Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịgbasa Ozi Ọma
“IHE kasị mma anyị pụrụ ịrọtụ ná nrọ.” Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Anders na Amalia Groth banyere ọzụzụ ozi ala ọzọ ha. Ha kwupụtara mmetụta nke 48 mmadụ dum gụsịrị akwụkwọ na klasị nke 97 nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead site n’ikwukwasị: “Ọzụzụ Gilead akwaliwo ma kwadebe anyị, ya mere ọ na-anụ anyị ọkụ n’obi ịga n’ebe ndị ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ.”
Anyị pụrụ ịhụta ọṅụ nke a ka ụmụ akwụkwọ ahụ na-ekwu okwu n’usoro ihe omume ahụ; 6,420 mmadụ zukọrọ na September 4, 1994, maka ihe omume ahụ.
“Theodore Jaracz so n’Òtù Na-achị Isi meghere usoro ihe omume ahụ site n’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ ‘Ịbụ Ndị Jehova Na-ezi Ihe,’” ka David Abel na nwunye ya, Kelli, kwuru. “Isi ihe anyị na-agaghị echefu mgbe ọ bụla bụ mgbe Nwanna Jaracz kwuru, sị: ‘Anyị aghaghị ịnakwere ịdị ntakịrị anyị ma e jiri anyị tụnyere Jehova,’ meekwa ihe atụ ya site n’ihe mmụta dị ike a na-achọta na Job isi 38 na 39. Nwanna Jaracz mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụ ezie na anyị amụbawo ihe ọmụma anyị nke Bible site n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, anyị amaghị azịza nye ajụjụ nile. Anyị aghaghị ịnọgide na-amụ Okwu Chineke.”
Christian na Angele Coffy kwuru okwu ugbu a: “Okwu Max Larson kwuru n’isiokwu bụ́ ‘Gịnị Bụ Abamuru nke Ntọala Ọma?’ masịrị anyị. Ọ masịrị anyị ya iji anyị tụnyere ụlọ nke ntọala miri emi n’ala siri ike dị mkpa iji kwụrụsie ike ọbụna n’oge ala ọma jijiji. Site n’iji ịdị uchu na-amụ ihe, anyị pụrụ ịzụlite mmekọrịta ka chie anya n’ebe Jehova nọ, nweekwa ike iwukwasị okwukwe anyị n’ihe ọmụma miri emi ka anyị wee nwee ike ịkwụrụsi ike n’oge ihe isi ike.”
“A ga na-echeta okwu nke Milton Henschel, onye isi oche nke ụlọ akwụkwọ ahụ, kwuru n’isiokwu bụ́ ‘Ubi Ndị ahụ Achawo Maka Owuwe Ihe Ubi’ ruo ogologo oge,” ka Gary na Lynn Elfers rịbara ama. “Akụkụ akwụkwọ nsọ bụ́ isi, Jọn 4:35-38, mesiri ike ihe ùgwù anyị nwere nke ịbanye n’ubi nke ndị ọrụ bu ụzọ kụwororịị mkpụrụ na ya. Nke a ga-akpali anyị iji echiche nke ịdị ngwa rụọ ọrụ.” Ikwekọ na nke a, Jan na Sirpa Vaahtola kwuru, sị: “Nwanna Henschel kpalitere atụmanya anyị banyere owuwe ihe ubi ka dị n’ihu site n’inye akụkọ kasị ọhụrụ sitere na Baltic States. Mmụba e nwere na Estonia bụ 51 pasent, na Latvia 106 pasent, nakwa na Lithuania 51 pasent. Lee aha ihe mkpali ọ bụ! Ụmụnna nọ n’ebe ahụ na-arịọ Onyenwenụ ahụ ka o zipụkwuo ndị ọrụ. Ọ tọrọ anyị ụtọ n’ụzọ pụrụ iche ịnụ nke a, ebe ọ bụ na ebe e kenyere anyị ọrụ bụ Estonia!”
“Joel Adams sochiri n’isiokwu bụ ‘Tụkwasị Jehova Obi,’” ka Kevin na Evelyn Cortina chetaghachiri. “Ọ gwara anyị okwu ndụmọdụ na anyị ekwesịghị iche mgbe ọ bụla na mgbe ụfọdụ anyị pụrụ ịtụkwasị Jehova obi mgbe ụfọdụkwa anyị pụrụ ịdabere n’echiche nke onwe anyị. N’ebe e kenyere anyị ọrụ anyị ga-eche ọtụtụ ihe ịma aka ihu—ahụ ike, nri, asụsụ, omenala, na ihe ndị ọzọ. Ha nile ga-achọ ka anyị tụkwasị Jehova obi.”
Onye ọzọ sochiri bụ Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ onye tụlere isiokwu bụ́ “Nọgide Na-atụgharị Uche n’Ebere Jehova.” Alen na Ann Marie Gokavi kwuru, sị: “O mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ntozu okè ndị Kraịst imere ndị ozi ala ọzọ ibe anyị na ndị anyị so na-ekerịta ozi ọma ahụ ebere. Ozi mba ọzọ gụnyere ịchụ àjà, ma ọ bụrụ na ebere adịghị ya, mgbe ahụ àjà ndị anyị na-achụ ga-aba uru dị nta.” (Matiu 9:13) Peter na Fleur Hupston kwukwasịrị: “Nwanna Lösch sịrị na anyị kwesịkwara imere ụmụnna anyị ndị nwoke na nwanyị ebere, si n’akụkụ ihu nke enyo e ji ahụta ihe dị anya na-ele ha anya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka e wee bịada amaghị eme ha dị iche iche kama ime ka ha bukwuo ibu.”
“Jack Redford, otu n’ime ndị nkụzi Gilead anyị, sochiri n’isiokwu bụ́ ‘Ị̀ Pụrụ Ịrịba Ịba Mba Ama?’” ka Mickey na Sherry Minsky chetara. “O mere ka ọ pụta ìhè na nganga na-eme ka o sie ike ịnakwere ịba mba nakwa na ọ bụrụ na anyị ga-emeghachi omume gabiga ókè maka ndụmọdụ, abamuru ya nile ga-akwa anyị. Mgbe ahụ ọ tụrụ aro ụfọdụ bara uru banyere ịnakwere ịba mba na-adabere n’Abụ Ákwá 3:27-31.” Charles na Joan Held tụbanyere okwu: “N’oge ka ukwuu ìsì na-ekpu anyị n’ebe erughị eru ndị nke anyị dị; ya mere, anyị aghaghị ile ịba mba anya dị ka ụzọ isi mepee anya anyị nye ihe ndị anyị na-amabughị banyere ha. Ịba mba ma ọ bụ ndụmọdụ site n’aka Jehova bụ ihe àmà nke ịhụnanya ya maka anyị.”
“Onye nkụzi ọzọ, Ulysses Glass, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ ‘Nweta Amamihe Bara Uru nke Na-eduba ná Ndụ.’ Ọ jụrụ sị: ‘Gịnị ka unu ga-eji ihe unu mụtaworo mee?’” ka Kenneth na Lisbeth Ardkäll kwuru. “Mgbe ahụ o nyere ihe atụ nke dabeere n’Ilu 30:24-26 banyere anụ coney dị ntakịrị na ụzọ Jehova siworo kwadebe ya n’ụzọ zuru ezu maka ndụ. Anyị, n’aka nke ọzọ, enweghị amamihe ebumpụta ụwa, ya mere ọ dị anyị mkpa ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ iji nweta amamihe. Jehova enyewo anyị ihe nile dị anyị mkpa iji mee otú ahụ. Ruo ókè anyị na-abịaru Jehova na ndị ibe anyị nso n’ịhụnanya, anyị ga-arụzu ihe dị ukwuu.”
Okwu Bụ Isi
“Nwanna Karl F. Klein, onye so n’Òtù Na-achị Isi, ji ikpo ọkụ soro anyị tụlee Abụ Ọma nke 19 n’okwu ya bụ́ ‘Ọla n’Etiti Ọla,’” ka Jay na Gwen Abraczinskas kwuru. “O gosipụtara ekele dị omimi nke ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid maka Jehova na ịhụnanya o nwere maka Okwu Chineke.” “Nwanna Klein kewara abụ ọma ahụ ụzọ atọ,” ka Keith na Donna Hornback rịbara ama. “Akụkụ nke 1 (amaokwu nke 1-6) na-egosi ekele Devid maka ihe okike Chineke, akụkụ nke 2 (amaokwu nke 7-10) kwupụtara ekele ya maka iwu nile nke Chineke, na akụkụ nke 3 (amaokwu nke 11-14) na-echetara anyị na, dị ka Devid, anyị kwesịrị ịchọ iso Jehova nwee mmekọrịta dị mma.”
“Isi ihe bụ na egwu Jehova dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị gaje izere ihe ọjọọ masịrị anyị. Nke a na-eduba anyị n’ime ihe dị ọcha n’anya ya,” ka David na Raylene Long kwuru. Frank na Vibeke Madsen kwenyere. “Okwu Nwanna Klein banyere abamuru nke ihe ncheta, iwu, na ihe ndị e nyere n’iwu nke Jehova chịkọtara nke ọma ihe anyị mụtara na Gilead,” ka ha kwuru. “Nke ahụ mere ka anyị kpebisikwuo ike ịrapagide n’Okwu Chineke n’ọdịnihu na imeso ya dị ka ebe nkwakọba nke ọla.”
Ka okwu ahụ bụ isi gasịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ natara akara ugo mmụta ha, a makwara ọkwa ebe ndị e kenyere ha ọrụ. Mgbe a kwụsịtụsịrị nwa oge maka ntụrụndụ, mmadụ nile zukọghachiri maka nnọkọ nke ehihie. Ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ keere òkè n’ịza ajụjụ ndị a jụrụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e gburu nkenke.
“Ihe sochiri bụ ihe omume nke ụmụ akwụkwọ ahụ bụ́ ‘Ndị A Zụrụ Ịghọ Ndị Mkpọsa Alaeze n’Ụwa Nile,’” ka Bob na Shannon Lakatos chetaghachiri. “Akụkụ mbụ nke ihe omume ahụ bụ maka ahụmahụ ụmụ akwụkwọ ndị ahụ nwere n’ije ozi ubi n’oge agụmakwụkwọ anyị were ọnwa ise. O lekwasịrị anya n’iji ajụjụ eme ihe n’ozi anyị n’ụzọ dị nkà. Akụkụ nke ịgba ajụjụ ọnụ gosiri ụzọ ndị dị mma isi chee ihe ịma aka na ọnọdụ na-agbanwe agbanwe nke ndụ ozi ala ọzọ ihu. Ihe nkiri slide atọ ahụ, nke Costa Rica, India, na Malawi, nyere anyị nghọta ụfọdụ nke nzukọ Jehova nke zuru ụwa ọnụ.”
“Ihe nkiri nke sochiri, Bụrụ Onye Ọchịchị Chineke, Ọ Bụghị Onye Ụwa, nyere ihe atụ nke mmetụta ọjọọ ndị ikwu ụfọdụ bụ́ ndị ụwa, ndị na-adabere n’echiche onwe ha, pụrụ inwe,” ka Jesse na Michelle Duncan rịbara ama. “O gosiri na ndị Kraịst aghaghị ịmata ụkpụrụ nduzi na ntụzi dị iche iche nke Ọchịchị Chineke dị ka ihe ndị dị mkpa ma baa uru,” ka Wenzel na Kelly Koula gbakwụnyere.
Abụ na ekpere ikpeazụ wetara usoro ihe omume obi ụtọ ahụ ná njedebe. Ka ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ na-apụ n’oké atụmanya nke ọpụpụ ha ịga n’ala 18 na-abụghị nke ha e kenyere ha ọrụ na ha, okwu ka o mesịa nke Tommi na Jael Kauko kwupụtara echiche ha nke ọma: “Ọ na-anụ anyị nnọọ ọkụ n’obi ịga n’ebe e kenyere anyị ọrụ na itinye n’ọrụ ihe anyị mụtaworo. Anyị anatawo ihe dị ukwuu—ugbu a ọ bụ oge nke anyị inye ihe.”
[Foto dị na peeji nke 26]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klasị nke 97 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla. (1) Hong, J.; Hong, D.; Groth, A.; Cortina, E.; Lakatos, S.; Hornback, D.; Acevedo, L.; Coffy, A. (2) Elfers, L.; Gokavi, A.; Ardkäll, L.; Abraczinskas, G.; Knott, K.; Lizer, T.; Abel, K.; Abel, D. (3) Duncan, M.; Gokavi, A.; Held, J.; Hupston, F.; Lakatos, B.; Long, R.; Minsky, S.; Acevedo, E. (4) Ardkäll, K.; Kauko, J.; Vaahtola, S.; Cortina, K.; Carson, N.; Minsky, M.; Lizer, G.; Koula, K. (5) Duncan, J.; Abraczinskas, J.; Vaahtola, J.; Madsen, F.; Madsen, V.; Long, D.; Carson, C.; Elfers, G. (6) Kauko, T.; Hupston, P.; Held, C.; Groth, A.; Hornback, K.; Koula, W.; Knott, D.; Coffy, C.