Olu Dị Iche Iche Na-akwado Nkwere
KA NARỊ afọ ikpeazụ na-agwụsị, olu ndị na-akwado sayensị, nkà ihe ọmụma ụwa, na enweghị mmasị n’okpukpe na-enwe mmetụta ọjọọ ná nkwere na Chineke na n’isite n’ike mmụọ nsọ nke Bible.
Ma ha abụghị nanị olu ndị a ga-anụ. Ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta hụrụ ihe dị ukwuu a pụrụ ikwu ná nkwado nke nkwenye na Chineke kama ịbụ n’ekweghị na Chineke. Ihe ọmụmụ ha dị iche iche welitekwara ụba nke ihe àmà nke na Bible bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ.
Otu olu pụtara ìhè bụ nke C. T. Russell. Ọtụtụ nde mmadụ gụrụ mpịakọta The Divine Plan of the Ages o dere na 1886. Otu isiokwu dị ike dị na ya bụ “A Nwapụta Ịdị Adị nke Onye Okike Kasị Elu nke Nwere Ọgụgụ Isi.”
N’iri afọ ndị sochiri, Russell dere ọtụtụ isiokwu, traktị, na akwụkwọ ndị nyere ihe ndị siri ike mere a ga-eji kwere na Chineke nakwa na Bible. Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara ndị a. Onye isi oche ya nke abụọ, J. F. Rutherford, dere Creation (1927) na akwụkwọ ndị ọzọ ndị welitekwuru olu na-akwado nkwere.
Society ahụ na nso nso a akwadebewo ihe ọmụma ndị ọzọ ka ọhụrụ n’okwu ndị a. Ndịàmà Jehova pụrụ inye gị ihe dị otú ahụ ka i jiri iche echiche tụlee ha.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị iji duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.