nke Chineke na nzube ya nile dị ebube. Ha chọrọ azịza nye ajụjụ banyere ndụ, chọkwa ịmara ụzọ ha kwesịrị isi bie ndụ iji nweta nnwapụta Chineke ma nwee obi ụtọ. Nke a pụtara ìhè n’otu ụlọ akwụkwọ dị na British Virgin Islands. Otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ na-akọ, sị:
◻ “Ejere m otu nzukọ nke ndị nkụzi na ndị nne na nna nwere n’ụlọ akwụkwọ dị n’ebe ahụ, e kwukwara ọtụtụ ihe banyere ọgwụ ọjọọ, ịṅụ mmanya, ime mkpapụ, ikiri TV, akara mmụta, na ihe ndị ọzọ, ya mere ekpebiri m iwere akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work ma gosi nwanyị nke bụ onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe ọ tụlesịrị akwụkwọ ahụ, ọ sịrị na ọ bụ nnọọ ihe dị ha mkpa wee jụọ ma ụlọ akwụkwọ ahụ ọ̀ pụrụ inweta otu mkpụrụ maka nke ọ bụla n’ime 120 ụmụ akwụkwọ ahụ. E sooro ndị okenye ọgbakọ tụlee okwu ahụ, ha wee kpebie inye ụlọ akwụkwọ ahụ akwụkwọ ndị ahụ dị ka onyinye. Mgbe anyị kwuru nke a, ndị nkụzi ahụ rịọrọ ka anyị nyefee akwụkwọ ahụ n’aka ụmụ akwụkwọ ahụ. Ndịàmà abụọ jere, ime ụlọ ahụ jupụtakwara n’ụmụ akwụkwọ ndị nọ na-eche ha. Ụmụnna ahụ kwuru okwu ruo ọkara hour, a gụpụtara ahụmahụ ndị na-egosi ụzọ akwụkwọ ahụ siworo nyere ndị na-eto eto na ndị agadi aka site na magazin dị iche iche nke Watch Tower Society. Mgbe ahụ e nyefere akwụkwọ ahụ n’aka ụmụ akwụkwọ ahụ chọsiri ya ike.”
Ọ bụ ihe ọṅụ ịmara na ụlọ akwụkwọ ahụ ekpebiwo iji akwụkwọ ahụ na-eme ihe dị ka akụkụ nke ihe ọmụmụ ndị nọ na praịmarị nke anọ na nke ise. N’ezie ọ ga-aza ọtụtụ ajụjụ nke ụmụ akwụkwọ ndị a nwere banyere ndụ na ọdịnihu.
Inyeju Ndị Agụụ Ihe Ime Mmụọ Na-agụ
Afọ—Na Papua New Guinea
A natara ahụmahụ a na-esonụ site n’aka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ọ na-egosi ụzọ agụụ ihe ime mmụọ si na-agụ ndị nọ ná mba ahụ na ụzọ akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible si dị irè n’imeju agụụ ha.
◻ “Ebe ọ bụ na m nweghị ike ileta ime obodo nke Kamberatoro,” ka onye nlekọta ahụ kwuru, “etinyere m oge m n’isoro obere ọgbakọ ahụ dị na Vanimo na-arụ ọrụ. E nwere ọtụtụ mmasị n’ebe ahụ. Ọtụtụ ndị sitere na Bewani natara akwụkwọ. Otu nwoke rịọrọ m ka m bịa leta ime obodo nke a, na ọ gaje inye m ebe m ga-ehi. Ọtụtụ ndị ahụwo akwụkwọ anyị. Mgbe ọ bụla anyị jere n’obodo Vanimo, akwụkwọ anyị ji adịghị ezuru anyị n’agbanyeghị na anyị na-ebu igbe akwụkwọ atọ. A na-ele Akwukwọm nke Akukọ Bible anya dị ka ọlaedo dị oké ọnụ ahịa. Ndị mmadụ na-achọ ya achọ. Etinyere m akwụkwọ ndị m ji gaa ngwa ngwa. Mgbe anyị gosiri ndị mmadụ akwụkwọ anyị, ụfọdụ na-ajụ, sị: ‘Olee maka akwụkwọ ahụ na-acha odo odo?’ Otu nwoke tụrụ ọda isii. O nyere m aha ya na adres ya wee rịọ ka m mee ka a maa ya n’ọkwa na redio mgbe m nwetara ha. Mgbe ahụ ọ ga-esi n’ime obodo ya bịa were ha.” Onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị kwukwara, sị: “Achọpụtara m na ọtụtụ ndị na Vanimo natara akwụkwọ ndị ahụ bụ́ Mankind’s Search for God na Questions Young People Ask—Answers That Work.”
Nke a na-egosi otú agụụ si agụ ndị nwere obi eziokwu maka nri ime mmụọ a na-achọta na Bible nakwa n’akwụkwọ dị iche iche Jehova wepụtaworo site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Lee ka obi si dị Ndịàmà Jehova ụtọ inwe ike inyere ndị a eziokwu na-agụ agụụ aka!
[Foto dị na peeji nke 19]
Ịgba àmà na Papua New Guinea