Mgbakọ “Izi Ihe Chineke” nke Etiopia—Oge Ọṅụ Pụrụ Iche
ỌBỤGHỊ mgbakọ distrikti mbụ Etiopia mere kemgbe e wepụsịrị mmachibido iwu ahụ, ma ọ pụrụ nnọọ iche. Kemgbe a nabatara ha n’ụzọ iwu kwadoro na November 11, 1991, Ndịàmà Jehova zukọrọ nke ugbo atọ ya n’ámá egwuregwu kasị ukwuu nke mba ahụ, bụ́ City Stadium, kpọmkwem n’etiti Addis Ababa. Ebe ọ bụ na ọgbọ ebe a enwebughị ohere na Sunday, a pụghịkwa ịchọta ebe ọzọ buru ibu otú a chọrọ, a chịkọtara usoro ihe omume ya n’ime ụbọchị atọ, site na Thursday ruo Saturday, January 13-15, 1994.
Ọ bụghị nanị na ụbọchị atọ ndị a nwetara ihu igwe magburu onwe ya n’okpuru eluigwe na-acha anụnụ anụnụ kamakwa n’inye ìhè ime mmụọ na-enwe mmetụta zuru ezu nke “Izi Ihe Chineke.” N’ọnọdụ na-adọrọ adọrọ nke nhazi okooko osisi gburugburu ebe ikpo okwu, isiokwu nke mgbakọ ahụ guzopụrụ iche n’okwu ndị e dere n’asụsụ Amharic.
Ma gịnị mere ka mgbakọ ahụ pụọ iche? Tinyere usoro ihe omume rijuru afọ, echiche na mmetụta onye ọ bụla lekwasịrị anya n’òtù ụmụnna mba nile na-ahụ n’anya nke anyị nwere na ngosipụta ndị doro anya nke ngọzi Chineke n’ebe ndị ya nọ n’ụdị nke uto Alaeze. E nwere ihe dị ka 270 ndị ala ọzọ bịaranụ site na 16 ala, tinyere Djibouti na Yemen. Ihe karịrị ọkara bịara site n’ebe na-atụ oyi na Europe na Ebe Ugwu America. Ndị bịaranụ gụnyere mmadụ abụọ so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ́ Lloyd Barry na Daniel Sydlik.
Ọdịnala ndị Etiopia nke ile ọbịa nke ọma tinyere ịhụnanya si n’ala ala obi ha nwere maka ụmụnna ha ndị bịara ileta ha kpatara njupụta obi ụtọ nke meriri ihe mgbochi nke asụsụ. Ekele abụghị nanị ikwe n’aka kama mmakụ na nsusu ọnụ, ruo ugboro isii! Ọtụtụ ndị bịara abịa agụwo banyere ọrụ Alaeze ahụ n’Etiopia ma mara na ụmụnna ha ndị Etiopia bụcha ndị a nwapụtaworo ikwesị ntụkwasị obi ha, bụ́ ndị tachiworo obi ná mkpọrọ na ụdị mkpagbu ndị ọzọ.a Ma o juru ndị ahụ bịara abịa anya ịhụ ọtụtụ ndị na-eto eto na-egosi ihu obi ụtọ na nkwanye ùgwù nke na-adalata n’ihe ka ọtụtụ ala taa. Ọtụtụ ụmụnna nwanyị ndị Etiopia yi uwe ọdịnala ha na-acha ụcha nke e ji nkà were owu kpaa, bụ́ nke mekwuru ka e nwee mmụọ nke ememe n’ezie.
Baptism e mere na Friday bụ nnọọ ihe na-akpali akpali. Ogologo ahịrị nke 530 ndị rarawooro onwe ha nye ọhụrụ, site n’afọ ndụ 10 ruo 80, gbatịpụrụ gafee ọkara nke ebe a na-agba bọlụ n’ámá egwuregwu ahụ. Nke a buru oké ibu karịa ihe onye ọ bụla tụrụ anya ya—ihe karịrị 1 maka Ndịàmà 7 ọ bụla ná mba ahụ. Lee aha ihe àmà nke ngọzi Jehova nye ndị ya n’ebe a! E nwere ọtụtụ anya mmiri ọṅụ n’ịhụ nke a, bụ́ nke ịbụ abụ ụtọ nke ihe karịrị 40 ndị si Itali bịa mewanyere ka ọ dị ụtọ. Ọtụtụ chere banyere okwu amụma nke Aịsaịa 60:5: “Mgbe ahụ ị ga-ahụ wee nwuo enwu, obi gị ga-atụkwa oké egwu, saa mbara; n’ihi na a ga-echigharịkwute gị ihe bara ụba nke oké osimiri, akụ̀ nke mba dị iche iche ga-abịakute gị.”
Ihe Ndị Pụrụ Iche Na-akpata Ọṅụ
E mere ka ngọzi Jehova pụtakwuo ìhè na Friday, mgbe e ji ịgba ajụjụ ọnụ chetaghachi mmalite dị nta nke ọrụ Alaeze ahụ n’Etiopia. E ji otu ìgwè nke ndị ozi ala ọzọ mbụ bụ́ ndị jeworo ozi n’ebe ahụ n’afọ ndị 1950 na 1970 mee ihe omume ahụ. Ihe karịrị 8,000 nụrụ ka Ray Casson, John Kamphuis, na Haywood Ward na-akọwa ọrụ ha nke nkụzi Bible, malite na September 14, 1950, mgbe ha bịarutere Addis Ababa. Ọchịchị onyeeze nke ụbọchị ndị ahụ chọrọ ka ha na-arụsi ọrụ ike ná nkụzi gụnyere ihe dị iche iche. Ya mere ha guzobere ụlọ akwụkwọ maka agụmakwụkwọ ndị okenye n’etiti obodo, na-enwe ihe ọmụmụ ndị dị iche iche. Ma n’oge ha na-anọghị n’ọrụ, ndị ozi ala ọzọ ndị a na-achọ ịmụba agụmakwụkwọ lekwasịrị anya n’izi ihe Chineke. Ha aghaghị ịgbaworị mgba iji mụta Amharic, asụsụ na-agbagwoju anya nke nwere abịdịị dị 250 mkpụrụ akwụkwọ. Ihe dị ka ọkara afọ gafere tupu ha eduzilie ọmụmụ Bible ebe obibi ha mbụ. Ihe dị ka 43 afọ mgbe nke a gasịrị, ha zutere ndị na-aga n’okporo ámá bụ́ ndị chetara ndị a bụbu ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, ná mgbakọ ahụ, ha ṅụrịrị ọṅụ ịhụkwa ọtụtụ ndị ha na-eduziburu ọmụmụ Bible ndị ghọworo a kwaa a kwụrụ n’okwukwe, bụkwa ndị gosiri ha ụmụ na ụmụ ụmụ ime mmụọ nke onwe ha.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:19, 20.
Ìgwè mmadụ ndị tọrọ ntị ha n’ala ma nwee ọṅụ kụrụ aka ruo ogologo oge ọ bụghị nanị n’ihi ajụjụ ọnụ ahụ a gbara ndị bụbu ndị ozi ala ọzọ kamakwa akụkọ na ekele ndị sitere Britain, Canada, Germany, Israel, Itali, Kenya, Netherlands, na United States—nke ndị nọchitere anya mba ndị ọzọ wetara. Nke a gosikwara ịhụnanya òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ndị Chineke. Okwu ndị bụ isi nke ụmụnna e tere mmanụ si n’Òtù Na-achị Isi kwuru, nakwa ekpere ha sitere n’ala ala obi, metụkwara ndị na-ege ntị n’ahụ n’ụzọ dị omimi. Ndị na-eto eto nọ n’ámá egwuregwu ahụ pụrụ ịhụ ndị ha yiri n’etiti ndị so mee ihe nkiri ahụ banyere ndị na-eto eto ndị na-echeta Onye Kere ha, ebe e gosiri ihe nkiri ahụ n’ụzọ na-ekpo ọkụ na nke kwekọrọ n’ihe a na-ahụkarị. Tinyere akwụkwọ ọhụrụ ndị e wepụtara na Bekee, akwụkwọ ọhụrụ atọ ndị e wepụtara n’asụsụ Amharic kpaliri ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu.b
N’oge ncheretụ nwa oge na oge ndị ọzọ, e nwere ohere ọma nke ịmara ọtụtụ ndị a hụrụ n’anya. Dị ka ihe atụ, kpọmkwem n’oche ihu, ka onye nkwusa kasị mee agadi n’Etiopia, bụ́ Tulu Mekuria nọ ọdụ, jiri mkpara e ji aka pịa. N’afọ gara aga, n’afọ ndụ agadi nke 113, e mere ya baptism dị ka otu onye n’ime Ndịàmà Jehova. Ná mgbakọ a, o nwere ọṅụ nke ịhụ nwunye ya gbaworo 80 afọ ka ọ gbasoro ihe nlereanya ya, na-aghọkwa nwanna nwanyị ime mmụọ ya. Ọnụnọ ya n’oge usoro ihe omume ahụ nile bụ ihe mkpali nye ndị na-eto eto. Otu n’ime ndị ahụ bụ Yohanes Gorems, onye n’afọ 16 ma bụrụ nwa akwụkwọ ka nọ n’ụlọ akwụkwọ ejeworị ozi afọ anọ dị ka onye nkwusa ọsụ ụzọ oge nile. Ya na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ toruworo ịga akwụkwọ bụ́ ndị ọbụna ọ tọrọ amụtawo ịzụchapụta oge, dị ka ịgba àmà n’isi ụtụtụ mgbe ha na-aga akwụkwọ ma ọ bụ site n’iji oge ntụrụndụ na mgbe a gbasara akwụkwọ eme ihe.
Lee Ihe Nlereanya nke Ikwesị Ntụkwasị Obi!
Ọtụtụ narị ndị na-ege ntị enwewo ahụmahụ nke ịga mkpọrọ na mmekpọ ọnụ n’okpuru gọọmenti ndị nọbu n’ọchịchị. Mandefro Yifru chetara afọ ise dị otú ahụ n’ụlọ mkpọrọ, ma ugbu a o nwere ọṅụ nke ịdị na-eje ozi n’Addis Ababa n’ọfịs ahụ e guzobere ọhụrụ, bụ́ nke na-ahụ maka nsụgharị, obibi akwụkwọ, na mbupụ akwụkwọ. Nwa okorobịa ọzọ so ya na-eje ozi, bụ́ Zecarias Eshetu, esighị n’ikwesị ntụkwasị obi ya dapụ afọ asatọ gara aga mgbe e gburu nna ya maka ịnọgide na-enwe nnọpụiche ndị Kraịst n’ime afọ atọ nke ịnọ ná mkpọrọ. Zecarias, otu n’ime ụmụ ise, dị afọ iri mgbe nna ya gara ngá. Meswat Girma na nwanne ya nwanyị Yoalan, ndị na-akwado iru iri afọ abụọ ha ugbu a ma ka nọrọkwa n’ụlọ akwụkwọ, na-echeta nna ha nanị site na foto, ebe ọ bụ na ha dị nta nke ukwuu mgbe e gburu nna ha na mberede n’ihi nnọpụiche ya. Iguzosi ike ya n’ezi ihe kpaliri ha, ha abụọ na-ejekwa ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, dị ka nna ha na-eme n’oge ọnwụ ya.
Onye ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ Tamirat Yadette, na-eje ozi ugbu a dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ógbè mara mma nke Rift Valley. N’ihi nnọpụiche ya nke ndị Kraịst, ọ nọrọ afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ asaa dị iche iche, mgbe ụfọdụ bụrụ onye e ji eriri ígwè kee ma tirisie ya ahụ. Ma, n’ime mkpọrọ o nyeere ihe karịrị mmadụ iri na abụọ aka iwere nguzo ha maka Alaeze Chineke.
Tesfu Temelso, onye na-eje ozi ugbu a dị ka onye nlekọta sekit, bụ onye a tụrụ mkpọrọ ugboro 17 n’afọ ndị ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. O nwere àpà dị iche iche site n’ihe ndị e tiri ya, ma o nwere obi aṅụrị ịhụ ọgbakọ dị iche iche n’ebe ndị ọ rụburu ọrụ. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị si Ọgbakọ Akaki tara ahụhụ ịga mkpọrọ na mmekpọ ọnụ, ma ọgbakọ ahụ etowo ruo ihe karịrị otu narị ndị nkwusa. Ha ewuwo Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova mbụ n’Etiopia. Site na Dese, obodo na-adọrọ mmasị dị ihe dị ka 300 kilomita n’ebe ugwu nke isi ala, ka ìgwè mmadụ ise cheworo ọnwụ ihu ma hụ ka otu nwanna n’ógbè ha nwụrụ site n’ihe ndị e tiri ya si bịa. Otu onye okenye n’etiti ha, Maseresha Kasa, kọwara na ya tachiri obi n’oge afọ isii nke ịga mkpọrọ, ọ bụghị n’ihi na ya pụrụ iche n’ụzọ ọ bụla, kama nanị n’ihi na ya mụtara ịdabere n’ebe Jehova nọ.—Ndị Rom 8:35-39; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 8:1.
Ọbụnadị ná nso nso a, ndị ọzọ egosiwo ikwesị ntụkwasị obi ha n’okpuru ule. Ìgwè dị ukwuu bịara mgbakọ ahụ site ná mba dị nso ebe, n’ihi nnọpụiche ha, a jụwo inye Ndịàmà nchebe ndị uwe ojii, akwụkwọ ndị e ji aga njem, satifiketi alụmdi na nwunye, ọgwụgwọ ụlọ ọgwụ, na ọrụ. Mgbe a na-alụ agha ná nso Mesewa, ọdụ ụgbọ mmiri nke Eritrea n’Osimiri Uhie, ọgbakọ ahụ nile, 39 n’ozuzu ha, gụnyere ụmụaka, biri ihe dị ka ọnwa anọ n’okpuru àkwà mmiri dị ala n’ime ọzara iji gbanarị mgbọ na bọmbụ ndị gọọmenti nọbu n’ọchịchị na-awụ ebe obibi ha. N’ọnọdụ a nke okpomọkụ na enweghị ihe e ji ebi ndụ, ntụle ha kwa ụbọchị nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nzukọ ndị ọzọ nyere ha ume dị ukwuu na ịnọ Jehova nakwa ibe ha nso. Ụmụnna nwanyị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ na-eje ozi ná nso isi iyi nke Blue Nile diri iyi egwu nke ndị na-eme ihe ike na mmekpa ahụ ndị Chọọchị Orthodox kpaliri, ma ha abụọ tachiri obi ma hụ ka ọtụtụ ndị ha na-amụrụ Bible na-egosipụta nrara ha raara onwe ha nye site na baptism ná mgbakọ a.
Otu nwanna kọrọ ule ya nke ịkpapụ iche n’ọrụ n’ime ime ógbè Ogaden, ná nso Somalia. Ọ nọgidere ndụ n’ụzọ ime mmụọ site n’ime nkwusa nakwa isoro ndị nwere mmasị enwe nzukọ, tinyere ndị dọkịta, bụ́ ndị ritere uru site n’izi ihe Chineke ma na-ezi ndị ọzọ ihe ugbu a. Ihe nlereanya ọma ọzọ nke ikwesị ntụkwasị obi bụ otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche n’Addis Ababa bụ́ onye, na 1992, ndị na-eme ihe ike nke ndị ụkọchukwu Orthodox kpaliri kụjasịrị ahụ n’ụzọ obi ịta mmiri ma hapụ ya na-eche na ọ nwụọla. N’ịbụ ihe obi ụtọ, ọ gbakere ma nọgide na-eje ozi n’otu ókèala ahụkwa. Ọnụ ọchị na-awa ya n’ihu ekpugheghị obi ilu ọ bụla. Nye ya, dịkwa ka ọ dị ndị ọzọ a nwapụtaworo na ndị bụ ndị ọhụrụ karị, Mgbakọ “Izi Ihe Chineke” nke a bụ ememe nke ọṅụ.
Nhazi ndị e mere ná mgbakọ a gara nnọọ were were, na-eme ka ndị ọbịa chee na ndị nyere onwe ha n’afọ ofufo so hazie ya enweworị ahụmahụ ọtụtụ afọ. N’ezie, ha enwewo ọganihu dị ngwa n’afọ abụọ ndị gara aga. Mgbakọ ụbọchị atọ ahụ gwụsịrị nnọọ oké ọsọ ọsọ. Ọnụ ọgụgụ kasị elu na Saturday bụ 9,556. Telivishọn, redio, na akwụkwọ akụkọ nke ala ahụ kọrọ ihe dị mma banyere ya. Mmadụ nile pụrụ ịhụ na Jehova na-eme ndị ya ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ. Ndị bịaranụ gụnyere ọtụtụ puku ndị nwere mmasị bụ́ ndị maliteworo irite uru site ‘n’Izi Ihe Chineke.’ E meghewo ubi sara mbara nye Ndịàmà Jehova ná mba nke a nwere ihe dị ka 50 nde ndị mmadụ, mgbakọ ahụ wusikwara mmadụ nile ike ná mkpebi ha iji oge fọdụrụnụ n’usoro ihe nke a nyere ndị nwere obi eziokwu aka iritekwa uru site n’izi ihe Chineke.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ na Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Addis Ababa, January 13-15, 1994
[Foto ndị dị na peeji nke 24]
Otu ìgwè nke ndị ọsụ ụzọ na Addis Ababa (aka nri); ndị na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị a tụchara mkpọrọ (okpuru); Onyeàmà gbara 113 afọ na nwunye ya