Chọọchị Kewara Ekewa—Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ọ Dịruru ná Njọ?
“DỊ KA nnukwute ezinụlọ a kpọtere n’ike, ndị bi n’ụlọ ochie na-achọ ịdakasị nke mgbidi ihu ya dakpọrọ na mberede, o yiri ka a na-esegharị okwu n’ọnụ ụlọ nke ọ bụla nnọọ—ebe ụmụ Jisọs na-akụjasị ntakịrị ịgba na-etigharị mkpu megide ndị Katọlik bụ́ ndị England na-edina ụdị onwe ha yi uwe kotu mara mma nke e ji akwa silk ojii dụọ.”—The Sunday Times, London, April 11, 1993.
Ezinụlọ a bụ Church of England. Esemokwu ahụ bụ banyere ịnabata ụmụ nwanyị n’ọkwá ndị ụkọchukwu. Nkọwa ruru ala nke adịghị n’otu miri emi metụtara nnọọ Krisendọm dum. Ka ndị bishọp nke Chọọchị Orthodox na popu na-ekwugide mkpebi nke ikwere ka ụmụ nwanyị bụrụ ndị ụkọchukwu, ozuzu nke ihe sitere na ya, dị ka otu akụkọ kwubiri, bụ na “nrọ nke ijikọghachi ya na akụkụ ndị ọzọ nke Krisendọm dịkwu anya karịa mgbe ọ bụla ọzọ.”
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Chọọchị ahụ Kewara Ekewa?
Dị ka anyị na-agụ na Matiu 7:21, Jisọs Kraịst kwuru na ọtụtụ ndị ga-ekwupụta okwukwe na ya dị ka Onyenwenụ ma ka ghara ‘ime ihe Nna ya na-achọ.’ Magazin bụ́ Maclean’s na-ekwu, sị: “A pụrụ ịgọpụrụ ndị na-agụ Matiu bụ́ ndị na-achọ nzọpụta maka inwe mgbagwoju anya banyere kpọmkwem ihe bụ uche Chineke, mgbe ndị Kraịst, na chọọchị ha dị iche iche, na-adịrịta iche nke ukwuu n’okwu ahụ.” Site ná njụta echiche ọha e mere n’etiti ndị Canada, o kwubiri na e nwere “nnukwute ndịrịta iche ná nkwenkwe na ihe omume nile nke ndị Kraịst bụ́ ndị Canada—ndịrịta iche ka ukwuu n’etiti ndị nke otu òtù chọọchị ọ bụla, n’ezie, karịa n’etiti òtù chọọchị ndị ahụ n’onwe ha.”
Dị ka nnyocha ya na-egosi, 91 pasent nke ndị Katọlik kwenyere n’iji usoro mmadụ mepụtara nke ịchịkwa ọmụmụ eme ihe ọ bụ ezie na chọọchị ha na-ekwugide ya; 78 pasent chere na e kwesịrị ikwere ka ụmụ nwanyị ghọọ ndị ụkọchukwu; 41 pasent na-anakwere nsikwopụ afọ ime “n’ọnọdụ ụfọdụ.” Enweghị nkwekọrịta n’ime òtù chọọchị ndị ahụ dị iche iche ‘n’ọtụtụ okwu nkà mmụta okpukpe,’ ka Maclean’s na-asị, “na-emesiwanye nkewa ndị na-adọrịsị chọọchị ndị bụ isi ike.”
Ụkpụrụ Abụọ Dịrịta Iche
Ụkpụrụ abụọ dịrịta iche nakwa ụkpụrụ ndị na-emegiderịta onwe ha dị n’ihe banyere omume. Ụfọdụ na-asị na ha na-ejigide ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, ma ndị ọzọ na-eleghara ha anya. Dị ka ihe atụ, ememe “alụmdi na nwunye” e meere ndị inyom abụọ na-edina onwe ha na Metropolitan Church nke Toronto, ò kwekọrọ n’uche Chineke? Ihe àmà na-egosi na ndị so mee ya chere otú ahụ. “Anyị chọrọ ime ememe ịhụnanya anyị n’ihu ọha na n’ihu Chineke,” ka ha kwuru.
Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ jụrụ otú o si bụrụ na “otu achịbishọp nke Katọlik onye e mewooro mkpesa ugboro ugboro, zigara ndị ụkọchukwu na-edina ụmụaka gakwuru ìgwè dị iche nke ụmụ okoro ndị ọzọ na-eje ozi ọlta.” Ụkọchukwu bụ́ Andrew Greeley na-atụ aro na ọ pụrụ ịbụ na site na 2,000 ruo 4,000 ndị ụkọchukwu emetọwo 100,000 ndị na-erubeghị inwe mmekọahụ, ọtụtụ mgbe na-enweghị ihe e mere banyere ya.
Chọọchị na-adịghị n’otu na-emepụta ndị mmadụ na-adịghị n’otu. Na Balkan, ndị Serbia na ndị Croatia bụ́ “ndị Kraịst” na-eche na Kraịst nọnyeere ha n’agha ha “ziri ezi.” Ọtụtụ na-eyi obe n’ọgbọ agha; otu onye, dị ka a kọrọ n’akụkọ, “na-akpụkarị obe nke ya n’ọnụ mgbe agha kpooro ọkụ karịsịa.”
“Ka Nkewa Gharakwa Ịdị n’Etiti Unu”
N’eziokwu, Bible hapụụrụ akọ na uche okwu ụfọdụ, ma nke a ekwesịghị ime ka e nwee ohere maka nkewa dị otú a. Pọl onyeozi na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ka unu nile na-ekwu [na-emekwa] otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu.”—1 Ndị Kọrint 1:10; Ndị Efesọs 4:15, 16.
Iji ezi obi lee “Iso Ụzọ Kraịst” ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga anya mgbe Pọl onyeozi desịrị okwu ndị ahụ na-ewelite ajụjụ ụfọdụ siri oké ike. Gịnị mere “ndị Kraịst” ji kewasịa ekewa otú a? Chọọchị kewara ekewa otú ahụ ọ̀ pụrụ ịlanarị? Ọ̀ dị mgbe ọ bụla a ga-enwe Krisendọm dị n’otu? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ngagharị iwe nke ndị ụkọchukwu megide nsikwopụ afọ ime
[Ebe e si nweta foto]
Ihu peji na elu: Eleftherios/Sipa Press