Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 2/1 p. 20-23
  • Ịchụrụ Jehova Àjà Ndị Ọ Na-anakwere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchụrụ Jehova Àjà Ndị Ọ Na-anakwere
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịhọrọ Ụzọ Ndị Dị Iche
  • Ndụmọdụ Jehova na Mmeghachi Omume Ken
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Ụmụnne Ndị Zụlitere Àgwà Dịrịtara Iche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ezi Nwa na Ajọ Nwa
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 2/1 p. 20-23

Ịchụrụ Jehova Àjà Ndị Ọ Na-anakwere

N’OTU oge n’akụkọ ihe mere eme, a pụrụ ịhụ ihe omume dị ịrịba ama n’ụzọ mbata dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige Iden.a N’ebe ahụ, ndị cherub dị ike nọ na-eche nche, ọdịdị ha na-atụ ụjọ mere ka o doo anya na ọ dịghị onye ọ bụla kwesịrị ịnwa anwa gafee. Ihe ọzọ nọchiri ụzọ bụ mma agha na-acha ọkụ ọkụ nke na-agba okirikiri, bụ́ nke yiri ka ọ na-achakwasị ire ọkụ na-eyi egwu n’osisi ndị gbara ya gburugburu n’abalị. (Jenesis 3:24) N’agbanyeghị otú nke a pụrụ isi na-akpali mmasị, ndị ọ bụla na-ekiri ya nọ n’ebe dị nnọọ anya.

Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na Ken na Ebel gara ebe ahụ ọtụtụ mgbe. N’ịbụ ndị Adam na Iv mụrụ ná mpụga ogige ahụ, ha pụrụ nanị ịkọ nkọ banyere ihe ọ dị ka ya ibi n’ime Paradaịs, dị ka ndị mụrụ ha biburu, ya na ahịhịa ndụ ya na-enweta mmiri nke ọma na ụba mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ya. Ugbu a obi abụọ adịghị ya na ntakịrị ihe a pụrụ ịhụ banyere Iden ga-abụworị ebe a na-adịghịzi arụ ọrụ nke ahịhịa tojukwara.

O doro anya na Adam na Iv akọwaworo ụmụ ha ihe mere na a naghịzi elekọta ubi ahụ anya nakwa ihe mere e ji chụpụ ha na ya. (Jenesis 2:17; 3:6, 23) Lee ka Ken na Ebel na-aghaghị isiworị nwee mwute! Ha pụrụ ịhụ ogige ahụ, ma ha apụghị ịbanye na ya. Ha nọ nnọọ Paradaịs ahụ nso ma aka ha apụghị iru ya. Ezughị okè etetọwo ha, ọ dịghịkwa ihe Ken na Ebel pụrụ ime banyere ya.

N’ezie mmekọrịta nke nne na nna ha apụghị inyewo aka. Mgbe ọ na-ama Iv ikpe, Chineke kwuru, sị: “N’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) N’ikwekọ n’amụma ahụ, Adam aghaghị ijiworị aka ike na-achị nwunye ya ugbu a, ikekwe ghara ịdị na-emesozi ya dị ka onye ibe na onye inyeaka. O yikwara ka Iv ọ dabeere n’ebe nwoke a nọ n’ụzọ gabigara ókè. Otu akwụkwọ nkọwa ruru n’ókè nke ịkọwa “ọchịchọ” ya dị ka “agụụ yitetụwara ọrịa.”

Ruo n’ókè ọnọdụ alụmdi na nwunye a metụtaruru nkwanye ùgwù ụmụ okoro ahụ na-akwanyere ndị mụrụ ha, Bible ekwughị. Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na Adam na Iv setịpụụrụ ụmụ ha ajọ ihe nlereanya.

Ịhọrọ Ụzọ Ndị Dị Iche

Ka e mesịrị, Ebel ghọrọ onye ọzụzụ ewu na atụrụ, Ken malitekwara ịrụ ọrụ ubi. (Jenesis 4:2) Ka ọ na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ ya, obi abụọ adịghị ya na Ebel nwere oge dị ukwuu iche echiche banyere amụma ahụ pụrụ iche e buru tupu a chụpụ ndị mụrụ ya n’Iden: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Ebel aghaghị icheworị, ‘Olee ụzọ a ga-esi mezuo nkwa ahụ Chineke kwere maka mkpụrụ ga-egwepịa agwọ ahụ, oleekwa ụzọ a ga-esi chifịa mkpụrụ ahụ n’ikiri ụkwụ?’

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ma eleghị anya mgbe ha meworo nnọọ okenye, Ken na Ebel chụụrụ Jehova àjà n’otu n’otu. Ebe ọ bụ na Ebel bụ onye ọzụzụ ewu na atụrụ, ọ bụghị ihe ijuanya na o nyere “ụfọdụ n’ime ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya, na ụfọdụ n’ime iberibe ha mara abụba.” N’ụzọ dị iche, Ken nyere “ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala.” Jehova nakweere àjà Ebel, ma “Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya, O leghị ha anya ọma.” (Jenesis 4:3-5) N’ihi gịnị?

Ụfọdụ na-arụtụ aka n’eziokwu ahụ bụ́ na àjà Ebel sitere n’ime “ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya,” ebe nke Ken bụ nanị “ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala.” Ma ihe bụ nsogbu abụghị ọdịdị nke ihe e wetara n’ubi nke Ken chụrụ n’àjà, n’ihi na ihe ndekọ ahụ na-ekwu na Jehova lere “Ebel, leekwa onyinye ịnata ihu ọma ya” anya ọma, o leghịkwa “Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya” anya ọma. (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere Jehova lere anya n’ụzọ bụ́ isi n’ọnọdụ obi nke onye na-efe ya. N’ime otú ahụ, gịnị ka ọ hụrụ? Ndị Hibru 11:4 na-ekwu na ọ bụ “okwukwe” ka Ebel ji chụọ àjà ya. Ya mere, ihe àmà na-egosi na Ken egosighị okwukwe ahụ mere ka a nakwere àjà Ebel.

Banyere nke a, ọ bụ ihe kwesịrị ka a rịba ama na onyinye Ebel gụnyere mwụsị ọbara. Ọ pụrụ ikwubiworịị n’ụzọ ziri ezi na nkwa ahụ Chineke kwere maka mkpụrụ ahụ a ga-echifịa n’ikiri ụkwụ ga-agụnye iji ndụ chụọ àjà. Onyinye Ebel ga-abụworị arịrịọ maka mkpuchi mmehie, o gosipụtakwara okwukwe na Chineke ga-enye àjà mkpuchi mmehie n’oge ya.

N’ụzọ dị iche, o yiri ka Ken echerughị echiche ala banyere àjà ọ chụrụ. “Onyinye ya bụ nanị ngosipụta nke nkwenye o kwenyere na Chineke bụ onye na-enye ihe,” ka otu onye na-akọwa Bible biri ndụ na narị afọ nke 19 tụrụ n’aro. “O kpughere n’ụzọ doro anya na ọ mataghị na e nwere esemokwu ọ bụla dị n’etiti ya na Onye Okike ya, ọ mataghịkwa mkpa ọ dị ime nkwupụta mmehie ma ọ bụ idabere ná mkpuchi mmehie.”

Ọzọkwa, dị ka ọkpara, Ken pụrụ ijiworị mpako chee na ọ bụ ya bụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-ebibi Agwọ ahụ, bụ́ Setan. Iv pụkwara iburuworị oké ọchịchọ dị otú ahụ n’uche maka ọkpara ya. (Jenesis 4:1) Otú ọ dị, ọ bụrụ na nke a bụ ihe Ken na Iv tụrụ anya ya, ha hiere nnọọ ụzọ.

Bible ekwughị ụzọ Jehova si gosipụta na ọ nakweere àjà Ebel. Ụfọdụ ndị na-atụ aro na ọkụ sitere n’eluigwe repịara ya. Nke ọ bụla ọ bụ, ozugbo ọ matara na a jụrụ onyinye ya, “Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu, ihu ya wee gbarụọ.” (Jenesis 4:5) Ken chere ihu n’ọdachi.

Ndụmọdụ Jehova na Mmeghachi Omume Ken

Jehova sooro Ken tụgharịa uche. “N’ihi gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ?” ka ọ jụrụ. Nke a nyere Ken ohere zuru ezu inyocha mmetụta na ebumnobi ya. “Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma,” ka Jehova gara n’ihu ikwu, “ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe? ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị, ma o kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.”—Jenesis 4:6, 7. (Lee igbe dị na peji nke 23.)

Ken aṅaghị ntị. Kama nke ahụ, o duuru Ebel gaa n’ọhịa wee gbuo ya. Mgbe e mesịrị, mgbe Jehova jụrụ ebe Ebel nọ, Ken mere ka mmehie ya kakwuo njọ site n’ịgha ụgha. “Amaghị m,” ka ọ zaghachiri. “Ọ̀ bụ onye nche nwanne m ka m bụ?”—Jenesis 4:8, 9.

Ma tupu ma mgbe o gbusịrị Ebel, Ken jụrụ ‘ime nke ọma.’ Ọ họọrọ ikwe ka mmehie chịa ya, n’ihi nke a, a chụpụkwara Ken site n’ebe ezinụlọ mmadụ bi. E nyere “ihe ịrịba ama,” nke bụ ma eleghị anya nanị iwu siri ike, ka o wee ghara ịdị onye ga-abọ ọbọ ọnwụ Ebel site n’igbu Ken.—Jenesis 4:15.

Ken mesịrị wuo otu obodo ukwu, bụ́ nke ọ kpọkwasịrị aha nwa ya nwoke. Ọ bụghị ihe ijuanya na ụmụ ya ghọrọ ndị e ji ime ihe ike ha mara. N’ikpeazụ, eriri Ken gwụsịrị mgbe Iju Mmiri ụbọchị Noa kpochapụrụ ndị ajọ omume nile.—Jenesis 4:17-24; 7:21-24.

E chebeghị ihe ndekọ Bible banyere Ken na Ebel nanị maka ihe ọgụgụ ntụrụndụ. Kama nke ahụ, “e dere [ya] izi anyị ihe,” “ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya.” (Ndị Rom 15:4; 2 Timoti 3:16) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ a?

Ihe Mmụta Nye Anyị

Dị ka Ken na Ebel, a na-akpọ ndị Kraịst òkù taa ịchụrụ Chineke àjà—ọ bụghị àjà nsure ọkụ nkịtị, kama “àjà, bụ́ otuto, . . . nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha Ya.” (Ndị Hibru 13:15) A na-emezu nke a ugbu a n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ, ka Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ihe karịrị ala 230. (Matiu 24:14) Ị̀ na-ekere òkè n’ọrụ ahụ? Mgbe ahụ ị pụrụ ijide n’aka na “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.”—Ndị Hibru 6:10.

Dị ka ọ dị banyere onyinye Ken na Ebel, a dịghị ekpebi ihe àjà gị bụ site n’otú ọ dị n’anya—dị ka ihe atụ, nanị site n’awa ole i tinyere n’ozi. Jehova na-ele ihe karịrị nke ahụ. Jeremaịa 17:10 na-ekwu na ọ “na-enyocha obi,” ọbụnakwa “na-anwa akụrụ”—echiche, mmetụta, na ebumnobi kasị mie emi nke ụdị onye mmadụ bụ. Ya mere ihe bụ́ isi bụ ebumnobi, ọ bụghị ọnụ ọgụgụ. N’ezie, ma ò hiri nne ma ọ dị ntakịrị, àjà na-adị oké ọnụ ahịa nye Chineke mgbe e ji obi nke ịhụnanya kwaliri chụọ ya.—Jiri Mak 12:41-44 tụnyere 14:3-9.

N’otu oge ahụ, anyị kwesịrị ịmara na Jehova agaghị anakwere àjà ndị na-erughị eru dịkwa ka ọ na-anakweghịrị onyinye na-esighị n’obi Ken nyere. (Malakaị 1:8, 13) Jehova na-achọ ka i nye ya ihe nile i nwere ike inye, ka i were obi, mkpụrụ obi, uche, na ume gị dum na-ejere ya ozi. (Mak 12:30) Ị̀ na-eme nke ahụ? Mgbe ahụ i nwere ezi ihe mere ị ga-eji were afọ ojuju na-ele àjà gị anya. Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.”—Ndị Galetia 6:4.

Ken na Ebel nwere otu nzụlite. Ma oge na ọnọdụ nyere onye ọ bụla n’ime ha ohere ịzụlite àgwà pụrụ iche. Àgwà Ken ji nwayọọ nwayọọ ghọọ nke ekworo, nkewa, na ọnụma mejupụtara.

N’ụzọ dị iche, Chineke na-echeta Ebel dị ka nwoke ezi omume. (Matiu 23:35) Mkpebisi ike ya ime ihe na-atọ Chineke ụtọ n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe ya, mere ka Ebel dị iche n’ụzọ na-akpali akpali n’ebe ndị na-enweghị ekele nọ n’ezinụlọ ya—Adam, Iv, na Ken, nọ. Bible na-agwa anyị na ọ bụ ezie na Ebel nwụrụ anwụ, ọ “na-ekwu okwu.” Ozi kwesịrị ntụkwasi obi o jeere Chineke bụ akụkụ nke ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme na-adịgide adịgide dị na Bible. Ka anyị gbasoo ihe nlereanya Ebel site n’ịnọgide na-achụrụ Chineke àjà ọ na-anakwere.—Ndị Hibru 11:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a  Ụfọdụ ndị na-eche na ogige Iden dịbu n’ógbè ugwu dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Turkey nke oge a.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Ihe Nlereanya Nye Ndị Kraịst Na-enye Ndụmọdụ

“N’IHI gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ?” Site n’ajụjụ a, Jehova ji obiọma soro Ken tụgharịa uche. Ọ manyeghị Ken ịgbanwe, n’ihi na Ken nweere onwe ya ime nhọrọ. (Tụlee Deuterọnọmi 30:19.) Ka o sina dị, Jehova alaghị azụ ịkọwapụta ihe ndị ga-esi n’ụzọ ọjọọ Ken pụta. Ọ dọrọ Ken aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị.”—Jenesis 4:6, 7.

Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị a siri ike, Jehova emesoghị Ken dị ka ‘onye na-enweghị olileanya.’ Kama nke ahụ, ọ gwara Ken banyere ngọzi ndị ga-adịrị ya ma ọ bụrụ na ọ gbanwee ụzọ ya, o gosipụtakwara obi ike na Ken pụrụ imeri nsogbu a ma ọ chọọ ime otú ahụ. “Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma,” ka Jehova kwuru, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe?” O nyekwara Ken ndụmọdụ banyere ọnụma ya na-akpata igbu ọchụ, sị: “O kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.”

Taa, ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst kwesịrị iṅomi ihe nlereanya Jehova. Dị ka e kwuru na 2 Timoti 4:2, ha aghaghị ‘ịtụ mmadụ mmehie ha n’anya’ ma “baa mba” mgbe ụfọdụ, na-akọwapụta hoo haa ihe ndị ga-esi n’ụzọ ọjọọ nke onye mmehie pụta. N’otu mgbe ahụ, ndị okenye kwesịrị ‘ịrịọ arịrịọ.’ Okwu Grik bụ́ pa·ra·ka·leʹo pụtara “ịgba ume.” “Ndụmọdụ ahụ adịghị afụ ụfụ n’ahụ, ọ bụghị nke ịba mba, ma ọ bụ nke nkatọ,” ka Theological Dictionary of the New Testament na-ekwu. “Eziokwu ahụ bụ́ na nkasi obi pụrụ ịbụ ihe ọzọ ọ pụtara na-atụ aka n’otu ihe ahụ.”

N’ụzọ dị ịrịba ama, okwu Grik yiri nke ahụ bụ́ pa·raʹkle·tos, pụrụ izo aka n’ebe onye inyeaka, ma ọ bụ onye na-ekpechite ọnụ mmadụ n’okwu ikpe nọ. Ya mere, ọbụna mgbe ndị okenye na-enye ịdọ aka ná ntị a kapịrị ọnụ ha kwesịrị icheta na ha bụ ndị inyeaka—ọ bụghị ndị iro—nke onye ahụ ndụmọdụ dị mkpa. Dị ka Jehova, ndị okenye kwesịrị inwe olileanya, na-egosi obi ike na onye ahụ a na-enye ndụmọdụ pụrụ imeri nsogbu ahụ.—Tụlee Ndị Galetia 6:1.

Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ọ dịịrị onye ahụ itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ. (Ndị Galetia 6:5; Ndị Filipaị 2:12) Ndị na-enye ndụmọdụ pụrụ ịchọpụta na ụfọdụ ndị adịghị aṅa ntị ná ndụmọdụ ha, dị nnọọ ka Ken họọrọ ileghara ndụmọdụ sitere n’aka Onye Okike n’onwe ya anya. Ma, mgbe ndị okenye na-eṅomi Jehova, bụ́ Onye Nlereanya zuru okè nye ndị Kraịst na-enye ndụmọdụ, ha pụrụ ijide n’aka na ha emewo ihe ha kwesịrị ime.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya