‘Ọrụ Ya Nile Na-eso Ya’
N’ELEKERE anya 8:50 nke ụtụtụ na Thursday, July 28, 1994, George D. Gangas nọchara oge ya n’elu ụwa. Ọ gbara 98 afọ. Otu n’ime ndị e tere mmanụ, George Gangas abụwo onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova eri October 15, 1971.
Ndị nile maara Nwanna Gangas n’onwe ha matara ịhụnanya ya maka ezi omume na mkpọrọmasị ya maka ihe ọjọọ. Ha na-echeta nke ọma ụzọ o si kọwaa Setan ugboro ugboro dị ka nnukwute ajọ onye ụgha, nke dịbigara njọ ókè, nke obi ọjọọ, nke rụrụ arụ, na nke na-asọ oyi. N’ụzọ dị iche, o kwuru banyere Jehova dị ka Nna na-ahụ n’anya, nke dị obi ọma, dị ọmịiko, dị nro, ma na-eche banyere anyị. Ọtụtụ na-echetakwa mmasị o nwere n’ịjụ ajụjụ Bible. Ná mkparịta ụka ọ bụla, ọ ghaghị iwelite ajụjụ dị iche iche—ụfọdụ n’ime ha na-adị mfe, ụfọdụ n’ime ha na-akpali echiche karị. N’ezie o nwere ịhụnanya maka eziokwu Bible.
E mere Nwanna Gangas baptism na July 15, 1921. Ọ malitere ọrụ ya n’ozi nkwusa oge nile (ịsụ ụzọ) na March 1928. N’ihi ya, ọ nọrọ n’ozi oge nile ngụkọta nke 66 afọ. Ọ ghọrọ onye òtù nke ndị ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Brooklyn nke Watch Tower Bible and Tract Society n’October 31, 1928.
Akụkọ ndụ ya pụtara ná mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke October 15, 1966. Ọ kọwara nwoke Chineke nke mmụọ na-achị n’ezie. N’isiokwu ahụ, o kwuru okwu na-esonụ nke na-ekpo obi ọkụ: “Enwere m mmasị ná ndụ, achọkwara m ka ụmụnna m nweta ndụ. M na-agụ ihe ndị ọzọ nile, n’ụzọ nke Pọl onyeozi, ‘dị ka ihe íyì n’ihi ọkịka nke ọmụma Kraịst Jisọs.’”—Ndị Filipaị 3:8.
Nwanna Gangas gosiri site n’omume ya nile na n’ezie o nwere mmasị ná ndụ, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi soro ndị ọzọ kerịta ihe “ọmụma Kraịst Jisọs.” Agụụ ya ga-agụ ndị mmadụ, ma lee ka anyị si na-enwe ọṅụ na ọ natawo ugbu a ụgwọ ọrụ ya nke eluigwe! Ugbu a, ‘ọ ga-ezu ike site ná ndọgbu ya nile n’ọrụ, n’ihi na ọrụ ya nile na-eso ya.’—Mkpughe 14:13, New International Version.