Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 11/15 p. 21-25
  • Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Bụ Nchegbu
  • E Nwere Enyemaka
  • Otú Ịdị Umeala n’Obi Pụrụ Isi Nye Aka
  • Ọrụ Ndidi Na-arụ
  • Tụkwasị Jehova Obi
  • Nọgide Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị
  • Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Nchegbu
    Teta!—2016
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 11/15 p. 21-25

Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile

“Wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya; na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.”​—⁠1 PITA 5:​6, 7.

1. Olee otú nchegbu pụrụ isi metụta anyị, oleekwa otú a pụrụ isi maa atụ nke a?

NCHEGBU pụrụ imetụta ndụ anyị n’ụzọ siri ike. A pụrụ iji ya tụnyere ụ̀zụ̀ nke na-akpaghasị ụda olu ụtọ mara mma nke a na-anụ na redio mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na e nweghị ihe ọ bụla na-akpaghasị ụzarị nke redio, a pụrụ ịnụ ụda olu ụtọ mara mma, ọ pụkwara ime ka ahụ dị jụụ. Otú ọ dị, ụ̀zụ̀ ahụ nke na-agbakasị ahụ pụrụ ịkpaghasị ọbụna olu ụtọ kasị mma, na-akpatara anyị mkpasu iwe na enwetaghị ihe a tụrụ anya ya. Nchegbu pụrụ inwe ụdị mmetụta yiri nke ahụ n’ịnọ jụụ anyị. Ọ pụrụ ibogbu anyị nke ukwuu nke na anyị apụghị ilebara ihe ndị dị mkpa anya. N’ezie, “nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala.”​—⁠Ilu 12:25.

2. Gịnị ka Jisọs Kraịst kwuru banyere “nchegbu nile nke ndụ”?

2 Jisọs Kraịst kwuru banyere ihe ize ndụ nke ịbụ onye oké nchegbu dọpụrụ uche ya. N’amụma ya banyere mgbe ikpeazụ, ọ gbara ume, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:​34-⁠36) Dị nnọọ ka iribiga ihe ókè na ịṅụbiga mmanya ókè pụrụ ịrụpụta ọnọdụ uche na-adịghị nkọ́, otú a ka ịbụ onye “nchegbu nke ndụ a” bogburu pụrụ isi mee ka echiche uche ziri ezi funahụ anyị, na-enwekwa oké ihe ọjọọ ndị ọ ga-arụpụta.

Ihe Bụ Nchegbu

3. Olee otú e siworo kọwaa “nchegbu,” gịnịkwa bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata ya?

3 A na-akọwa “nchegbu” dị ka “ihe mgbu ma ọ bụ nchekasị nke uche nke na-abụ[karị] n’ihi ihe ọjọọ na-akwado ime ma ọ bụ nke a na-atụ anya ya.” Ọ bụ “nchegbu na-atụ ụjọ ma ọ bụ mmasị” tinyekwara “echiche nke nchekasị na ụjọ bụ́ nke na-ezighị ezi na nke gabigara ókè nke ihe na-aka ya akara ọtụtụ mgbe bụ ihe àmà dị iche iche n’ahụ (ndị dị ka ịgba ọsụsọ, ahụ erughị ala, na obi ịkụsi ike karị), inwe obi abụọ banyere ịbụ eziokwu na ọdịdị nke ihe iyi egwu ahụ, na inwe obi abụọ banyere ikike mmadụ nwere n’onwe ya ịnagide ya.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Ya mere nchegbu pụrụ ịbụ nsogbu gụnyere ọtụtụ ihe. Ihe ndị so n’ime ọtụtụ ihe na-akpata ya bụ ọrịa, ịka nká, ụjọ nke mpụ, ịchụ n’ọrụ, na nchegbu banyere ọdịmma nke ezinụlọ mmadụ.

4. (a) Gịnị ka ọ dị mma icheta banyere ndị mmadụ na nchegbu ha? (b) Ọ bụrụ na anyị na-enwe nchegbu, gịnị ka a pụrụ ime?

4 N’ụzọ doro anya, e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche nke nchegbu, dị nnọọ ka e nwere ọnọdụ na ihe ndị dịgasị iche iche ndị pụrụ ịkpata ya. Mmadụ nile adịghị emeghachi omume n’otu aka ahụ n’ebe otu ọnọdụ dị. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịghọta na a sịgodi na otu ihe adịghị enye anyị nsogbu, ọ pụrụ ịbụ ihe na-akpatara ụfọdụ n’ime ndị anyị na ha na-efekọ Jehova ofufe oké nchegbu. Gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na nchegbu eruo n’ókè nke na anyị apụghị itinye uche n’eziokwu ndị kwekọrọ ekwekọ ndị dịkwa ụtọ nke Okwu Chineke? Gịnị ma ọ bụrụ na nchegbu enye anyị nsogbu nke ukwuu nke na anyị enweghị ike ilekwasị anya n’ihe iseokwu nke ọkaaka Jehova na iguzosi ike n’ezi ihe ndị Kraịst? Ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị enwe ike ịgbanwe ọnọdụ anyị. Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịchọ isi ihe ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịnagide nchegbu na-enweghị isi nke nsogbu ndị tara akpụ ná ndụ kpatara.

E Nwere Enyemaka

5. Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Abụ Ọma 55:22?

5 Mgbe enyemaka ime mmụọ dị ndị Kraịst mkpa, bụrụkwa ndị e ji nchegbu bogbuo, ha pụrụ inweta nkasi obi site n’Okwu Chineke. Ọ na-enye nduzi a pụrụ ịdabere na ya ma na-enye anyị ọtụtụ mmesi obi ike na anyị anọghị nanị anyị dị ka ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe. Dị ka ihe atụ, onye ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ abụ, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndị a? Site n’ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe nke na-ahụ n’anya nchegbu, nchekasị, ụjọ, na ndakpọ olileanya anyị nile. Nke a ga-enye aka inye anyị mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi na ịdị jụụ nke obi.

6. Dị ka Ndị Filipaị 4:​6, 7 si kwuo, gịnị ka ekpere pụrụ imere anyị?

6 Ekpere si n’obi nke a na-ekpechi anya dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-atụkwasị Jehova ibu anyị, gụnyere nchegbu anyị nile. Nke a ga-ewetara anyị udo nke ime, n’ihi na Pọl onyeozi dere, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:​6, 7) “Udo nke Chineke” nke na-enweghị atụ bụ ịdị jụụ a na-adịghị ahụkebe nke ndị ohu Jehova raara onwe ha nye na-enwe ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike. Ọ na-abịa site ná mmekọrịta onwe onye chiri anya nke anyị na Chineke. Ka anyị na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ ma na-ekwe ka ọ kpalie anyị, a dịghị ewepụrụ anyị nsogbu nile nke ndụ, ma anyị na-enwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ nke bụ udo. (Luk 11:13; Ndị Galetia 5:​22, 23) Nchegbu adịghị erikpu anyị, n’ihi na anyị maara na Jehova na-eme ka ndị ya nile na-ekwesị ntụkwasị obi ‘biri ná ntụkwasị obi,’ ọ gaghịkwa ekwe ka ihe ọ bụla ga-akpatara anyị mmerụ ahụ na-adịgide adịgide mee.​—⁠Abụ Ọma 4:8.

7. Òkè dị aṅaa ka ndị Kraịst bụ ndị okenye pụrụ ikere n’inyere anyị aka ịnagide nchegbu?

7 Ma, gịnị ma ọ bụrụ na nchegbu anyị anọgide, ọbụna n’agbanyeghị na anyị na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ ma na-anọgidesi ike n’ekpere? (Ndị Rom 12:12) Ndị okenye a họpụtara ahọpụta nọ n’ime ọgbakọ bụkwa ndokwa Jehova iji nyere anyị aka n’ụzọ ime mmụọ. Ha pụrụ ịkasi anyị obi, nyekwara anyị aka site n’iji Okwu Chineke eme ihe na site n’isoro anyị kpee ekpere nakwa ikpere anyị ekpere. (Jemes 5:​13-⁠16) Pita onyeozi gbara ndị okenye ibe ya ume ka ha jiri ọchịchọ obi, ịnụ ọkụ n’obi, nakwa n’ụzọ nlereanya zụọ atụrụ Chineke. (1 Pita 5:​1-⁠4) Ndị ikom ndị a bu ọdịmma anyị kachasị mma n’obi ma chọọ inye aka. Otú ọ dị, iji rite uru n’ụzọ zuru ezu site n’enyemaka ndị okenye na iji na-eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ n’ọgbakọ, ọ dị anyị nile mkpa itinye ndụmọdụ nke Pita n’ọrụ: “Unu ndị bụ nwata, doonụ onwe unu n’okpuru ndị okenye. Ma unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.”​—⁠1 Pita 5:5.

8, 9. Nkasi obi dị aṅaa ka a pụrụ inweta site na 1 Pita 5:​6-⁠11?

8 Pita gbakwụnyere, sị: “Ya mere wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya; na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi. Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi: ma na-eguzogidenụ ya, n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ́ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa. Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n’ebube ebighị ebi Ya n’ime Kraịst, mgbe unu hụworo ahụhụ nwa oge, Ya onwe ya ga-eme ka unu zuo okè, meekwa ka unu guzosie ike, meekwa ka unu dị ike, tọọkwa unu ntọala. Ọ bụ Ya nwe ike nile ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.”​—⁠1 Pita 5:​6-⁠11.

9 Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịghọta na anyị pụrụ ‘ịtụkwasị Chineke nchegbu anyị nile, n’ihi na ihe nile banyere anyị na-emetụ Ya n’obi’! Ọ bụrụkwa na ụfọdụ n’ime nchegbu anyị bụ n’ihi mgbalị nile nke Ekwensu imebi mmekọrịta nke anyị na Jehova site n’iwetara anyị mkpagbu na ahụhụ ndị ọzọ, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe magburu onwe ya ịmara na ihe nile ga-emesịa dịrị ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe mma? Ee, mgbe anyị tasịworo ahụhụ ruo nwa oge, Chineke nke amara nile ga-eme ka ọzụzụ anyị zuo okè, ọ ga-emekwa ka anyị dị ike, tọọkwa anyị ntọala.

10. Pita nke Mbụ 5:​6, 7 na-ezo aka n’àgwà atọ dị aṅaa ndị pụrụ inye aka belata nchegbu?

10 Pita nke Mbụ 5:​6, 7 na-ezo aka n’àgwà atọ ndị pụrụ inyere anyị aka ịnagide nchegbu. Otu bụ ịdị umeala n’obi, ma ọ bụ “obi dị umeala.” Amaokwu nke 6 ji okwu bụ́ “n’oge nke Ya” wee mechie, na-atụ aro mkpa ọ dị inwe ndidi. Amaokwu nke 7 na-egosi na anyị pụrụ iji obi ike tụkwasị Chineke nchegbu anyị nile ‘n’ihi na ihe nile banyere anyị na-emetụ Ya n’obi,’ okwu ndị ahụ na-agbakwa ume ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam. Ya mere ka anyị lee otú ịdị umeala n’obi, inwe ndidi, na ịtụkwasị obi kpam kpam n’ebe Chineke nọ pụrụ isi nye aka ibelata nchegbu.

Otú Ịdị Umeala n’Obi Pụrụ Isi Nye Aka

11. Olee otú ịdị umeala n’obi pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide nchegbu?

11 Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-anakwere na echiche Chineke karịrị nke anyị n’ụzọ dị ukwuu. (Aịsaịa 55:​8, 9) Ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ịmata ịdị ntakịrị nke echiche uche anyị ma e jiri ya tụnyere echiche Jehova nke metụtara ihe nile. Ọ na-ahụ ihe ndị anyị na-adịghị ahụ, dị ka e gosiri n’ọnọdụ nke nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job. (Job 1:7-⁠12; 2:1-⁠6) Site n’iweda onwe anyị ala “n’okpuru aka dị ike nke Chineke,” anyị na-anakwere ọnọdụ anyị dị ala ma e jiri ya tụnyere nke Ọkaaka Kachasị Ihe Nile Elu. N’aka nke ọzọ, nke a na-enyere anyị aka ịnagide ọnọdụ ndị o kwere ka ha dịrị. Nnapụta ozugbo pụrụ ịgụsi obi anyị agụụ ike, ma ebe ọ bụ na àgwà dị iche iche nke Jehova nwere nguzozi zuru okè, ọ maara kpọmkwem mgbe na otú ọ ga-esi mee ihe maka anyị. Ya mere, dị ka obere ụmụaka, ka anyị jiri ịdị umeala n’obi jigide ógwè aka dị ike nke Jehova, na-enwe obi ike na ọ ga-enyere anyị aka ịnagide nchegbu anyị.​—⁠Aịsaịa 41:​8-⁠13.

12. Olee mmetụta ọ pụrụ inwe n’ebe nchegbu banyere ịnọ ná ntụkwasị obi ihe onwunwe dị ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị umeala n’obi tinye okwu ndị dị ná Ndị Hibru 13:5 n’ọrụ?

12 Ịdị umeala n’obi na-agụnye ịdị njikere itinye ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke n’ọrụ, bụ́ nke pụrụ ọtụtụ mgbe ibelata nchegbu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe kpatara nchegbu anyị bụ n’ihi itinyemi aka ná nchụso ihe onwunwe, anyị pụrụ ime nke ọma ichebara ndụmọdụ nke Pọl echiche: “Ka ọchịchọ obi unu ghara ịdị n’ịhụnanya ego; ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a: n’ihi na [Chineke] ekwuwo, sị, M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Site n’iji ịdị umeala n’obi na-etinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ, ọtụtụ enwerewo onwe ha pụọ n’oké nchegbu banyere ịnọ ná ntụkwasị obi n’ihe onwunwe. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọnọdụ akụ̀ na ụba emeziwanyebeghị, ọ dịghị eche ha echiche ruo n’ókè nke ịkpatara ha mmerụ ahụ ime mmụọ.

Ọrụ Ndidi Na-arụ

13, 14. (a) A bịa n’ihe banyere iji ndidi na-atachi obi, ihe nlereanya dị aṅaa ka Job setịpụrụ? (b) Iji ndidi na-echere Jehova pụrụ imere anyị gịnị?

13 Okwu ahụ bụ́ “n’oge nke Ya,” nke dị na 1 Pita 5:6, na-atụ aro mkpa nke iji ndidi na-atachi obi. Mgbe ụfọdụ otu nsogbu pụrụ ịdịgide ruo ogologo oge, nke ahụ pụkwara ime ka nchegbu ka njọ. Ọ bụ mgbe ahụ karịsịa ka ọ dị anyị mkpa ịhapụrụ Jehova ihe nile. Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ ndị tachiri obi: unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:11) Job nwetara ndakpọ akụ̀ na ụba, ụmụ iri ya nwụnahụrụ ya, ọ rịara ọrịa na-asọ oyi, bụrụkwa onye ndị nkasi obi ụgha mara ikpe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ nchegbu ụfọdụ ga-abụ ihe dị otú o kwesịrị.

14 Ka o sina dị, Job bụ onye kwesịrị nṅomi n’ihe banyere iji ndidi na-atachi obi. Ọ bụrụ na anyị na-enwe oké ule nke okwukwe, ọ pụrụ ịdị mkpa na anyị ga-echere maka nnapụta, ọbụna dị ka o cheere. Ma Chineke mere ihe n’ihi ya, na-anapụta Job n’ikpeazụ site n’ahụhụ ya ma na-enyeghachi ya ụgwọ ọrụ n’ụba. (Job 42:​10-⁠17) Iji ndidi na-echere Jehova na-ewulite ntachi obi anyị ma na-ekpughe ịdị omimi nke nraranye anyị raara onwe anyị nye ya.​—⁠Jemes 1:​2-⁠4.

Tụkwasị Jehova Obi

15. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụkwasị Jehova obi kpam kpam?

15 Pita gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha ‘tụkwasị Chineke nchegbu ha nile n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Ya mere anyị pụrụ, anyị kwesịkwara ịtụkwasị obi kpam kpam na Jehova. Ilu 3:​5, 6 na-asị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” N’ihi ahụmahụ ndị gara aga, ọ na-esiri ụfọdụ ndị nwere oké nchegbu ike ịtụkwasị ụmụ mmadụ ndị ọzọ obi. Ma anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Onye Okike anyị obi, onye bụ Isi Iyi na Onye Na-akwado ndụ. Ọbụna a sị na anyị ejighị n’aka ihe ga-abụ mmeghachi omume anyị n’otu okwu, anyị pụrụ ịdabere mgbe nile n’ebe Jehova nọ maka ịnapụta anyị site n’ọdachi anyị.​—⁠Abụ Ọma 34:18, 19; 36:9; 56:3, 4.

16. Gịnị ka Jisọs Kraịst kwuru banyere nchegbu n’ihi ihe onwunwe?

16 Ịtụkwasị Chineke obi na-agụnye irubere Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, isi bụ́ onye kụziri ihe ndị ọ mụtara site n’aka Nna ya. (Jọn 7:16) Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘kpado akụ̀ n’eluigwe’ site n’ijere Jehova ozi. Ma olee banyere mkpa ihe onwunwe ndị dị ka ihe oriri, uwe, na ụlọ? “Unu echegbula onwe unu,” ka Jisọs dụrụ n’ọdụ. O kwuru na Chineke na-azụ ụmụ nnụnụ. Ọ na-eyikwasị okooko osisi uwe n’ụzọ mara mma. Ọ̀ bụ na ụmụ mmadụ ndị na-ejere Chineke ozi abaghị n’ihe karịa ndị a? N’ezie ha bara. N’ihi ya, Jisọs gbara ume, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume [Chineke]; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” Jisọs gara n’ihu, sị: “Ya mere, unu echegbula onwe unu nye echi: n’ihi na echi ga-echegburu onwe ya.” (Matiu 6:​20, 25-⁠34) Ee, ihe oriri, ihe ọṅụṅụ, uwe, na ụlọ dị anyị mkpa, ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, anyị agaghị echegbubiga onwe anyị ókè banyere ihe ndị a.

17. Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe atụ nke mkpa ọ dị ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ?

17 Iji buru ụzọ chọọ Alaeze ahụ, anyị aghaghị ịtụkwasị Chineke obi ma setịpụ ihe ndị dị anyị mkpa karị n’usoro kwesịrị ekwesị. Onye na-egwu mmiri nke na-enweghi ihe e ji ekute ume n’ime mmiri pụrụ ịmakpunye n’ime mmiri n’ịchọ oyster nke nwere pearl n’ime ya. Nke a bụ otú o si akpata ihe ọ na-enye ezinụlọ ya. Ihe dị oké mkpa, n’ezie! Ma gịnị ka mkpa? Ikuku! Ọ ghaghị ịdị na-ese n’elu mmiri site na mgbe ruo na mgbe iji kunye ikuku n’akpa ume ya. Ikuku bụ ihe dị oké mkpa karị. N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa na anyị ga-etinye aka n’ụzọ ụfọdụ n’ime usoro ihe ochie nke a iji nweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Otú ọ dị, ihe ime mmụọ aghaghị ibute ụzọ n’ihi na ndụ nke ezinụlọ anyị kpọmkwem dabeere n’ihe ndị a. Iji zere nchegbu gabigara ókè banyere ihe onwunwe ndị dị anyị mkpa, anyị aghaghị ịtụkwasị obi kpam kpam n’ebe Chineke nọ. Ọzọkwa, ‘ịrụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè’ pụrụ inye aka ibelata nchegbu n’ihi na “ọṅụ Jehova” bụ ike anyị.​—⁠1 Ndị Kọrint 15:58; Nehemaịa 8:10.

Nọgide Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị

18. Olee ihe àmà e nwere na ịtụkwasị Jehova nchegbu anyị nile pụrụ inyere anyị aka n’ezie?

18 Iji nọgide na-atụkwasị uche n’ihe ime mmụọ n’ụzọ doro anya, anyị aghaghị ịnọgide na-atụkwasị Jehova nchegbu anyị nile. Na-echeta mgbe nile na ọ na-eche banyere ndị ohu ya n’ezie. Iji maa atụ: N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi di ya nye ya, nchegbu nke otu nwanyị bụ onye Kraịst kawanyere njọ ruo n’ókè nke na ọ pụghị ihi ụra. (Tụlee Abụ Ọma 119:28.) Otú ọ dị, n’elu àkwà, ọ ga-atụkwasị Jehova nchegbu ya nile. Ọ ga-awụpụrụ Chineke obi ya, na-agwa ya banyere ihe mgbu nke ya na obere ụmụ ya ndị nwanyị abụọ na-enwe. Mgbe o besịrị ákwá maka nnapụta site n’ikpesi ekpere ike, ọ na-enwekarị ike ihi ụra, n’ihi na ọ tụkwasịrị obi na Jehova ga-elekọta ya na ụmụ ya. Nwanyị nke a gbara alụkwaghịm n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro, n’obi ụtọ alụọla ugbu a di ọzọ bụ́ onye okenye.

19, 20. (a) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ụzọ ndị anyị pụrụ isi nagide nchegbu? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịnọgide na-eme banyere nchegbu anyị nile?

19 Dị ka ndị Jehova, anyị nwere ụzọ dị iche iche nke isi na-anagide nchegbu. Itinye Okwu Chineke n’ọrụ na-enye aka karịsịa. Anyị nwere ụba nke nri ime mmụọ ndị Chineke na-enye site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” gụnyere isiokwu ndị na-enye aka ndị na-enyekwa ume ọhụrụ bụ́ ndị a na-ebipụta n’Ụlọ Nche na Teta! (Matiu 24:​45-⁠47) Anyị nwere enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke. Ekpere nke a na-ekpechi anya na nke a na-ekpesi ike na-abara anyị uru nke ukwuu. Ndị okenye a họpụtara ahọpụta dị njikere, dịkwa nkwadebe inye enyemaka na nkasi obi ime mmụọ.

20 Ịdị umeala n’obi na ndidi anyị bara oké uru n’ịlụso nchegbu nke pụrụ ịdọla anyị azụ ọgụ. Ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ dị mkpa karịsịa, n’ihi na a na-ewuli okwukwe anyị elu ka anyị na-enwe ahụmahụ nke enyemaka na nduzi ya. N’aka nke ọzọ, okwukwe n’ebe Chineke nọ pụrụ ichebe anyị pụọ n’ịbụ ndị na-enwe obi erughị ala n’ụzọ gabigara ókè. (Jọn 14:1) Okwukwe na-akwali anyị ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ na iji ọrụ Onyenwe anyị n’aka bụ́ nke na-enye ọṅụ, nke pụrụ inyere anyị aka ịnagide nchegbu. Ụdị ihe omume dị otú ahụ na-eme ka anyị nwee mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi n’etiti ndị ahụ ga-abụku Chineke abụ otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. (Abụ Ọma 104:33) Ya mere ka anyị nọgide na-atụkwasị Jehova nchegbu anyị nile.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ Olee otú a pụrụ isi kọwaa nchegbu?

◻ Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ụzọ ndị anyị pụrụ isi nagide nchegbu?

◻ Olee otú ịdị umeala n’obi na ndidi pụrụ isi nye aka belata nchegbu?

◻ N’ịnagide nchegbu, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọgide na-atụkwasị Jehova nchegbu anyị nile?

[Foto dị na peeji nke 24]

Ị̀ maara ihe mere Jisọs ji kwuo, sị, “Unu echegbula onwe unu”?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya