Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Chineke dọrọ Ken aka ná ntị na ‘mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa n’ọnụ ụzọ, ọ bụkwa n’ebe ọ nọ ka ọchịchọ ya dị,’ nke yiri ka ọ na-ezo aka n’ebe anụ ọhịa na anụ ọ ga-eri dị. (Jenesis 4:7) N’ihi gịnị ka a ga-eji jiri okwu dị otú ahụ mee ihe ma ọ bụrụ na tupu Iju Mmiri ahụ, ụmụ anụ na-eri nanị ihe ọkụkụ?
N’akwụkwọ ndị Mosis dere, anyị na-ahụ ọtụtụ amaokwu ndị na-egosi ihe ndị bụ eziokwu ma ọ bụ akụkọ ndị mere eme ndị pụrụ iyi ihe ndị na-adabaghị adaba n’ụzọ na-eju anya n’ọnọdụ ha n’akụkọ ihe mere eme.
Dị ka ihe atụ, ihe ndekọ dị na Jenesis 2:10-14 nyere nkọwa ọdịdị ụwa banyere ogige Iden. Mosis dere na otu osimiri bụ “nke na-aga Asiria n’Ihu anyanwụ.” Ma ala Asiria nwetara aha ya site n’Ashụa, nwa Shem nke a mụrụ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. (Jenesis 10:8-11, 22; Ezikiel 27:23; Maịka 5:6) Ihe àmà na-egosi na n’ihe ndekọ ya ziri ezi, nke sitere na mmụọ nsọ, Mosis jiri nanị aha ahụ bụ́ “Asiria” zoo aka n’ókèala nke ndị na-agụ akwụkwọ ya maara.
Tụlee ihe atụ ọzọ site n’isiakwụkwọ ndị mbụ nke Jenesis. Mgbe Adam na Iv mehiesịrị, a chụpụkwa ha n’ogige ahụ, Jehova gbochiri ha ịlaghachite. N’ụzọ dị aṅaa? Jenesis 3:24 na-asị: “O wee chụpụ mmadụ ahụ, mee ka Cherubim nọdụ n’akụkụ Ihu anyanwụ nke ubi Iden a gbara ogige, ha na ire ọkụ nke mmà agha nke na-echigharị onwe ya, idebe ụzọ osisi ahụ nke ndụ.” Rịba ama, “ire ọkụ nke mmà agha.” Chineke ò mepụtara mmà agha?
Ọ dịghị mkpa ka anyị kwubie na Onye Okike anyị na-ahụ n’anya bụ onye mbụ mepụtara ihe anyị maara dị ka mmà agha. Adam na Iv hụrụ n’ihu ndị mmụọ ozi ahụ ihe nke na-egbukepụ ọkụ. Gịnị ka ọ bụ kpọmkwem? N’oge Mosis dere akwụkwọ Jenesis, a maara mmà agha nke ọma, na-ejikwa ya ebu agha. (Jenesis 31:26; 34:26; 48:22; Ọpụpụ 5:21; 17:13) Ya mere okwu Mosis ndị bụ́ “ire ọkụ nke mmà agha” nyeere ndị na-agụ ya aka iji anya nke uche hụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ihe dịrị n’ụzọ mbata Iden. Ihe ọmụma a maara n’ụbọchị Mosis nyere aka n’ịghọta ihe ndị dị otú ahụ. Okwu ndị Mosis jikwara mee ihe aghaghị iziwo ezi, n’ihi na Jehova mere ka e tinye ya na Bible.—2 Timoti 3:16.
Gịnị banyere Jenesis 4:7? N’ebe ahụ Chineke dọrọ Ken aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe? ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị, ma o kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.” Dị ka a rịbara ama, okwu ahụ yiri ka ọ na-egosi onyinyo nke anụ ọhịa agụụ ji nke na-ede anụ ịmakwasị ya ma ripịa ya.
Ka o sina dị, ihe àmà n’ime Bible na-atụ aka n’Adam na Iv isorowo anụ nile dịrị n’udo. Ụfọdụ n’ihe ndị ahụ e kere eke pụrụ inwewo ntụsara ahụ n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ọbụna na-erite uru site n’ịnọ nso dị otú ahụ. Ndị ọzọ bụ anụ ọhịa, anụ ndị dị ka e si kee ha na-achọ ibi n’ebe ụmụ mmadụ na-anọghị. (Jenesis 1:25, 30; 2:19) Ma, Bible adịghị atụ aro na nke ọ bụla n’ime ụmụ anụ ndị ahụ riri anụ ndị ọzọ ma ọ bụ ụmụ mmadụ. Na mbụ, Chineke kenyere kpọmkwem ihe ọkụkụ dị ka nri maka ma ụmụ anụmanụ ma ụmụ mmadụ. (Jenesis 1:29, 30; 7:14-16) Nke ahụ agbanweghị ruo oge Iju Mmiri ahụ, dị ka Jenesis 9:2-5 na-egosi.
Mgbe ahụ, gịnị banyere ịdọ aka ná ntị Chineke dọrọ Ken, dị ka anyị na-agụ na Jenesis 4:7? N’ezie onyinyo nke anụ ndọgbu nke na-ede anụ ma dị njikere ịmakwasị ya gaara adịwo mfe nghọta n’ụbọchị Mosis, dị ka anyị ghọtakwara ya. Ya mere ọzọ, Mosis pụrụ ịdị na-eji okwu ndị e mere ka ha kwekọọ ná ndị na-agụ ya bụ́ ndị maara ụwa dị mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. Ọbụna ma ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe Ken hụrụ ihe e kere eke dị otú ahụ, ọ gaara enwewo ike ịghọta isi ihe nke ịdọ aka ná ntị nke mere ka ọchịchọ mmehie yie ajọ anụ nke agụụ ji.
Akụkụ ndị bụ isi ndị kwesịrị inwe mmetụta ka ukwuu n’ahụ anyị bụ ndị a: obi ọma Chineke n’ịdọ Ken aka ná ntị, uru nke iji obi umeala nakwere ndụmọdụ, ụzọ o si dị mfe ekworo imerụ mmadụ, na ụzọ anyị kwesịrị isi jiri ịdọ aka ná ntị ndị Chineke tinyere n’Akwụkwọ Nsọ maka anyị kpọrọ ihe.—Ọpụpụ 18:20; Eklisiastis 12:12; Ezikiel 3:17-21; 1 Ndị Kọrint 10:11; Ndị Hibru 12:11; Jemes 1:14, 15; Jud 7, 11.