Nzukọ Kwa Afọ—October 7, 1995
A GA-EME NZUKỌ KWA AFỌ nke ndị nọ n’òtù Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania n’October 7, 1995, n’ụlọ nzukọ Assembly Hall of Jehovah’s Witnesses, 2932 Kennedy Boulevard, Jersey City, New Jersey. Nzukọ bu ụzọ nke nanị ndị nọ n’òtù ahụ ga-amalite n’elekere 9:30 ụtụtụ, nzukọ kwa afọ nke ọha mmadụ ga-esochikwa ya n’elekere 10:00 ụtụtụ.
Ndị so n’Òtù Ụlọ Ọrụ ahụ kwesịrị ime ka Ọfịs Odeakwụkwọ òtù ahụ mara ugbu a banyere mgbanwe ọ bụla e nweworo n’adres nzipụ ozi ha n’ime otu afọ gara aga ka akwụkwọ ịma ọkwa na akwụkwọ ozi nnọchiteanya ndị a na-ezitere ha mgbe nile nwee ike iru ha aka n’ime ọnwa July.
E kwesịrị izighachi akwụkwọ ndị nnọchiteanya ndị ahụ, ndị a ga-ezijere ndị òtù ahụ n’otu mgbe ahụ ha na akwụkwọ ịma ọkwa maka nzukọ kwa afọ ahụ iji wee rute n’Ọfịs Odeakwụkwọ nke Society n’oge na-agafeghị August 1. Onye ọ bụla so n’òtù ahụ kwesịrị idejupụta ma ziteghachi akwụkwọ nnọchiteanya nke ya ngwa ngwa, na-egosi ma ọ ga-abịa nzukọ ahụ n’onwe ya ma ọ bụ na ọ gaghị abịa. Ihe ọmụma e nyere n’akwụkwọ nnọchiteanya nke ọ bụla kwesịrị ido anya n’isiokwu a, ebe ọ bụ na a ga-adabere na ya iji mara ndị ga-anọ ebe ahụ n’onwe ha.
A na-atụ anya na a ga-emezucha ihe nile, gụnyere nzukọ metụtara ọrụ ha na inye akụkọ ozi dị iche iche n’ihe dị ka elekere 1:00 ehihie ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị. A gaghị enwe nnọkọ nke ehihie. N’ihi ohere na-ebughị ibu e nwere, ọ bụ nanị ndị nwere tiketi ka a ga-anabata. Ọ dịghị ndokwa ọ bụla a ga-eme iji eriri telifon jikọta nzukọ kwa afọ a na ebe nzukọ ndị ọzọ.