Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 3/15 p. 19-22
  • Ihe Mere Na Òkè Nke Onye Mkpesa Abụghị nke Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Na Òkè Nke Onye Mkpesa Abụghị nke Obi Ụtọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpesa Ndị Kwesịrị Ekwesị
  • Otú Chineke Si Ele Ndị Mkpesa Anya
  • Imeri Mmụọ nke Ime Mkpesa
  • Ime Mkpesa Nile Hà Dị Njọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • ‘Nọgidenụ Na-eme Ihe n’Enweghị Ntamu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Zere Ịna-emekarị Mkpesa?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Ngọzi Ma Ọ Bụ Nkọcha—Ihe Atụ Nye Anyị Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 3/15 p. 19-22

Ihe Mere Na Òkè Nke Onye Mkpesa Abụghị nke Obi Ụtọ

ITE egwú ọṅụ agbanwewo ịbụ obi nkoropụ nanị n’ime izu ole na ole. Nṅụrị ọṅụ mbụ nke ndị Israel n’ihi nnwere onwe ha nwetara ọhụrụ site n’agbụ Ijipt adakpọwo gaa n’ịbụ ntamu na-enweghị isi maka nri. N’ọnwa nke abụọ mgbe ha hapụsịrị Ijipt, mba ahụ afọ na-adịghị eju sịrị na òkè nke ịbụ ohu ga-akara ha mma karịa ndụ nke ihe isi ike n’ọzara. N’ọnwa ndị sochirinụ, mmụọ ime mkpesa nke a richapụrụ mkpebi ha irubere Jehova isi ma mebie olileanya ọgbọ ahụ nwere ịbanye n’Ala Nkwa ahụ.​—⁠Ọpụpụ 16:​1-⁠3; Ọnụ Ọgụgụ 14:​26-⁠30.

Otú ọ dị, ọ dịbeghị mgbe ime mkpesa bụ nanị n’ime otu ọgbọ ma ọ bụ otu ndị. Olee onye na-adịghị eme mkpesa mgbe ụfọdụ banyere ọrụ, nri, ihu igwe, ụmụaka, ndị agbata obi, ma ọ bụ ọnụ ahịa ihe e ji ebi ndụ? O yiri ka ezughị okè mmadụ ọ̀ na-enwe ọchịchọ ime mkpesa.​—⁠Ndị Rom 5:12; Jemes 3:2.

Gịnị mere o ji adịrị anyị mfe ime mkpesa? Ma eleghị anya anyị na-enwe mmetụta nke ịda mbà n’obi, enwetaghị ihe a tụrụ anya ya, ma ọ bụ ọrịa. Ime mkpesa pụrụ ịbụ ụzọ isi gosipụta nkụda mmụọ anyị, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ ụzọ ọzọ nke isi kwuo: “M ga-arụ ọrụ ahụ nke ọma karị!” Mgbe ụfọdụ ọdịiche ndị e nwegasịrị n’ụdị mmadụ na-akpalite ime mkpesa. Ọzọkwa, e nwere ihe mkpasu iwe ndị ziri ezi.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ihe kpatara ya, dị ka ihe nlereanya a na-akọ banyere ndị Israel na-egosi, ime mkpesa pụrụ iweta mbibi ma ọ nọgide. Mmadụ pụrụ ịghọ onye ime mkpesa riri ahụ, ọbụna na-atamu banyere ụzọ Jehova si na-eme ihe. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị ize ndụ otú a? Oleekwa otú e kwesịrị isi lebara mkpesa ndị kwesịrị ekwesị anya?

Mkpesa Ndị Kwesịrị Ekwesị

Ọ bụrụ na ihe mkpasu iwe ahụ abụghị nke siri oké ike, ajụjụ mbụ anyị kwesịrị ịjụ bụ, M̀ pụrụ ileghara ya anya n’ịhụnanya? N’eziokwu, anyị pụrụ inwe ezi ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa megide mmadụ, ma eleghị anya ọbụna onye kwere ekwe ibe anyị. Ọ pụrụ imesowo anyị ihe n’enweghị obi ọma ma ọ bụ n’ikpe na-ezighị ezi. Ka o sina dị, ikpesara ndị ọzọ banyere mmeso ahụ na-adịghị mma ọ̀ ga-eme ka ihe ka mma? Olee otú Bible kwuru ka anyị si meghachi? Ndị Kọlọsi 3:13 na-asị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” Ya mere ọbụna mgbe mkpesa ziri ezi, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu ka e nwee àgwà mgbaghara kama mmụọ ime mkpesa.​—⁠Matiu 18:​21, 22.

Gịnị ma ọ bụrụ na okwu ahụ siri oké ike ileghara anya? A pụrụ inwe ezi ihe mere a ga-eji kwupụta mkpesa. Mgbe “iti mkpu” ziri ezi rịgokwuuru Jehova banyere Sọdọm na Gọmọra, o mere ihe iji hụ maka ọnọdụ dị ihere nke obodo ndị ahụ retọrọ eretọ. (Jenesis 18:​20, 21) Mkpesa ọzọ ziri ezi bilitere ngwa ngwa mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị. Mgbe a na-ekesara ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụ́ ndị nọ ná mkpa nri, e gosiri ile mmadụ anya n’ihu n’ebe ndị inyom na-asụ Hibru nọ. Dị ka a tụrụ anya ya, nke a kpatara iwe n’etiti ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụ́ ndị na-asụ Grik. Mkpesa ahụ mesịrị ruo ndị ozi ntị, ngwa ngwa ha hazikwara òtù ndị ikom ruru eru idozi nsogbu ahụ.​—⁠Ọrụ 6:​1-⁠6.

Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst a họpụtara ahọpụta taa kwesịrị n’otu aka ahụ ịhapụ igbu oge n’ime ihe ndị dị mkpa mgbe e mere ka ha mara banyere okwu ndị siri ike. Ilu 21:13 na-asị: “Onye na-ekwuchipụ ntị ya n’iti mkpu nke onye na-enweghị ike, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu, ma agaghị aza ya.” Kama ilefuru mkpesa ziri ezi anya, ndị okenye kwesịrị iji obi ebere ṅaa ntị. N’aka nke ọzọ, anyị nile pụrụ ikwenyekọ site n’ime mkpesa ndị siri ike nye ndị okenye, kama ịdị na-agụ ha ka egwú n’ebe onye ọ bụla ga-aṅa ntị nọ.

Ka o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị ga-ekwenye n’obi eziokwu na e nwere mgbe ezughị okè mmadụ na-eme ka anyị na-eme mkpesa na-enweghị isi. Ilebakwu anya n’akparamagwa ndị Israel n’ọzara ga-enyere anyị aka ịhụ ihe ize ndụ nke ikwere ka ntakwurị na-anọkata bilite rịa elu ịghọ mmụọ ime mkpesa.

Otú Chineke Si Ele Ndị Mkpesa Anya

Ntamu ndị Israel banyere inweta nri na-ekpughe ihe ize ndụ abụọ dị n’ime mkpesa. Nke mbụ, ime mkpesa na-efe efe. Ihe ndekọ ahụ na-asị na “nzukọ nile nke ụmụ Israel wee tamuo ntamu megide Mosis, megidekwa Erọn, n’ọzara ahụ.” (Ọpụpụ 16:2) Ọ ghaghị ịbụ na ole na ole malitere ime mkpesa banyere ụkọ nri, ngwa ngwa kwa, mmadụ nile na-eme mkpesa.

Nke abụọ, onye mkpesa ahụ na-ekwubigakarị okwu ókè banyere nsogbu ahụ. N’ọnọdụ nke a, ndị Israel kwusiri ike na ọ ga-akara ha mma n’Ijipt, ebe ha pụrụ ịdị na-eri achịcha na anụ otú masịrị ha. Ha mere mkpesa na e duruwo ha bata n’ọzara ahụ nanị ka ha nwụọ n’agụụ.​—⁠Ọpụpụ 16:3.

Ọnọdụ ndị Israel ahụ ọ̀ jọruru njọ otú ahụ? Ma eleghị anya nri ha na-agwụsị, ma Jehova eburuwo ụzọ hụ nsogbu ahụ, n’oge ya kwa, o nyere manna iji gboo mkpa anụ ahụ ha. Mkpesa ha e ji ikwubiga okwu ókè mee gosipụtara enweghị ntụkwasị obi ma ọlị na Chineke. Ka ha nọ n’Ijipt ha emewo mkpesa ziri ezi banyere ọnọdụ obi ọjọọ ndị ahụ. (Ọpụpụ 2:23) Ma mgbe Jehova tọhapụrụ ha site n’ịbụ ohu, ha malitere ime mkpesa banyere nri. Nke ahụ bụ ntamu ọ na-adịghị ihe kpatara ya. “Ha abụghị megide anyị, bụ́ ntamu unu na-atamu, kama imegide Jehova,” ka Mosis dọrọ aka ná ntị banyere ya.​—⁠Ọpụpụ 16:8.

Mmụọ nke a nke ime mkpesa nke ndị Israel gosipụtara onwe ya ugboro ugboro. N’ime otu afọ, manna ahụ ghọrọ ihe a na-eme mkpesa banyere ya. (Ọnụ Ọgụgụ 11:​4-⁠6) Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, akụkọ ọjọọ site n’ọnụ 10 n’ime ndị nledo 12 nke Israel kpalitere iti mkpu banyere ihe ize ndụ e chere na a ga-enwe n’ịdọrọ Ala Nkwa ahụ n’agha. Ndị ahụ megidere otú a ruo n’ókè nke ikwu, sị: “Ọ ga-adị anyị nnọọ mma ma a sị na anyị anwụrụwo n’ala Ijipt, ma ọ bụ n’ọzara nke a!” (Ọnụ Ọgụgụ 14:2) Lee ajọ enweghị ekele nke a bụ! Ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova gwara Mosis, sị: “Ruo ole mgbe ka ndị nke a ga-elelị m anya? Ọ̀ bụkwa ruo ole mgbe ka ha na-agaghị ekwe na mụ?” (Ọnụ Ọgụgụ 14:11) A mara ndị mkpesa ahụ na-enweghị ekele ikpe ịnọ na-agagharị n’ime ọzara ahụ ruo 40 afọ ruo mgbe ọgbọ ahụ nwụsịrị.

Pọl onyeozi na-echetara anyị ihe atụ nke a. Ọ na-adọ ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị ka ha ghara ịdị mgbe ọ bụla ka ndị Israel ahụ ghọrọ ndị ntamu, wee ghọọ ndị e bibiri n’ọzara. (1 Ndị Kọrint 10:​10, 11) O doro anya na ntamu na-ezighị ezi na mmụọ ime mkpesa pụrụ irichapụ okwukwe anyị ma duba anyị n’iwe Jehova.

Ma, Jehova na-enwere ndị na-ejere ya ozi ndidi bụ́ ndị na-eme mkpesa mgbe ụfọdụ n’ihi ọnọdụ na-eweta nkụda mmụọ. Mgbe Elaịja gbalagara n’Ugwu Horeb n’ihi mkpagbu nke ajọ Eze Nwanyị Jezebel, obi siri ya ike na ọrụ ya dị ka onye amụma agwụsịwo. O chere n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ nanị ya bụ onye na-efe Jehova nke fọrọ n’ala ahụ. Iji gbaa okwukwe Elaịja ume, Chineke bu ụzọ nye ya ihe ngosi nke ike ịbụ Chineke Ya. A gwazịrị onye amụma ahụ na a ka nwere 7,000 ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi n’Israel nakwa na o nwere ọrụ dị ukwuu ọ ga-arụ. N’ihi ya, Elaịja chezọrọ mkpesa ya ma jiri ume ọhụrụ gaa n’ihu. (1 Ndị Eze 19:​4, 10-12, 15-⁠18) Ka ndị okenye bụ́ ndị Kraịst na-egosi nghọta, ha pụrụ n’otu aka ahụ ịkasi ndị na-ekwesị ntụkwasị obi obi, na-enyere ha aka ịhụ òkè ha ná mmezu nke nzube Chineke.​—⁠1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.

Imeri Mmụọ nke Ime Mkpesa

Olee otú a pụrụ isi merie mmụọ nke ime mkpesa? Ọ dị mma, ndị e nyere ihe nnwapụta banyere mmerụ ahụ nke ụtaba na-akpata n’ahụ nwere ihe mkpali dị ike ịkwụsị ise sịga. N’otu aka ahụ, ịghọta ihe mere mmụọ ime mkpesa ji bụrụ ihe na-emerụ ahụ pụrụ ịkwali anyị ịkwụsị àgwà ọ bụla nke ime mkpesa.

Uru ndị dị aṅaa na-abịara ndị meriri mmụọ ime mkpesa? Otu uru dị mkpa ndị na-ezere ime mkpesa na-erita bụ na ha pụrụ ile okwu anya site n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ si ele ihe anya na n’ụzọ ezi uche. Ọ na-esi ike onye mkpesa ịkwụsị ma chee echiche banyere nsogbu site n’ụzọ Jehova si ele ihe anya. Ndị Israel ahụ na-eme mkpesa chezọrọ na Jehova Chineke tọhapụrụ ha site n’agbụ, jirikwa ọrụ ebube kewaara ha mmiri nke Osimiri Uhie ahụ. Echiche ọjọọ ha kpuru ha ìsì n’ebe ike Chineke dị ma napụ ha ọṅụ ha. N’ihi ya, obi ike ha nwere na Jehova fefusịrị dị ka ikuku.

Ọzọkwa, onye nwere ike ịtụ nsogbu ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ụzọ ziri ezi na-aghọta mgbe ihie ụzọ ndị nke ya bụ isi ihe ndị kpatara ihe isi ike ya. O yikarịghị ka ọ ga-adahie n’ihe ahụ ọzọ. Jeremaịa dọrọ ndị Israel ibe ya aka ná ntị ka ha ghara ime mkpesa banyere ihe isi ike ha na-enwe mgbe mbibi Jerusalem gasịrị. Ahụhụ ha bụ ihe sitere kpọmkwem ná mmehie ha, nke ahụ bụkwa ihe dị ha mkpa ịghọta iji chegharịa ma laghachikwuru Jehova. (Abụ Ákwá 3:​39, 40) N’otu aka ahụ, Jud onye na-eso ụzọ katọrọ “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” bụ́ ndị jụrụ nduzi Jehova wee bụrụ “ndị ime mkpesa banyere òkè ha ná ndụ” (NW) maara ahụ.​—⁠Jud 3, 4, 16.

Dị ka Eze Solomọn maara ihe kwuru n’otu oge, “obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ dị mma: ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu na-amịkọ ọkpụkpụ.” (Ilu 17:22) Mmụọ mkpesa na-amịkpọ anyị n’ụzọ mmetụta uche ma na-ewepụ ọṅụ anyị. Ọ na-egosipụta enweghị olileanya, ọ bụghị ịtụ anya ihe dị mma. Ma ndị mụtara iche echiche na ikwu okwu banyere ‘ihe ndị kwesịrị otuto’ nwere obi na-aṅụrị ọṅụ, nke pụrụ ime ka ahụ ka ha mma.​—⁠Ndị Filipaị 4:8.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndụ anyị ga-adị ụtọ karị ma ọ bụrụ na anyị ahụta àgwà ọma nke ndị mmadụ kama ebe ndị ha na-ada ada. A ga-ebuli anyị elu ma anyị mee ihe kasị mma anyị pụrụ ime n’ọnọdụ ndị siri ike pụrụ ime kama ịdị na-atakwuri banyere ihe ndọghachi azụ ndị anyị nwere. Ọbụna ule dị iche iche pụrụ ịbụ ihe na-enye ọṅụ ma anyị lee ha anya dị ka ohere ịgba okwukwe anyị ume na imesi ntachi obi anyị ike.​—⁠Jemes 1:​2, 3.

Ọ dịkwa mkpa icheta na mgbe anyị tamuru ntamu, ọ bụghị nanị onwe anyị ka anyị na-emerụ ahụ. Site n’ịdị na-ekwupụta mkpesa mgbe nile, anyị pụkwara imebi okwukwe ndị ọzọ. Akụkọ ọjọọ nke ndị nledo iri ahụ nke Israel mere ka mba ahụ dum lee imeri Ala Nkwa ahụ anya dị ka ihe omume olileanya na-adịghị na ya. (Ọnụ Ọgụgụ 13:25–14:4) N’oge ọzọ, Mosis nwere nkụda obi nke ukwuu n’ihi ntamu na-adịghị akwụsị akwụsị nke ndị ahụ nke na ọ rịọrọ Jehova ka o wepụ ndụ ya. (Ọnụ Ọgụgụ 11:​4, 13-⁠15) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị ekwuo okwu banyere ihe n’ụzọ na-ewuli elu, anyị pụrụ inwe ike ịgba okwukwe ndị ọzọ ume ma tinye ihe n’ọṅụ ha.​—⁠Ọrụ 14:​21, 22.

Ọ bụ ezie na a pụrụ ịnwa anyị ime mkpesa banyere ndị ọrụ ibe anyị, ndị enyi anyị, ezinụlọ anyị, ma ọ bụ ọbụna ndị okenye ọgbakọ, Jehova chọrọ ka ndị ya ‘nwee ịhụnanya dị ike n’ebe ibe ha nọ.’ Ịhụnanya dị otú ahụ na-akwali anyị ikpuchi ndahie nke ndị ọzọ kama ime ka ihie ụzọ ha nile pụta ìhè. (1 Pita 4:8) Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jehova na-echeta na anyị bụ ájá nkịtị, ọ dịghịkwa ele ndahie nile anyị anya. (Abụ Ọma 103:13, 14; 130:3) Ọ bụrụ na anyị nile anwaa iṅomi ihe nlereanya ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-eme mkpesa dị ntakịrị nke ukwuu karị.

Mgbe e weghachiri ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè, ọ dịghị onye ga-enwe ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa banyere òkè ya ná ndụ. Tupu oge ahụ erute, ọ dị anyị mkpa iguzogide ọnwụnwa ime mkpesa banyere ndị ọzọ ma ọ bụ banyere ọnọdụ ndị na-anwale mmadụ bụ́ ndị anyị na-ezute. Iji gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi, hụkwa ndị kwere ekwe ibe anyị n’anya n’ezie, ka anyị ‘mee ihe nile na-ejighị ntamu.’ (Ndị Filipaị 2:14) Nke a ga-eme Jehova obi ụtọ, ọ ga-abakwara anyị uru nke ukwuu. Ya mere, maka ọdịmma nke anyị na nke ndị ọzọ, ka anyị ghara ichezọ na òkè nke onye mkpesa abụghị nke na-enye obi ụtọ.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ọbụna manna Chineke ji ọrụ ebube nye ghọrọ ihe e mere mkpesa banyere ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya