Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ndị Bụbu Ndị Iro Adịrị n’Otu n’Ijere Jehova Ozi
“NKE mbụ ya m nụrụ ihe ọ bụla banyere Ndịàmà Jehova bụ mgbe m na-eje ozi dị ka onye na-eji égbè eche nche na Bosnia,” ka Branko na-akọwa.a
Branko na-eche nche n’otu ụlọ ọgwụ ebe a na-agwọ ndị e merụrụ ahụ. Otu n’ime ndị dọkịta so Ndịàmà na-amụ Bible, n’otu oge ọrụ abalị, ọ kọwaara Branko ihe dị ukwuu ọ mụtaworo banyere Bible.
Ihe Branko nụrụ n’abalị ahụ kpaliri ya nke ukwuu nke na ọ chịsara ngwá agha ya ozugbo. Ọ kpọtụụrụ Ndịàmà, na-achọ ịmụtakwu ihe. Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, mgbe ọ kwagasịrị ná mba ọzọ nke Europe, Branko chọtara otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma gaa nzukọ nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-eji asụsụ Yugoslavian amụ ihe. Ọ bụ ebe ahụ ka Branko zutere Slobodan.
Slobodan sitekwara na Bosnia, o jewokwa ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’otu agha ahụ dị ka Branko—kama n’akụkụ nke ndị iro. Slobodan alụworo ndị Serbia agha megide ndị Croatia. Tupu ha abụọ ezute, Slobodan aghọọla Onyeàmà Jehova e mere baptism. O wepụtara onwe ya iduziri Branko, onye bụbu onye iro ya, Bible. Ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu, Branko mụtakwuru ihe banyere Jehova, ịhụnanya ya maka Chineke tokwara. Nke a kpaliri Branko ịrara ndụ ya nye Onye Okike. N’October 1993 o gosipụtara nraranye ya site na baptism ime mmiri.
Olee otú Slobodan si ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ọ hapụwo ọgbọ agha ahụ na Bosnia ihe dị ka ná mmalite agha ahụ. Ọ gụwo ụfọdụ akwụkwọ Ndịàmà, kama ọ bụ mgbe Ndịàmà abụọ bịara kpọtụrụ ya n’ụlọ ya ná mmalite nke 1992 ka mmasị ya n’Okwu Chineke toro. Ònye kpọtụụrụ Slobodan, na-ewepụta onwe ya isoro ya mụọ Bible? Ọ bụ Mujo, onye sikwa Bosnia bịa, kama bụrụ onye a zụlitere dị ka onye Alakụba. Ka ọmụmụ Bible ahụ na-aga n’ihu, Mujo na Slobodan, ndị bụbu ndị iro, jiri oge ụfọdụ nọkọọ ọnụ kwa ụbọchị iji wusie okwukwe ibe ha ike.
Agha ahụ a na-alụ n’ebe bụbu Yugoslavia egbuwo ọtụtụ narị puku ndị mmadụ. Ma Branko, Slobodan, na Mujo na-eje ozi ugbu a dị ka ndị nkwusa oge nile nke ozi ọma n’otu ọgbakọ ahụ nke Ndịàmà Jehova. Ha emeriwo esemokwu agbụrụ na ebo, ugbu a kwa ha na-achọ udo ka ha na-edo onwe ha n’okpuru Onye Okike, bụ́ Jehova.
Ma gịnị wetara ụdị mgbanwe ndị ahụ? Ọ bụ ịhụnanya ha maka Jehova, ùgwù ha na-akwanyere Bible, na ịnụ ọkụ n’obi ha itinye eziokwu Bible n’ọrụ ná ndụ ha. Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike . . . bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izù nile nke obi.”—Ndị Hibru 4:12.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a E jiwo ihe na-abụghị aha ha mee ihe.