Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 9/15 p. 27-30
  • Ị̀ Na-amụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Anyị Kasị Ukwuu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-amụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Anyị Kasị Ukwuu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ìzùzù Sitere n’Aka Jehova
  • Ojiji Jehova Na-eji Ilu Dị Iche Iche Eme Ihe
  • Ajụjụ Ndị Na-enyocha Obi
  • Iwulite Obi Ike
  • Ihe Mmụta A Na-ahụ Anya
  • Iji Ndidi Na-ezi Ihe
  • Nọgide Na-amụta Ihe Site n’Aka Jehova
  • Ọ Mụtara Ime Ebere
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Ime Ebere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Jona Amụta Banyere Ebere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Jehova Nweere Jona Ndidi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 9/15 p. 27-30

Ị̀ Na-amụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Anyị Kasị Ukwuu?

“AMỤRỤ m nkà mmụta iwu ruo afọ ise n’otu n’ime mahadum kasị mma na Spain,” ka Julio kọwara. “Ma ihe m mụtara mgbe m malitere ịmụ Bible ka ya mma nke ukwuu. Mahadum kụziiri m otú e si amụ ihe; Bible kụziiri m otú e si ebi ndụ.”

Site na Bible anyị na-enweta echiche Chineke, ụkpụrụ ya nile, na ntụziaka ya. Akwụkwọ Nsọ na-akọwa Jehova dị ka “Onye Ozizi Kasị Ukwuu” n’ihi na ọ bụ onye nkụzi kasị mma n’eluigwe na ala. (Aịsaịa 30:20, NW) N’ụzọ nkịtị, akụkụ akwụkwọ nsọ Hibru ahụ kpọrọ Ya “ndị ozizi”​—⁠ụbara nke na-egosi ịma mma. Nke a kwesịrị ichetara anyị na ịbụ ndị Jehova ziri ihe dị mma nke ukwuu karịa ịmụ ihe n’okpuru onye nkụzi ọ bụla ọzọ.

Ìzùzù Sitere n’Aka Jehova

N’ihi gịnị ka izi ihe Chineke ji bụrụ ihe bara uru otú a? Na nke mbụ, n’ihi ihe ndị bara oké uru dị n’ime ya. Izi ihe Jehova na-enye anyị “ìzùzù.” Ọzọkwa, amamihe Chineke na-eme ka ndị na-etinye ya n’ọrụ “dị ndụ.”​—⁠Ilu 3:​21, 22; Eklisiastis 7:12.

Onye dere Abụ Ọma nke 119 ghọtara na amamihe Jehova echebewo ya ná ndụ ya nile. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ abụ, sị: “Iwu ọnụ Gị dị m mma karịa ọlaedo na ọlaọcha [a] na-adịghị ịgụta ọnụ. A sị na iwu Gị abụghị ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu, mgbe ahụ m ga-alaworị n’iyi n’ime mweda n’ala m. Ihe nile I nyere n’iwu na-eme m ka m mara ihe karịa ndị iro m; n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka nke ahụ dịịrị m. Karịa ndị nile na-ezi m ihe ka m nwere uche; n’ihi na ihe àmà Gị nile bụ ihe m na-atụgharị n’uche.”​—⁠Abụ Ọma 119:​72, 92, 98, 99.

Onye ọbụ abụ ahụ abụghị nanị onye gaara ‘alaworị n’iyi n’ime mweda n’ala ya,’ a sị na ọ bụghị iwu Jehova. O doro Rosa, nwa agbọghọ si Spain, anya na a zọpụtara ndụ ya n’ihi na o tinyere ụkpụrụ Chineke n’ọrụ. “Ka m na-erule 26 afọ, anwawo m igbu onwe m ugboro abụọ,” ka ọ na-echeta.

Rosa etinyeworị onwe ya n’ịgba akwụna, nakwa ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. “Otu ụbọchị, mgbe m nọ n’oké ịda mbà,” ka o kwuru, “otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà gwara m okwu banyere otú Bible pụrụ isi nyere anyị aka ịgwọta nsogbu anyị. M malitere ịmụ Okwu Chineke, bụ́ nke m hụtara dị ka ihe na-adọrọ mmasị. N’ime otu ọnwa enwere m ume nke ịmaliteghachi ndụ n’isi n’ụzọ dị ọcha. Ugbu a m nwere nzube ná ndụ, enwekwaghị m mkpa nke njikpọ nke ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ. Ebe m chọsikwara ike ịbụ enyi Jehova, ekpebisiri m ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. A sị na ọ bụghị ìzùzù nke Okwu Chineke, eji m n’aka na tupu ugbu a m gaara egbuworị onwe m.”

N’ezie, amamihe sitere n’aka Jehova na-azọpụta ndụ. Ya mere, anyị pụrụ irite uru ọ bụghị nanị site n’ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị n’izi ihe Chineke kamakwa site n’ụzọ Jehova na-eji ezi ndị ohu ya ihe. Ebe Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, nyere anyị iwu ịbụ ndị nkụzi na ndị na-eme ndị na-eso ụzọ, anyị chọrọ ịmụta ụzọ ndị kasị irè nke izi ozizi.​—⁠Matiu 28:​19, 20.

Ojiji Jehova Na-eji Ilu Dị Iche Iche Eme Ihe

Oziọma Mak sịrị na ‘ma a sị na o jighị ilu [Jisọs] adịghị agwa ha okwu.’ (Mak 4:34) Ihe a e jiri mara izi ihe Jisọs abụghị ihe ijuanya. Nanị ihe o mere bụ iṅomi otu n’ime ụzọ e si nye mba Israel ozi amụma Jehova. Ndị a nwere ọtụtụ ilu e ji ihe ndị a na-ahụ anya mee.​—⁠Aịsaịa 5:​1-⁠7; Jeremaịa 18:​1-⁠11; Ezikiel 15:​2-⁠7; Hosea 11:​1-⁠4.

Dị ka ihe atụ, rịba ama otú Jehova si jiri ilu siri ike kụziere anyị na arụsị abaghị uru ọ bụla. Aịsaịa 44:​14-⁠17 kwuru, sị: “Ọ na-egbuturu onwe ya osisi cedar dị iche iche, werekwa osisi holm na osisi oak . . . Ọ kụwo osisi fir . . . Ọ ga-abụkwara mmadụ ihe isure ọkụ; o wee were ụfọdụ n’ime ha, nyaa ọkụ; ee, ọ fụnwuo ya, wee sie achịcha; ee, ọ na-apị chi, wee kpọọ isiala nye ya; o mewo ya arụsị a pịrị apị, wee daa kpuo ihu n’ala n’ihu ya. Nkera ya ka o sureworo n’ọkụ; o ji nkera ya eri anụ; ọ na-ahụ anụ ọhụhụ, wee rijuo afọ: . . . ma nke fọdụrụ n’ime ya ka o meworo ka ọ ghọọ chi, ọbụna arụsị ya a pịrị apị: ọ na-ada kpuo ihu n’ala n’ihu ya, na-akpọkwa isiala, na-ekpere ya, sị, Napụta m; n’ihi na chi m ka ị bụ.” Ilu ndị dị ka ndị a bụ ngwá ọrụ dị ike n’inyere ndị obi ha ziri ezi aka ịjụ ikpere arụsị na ozizi ụgha dị iche iche.

Ajụjụ Ndị Na-enyocha Obi

Bible nwekwara ihe atụ dị iche iche nke otú Jehova si jiri ajụjụ ndị na-akpali iche echiche gbazie echiche nke ụfọdụ ndị ohu ya. Nna ochie bụ́ Job bụ otu onye n’ime ndị a. Jehova ji ndidi nyere ya aka ịtụle adịghị mkpa nke onwe ya ma e jiri ya tụnyere Chineke. E mere nke a site n’iji ọtụtụ usoro ajụjụ mee ihe, bụ́ ndị Job na-erutụghị eru ịza.

“Olee ebe ị nọ mgbe M tọrọ ntọala ụwa?” ka Jehova jụrụ Job. “Ọ̀ bụ ònye ji ibo ọnụ ụzọ mechibido oké osimiri? . . . Ị̀ na-ekekọta ihu ụtọ Pleiades, ma ọ bụ tọsaa ihe ọdụdọ nile nke Orion? . . . Ọ̀ bụ ogwe aka dị ka Chineke ka i nwere?” Ịgba ajụjụ a na-eweda mmadụ n’ala gụnyere ajụjụ ahụ dị oké mkpa: “Ị̀ na-ama m [Jehova] ikpe, ka i wee bụrụ onye ezi omume?”​—⁠Job 38:4, 8, 31; 40:8, 9.

Ajụjụ ndị a na-enyocha obi mere ka Job ghọta na ya ekwuwo okwu n’enweghị nghọta. Ya mere, ọ rịọrọ mgbaghara ma chegharịa. (Job 42:6) Dị ka ọ dị n’ọnọdụ a, ajụjụ ndị a họọrọ nke ọma pụrụ inye aka ịgbazi echiche na-ezighị ezi nke ụmụ anyị ma ọ bụ ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible.

Iwulite Obi Ike

Gịnị ma ọ bụrụ na ọ dị anyị mkpa inyere onye na-enwe mmetụta nke erughị eru ma ọ bụ enweghị ike ime ihe aka? Mkparịta ụka dị n’etiti Jehova na onye amụma ya bụ́ Mosis na-enye aka n’akụkụ nke a. Mgbe Chineke nyere Mosis ọrụ ịbụ onye na-ekwuchitere ya ọnụ n’ihu Fero na ndị Israel, onye amụma ahụ nwere mmetụta na ya enweghị ike ịrụ ọrụ ahụ. “Onye ọnụ ya dị arọ, nke ire ya dịkwa arọ, ka m bụ,” ka o kwuru. Otú ọ dị, Chineke zaghachiri, sị: “Ònye tinyeworo ọnụ mmadụ nwere? . . . Ọ́ bụghị mụ onwe m, bụ́ Jehova? Ma ugbu a, jee, Mụ onwe m ga-anọnyere ọnụ gị, zi gị ihe ị ga-ekwu.”​—⁠Ọpụpụ 4:​10-⁠12.

Jehova nyere nwanne Mosis bụ́ Erọn ọrụ dị ka onye na-ekwuchitere ya ọnụ, ha gakwara n’ihu ịrụzu ọrụ ha n’Ijipt. (Ọpụpụ 4:​14-⁠16) Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-enwekwa otu ụdị mmetụta Mosis nke erughị eru mgbe ha na-eje ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ ịgba àmà okporo ámá na nke mbụ ha. Dị ka ọ dị n’ọnọdụ Mosis, anyị ịmara na Jehova kwụ anyị n’azụ nakwa na onye ozi nwere ahụmahụ ga-esonyere anyị pụrụ inyere anyị aka imeri ịla azụ anyị. Ọbụna dị ka Mosis nwere ike ịzụlite obi ike ruo n’ókè nke ikwu okwu ndị dị ike a na-achọta n’akụkụ nile nke akwụkwọ Bible bụ́ Deuterọnọmi, site n’enyemaka Jehova anyị onwe anyị kwa pụrụ iwulite nkà ikwu okwu.

Ihe Mmụta A Na-ahụ Anya

Ezi ọchịchọ nke inyere ndị ọzọ aka dịkwa mkpa. Nke ahụ bụ àgwà nke onye amụma bụ́ Jona na-enweghị. Jehova nyere Jona ọrụ ịdọ ndị Nineve aka ná ntị banyere mbibi nke na-aga ịdakwasị obodo ahụ. N’ụzọ dị ịtụnanya, ndị Nineve chegharịrị. (Jona 3:⁠5) Dị ka ihe si na ya pụta, Jehova yigharịrị ọdachi ahụ. Otú ọ dị, kama inwe ọṅụ dị ukwuu n’ịga nke ọma nke ọrụ nkwusa ya, Jona were iwe na a gaghị emezu ihe o buru n’amụma. Olee otú Jehova si nyere ya aka inweta echiche ziri ezi?

Jehova jiri otu osisi ogiri ụgba kụziere Jona ịdị mkpa nke ichebara ndị ọzọ echiche. Osisi ahụ tolitere n’otu abalị n’ụzọ ọrụ ebube ma mee ndò dị mma maka Jona, bụ́ onye guzobeworo otu ụlọ ntu ná mpụga nke Nineve. Jona malitere ‘ịṅụrị ọṅụ nke ukwuu’ n’ihi osisi ọma nke a. Ma mgbe ahụ Jehova mere ka otu ikpuru ribie osisi ahụ, o wee kpọnwụọ. N’ihi ịbụ onye e kpughere nye anwụ na ifufe dị ọkụ, Jona were iwe ma kwuo, sị: “Ọ ka m mma ịnwụ ọnwụ karịa ịdị ndụ.” (Jona 4:​5-⁠8) Gịnị bụ ihe mmụta dị n’ihe ndị a nile?

Jehova gwara Jona, sị: “Gị onwe gị meere ogiri ụgba nke a ebere, bụ́ ihe nke ị na-adọgbughị onwe gị n’ọrụ n’ihi ya, nke ị na-emeghịkwa ka ọ dị ukwuu; nke tolitere n’otu abalị, laakwa n’iyi n’otu abalị: Mụ onwe m kwa, M gaghị emere Nineve ebere, bụ́ obodo ukwuu ahụ; nke ihe karịrị [otu narị puku na iri puku mmadụ abụọ] nọ n’ime ya, bụ́ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha na aka ekpe ha; na ọtụtụ anụmanụ?”​—⁠Jona 4:​9-⁠11.

Lee ihe mmụta dị ike a na-ahụ anya nke ahụ bụ! Jona nwere mmasị n’ahụ osisi ogiri ụgba ahụ karịa n’ọtụtụ puku nke ndị mmadụ. Ọ bụ ezie na nchegbu maka akụkụ ọ bụla nke okike Chineke dị mma, inye aka ịzọpụta ndụ ndị mmadụ bụ ọrụ anyị kasị mkpa.

Iji Ndidi Na-ezi Ihe

Dị ka Jona chọpụtara, ọ bụghị ihe dị mfe mgbe nile ijezu ozi anyị. (2 Timoti 4:5) Otú ọ dị, iji ndidi na-emeso ndị ọzọ ga-enye aka.

Olee ụzọ ị na-esi emeghachi omume mgbe otu n’ime ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible na-ewe oge ma ọ bụ yie onye na-enweghị ezi uche? Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu na-akụziri anyị ụzọ e si emeso ụdị nsogbu ahụ. O gosipụtara ndidi pụrụ iche mgbe Abraham wụkwasịrị ya ọtụtụ ajụjụ banyere ikpe na-abịakwasị Sọdọm na Gọmọra. “Ọ̀ ga-abụ ezie na Ị ga-ekpochapụ ndị ezi omume tinyere ndị na-emebi iwu?” ka Abraham jụrụ. “Eleghị anya [ndị ezi omume iri ise] dị n’obodo ahụ,” ka Abraham rịọrọ. “Ọ̀ ga-abụ ezie na ị ga-ekpochapụ ebe ahụ ghara ịgbaghara ya n’ihi [ndị ezi omume iri ise] nọ n’ime ya?” Azịza Jehova nyere Abraham kpaliri ya ịnọgide na-arịọ arịrịọ ruo mgbe e gbuturu ọnụ ọgụgụ ya ruo iri. Jehova maara na nanị ezinụlọ Lọt kwesịrị ka e chebe ha ndụ, e mewokwa ndokwa ime nke ahụ. Ma Chineke ji ndidi nyere Abraham ohere ịnọgide na-agba ya ajụjụ ruo mgbe ọ ghọtara ịdị ukwuu nke ebere Jehova.​—⁠Jenesis 18:​20-⁠32.

Jehova chebaara nghọta a kpaara ókè nke Abraham na mmetụta nchegbu ya echiche. Ọ bụrụkwa na anyị aghọta erughị eru nke onye anyị na-eduziri ọmụmụ ihe, ọ ga-enyere anyị aka igosi ndidi mgbe ọ na-agba mgba ịghọta otu ozizi ma ọ bụ imeri àgwà gbamiworo mkpọrọgwụ.

Nọgide Na-amụta Ihe Site n’Aka Jehova

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova Chineke bụ Onye Ozizi Kasị Ukwuu. Site n’ụzọ ndị dị otú ahụ dị ka ilu, ajụjụ, na ihe mmụta a na-ahụ anya dị iche iche, ọ na-eji ndidi enye nghọta. Ruo n’ókè anyị ṅomiri ụzọ izi ihe ya dị iche iche, anyị onwe anyị ga-aghọ ndị nkụzi ka mma.

Ebe ndị na-ezi ndị ọzọ ihe na-ekwesịghị ileghara izi onwe ha ihe, anyị ga-anọgide na-abụ “ndị mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:13) Aịsaịa dere, sị: “Anya gị abụọ ga na-ahụ [Onye Ozizi Kasị Ukwu, NW] gị: ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:​20, 21) Site n’ịnọgide na-eje ije n’ụzọ Jehova ma na-enyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ, anyị pụrụ inwe ihe ùgwù pụrụ iche nke ịmụta ihe site n’aka Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu ruo mgbe ebighị ebi.

[Foto dị na peeji nke 28]

Jehova jụrụ Job, sị: “Ọ̀ bụ n’okwu ọnụ gị ka ugo na-efeli elu, ma ọ bụ mee akwụ ya ka ọ dị elu?”

[Foto dị na peeji nke 28]

Site n’otu osisi ogiri ụgba, Jehova kụziiri Jona inwekwu mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya