Ịchọta Ezi Akụ̀ Na Hong Kong
HONG KONG bụ ebe a pụrụ ịkpata oké ego n’ime oge dị mkpirikpi—ma ọ bụrụ na ihe nile na-adabara gị. N’ime afọ 40 ma ọ bụ ihe dị ka ya gara aga, mba ahụ Britain chịrị etowo site n’ọdụ ụgbọ mmiri nọ n’ụra gaa n’isi iyi akụ na ụba nke dị mkpa ọ bụghị nanị n’Ọdịda Ọwụwa Anyanwụ Esia kamakwa n’ọgbọ azụmahịa ụwa nile.
Ụtụ taks dị ala na-adọta ndị si mba ọzọ bịa imepe ụlọ ahịa, na-abụkwa ihe na-akpali ndị na-arụsi ọrụ ike a na-achọta n’etiti nde mmadụ isii bi na Hong Kong. Ihe ọzọ dị mma banyere ya bụ ọnọdụ ya nke dị ka ụzọ ngabita n’etiti ebe ndịda China na ógbè Esia na Pacific nakwa ebe ndị ọzọ. Site n’inwe usoro ime njem na nkwurịta okwu ọgbara ọhụrụ nakwa ngalaba ahịa ukwu na ahia nta e mepere nke ọma, Hong Kong nọ n’ọnọdụ nke imejupụta mkpa nke azụmahịa nke mba nile n’ụzọ dị ngwa.
Ọganihu ọnọdụ akụ na ụba enyewo Hong Kong otu n’ime ọnọdụ ibi ndụ kasị elu n’ụwa. Otú ọ dị, ịba ụba nke ihe onwunwe ò wetawo afọ ojuju na obi ụtọ na-adịgide adịgide nye ndị bi na Hong Kong? Ee e, ma ụfọdụ achọwo ma nweta ụdị akụ ka mma nke ukwuu.
Ha Chọtara Akụ Ime Mmụọ
Otu onye so ná ndị chọtaworo akụ ime mmụọ dị oké ọnụ ahịa bụ Alfred, onye a mụrụ na Hong Kong. Ọ rụrụ ọrụ nwere ihe ịga nke ọma dị ka onye isi nke otu ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ngalaba n’ụwa nile nke isi ụlọ ọrụ ya dị na Britain. Dị ka ọtụtụ ndị ọzọ nọ na Hong Kong, ihe mgbaru ọsọ ya ná ndụ bụ ịkpata oké ego, inwe ụlọ nke aka ya, iriju afọ, na ibi ndụ dị mma. Site n’ọnọdụ ya na ego ọ na-akpata, o yiri ka ò nwetawo ihe ndị ahụ nile. Ma ò nwere obi ụtọ? “Amụtara m site n’ahụmahụ na ego nwere n’ezie ịkpa ókè nke ya,” ka Alfred kwara arịrị ya. Ọ nọgidere na-echegbu onwe ya banyere oge ego ọ kpakọbara ga-anọruru ya ma a chụọ ya n’ọrụ. Mgbe o tinyekwuru oge n’ọrụ ya, nsogbu ezinụlọ malitere ibilite. Nwunye ya, bụ́ Emily, dara mbà n’obi mgbe nwa ha nwoke nwụrụ na mberede. “Achọrọ m ịmara ebe ọ nọ ka m wee nwee ike ime ihe iji nyere ya aka,” ka o kwuru. Ebe nwanyị ahụ na-apụghị ime ihe ọ bụla, ọ dara mbà n’obi nke ukwuu.
Nna Justina nwụnahụrụ ya mgbe ọ dị ntakịrị. Ma site n’ịgba mbọ ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Hong Kong nke nwere ùgwù. Nke a dugara na ya inweta ọrụ n’aka ndị gọọmenti. N’asụsụ Cantonese, a na-akpọ nke a gum fan woon, efere ọlaedo osikapa—ọrụ e ji n’aka na ụgwọ dị mma. Ma, Justina enweghị obi ụtọ ma ọ bụ afọ ojuju. Ọtụtụ mgbe o chere echiche banyere ihe bụ nzube nke ndụ na ihe ọdịnihu ga-eweta. Di ya, bụ́ Francis, chekwara na ndụ enweghị nzube ọ bụla. O chere na ya dị ka otu mkpụrụ akụkụ na-abaghị uru nke dị n’otu nnukwu ígwè ọrụ, onye na-adịghị mkpa, onye chọtara onwe ya n’usoro na-adịghị agwụ agwụ.
E nwekwara Ricky, bụ́ onye na-elekọta otu azụmahịa. Ọ bụ ezie na ọ na-akpata oké ego, ọ malitere ịhụ akụkụ ọzọ nke ndụ—ịsọ mpi obi ọjọọ dị n’etiti ndị ọrụ ibe ya na nsogbu ndị dị n’alụmdi na nwunye ya. Ego apụghị inye aka n’idozi nsogbu ndị a. N’echiche nwunye ya, bụ́ Wendy, ọrụ nwere ùgwù, oké ego, na ibi n’ọha nke nwere ndọrọ ndọrọ ọchịchị guzosiri ike pụtara ịnọ ná ntụkwasị obi. Ma ruo olee mgbe ka ndụ ya yiri nke nọ ná ntụkwasị obi ga-adịgide? Nke ahụ nyere ya nsogbu n’obi n’ihi na ihe ọnwụ na-eme mere ka o chee na ndụ ya enweghị nzube ọ bụla.
David nwere akụkọ nke ya ịkọ. Agụmakwụkwọ mahadum ya wetaara ya ezigbo ọrụ na ọnọdụ akụ na ụba e ji n’aka, ma ọ chọtaghị afọ ojuju. N’ihi gịnị? O mikpuru onwe ya n’ime ozizi evolushọn na nkà ihe ọmụma, o kwenyekwara na ndụ bụ nanị nke a na-adị ugbu a. David chere na ọ dịghị ihe ọ bụla ọ ga-elepụ anya maka ya, akụ ihe onwunwe ya nile egbochighịkwa ya inwe mmetụta nke onye na-enweghị enyemaka.
Ọ bụ ezie na ndị a nọ n’ọnọdụ ndụ dịgasị iche iche, ha nwere otu ihe n’ozuzu. Ha nile enwetawo ihe ha chere na ọ ga-eweta ndụ obi ụtọ na afọ ojuju. Otú ọ dị, mgbe ha ruru ná nsọtụ ebe ha chere na nrọ ha ga-amalite imezu, ndụ ha tọgbọrọ n’efu.
Ịba Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ
Ọnọdụ nke Alfred, Justina, na ndị ọzọ a ka kpọtụrụ uche dị nnọọ ka nke nwoke ọgaranya ahụ dị n’ilu Jisọs. Ọ ‘kpadooro onwe ya akụ ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.’ (Luk 12:21) Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na ha chọtara ihe ka mma—ndụ nke jupụtara n’ezi akụ. Ndị chọrọ ezi obi ụtọ na afọ ojuju agaghị ‘atụkwasị obi ha n’ihe ahụ a na-ejighị n’aka, bụ́ akụ, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke, onye na-ewere akụ ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.’ (1 Timoti 6:17) Ee, ịmara ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na ịtụkwasị obi ha n’ebe ọ nọ wetara ọdịiche ná ndụ nke onye ọ bụla n’ime ndị a. Ka anyị hụ otú ihe ndị a nile si mee.
Ike ụwa gwụrụ Alfred na Emily mgbe nwa ha nwoke nwụrụ na mberede, ihe onwunwe ha nile apụghịkwa ibelata ihe mgbu ha. Ha gara chọọchị ma ka nwee mmetụta nke ịtọgbọ n’efu na enweghị afọ ojuju. Mgbe ahụ otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ọnụ ụzọ ha wee jụọ, sị: “Gịnị bụ olileanya mmadụ maka ọdịnihu?” Alfred zaghachiri dị ka ihe a gwaworo ya na chọọchị banyere eluigwe na hell si dị. Otú ọ dị, site na Bible, e gosiri ya na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla” nakwa na ndị nọ ná ncheta Chineke nọ n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ na-echere mbilite n’ọnwụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Jọn 5:28, 29) Nke a dara ka ihe ezi uche dị na ya na ihe kwere nghọta nye Alfred. Ugbu a ọ ghọtara na nwa ya nwoke anọghị n’otu ebe na-ata ahụhụ kama ọ nọ n’ụra ọnwụ, na-enwe olileanya nke ma eleghị anya isoro ezinụlọ ya nọkọọ ọzọ site ná mbilite n’ọnwụ. Lee aha nkasi obi na izu ike nke a bụ! Mgbe oge na-aga Alfred na nwunye ya nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi wee malite ime ihe iji jidesie aka ike n’ezi akụ ndị ahụ nke Bible na-enye.
Justina nwere ịda mbà n’obi mgbe ọ na-enweghị ike ịhụ n’etiti ndị ọrụ ibe ya mmụọ sitere n’obi nke inye aka n’ilekọta ndị ọzọ. N’ịbụ ezi onye Katọlik, o nwere nkụda mmụọ mgbe ọ matara na ụkọchukwu ha na-ese sịga ma na-aga egwú ọgbụgba, dị nnọọ ka ndị ikom ndị ọzọ na-eme. Mgbe ahụ o zutere Ndịàmà Jehova wee malite inweta azịza Akwụkwọ Nsọ ndị na-eju afọ nye ọtụtụ ajụjụ. Ụkọchukwu ha agwabeghị ya ihe ọ bụla ma e wezụga uche nke aka ya, o mepebeghịkwa Bible kemgbe afọ 16, ọ bụ ezie na ọ bụ onye na-agachi chọọchị anya, bụrụkwa onye nkịtị na-enye aka ilekọta chọọchị ruo afọ 10.
Ka Ndịàmà ahụ sooro Justina na di ya, bụ́ Francis na-amụ Bible, a kpaliri di ya site n’ịdị n’otu ha zuru ụwa ọnụ ná nkwenkwe na omume. Francis kwetara na Chineke dị adị. E kwuwerị, ọ bụ nanị ezi Chineke, nke dị adị, pụrụ inwe mmetụta dị otú ahụ n’ebe ìgwè mmadụ zuru ụwa ọnụ nọ. Lee aha obi ụtọ di na nwunye nke a na-enwe na ha achọtawo ezi akụ!
Ricky na Wendy matara na ha aghaghị ime ihe mgbe ha hụrụ na ha ji nke nta nke nta na-emikpu ná nsogbu onwe onye ndị siri ike. Ebe ha abụọ zuteworo Ndịàmà Jehova n’oge gara aga, ha wepụtara onwe ha iche iche ije chọọ ha ọzọ. Site n’oké mgbalị, Ricky na Wendy chọtara ọ bụghị nanị ihe ngwọta dị irè nye nsogbu ha kamakwa ezi akụ ná mmekọrịta onwe onye nke ha na ‘Chineke obi ụtọ,’ bụ́ Jehova.—1 Timoti 1:11.
Ndụ David gbanwekwara mgbe Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya. Site n’ebumnuche nke ikpughe mmejọ ha, o kwetara ka ha bịaghachi. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga e mepere anya ya, n’ihi ya ọ malitere ịhụ na Bible ziri ezi n’ụzọ nkà mmụta sayensị, akụkọ ihe mere eme, na n’ihe ndị ọzọ. Ihe ndị a nile nyeere David aka ile Bible anya dị ka akwụkwọ eziokwu nke nyere ya ezi nzube ná ndụ. Lee aha mgbanwe obi ụtọ na nke na-eme mmadụ ọgaranya ọ bụụrụ ya!
Inyere Ọtụtụ Ndị Ọzọ Aka Ịchọta Ezi Akụ
N’ọnụ ọgụgụ mmadụ bara ụba nke Hong Kong, Alfred, Emily, Justina, Francis, na ndị ọzọ a kpọtụrụ uche n’ebe a bụ nanị ole na ole ná ndị chọtaworo ezi akụ nile nke eziokwu Bible na okwukwe n’ebe Jehova Chineke nọ. Na 1992 ihe dị ka 2,600 Ndịàmà nke Jehova tinyere ngụkọta nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 900,000 hour n’ịkpọtụrụ ndị Hong Kong na n’iduziri ha ihe karịrị 3,800 ọmụmụ Bible ebe obibi. Otú ọ dị, ndụ a na-adị na Hong Kong na-ekwo ekwo, ndị mmadụ na-ejikwa ọrụ n’aka. Ya mere, tụkwasị n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ndị nkwusa Alaeze na-enwe ihe ịga nke ọma n’ịgba àmà okporo ụzọ. Ha na-ejekwurukwa ndị mmadụ n’ebe ha na-arụ ọrụ site n’ịkpọtụrụ ndị na-arụ n’ọfịs, ndị na-ere ihe n’ụlọ ahịa, ndị ọrụ ugbo, na ndị ikom na-alata site ná njem ịkụ azụ n’Osimiri Ebe Ndịda China.
N’ezie a pụrụ ikwu na “owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole” na Hong Kong. (Matiu 9:37) Ka ọ dị ugbu a, nkezi nke Ndịàmà n’ebe ọnụ ọgụgụ ndị mba ahụ dị bụ 1 n’ime 2,300 mmadụ. N’ịghọta ịdị ngwa nke ọrụ owuwe ihe ubi ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 600 n’ime 2,600 ndị nkwusa Alaeze n’ebe ahụ bụ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile nke ozi ọma ahụ. Ndịàmà Jehova nọ na Hong Kong, dị ka ndị nọ n’ebe ndị ọzọ, na-aghọta na ‘ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya.’ (Ilu 10:22) Otú a, ha na-arụsi ọrụ ike inyere ọtụtụ ndị mmadụ karị bi n’ógbè ahụ bara ọgaranya aka ịchọta ezi akụ.
[Map dị na peeji nke 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
OSIMIRI NDỊDA CHINA
CHINA
Hong Kong
Kilomita
Maịlụ
15
15