Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Na Matiu 3:7, n’ihi gịnị ka “New World Translation” ji jiri okwu ahụ dị ogologo karị bụ́ “ji anya gwuru” mee ihe kama iji “hụrụ” dị ka e ji ya mee n’ọtụtụ nsụgharị Bible ndị ọzọ?
N’ezie, a pụrụ iji nsụgharị nke ọ bụla n’ime ha mee ihe, ọ gaghịkwa abụ nke na-ezighị ezi. Ọ bụghịkwa asụsụ nile na-adabacha n’ụzọ dị mfe n’ịkọwapụta ụtọ asụsụ Grik e ji mee ihe n’ebe a. Ma otú e si dee Matiu 3:7 na New World Translation of the Holy Scriptures na Bekee na-ewepụta ụtọ okwu a na-achọta n’ihe odide Grik e si na ya sụgharịta ya. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe [Jọn Onye Na-eme Baptism] ji anya gwuru ọtụtụ n’ime ndị Farisii na Sadusii ahụ na-abịa ime baptism, ọ sịrị ha: ‘Unu ụmụ ajụala, ònye gwara unu ka unu gbanarị iwe ahụ na-abịa?’”
Dị ka e kwuru, ọtụtụ Bible sịrị nanị na Jọn “hụrụ” ka ndị Farisii na Sadusii na-abịa n’ebe ọ na-eme ndị Juu baptism. Otú ọ dị, Bible ò bu n’uche na Jọn hụrụ ka nke a nọ na-eme n’ime oge gbatịpụrụ agbatịpụ, dị ka a ga-asị na ọ nọ na-ekiri ya ruo oge ụfọdụ wee bụrụ onye a kpaliri n’ikpeazụ ikwu okwu banyere ihu abụọ nke omume ha? Nsụgharị ahụ bụ́ “hụrụ” pụrụ iduje ná nghọta dị otú ahụ. N’ezie, echiche ahụ na-apụta ìhè ná nsụgharị nke Ferrar Fenton mere nke na-asị: “Ma ka ọ nọ na-ele ọtụtụ n’ime ndị Farisii . . .”
Ọdịdị okwu Grik nke ngwaa ahụ bụ ihe a na-akpọ aorist. Aorist na-akọwa ihe mere n’otu ntabi anya, ma ọ bụ ná mkpirikpi oge, ebe ọdịdị okwu ihe na-eme ugbu a na-akọwa ihe na-eme aga n’ihu (ịdị na-eme), ọdịdị okwu ka mesịrị bụkwa n’ụzọ bụ́ isi ihe e mesịworo (imeworịị). Ya mere echiche dị na ngwaa aorist ahụ dị na Matiu 3:7 bụ na Jọn Onye Na-eme Baptism n’otu ntabi anya hụrụ ka ndị Farisii na ndị Sadusii ahụ na-abịa, ma ọ bụ “o ji anya gwuru” ha. Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ zaghachiri dị ka anyị na-agụ n’amaokwu nke 7-12.
E nwere nnọọ ọtụtụ ihe atụ nke iji ọdịdị okwu aorist nke a mee ihe n’echiche nke a. Anyị ịghọta ụtọ okwu ya pụrụ iduje n’anyị inwe mmetụta ka omimi maka ihe Bible na-ekwu.
Dị ka ihe atụ, Matiu 9:9 na-ekwu, sị: “Mgbe Jisọs na-esi n’ebe ahụ na-aga, O [ji anya gwuru, “NW”] otu nwoke a na-akpọ Matiu, ka ọ nọdụrụ n’ụlọ ụtụ: Ọ sị ya, So m. O wee bilie, soo Ya.” Ọ dịghị Jisọs mkpa ịnọ ogologo oge na-ekiri Matiu, ma ọ bụkwanụ ịnọ na-ele Matiu ugboro ugboro. Jisọs ji anya gwuru Matiu, O mekwara ihe.
Ndị ahụ bụ ihe atụ abụọ nke nlezianya nke New World Translation ji mee ihe n’ihe banyere ngwaa Grik ndị dị n’ọdịdị okwu aorist. Tụlee ebe ndị ọzọ ọ pụtakwara otú ahụ, hụkwa ụtọ okwu ka ukwuu ndị ị naachọta:
“Mgbe Jisọs bịara n’ụlọ onye isi ahụ, [wee jiri anya gwuru, “NW”] ndị ọkwà ọ̀jà, na ìgwè mmadụ ka ha na-atụ ụ̀zụ̀, Ọ sị, Wezụganụ onwe unu; n’ihi na nwa agbọghọ nta ahụ anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra.”—Matiu 9:23, 24.
“Mgbe ndị na-eso ụzọ Ya [ji anya gwuru, “NW”] Ya ka Ọ na-eje ije n’elu oké osimiri, obi wee lọọ ha mmiri, ha sị, Ọ bụ mmụọ; ha wee tie mkpu site n’egwu. Ma ngwa ngwa Jisọs gwara ha okwu, sị, Nweenụ obi ike; ọ bụ Mụ.”—Matiu 14:26, 27.
“Otu n’ime ndị isi ụlọ nzukọ, aha ya bụ Jeairọs, wee bịa; mgbe o [ji anya gwuru, “NW”] Ya [Jisọs], o wee daa n’ala n’ụkwụ Ya, wee rịọsie Ya ike, sị, Nwa m nwanyị nta na-anwụnyụ anya: arịọ m Gị ka Ị bịa bikwasị ya aka Gị abụọ.”—Mak 5:22, 23.
“Mgbe Ọ bịaruru nso ọnụ ụzọ ámá obodo [Nain] ahụ, lee, a na-ebupụ otu onye nwụrụ anwụ, bụ́ nwa nwoke nke nne ya mụrụ nanị ya, nwanyị ahụ bụkwa onye di ya nwụrụ: oké ìgwè nke ndị obodo ahụ sorokwa ya. Mgbe Onyenwe anyị [ji anya gwuru, “NW”] ya, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ya, sị ya, Akwala ákwá.”—Luk 7:12, 13.
“Ya mere Meri, mgbe ọ bịara n’ebe Jisọs nọ, mgbe o [ji anya gwuru, “NW”] Ya [Jisọs], ọ daa n’ala n’ụkwụ Ya, na-asị Ya, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na Ị nọrịị n’ebe a, nwanne m nwoke agaghị anwụworị. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa ákwá, na ndị Juu ndị sooro ya bịa ka ha na-akwakwa ákwá, Ọ sụọ ude n’ime mmụọ Ya.”—Jọn 11:32, 33.
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịgụkwu ebe ndị ọzọ, sapeta Ọrụ Ndị Ozi 7:23-25; 9:39, 40; 21:32; 28:3-5; na 1 Jọn 5:16. Ime otú ahụ pụrụ igosikwu otú ọ pụrụ isi bụrụ ihe na-enye afọ ojuju nye ndị na-amụsi Bible ike ime ka nghọta ha nke ihe e dere n’Okwu Chineke sakwuo mbara ma ọ bụ dị omimi karị.