Irute Ụdị Mmadụ Nile n’Atens nke Oge A
MGBE Pọl onyeozi jere leta Atens n’ihe dị ka na 50 O.A., obodo ukwu ahụ ka bụ isi azụmahịa dị mkpa, ọ bụ ezie na o nwekwaghị ebube ya nke oge ochie. Otu akwụkwọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu, sị: “[Atens] nọgidere na-abụ obodo ukwu bụ isi nke ihe ime mmụọ na nke nkà ihe osise nke Gris, nakwa ebe ndị gụrụ akwụkwọ na ndị dị ike nke oge ahụ na-achọsi ike ije leta.”
Mgbe ọ nọ n’ebe ahụ, ma eleghị anya Pọl nwere ohere nke ime nkwusa gwa ndị Juu, ndị Atens na-agọ mmụọ, na ndị sitere n’ọtụtụ ebe dị iche iche. N’ịbụ ụdị onye nkụzi mụ anya, nke nwere nkà ọ bụ, o kwuru n’ime otu okwu na Chineke nyere ‘mmadụ nile ndụ, na ume,’ na ‘o sitere n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ,’ nakwa ‘ka ha nile chegharịa n’ebe nile’ n’ihi na Ọ ga-ekpe ‘elu ụwa dum mmadụ bi’ ikpe.—Ọrụ 17:25-31.
Ókèala Gwara Ọgwa
N’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, Atens aghọghachiwo obodo ukwu nke na-adọta ndị mmadụ site n’ebe nile. Ndị nnọchianya mba na ndị ọrụ agha abịawo dị ka akụkụ nke mmekọrịta mba na mba. Ndị na-eto eto sitere Africa na Middle East bi n’ebe ahụ dị ka ụmụ akwụkwọ mahadum. Ndị ọrụ bịara abịa site n’Africa, Esia, na mba Ọwụwa Anyanwụ Europe enubatawo. E nwere ọtụtụ ndị Philippines na ndị ọzọ sitere Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, ndị bịara ịchọ ọrụ dị ka ụmụ odibo. A na-anọgidekwa na-enwe nnubata nke ndị gbara ọsọ ndụ site ná mba ndị dị ya gburugburu na n’ebe ndị e nwere nsogbu gburugburu ụwa.
Ọnọdụ a na-echere ndị nkwusa ozi ọma Alaeze nọ n’obodo ahụ aka mgba. Ihe ka ná ndị bi ebe ahụ nwa oge na-asụ Bekee, ma ụfọdụ na-asụ nanị asụsụ ala ha. Ndị a sitere n’ọtụtụ ọdịbendị na okpukpe dị iche iche. Ị pụrụ ịhụ n’etiti ndị ọbịa ahụ ndị sị na ha bụ ndị Kraịst, ndị Alakụba, ndị Hindu, ndị Buddha, ndị kwere n’okike, ndị na-amaghị ma Chineke ọ dị, na ndị na-ekweghị na Chineke. Ndịàmà Jehova aghaghị ịmụta ịgbanwe okwu ha iji kwekọọ n’ọnọdụ dị iche iche nke ndị a.
Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ndị a bịara ọhụrụ enweela ọtụtụ ihe isi ike, ha na-ajụkarị ajụjụ banyere ihe bụ nzube nke ndụ na olileanya ndị e nwere maka ọdịnihu. Ụfọdụ nwere nsọpụrụ dị elu maka Bible, ọ dịghịkwa esiri ha ike ịnakwere ihe ọ na-ekwu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ókèala a gwara ọgwa dị umeala n’obi, dị nwayọọ n’obi, ma nwee agụụ maka eziokwu. Ha na-enwere onwe ha karị ịchọ eziokwu n’ihi na ha anọghị ezinụlọ ha na gburugburu ala ha nso.
E hiwere ọgbakọ Bekee mbụ n’Atens na 1986 ịhụ maka ókèala a. Uto ya adịwo ịtụnanya. N’ime afọ ise gara aga, e meela ihe dị ka 80 ndị ọhụrụ baptism. Ihe ọ rụpụtara bụ na e guzobewo n’Atens ọgbakọ Arabic, ọgbakọ na-asụ Polish, ruokwa oge ụfọdụ, ìgwè na-asụ French. Ụfọdụ ndị sitere n’ọgbakọ Bekee ahụ akwapụwo ije nyere ọgbakọ na ìgwè ndị ọzọ dị otú ahụ dị na Tesalọnaịka nke dị n’ebe ugwu, na Heraklion, Krit, na Piraeus, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri nke Atens, aka. Ị̀ ga-enwe mmasị izute ụfọdụ n’ime ndị ahụ si ala ọzọ ndị mụtaworo eziokwu ahụ n’Atens?
Ndị A Na-achọsi Ike nke Mba Nile Na-abata
A mụrụ Thomas n’Asmara, Eritrea, o tolitekwa dị ka ezigbo onye Katọlik. Mgbe ọ dị afọ 15, ọ banyere n’ebe obibi ndị mọnk. Ọ jụrụ otu n’ime ndị isi ebe obibi ahụ, sị: “Olee otú ọ ga-esi kwe omume na otu Chineke bụ Chineke atọ?” Onye isi ebe obibi ahụ zara, sị: “N’ihi na anyị na-anakwere ihe popu na-ekwu banyere ihe ime mmụọ. Karịsịa, ihe a bụ ihe omimi, ị dịkwa ntakịrị gabiga ókè ịghọta ya.” Mgbe ọ nọsịrị afọ ise n’ebe obibi ndị mọnk ahụ, Thomas pụrụ, bụrụ onye omume na nkụzi dị iche iche nke chọọchị ahụ mere ka o nwee mwute na nkụda mmụọ. Ma, ọ kwụsịghị ọchịchọ ọ na-achọ ezi Chineke ahụ.
Otu ụbọchị, ntakịrị oge ka ọ kwagasịrị Atens, ọ hụrụ otu mkpụrụ Ụlọ Nche n’ọnụ ụzọ ya, nke isiokwu ihu akwụkwọ ya bụ́ “Ahụ Ike na Obi Ụtọ Pụrụ Ịbụ nke Gị.” Ọ gụrụ ya ọtụtụ ugboro. N’otu magazin ahụ, ọ gụtara na anyị kwesịrị ibu ụzọ chọọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. (Matiu 6:33) Thomas gburu ikpere n’ala rịọ Chineke ka o gosi ya otú ọ ga-esi mee nke a, na-ekwe nkwa, sị: “Ọ bụrụ na i gosi m otú e si achọ Alaeze gị, m ga-eji ọnwa isii ná ndụ m mụọ ụzọ isi jeere gị ozi.” N’izu nke anọ mgbe nke ahụ gasịrị, Ndịàmà abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya. Ozugbo Thomas nakweere ọmụmụ Bible, ọnwa iri kwa n’ihu e mere ya baptism. Ọ na-asị: “Jehova zara ekpere m n’ezie, o nyekwara m ohere ịbụ otu n’ime Ndịàmà ya. Ugbu a ịhụnanya ya na-akpali m ibu ụzọ na-achọ Alaeze ya na ezi omume ya ná ndụ m.”
Ka ha na-eme nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, Ndịàmà abụọ ọzọ hụrụ aha a na-adịghị azakebe n’ógbè ahụ ka ọ dịdewere mgbịrịgba ọnụ ụzọ.
“Gịnị ka unu na-achọ?” ka olu nwanyị kwuru site n’ígwè intercom.
Otu n’ime Ndịàmà ahụ kwuru na ha na-achọ ịchọta ndị na-asụ Bekee bụ́ ndị nwere mmasị na Bible.
“Olee aha okpukpe unu?” ka nwanyị ahụ jụrụ.
“Anyị bụ Ndịàmà Jehova.”
“Ọ dị mma! Gbagotenụ n’okpukpu ụlọ elu nke ikpeazụ.”
Ha mere otú ahụ, mgbe ọnụ ụzọ nke ígwè e ji arịgo ụlọ elu meghekwara, otu nwoke gbara dimkpa nke na-enweghị omume enyi guzo n’ebe ahụ. Ma nwanyị ahụ kwusikwuru okwu ike site n’ime ụlọ.
“Hapụ ha ka ha bata. Achọrọ m ịgwa ha okwu.”
Ọ dabara na o so òtù egwuregwu nke di ya na-eme njegharị gburugburu ụwa, ọ ka bụkwa ụnyaahụ ka ọ nọ na-ekpe ekpere ka ya chọta Ndịàmà Jehova. Ya mere, a malitere ọmụmụ Bible ozugbo. Ebe ọ bụ na oge ha nwere ịnọ na Gris dị mkpirikpi, e mere ndokwa inwe ọmụmụ ihe atọ n’otu izu, na-amụsị akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi nanị n’izu iri.
Oge egwuregwu ọzọ kpọghachitere ha na Gris. Nwunye nwoke ahụ maliteghachiri ọmụmụ ihe ya, nweekwa ọganihu magburu onwe ya. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, o sonyeere Ndịàmà ahụ n’ọrụ ime nkwusa dị ka onye nkwusa na-emebeghị baptism, malitekwa ọmụmụ Bible mbụ ya ngwa ngwa. Ònye ka ọ maliteere ya? Di ya, bụ́ onye nwere nnọọ mmasị n’ebe Ndịàmà ahụ nọ nakwa ná mgbanwe ndị nwunye ya mere.
Allan, bụ́ nwa nwoke nke onye ụkọchukwu Protestant, tolitere na South Africa. Malite n’oge ọ dị ntakịrị, o kwenyesiri ike na Bible bụ mkpughe e ji ike mmụọ nsọ dee nke sitere n’aka Chineke. N’enweghị afọ ojuju n’okpukpe ya, o chigharikwuuru nkà ihe ọmụma na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma nke a mere ka o nwekwuo mmetụta nke ịtọgbọ chakoo karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Mgbe ọ kwagasịrị Gris, mmetụta ya nke ịtọgbọ chakoo rịrị elu. O chere na ndụ ya enweghị nzube, na ya nọ n’ụzọ nke na-enweghị ebe ọ na-eduje.
N’otu abalị ọ dị ihe merenụ. “Egburu m ikpere n’ala wee megheere Chineke obi m,” ka Allan na-akọ. “N’anya mmiri nke mwute maka ụzọ ndụ m, arịọrọ m Chineke ka o duru m gakwuru ezi ndị na-eso ụzọ ya. Ekwere m nkwa na m ga-eje ije n’ìhè nke nduzi ya.” N’ime izu ahụ, ọ nọ n’ime ụlọ ahịa wee soro onye nwe ụlọ ahịa ahụ, otu nwanyị, onye ọ dabara na ọ bụ Onyeàmà, nwee nkwurịta okwu. Nkwurịta okwu ahụ ghọrọ n’ezie ebe ihe nọrọ gbanwee ná ndụ Allan. “N’ụbọchị ndị sochiri, ahụrụ m ka e bibisịrị nkwenkwe ndị m ji kpọrọ ihe: Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi—o doro anya na ha nile abụghị nkụzi Bible.” N’Ụlọ Nzukọ Alaeze, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà kwuru ka ha duziere ya ọmụmụ Bible. Ọ nakweere ma nwee ọganihu dị ngwa. “Eziokwu ahụ mere m ka m bee ákwá n’obi ụtọ,” ka Allan na-echeta, “o mekwara ka m si n’ohu pụọ.” Otu afọ n’ihu e mere ya baptism. Taa obi dị ya ụtọ ije ozi dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ dị n’ógbè ebe o bi.
Elizabeth si Nigeria, bụ́ ebe ọ nọworo chọọ Chineke n’ime chọọchị dị iche iche ma bụrụ onye na-enweghị afọ ojuju. Ihe kasị emenye ya ụjọ bụ ozizi mmekpa ahụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. Mgbe ya na ezinụlọ ya bịara Atens, Ndịàmà abụọ kpọtụrụ n’ọnụ ụzọ ya, a malitekwara ọmụmụ Bible. Obi tọrọ Elizabeth ụtọ ịmụta na Chineke adịghị emekpa ndị mmadụ ahụ, kama ọ na-enye olileanya maka ndụ ebighị ebi n’elu ala e mere ka ọ ghọọ paradaịs. Ọ dị ime nwa ya nke anọ, bụ́ nke ọ chọrọ isikwopụ. Mgbe ahụ ọ mụtara site na Bible otú Jehova si ele ịdị nsọ nke ndụ anya. Ugbu a o nwere nwa nwanyị mara mma. Elizabeth nwere ọganihu ngwa ngwa, e meekwa ya baptism n’oge na-adịghị anya. Ọ bụ ezie na o nwere ụmụ anọ na ọrụ oge nile, ọ na-enwe ike arụ ọsụ ụzọ inyeaka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ọnwa. A gọziwo ya ịhụ ka di ya malitere ịmụ Bible. Ọ na-asị: “N’ikpeazụ achọtara m ezi Chineke ahụ na ezi ofufe, ekele dịrị Jehova na nzukọ ya nke na-ahụ n’anya.”
Ọtụtụ ndị nọ n’ókèala a gwara ọgwa bụ ndị a na-ezute n’ọrụ okporo ámá, ma ọ na-ewe nnọgidesi ike iji wulite mmasị ha. Nke a bụ otú ọ dị n’ihe banyere nwa agbọghọ aha ya bụ Sallay, nke si Sierra Leone. Otu Onyeàmà nyere ya otu traktị, nara ya adres ya, ma mee ndokwa ịkpọtụrụ ya. Sallay nwere mmasị ma nakwere ọmụmụ Bible, ma n’ihi nrụgide ndị sitere n’ebe ọrụ na ihe isi ike ndị ọzọ, a dịghị amụchi ya anya. Na mberede, ọ kwapụrụ n’enyeghị adres ọhụrụ ya. Onyeàmà ahụ nọgidesiri ike site n’ịdị na-eje n’adres ochie ahụ, ka e mesịkwara Sallay zitere ozi ka Onyeàmà ahụ bịa n’ebe obibi ọhụrụ ya.
Ọmụmụ ihe ahụ ghọrọ nke a na-amụchi anya ugbu a karị n’agbanyeghị na Sallay nọ n’ọnwa ndị ikpeazụ nke afọ ime ya. Mgbe ọ mụsịrị nwa ahụ, Sallay ghọrọ onye nkwusa na-emebeghị baptism. Ihe a nile pụrụ iyi ihe dị mfe, ma ọ dịghịrị ya. N’elekere 6:30 nke ụtụtụ, ọ ghaghị ijikere maka njem bọs ga-ewe ọkara hour iji kpọga nwa ya n’ụlọ akwụkwọ ọta akara, bụ́ nke njem bọs otu hour ọzọ ga-esochi gaa ọrụ. Mgbe ọ rụsịrị ọrụ n’ọrụ ya nke ihicha ihe, ọ na-eme njem ahụ ọzọ laghachi n’ebe obibi ya. N’ụbọchị ndị a ga-enwe nzukọ, ma ọ bụ mgbe ọ ga-eje ozi ubi, ọ na-eme njem bọs otu hour ọzọ uje na ụla, n’agbanyeghị mmegide nke di ya. Ka ọ nọ na-egosi di ya ịhụnanya na ndidi, o nwere ọganihu ruo n’ókè nke nraranye na baptism. Gịnị banyere di ya? Ọ bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst ma kweta inwe ọmụmụ Bible.
Ndị E Ji Ihe Ọma Ndị A Rụpụtara Gọzie
Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị a, ọnụnọ ha nọ n’Atens bụ ruo nwa oge. Ọtụtụ na-alaghachi obodo a mụrụ ha iji soro ndị ikwu na ndị enyi kerịta ozi ọma ahụ. Ndị ọzọ na-akwaga mba Ọdịda Anyanwụ ndị ọzọ ma nọgide na-ejere Jehova ozi. Ndị na-anọgide na Gris na-arụpụta ihe ndị dị mma n’ịgbara ndị obodo ha àmà bụ́ ndị kwagawokwara n’ebe ahụ. N’ọnọdụ ndị ọzọ mkpụrụ nke eziokwu mịrị mkpụrụ nanị mgbe ndị ọbịa ahụ kwagasịrị ná mba ọzọ ma bụrụ ndị Ndịàmà kpọtụụrụ.
Ihe a nile na-egosi na Jehova adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-anabata ndị mmadụ sitere ná mba nile bụ́ ndị na-atụ egwu ya ma hụ ezi omume n’anya. (Ọrụ 10:34, 35) Nye ndị dị otú ahụ yiri atụrụ, nkwaga ha kwagara mba ọzọ maka uru ihe onwunwe rụpụtara ngọzi bara ụba karịa otú ha tụrụ anya ya—ịmata ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na nkwa ya nke ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume. Ee, n’ezie Jehova agọziwo n’ụba mgbalị ndị a na-eme iji rute ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ n’Atens nke oge a!
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Ndị sitere n’ọtụtụ ala na-anụ ozi ọma ahụ n’Atens