Ị̀ Na-echeta?
Ì jiwo nlezianya chebara mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche echiche? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-ahụta ya ịbụ ihe mmasị ichetaghachi ihe ndị na-esonụ:
▫ Olee ọdịiche bụ́ isi dị n’etiti mmadụ na anụmanụ?
Ọdịiche bụ́ isi dabeere n’ọdịdị, ikike, na ịrụ ọrụ nke ụbụrụ. N’anụmanụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrụ nile ụbụrụ na-arụ ka a haziworo n’ihe a nọworo na-akpọ amamihe sitere n’okike. Nke a abụghị otú ọ dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Chineke nyere ụmụ mmadụ ikike nke nnwere onwe ime nhọrọ. (Ilu 30:24-28)—4/15, peji nke 5.
▫ Òkè dị aṅaa ka ịbụ abụ keere n’ofufe ụlọ nsọ ahụ nke ndị Israel?
Egwú, karịsịa ndị ọbụ abụ, nwere ọnọdụ dị mkpa n’ofufe, ọ bụghị nanị iji kụbanye akụkụ ndị dị ike nke Iwu ahụ, kama iji mee ka e nwee mmụọ ziri ezi maka ofufe. O nyeere ndị Israel aka ife Jehova n’ụzọ na-ekpo ọkụ. (1 Ihe Emere 23:4, 5; 25:7)—5/1, peji nke 10, 11.
▫ Ụdị nlekọta dị aṅaa ka ụmụntakịrị chọrọ site na nwa ọhụrụ?
Ndị nne na nna aghaghị inye nwa a mụrụ ọhụrụ nlekọta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile. Pọl dere, sị: “I sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta.” (2 Timoti 3:15) Ya mere nlekọta nne nke Timoti natara, ọbụna site na nwa ọhụrụ, bụkwa ụdị nke ime mmụọ.—5/15, peji nke 11.
▫ Olee ihe àmà anọ na-anwapụta na Bible nwere ozi Chineke maka ihe nile a kpọrọ mmadụ?
(1) Ịdị ebe aka ga-eru. Aka ihe dị ka 98 pasent nke ndị bi n’ụwa ga-eru ebe Bible dị. (2) Ịkọ ihe mere eme. Bible nwere akụkọ ihe mere eme ndị bụ́ eziokwu, ọ bụghị akụkọ ọdịbendị ndị a na-apụghị ịnwapụta anwapụta. (3) Ịdị irè. Iwu na ụkpụrụ ya nile na-atụpụta ụzọ ndụ nke na-ewetara ndị na-agbasochi ha anya uru. (4) Amụma. Ọ bụ akwụkwọ nke na-akọ n’ụzọ sara mbara ihe ga-eme n’ọdịnihu.—6/1, peji nke 8, 9.
▫ Olee ibu ọrụ na-eso ịmata ezi okpukpe ahụ?
Ozugbo anyị matara ezi okpukpe ahụ, anyị aghaghị iwulite ndụ anyị gburugburu ya. Ọ bụ ụzọ nke ndụ. (Abụ Ọma 119:105; Aịsaịa 2:3)—6/1, peji nke 13.
▫ N’ihi gịnị ka ọmụmụ ihe onwe onye nke Bible ji dị oké mkpa?
Ọ dị ndị ohu nile na-arụsi ọrụ ike nke Chineke mkpa ime ka ọṅụ na ume ha na-adị ọhụrụ kwa ụbọchị site n’ịchọpụta akụkụ ndị dị ọhụrụ ma ọ bụ ndị miri emi karị nke eziokwu nke Okwu Chineke. N’ụzọ dị otú a ha na-anọgide ná mkpali onwe ha n’ime mmụọ.—6/15, peji nke 8.
▫ Gịnị ka okwu ahụ bụ “mmehie” pụtara dị ka e ji ya mee ihe na Bible?
N’ụdị ha nke ngwaa, okwu Hibru na Grik e jikarịrị eme ihe na Bible iji gosi “mmehie” pụtara “erughị,” n’echiche nke erughị ma ọ bụ enwetaghị ihe mgbaru ọsọ, akara, ma ọ bụ ihe a tụdoro. Mmadụ abụọ mbụ ahụ erughị ọ̀tụ̀tụ̀ nke ebube Chineke, ghara iru nzube e ji kee ha n’onyinyo Chineke. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha mehiere. (Jenesis 2:17; 3:6)—6/15, peji nke 12.
▫ Gịnị mere amamihe adịghị ya ma ọlị ịgụ akwụkwọ ndị si n’ezi ofufe dapụ?
Ụfọdụ akwụkwọ ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ewepụta okwu ụgha site n’iji “okwu ụtọ” na “okwu nrafu dị iche iche” na-eme ihe. (Ndị Rom 16:17, 18; 2 Pita 2:3) Ihe odide nile nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akatọ nanị akatọ ma na-eweda ala! Ọ dịghị ihe na-ewuli elu dị ya.—7/1, peji nke 12.
▫ Gris ọ̀ bụ mmalite nke ọchịchị onye kwuo uche ya?
Na Gris oge ochie, e nwere ọchịchị onye kwuo uche ya n’ime obodo ole na ole dị n’ime obodo ukwu, ọbụna n’ime ndị a nanị ndị ikom mere ntụli aka elu. Nke a pụtara na a gụpụrụ ụzọ anọ n’ime ụzọ ise nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ebe ahụ. Ọ bụghị ịchịisi ma ọ bụ ọchịchị onye kwuo uche ya ma ọli!—7/1, peji nke 16.
▫ Olee ihe na-eme ka alụmdi na nwunye ndị Kraịst na-aga nke ọma?
Mgbe di na nwunye na-akwanyere echiche Chineke maka alụmdi na nwunye ùgwù ma na-agbalị iji ụkpụrụ ndị dị n’Okwu ya na-ebi ndụ. (Ndị Efesọs 5:21-33)—7/15, peji nke 10.
▫ Olee ụzọ ọmụmụ ihe ezinụlọ gị pụrụ isi na-atọ ụtọ?
Gbalịa ịhụ na ụmụaka ahụ dum tinyere ọnụ. Nwee àgwà ziri ezi ma na-ewuli elu, jiri ikpo ọkụ na-aja ụmụ gị mma n’ihi ha ikere òkè. A gụzula nanị ihe a na-amụ kama gbalịa iru n’obi ụmụ gị.—7/15, peji nke 18.
▫ Gịnị ka okwu ahụ bụ: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị” pụtara? (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3)
Rịba ama na Bible adịghị ekwu na mba nile ga-enweta “udo na ntụkwasị obi.” Ma na ọ dịghị ihe ọzọ ha ga na-ekwu banyere ya n’ụzọ pụrụ iche, na-ekwupụta atụmanya ihe ọma na mmesi obi ike nke a na-enwetụbeghị ihe yiri ya. Ohere ndị e nwere maka inweta udo na ntụkwasị obi ga-eyi ihe dị nso karịa mgbe ọ bụla bu ụzọ.—8/1, peji nke 6.
▫ Kpọọ aha ụzọ atọ Jehova si egosipụta ezi uche.
Jehova egosipụtawo ịdị njikere ya ịgbaghara. (Abụ Ọma 86:5) Ọ nọwo na-adị njikere ịgbanwe ụzọ a chọrọ iji mee ihe dị ka ọnọdụ ndị ọhụrụ na-ebilite si chọọ. (Lee Jona, isi nke 3.) Ọzọkwa, Jehova egosipụtawo onwe ya inwe ezi uche n’iji ịbụ isi eme ihe. (1 Ndị Eze 22:19-22)—8/1, peji nke 12-14.