Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Chineke ọ̀ na-akpa ókè n’ịhọrọ ndị ikom maka òtù na-achị isi oge mbụ bụ́ ndị sitere n’otu agbụrụ na mba—ebe ha nile bụ ndị Juu?
Ee e, ọ dịghị ma ọlị. Ndị nile Jisọs bu ụzọ kpọọ dị ka ndị na-eso ụzọ ya bụ ndị Juu. E mesịa, na Pentikọst 33 O.A., ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ghọrọ ndị mbụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ha wee bata n’ọnọdụ iso Kraịst chịa n’eluigwe. Ọ bụ nanị mgbe e mesịrị ka e webatara ndị Sameria na ndị Jentaịl a tọghatara atọghata, bụ́ ndị a na-ebighị úgwù. N’ihi ya, o kwere nghọta na ndị Juu, ‘ndị ozi na ndị okenye na Jerusalem,’ mejupụtara òtù na-achị isi n’oge ahụ, dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndị Ozi 15:2. Ndị a bụ ndị ikom nwere nghọta sara mbara karị nke ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ na ọtụtụ afọ nke ahụmahụ n’ezi ofufe, ha enwewokwa oge ka ukwuu itolite ịghọ ndị okenye tozuru okè nke ndị Kraịst.—Tụlee Ndị Rom 3:1, 2.
Ka ọ na-erule oge nzukọ òtù na-achị isi ahụ nke a kọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 15, ọtụtụ ndị Jentaịl aghọwo ndị Kraịst. Ndị a gụnyere ndị Africa, ndị Europe, na ndị sitere n’ógbè ndị ọzọ. Ma, e nweghị ihe ndekọ ọ bụla na e tinyewo onye Jentaịl ọ bụla n’òtù na-achị isi iji mee ka Iso Ụzọ Kraịst na-adọrọ mmasị ndị na-abụghị ndị Juu. Ọ bụ ezie na ndị Jentaịl ndị a bụ́ ndị Kraịst a tọghatara ọhụrụ bụ ndị òtù hà nhata nke “Israel nke Chineke,” ha aghaghị ịkwanyeworo ntozu okè na ahụmahụ ka ukwuu nke ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ùgwù, dị ka ndị ozi, bụ́ ndị bụ akụkụ nke òtù na-achị isi ahụ laa azụ n’oge ahụ. (Ndị Galetia 6:16) Rịba ama n’Ọrụ Ndị Ozi 1:21, 22 otú e si kwanyere nnọọ ahụmahụ dị otú ahụ ùgwù.—Ndị Hibru 2:3; 2 Pita 1:18; 1 Jọn 1:1-3.
Ruo ọtụtụ narị afọ, Chineke emesowo mba Israel, ebe Jisọs si họrọ ndị ozi ya, ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụghị ihie ụzọ ma ọlị ma ọ bụ ikpe na-ezighị ezi na ọ dịghị ndị ozi sitere n’ebe a maara ugbu a dị ka South America ma ọ bụ Africa ma ọ bụ Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ. Ka oge na-aga ndị ikom na ndị inyom sitere n’ebe ndị ahụ ga-enwe ohere nke inweta ihe ùgwù ndị dị ebube karịa nke ịbụ onyeozi n’elu ụwa, ịbụ onye so n’òtù na-achị isi narị afọ mbụ, ma ọ bụ ịnata nhọpụta ọ bụla ọzọ n’etiti ndị Chineke taa.—Ndị Galetia 3:27-29.
A kwaliri otu onyeozi ikwu na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ee, uru nile nke mgbapụta Kraịst dịịrị onye ọ bụla, n’akpaghị ókè. A ga-agụnyekwa ndị mmadụ sitere n’ebo na asụsụ na mba ọ bụla n’Alaeze eluigwe ahụ na n’oké ìgwè mmadụ ahụ ga-ebi ndụ ebighị ebi n’ụwa.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe oké mmetụta banyere nzụlite nke ebo, asụsụ, ma ọ bụ mba. A na-eme ihe atụ nke a site n’ihe anyị na-agụ n’Ọrụ Ndị Ozi 6:1 banyere okwu kpatara ịtamu ntamu n’etiti ndị Kraịst na-asụ asụsụ Grik na ndị nke na-asụ asụsụ Hibru. Anyị pụrụ itolitewo na-enwe ma ọ bụ mịkọrọ mmetụta ndị a na-enwe ugbu a banyere nzụlite nke asụsụ, ebo, agbụrụ, ma ọ bụ mmadụ ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. N’iburu n’uche na nke ahụ pụrụ nnọọ ịdị adị, anyị ga-eme nke ọma itinye mgbalị siri ike ikwe ka echiche Chineke nke bụ na mmadụ nile hà nhata n’ihu ya, n’agbanyeghị otú anyị dị n’elu ahụ kpụzie mmetụta anyị na mmeghachi omume anyị. Mgbe Chineke mere ka e dekọọ iru eru nile nke ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, o kwughị ihe ọ bụla banyere ebo na mba a zụlitere mmadụ na ya. Ee e, o lekwasịrị anya n’iru eru ime mmụọ nke ndị pụrụ iwepụta onwe ha ije ozi. Nke ahụ bụ eziokwu banyere ndị okenye ọgbakọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị ọrụ alaka ụlọ ọrụ taa, dị ka ọ bụ eziokwu banyere òtù na-achị isi na narị afọ mbụ.