Ndị Kraịst Na-anụ Ọkụ N’obi Nke Britain
Ihe na-erughị pasent 10 nke 56 nde mmadụ bi na Britain bụ́ ugbu a ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi, dị ka akwụkwọ bụ́ The Economist na-ekwu. N’otu Sunday dị ka ibe ya, ihe na-erughị nde mmadụ anọ na-aga chọọchị. N’ime ndị a, nanị 1.1 nde bụ ndị Anglikan. Otú ọ dị, n’agbanyeghị echiche amaghị ma Chineke ọ̀ dị nke gbasara ebe nile, Church of England nọgidere n’ọkwá ya nke ịbụ okpukpe Mba ahụ. “Britain abụbeghị ọha mmadụ nke ndị Kraịst ruo ọtụtụ afọ ma jụ ịnakwere na ya bụ nke nwere echiche amaghị ma Chineke ọ̀ dị, karịsịa n’ihi ụjọ,” ka otu magazin akụkọ ahụ na-ekwu. Ka a sịkwa ihe mere ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị oge a na akwụkwọ akụkọ dị iche iche ji na-akpọ òkù maka mgbubipụ Chọọchị, nkewa ná njikọ dị iche iche Chọọchị na Gọọmenti.
“Ụwa nke na-enweghị ihe jikọrọ ya na okpukpe ma ọlị, nke na-azọrọ ịbụ nke Kraịst, bụ ụwa kasị njọ,” ka Walter Bagehot, bụ́ editọ akwụkwọ The Economist na narị afọ nke 19, kwara arịrị kwuo. Ma na narị afọ mbụ O.A., Jisọs Kraịst kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ‘abụghị akụkụ nke ụwa, dị ka ọ na-abụghị akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 17:16) Otú ọ dị, o zipụrụ ha banye n’ụwa ikwusa Alaeze Chineke. N’otu aka ahụ taa, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa bụ ndị a maara nke ọma maka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ‘n’ihu ọha mmadụ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’—Ọrụ 20:20.
E jiri ha tụnyere ndị Anglikan, 126,173 Ndịàmà na Britain dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ. Ma ha na-etinye ihe dị ka 20 hour n’otu ọnwa ịga nzukọ ndị Kraịst. Ọzọkwa, n’ime 1992 Onyeàmà nke ọbụla tinyere ná nkezi hour 16 ọzọ n’ọnwa ikwusara ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze Chineke, gọọmenti nke ga-eguzobe ụwa ọhụrụ nke ezi omume n’isi nso. (Matiu 24:14; 2 Pita 3:13) Mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova ga-abịa n’ụlọ gị, ị̀ ga-ege ntị n’ozi ha pụrụ iche ma chọpụta ihe na-akpali ịnụ ọkụ n’obi ha?