Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 6/15 p. 12-17
  • Ngọzi Ma Ọ Bụ Nkọcha—E Nwere Nhọrọ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọzi Ma Ọ Bụ Nkọcha—E Nwere Nhọrọ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngọzi E Mere Ka E Nwee Ike Inweta
  • Gịnị Banyere Nkọcha?
  • Nkwupụta Ngọzi na Nkọcha
  • Ilebatụkwu Ya Anya
  • Nhọrọ nke Israel Wetara Ọdịiche
  • Ngọzi Ma Ọ Bụ Nkọcha—Ihe Atụ Nye Anyị Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • ‘Họrọ Ndụ, Ka I Wee Dị Ndụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Shekem—Obodo Dị na Ndagwurugwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ngọzi Jehova Ọ̀ Ga-eru Gị Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 6/15 p. 12-17

Ngọzi Ma Ọ Bụ Nkọcha—E Nwere Nhọrọ!

“Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ.”—DEUTERỌNỌMI 30:19.

1. Ikike dị aṅaa ka e nyere ụmụ mmadụ?

JEHOVA CHINEKE mere anyị—bụ́ mmadụ o kere eke nwere ọgụgụ isi—ịbụ ndị nweere onwe ha ime nhọrọ. E keghị anyị dị ka nanị ígwè ọrụ nkịtị, ma ọ bụ robot, kama e nyere anyị ihe ùgwù na ibu ọrụ nke ime nhọrọ. (Abụ Ọma 100:3) Ndị mmadụ mbụ—Adam na Iv—nweere onwe ha ịhọrọ ụzọ omume ha, ha ga-azakwa ajụjụ nye Chineke maka nhọrọ ha.

2. Nhọrọ dị aṅaa ka Adam mere, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?

2 Onye Okike enyewo ihe n’ụba maka ndụ mmadụ nke ngọzi na-agaghị agwụ agwụ n’elu ala bụ́ paradaịs. N’ihi gịnị ka a na-ejibeghị mezuo nzube ahụ? N’ihi na Adam mere nhọrọ na-ezighị ezi. Jehova enyewo nwoke ahụ iwu a, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) A sị na Adam họọrọ irube isi, a gaara agọzi nne na nna anyị mbụ. Nnupụisi wetara ọnwụ. (Jenesis 3:6, 18, 19) Ya mere e bufeworo ụmụ Adam nile mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

Ngọzi E Mere Ka E Nwee Ike Inweta

3. Olee otú Chineke si mesie anyị obi ike na a ga-emezu nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ?

3 Jehova Chineke guzobere ụzọ a ga-esi mesịa mezuo nzube ya maka ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ. Ya onwe ya buru ụzọ kwuo banyere otu Mkpụrụ, na-ebu amụma n’Iden, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Chineke mesịrị kwee nkwa na ngọzi ga-abịara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi site ná Mkpụrụ a, nwa Abraham.—Jenesis 22:15-18.

4. Ndokwa dị aṅaa ka Jehova meworo maka ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ?

4 Mkpụrụ nke ngọzi ahụ e kwere ná nkwa mesịrị bụrụ Jisọs Kraịst. Banyere òkè Jisọs na-ekere ná ndokwa Jehova maka ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ, onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie bụ́ ndị rubeere Chineke isi ma jiri uru nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst mee ihe ga-enweta ngọzi. (Ọrụ 4:12) Ị̀ ga-ahọrọ nrubeisi na ngọzi? Nnupụisi ga-eweta ihe dị nnọọ iche.

Gịnị Banyere Nkọcha?

5. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “nkọcha” pụtara?

5 Ihe na-emegide ngọzi bụ nkọcha. Okwu ahụ bụ́ “nkọcha” pụtara ikwu ihe na-adịghị mma banyere mmadụ ma ọ bụ ịbụ ya ọnụ. Okwu Hibru bụ́ qela·lahʹ sitere na ngwaa bụ́ qa·lalʹ, na-apụta n’ụzọ nkịtị “dị fekefeke.” Otú ọ dị, mgbe e jiri ya mee ihe n’echiche ihe atụ, ọ na-apụta ‘ịkọcha’ ma ọ bụ ‘ilelị anya.’—Levitikọs 20:9; 2 Samuel 19:43.

6. Ihe omume dị aṅaa metụtara Elaịsha mere ná nso Betel oge ochie?

6 Tụlee ihe atụ na-akpali akpali nke ime ihe ngwa ngwa nke metụtara nkọcha. Nke a mere ka onye amụma Chineke bụ́ Elaịsha ji ụkwụ site Jeriko na-aga Betel. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Mgbe ya onwe ya na-arịgo n’ụzọ, ụmụ okoro siri n’obodo pụta, wee kwaa ya emo, sị ya, Rịgoo, onye isi nkwọcha; rịgoo, onye isi nkwọcha. O lee anya n’azụ ya, hụ ha, kọchaa ha n’aha Jehova. Nne anụ ọhịa bear abụọ wee si n’oké ọhịa pụta, dọkaa [iri ụmụ okoro anọ na abụọ] n’etiti ha.” (2 Ndị Eze 2:23, 24) E kpugheghị kpọmkwem ihe Elaịsha kwuru mgbe o kwuru okwu nkọcha ahụ site n’ịkọcha ụmụaka ahụ na-eme akaje. Ka o sina dị, okwu ahụ e kwuru n’ọnụ rụpụtara ihe n’ihi na onye amụma Chineke nke na-eme ihe kwekọrọ n’uche Chineke kwuru ya n’aha Jehova.

7. Gịnị mere ụmụaka ahụ mere Elaịsha akaje, n’ihi gịnịkwa?

7 Isi ihe kpatara akaje ahụ yiri ka ọ bụ na Elaịsha yi uwe e ji mara Elaịja, ụmụaka ahụ achọghịkwa onye ga-anọchi anya onye amụma ahụ ịnọ gburugburu ebe ahụ. (2 Ndị Eze 2:13) Iji zaghachi ihe ịma aka nke ya ịbụ onye na-anọchi Elaịja na iji kụziere ndị a na-eto eto na ndị mụrụ ha nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka onye amụma Jehova, Elaịsha ji aha Chineke nke Elaịja kọchaa ìgwè ahụ na-eme akaje. Jehova gosipụtara nkwado ọ kwadoro Elaịsha dị ka onye amụma ya site n’ime ka nne anụ ọhịa bear abụọ si n’oké ọhịa pụta ma dọrie mmadụ 42 n’ime ndị ahụ na-akwa emo. Jehova mere ihe n’ụzọ pụtara ìhè n’ihi ajọ enweghị nkwanye ùgwù ha maka ụzọ nkwurịta okwu o ji na-eme ihe n’elu ala n’oge ahụ.

8. Gịnị ka ndị Israel kweere ime, gịnịkwa bụ olileanya dịịrị ha?

8 Ọtụtụ afọ tupu oge ahụ, ndị Israel gosiri otu ụdị enweghị nkwanye ùgwù ahụ maka ndokwa Chineke. Otú a ka o si malite: Na 1513 T.O.A., Jehova gosiri ndị Israel ihu ọma site n’ịnapụta ha n’agbụ Ijipt dị ka “n’elu nkù ugo.” Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ha kwere nkwa irubere Chineke isi. Rịba ama otú e si jikọọ nrubeisi na ịnata ihu ọma Chineke n’ụzọ a na-apụghị ịtọsa atọsa. Jehova kwuru site n’ọnụ Mosis, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karịa ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile.” Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ahụ kwetara, na-asị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” (Ọpụpụ 19:4, 5, 8; 24:3) Ndị Israel zọọrọ na ha hụrụ Jehova n’anya, rara onwe ha nye ya, ma ṅụọ iyi ịṅa ntị n’olu ya. Ime nke ahụ ga-eweta ngọzi dị ukwuu.

9, 10. Mgbe Mosis nọ n’Ugwu Saịnaị, gịnị ka ndị Israel mere, gịnịkwa si na nke ahụ pụta?

9 Otú ọ dị, tupu ‘mkpịsị aka Chineke’ edee ihe ndị bụ isi ná nkwekọrịta ahụ na nkume, nkọcha Chineke ghọrọ ihe dị mkpa. (Ọpụpụ 31:18) N’ihi gịnị ka e ji kwesị inweta ụdị ihe ọjọọ ndị dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na ndị Israel egosibeghị ọchịchọ ime ihe nile Jehova kwuworo? Ee, n’okwu ọnụ ha chọrọ ngọzi, ma n’omume ha họọrọ ụzọ nke kwesịrị nkọcha.

10 N’ụbọchị 40 mgbe Mosis nọ n’Ugwu Saịnaị na-anata Iwu Iri ahụ, ndị Israel mebiri nkwa mbụ ha bụ́ iguzosi ike n’ihe nye Jehova. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ndị Israel wee hụ na Mosis nọrọ ọdụ isi n’ugwu ahụ rịdata, ndị ahụ wee kpọkọta onwe ha n’ebe Erọn nọ, sị ya, Bilie, meere anyị chi, ndị ga na-eje n’ihu anyị; n’ihi na Mosis a, bụ́ nwoke nke mere ka anyị si n’ala Ijipt rịgopụta, anyị amaghị ihe meworo ya.” (Ọpụpụ 32:1) Nke a bụ ihe atụ ọzọ nke omume enweghị nkwanye ùgwù e gosiri n’ebe onye ozi bụ́ mmadụ nke Jehova ji na-eme ihe mgbe ahụ iji na-edu ma na-atụziri ndị ya nọ. A rabanyere ndị Israel n’iṅomi ikpere arụsị nke Ijipt, ha wee nweta ihe dị oké njọ ọ rụpụtara mgbe e ji mma agha gbuo ihe dị ka 3,000 n’ime ha n’otu ụbọchị.—Ọpụpụ 32:2-6, 25-29.

Nkwupụta Ngọzi na Nkọcha

11. Ntụziaka ndị dị aṅaa banyere ngọzi na nkọcha ka Joshua mezuru?

11 Ka ọ na-eru ná ngwụsị njem 40 afọ nke Israel mere n’ọzara, Mosis depụtasịrị ngọzi nile a ga-enweta site n’ịhọrọ ụzọ nke irubere Chineke isi. O kwupụtakwara nkọcha ndị Israel ga-enweta ma ọ bụrụ na ha ahọrọ inupụrụ Jehova isi. (Deuterọnọmi 27:11–28:10) N’oge na-adịghị anya ka Israel banyesịrị n’Ala Nkwa ahụ, Joshua mezuru ntụziaka Mosis ndị metụtara ngọzi na nkọcha ndị a. Ebo isii nke Israel guzo n’ala ala Ugwu Ibal, isii nke ọzọ weere ọnọdụ n’ihu Ugwu Geraịzim. Ndị Livaị guzo ná ndagwurugwu dị n’agbata ha. N’ụzọ doro anya, ebo ndị guzo n’ihu Ugwu Ibal sịrị “Amen!” ná nkọcha, ma ọ bụ ọbụbụ ọnụ nke a gụụrụ ha. Ndị ọzọ zaghachiri ná ngọzi ndị Livaị gụụrụ ha n’ala ala Ugwu Geraịzim.—Joshua 8:30-35.

12. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime nkọcha nke ndị Livaị kwupụtara?

12 Chetụdị n’echiche na ị nụrụ ka ndị Livaị na-asị: “Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke na-eme arụsị a pịrị apị ma ọ bụ arụsị a wụrụ awụ, bụ́ ihe arụ nke Jehova, ọrụ aka nke onye na-atụ akịka, wee tinye ya n’ebe nzuzo. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-elelị nna ya ma ọ bụ nne ya. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-ewezụga ókèala agbata obi ya. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-eme onye ìsì ka o jehie n’ụzọ. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-ewezụga ikpe nke ọbịa, na nke nwa mgbei, na nke nwanyị di ya nwụrụ. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye ya na nwunye nna ya na-edina; n’ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna ya. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye ya na anụmanụ ọ bụla na-edina. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye ya na nwanne ya nwanyị na-edina, bụ́ nwa nwanyị nke nna ya, ma ọ bụ nwa nwanyị nke nne ya. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye ya na nne nwunye ya na-edina. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-anara ihe iri ngo itigbu mmadụ, bụ́ ịwụsi ọbara nke onye na-emeghị ihe ọjọọ. . . . Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye na-emeghị ka okwu nile nke iwu a guzosie ike, ime ha.” Mgbe e kwusịrị nkọcha nke ọ bụla, ebo ndị nọ n’ihu Ugwu Ibal na-asị, “Amen!”—Deuterọnọmi 27:15-26.

13. N’okwu nke gị, olee otú ị ga-esi ekwupụta ụfọdụ ngọzi nke ndị Livaị kwupụtara?

13 Ugbu a cheedị n’echiche na ị nụrụ ka ndị ahụ nọ n’ihu Ugwu Geraịzim na-eji olu dara ụda na-azaghachi ná ngọzi nke ọ bụla ka ndị Livaị na-ekwupụta, sị: “Onye a gọziri agọzi ka gị onwe gị ga-abụ n’obodo, onye a gọziri agọzi ka gị onwe gị ga-abụkwa n’ọhịa. Ihe a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ, bụ́ mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, bụ́ ụmụ ehi gị mụrụ, na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ gị. Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe gị i ji agwọ achịcha ga-abụ. Onye a gọziri agọzi ka gị onwe gị ga-abụ ná mbata gị, onye a gọziri agọzi ka gị onwe gị ga-abụkwa n’ọpụpụ gị.”—Deuterọnọmi 28:3-6.

14. N’ihe ndabere dị aṅaa ka ndị Israel ga-anata ngọzi?

14 Gịnị bụ ihe ndabere maka ịnata ngọzi ndị a? Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ọ bụrụ na i gee ntị nke ọma n’olu nke Jehova, bụ́ Chineke gị, ilezi anya ime ihe nile O nyere n’iwu, bụ́ nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, na Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-eme gị ka ị kachasịa mba nile nke ụwa elu: ngọzi ndị a nile ga-abịakwasịkwa gị, wee ruo gị ahụ, mgbe ị ga-ege ntị olu Jehova, bụ́ Chineke gị.” (Deuterọnọmi 28:1, 2) Ee, ụzọ isi nweta ngọzi Chineke bụ irubere Chineke isi. Ma gịnị banyere anyị taa? Anyị nile n’otu n’otu ànyị ga-ahọrọ ngọzi na ndụ site n’ịnọgide ‘na-ege ntị nke ọma n’olu Jehova’?—Deuterọnọmi 30:19, 20.

Ilebatụkwu Ya Anya

15. Isi ihe dị aṅaa ka e mere ka ọ pụta ìhè ná ngọzi e dekọrọ na Deuterọnọmi 28:3, oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru na ya?

15 Ka anyị tụgharịa uche n’ụfọdụ ngọzi nke onye Israel pụrụ inweta n’ihi irubere Jehova isi. Dị ka ihe atụ, Deuterọnọmi 28:3 na-asị: “Onye a gọziri agọzi ka gị onwe gị ga-abụ n’obodo, onye a gọziri agọzi ka gị onwe gị ga-abụkwa n’ọhịa.” Ịbụ onye Chineke gọziri adabereghị n’ebe mmadụ nọ ma ọ bụ n’ọrụ e nyere ya. Ụfọdụ pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ ndị ọnọdụ ha jichiri, ikekwe n’ihi na ha na-ebi n’ógbè e tisasịworo n’ụzọ ihe onwunwe ma ọ bụ ná mba agha tisaworo. Ndị ọzọ pụrụ ịchọsi ike ijere Jehova ozi n’ebe dị iche. Ụfọdụ ndị ikom bụ́ ndị Kraịst pụrụ inwe nkụda aka n’ihi na a họpụtabeghị ha dị ka ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, ndị inyom bụ́ ndị Kraịst pụrụ inwe nkụda obi n’ihi na ha anọghị n’ọnọdụ nke ikere òkè n’ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ. Ma, a ga-agọzi onye ọ bụla nke ‘na-ege ntị nke ọma n’olu Jehova ma jiri nlezianya na-eme ihe nile ọ chọrọ’ ugbu a na mgbe nile ebighị ebi.

16. Olee otú nzukọ Jehova taa si na-enweta ahụmahụ nke ụkpụrụ dị na Deuterọnọmi 28:4?

16 Deuterọnọmi 28:4 na-asị: “Ihe a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ, bụ́ mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, bụ́ ụmụ ehi gị mụrụ, na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ gị.” Ojiji e ji nnọchiaha Hibru maka otu onye mee ihe bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “gị” na-egosi na nke a ga-abụ ihe onye Israel na-erube isi ga-enweta n’onwe ya. Gịnị banyere ndị ohu Jehova na-erube isi taa? Mmụba na mgbasawanye n’ụwa nile na-aga n’ihu n’ime nzukọ nke Ndịàmà Jehova bụ ihe sitere ná ngọzi Chineke na-agọzi ezi mgbalị nke ihe karịrị 5,000,000 ndị nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ. (Mak 13:10) Ohere nke mmụba ka ukwuu pụtakwara ìhè n’ihi na ihe karịrị 13,000,000 bịara ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị nke 1995. Ị̀ na-enweta ngọzi Alaeze?

Nhọrọ nke Israel Wetara Ọdịiche

17. Ịbụ ndị ngọzi ma ọ bụ nkọcha ‘ruru ahụ’ dabeere na gịnị?

17 Ihe nke a pụtara bụ na ngọzi ga-achụso onye Israel na-erube isi. E kwere nkwa, sị: “Ngọzi ndị a nile ga-abịakwasịkwa gị, wee ruo gị ahụ.” (Deuterọnọmi 28:2) N’otu aka ahụ, e kwuru banyere nkọcha ndị ahụ, sị: “Nkọcha nile ndị a ga-abịakwasị gị, wee ruo gị ahụ.” (Deuterọnọmi 28:15) Ọ bụrụ na ị bụrịị onye Israel nke oge ochie, ị̀ gaara abụ onye ngọzi ka ọ bụ nkọcha ‘ga-eru ahụ’? Nke ahụ gaara adabere na ma ì rubeere Chineke isi ma ọ bụ ma ì nupụụrụ ya isi.

18. Olee otú ndị Israel gaara esiworị zere nkọcha?

18 Na Deuterọnọmi 28:15-68, e kwupụtara ihe na-egbu mgbu ndị na-esite ná nnupụisi apụta dị ka nkọcha. Ụfọdụ bụ kpọmkwem ihe megidere ngọzi maka nrubeisi ndị a kpọpụtara na Deuterọnọmi 28:3-14. Ọtụtụ mgbe, ndị Israel nwetara ihe dị oké njọ ndị si ná nkọcha pụta n’ihi na ha họọrọ ife ofufe ụgha. (Ezra 9:7; Jeremaịa 6:6-8; 44:2-6) Lee ọdachi ọ bụ! A gaara ezereworị ihe ndị ahụ na-esi na ya apụta site n’ime ezi nhọrọ, nke nrubeisi n’iwu na ụkpụrụ dị mma nke Jehova, nke kọwara ezi ihe na ihe ọjọọ n’ụzọ doro anya. Ọtụtụ ndị taa na-enweta ihe mgbu na ọdachi n’ihi na ha ahọrọwo ime ihe megidere ụkpụrụ Bible site n’ikpe okpukpe ụgha, inwe mmekọahụ rụrụ arụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè, na ihe ndị yiri ha. Dị ka n’Israel na Juda oge ochie, ime nhọrọ ndị dị otú ahụ dị njọ na-eweta nkatọ Chineke na ihe mgbu na-adịghị mkpa nke obi.—Aịsaịa 65:12-14.

19. Kọwaa ọnọdụ ndị e nwetara mgbe Juda na Israel họọrọ irubere Jehova isi.

19 Ngọzi bara ụba, ịdị jụụ jupụtakwara nanị mgbe Israel rubeere Jehova isi. Dị ka ihe atụ, banyere ụbọchị Eze Solomọn, anyị na-agụ, sị: “Juda na Israel dị ọtụtụ, dị ka ájá nke dị n’akụkụ oké osimiri n’ịba ụba, na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. . . . Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo na Bịasheba, ụbọchi nile nke Solomọn.” (1 Ndị Eze 4:20-25) Ọbụna n’oge Eze Devid, bụ́ nke mmegide sitere n’aka ndị iro nke Chineke kara akara, mba ahụ nwetara nkwado na ngọzi Jehova mgbe ha họọrọ irubere Chineke nke eziokwu isi.—2 Samuel 7:28, 29; 8:1-15.

20. Banyere gịnị ka Chineke nwere obi ike n’ebe ụmụ mmadụ nọ?

20 Ị̀ ga-erubere Chineke isi, ka ị̀ ga-enupụrụ ya isi? Ndị Israel nwere nhọrọ. Ọ bụ ezie na anyị nile eketawo ọchịchọ ime mmehie site n’aka Adam, anyị anatawokwa onyinye nke nnwere onwe ime nhọrọ. N’agbanyeghị Setan, ajọ ụwa a, na ezughị okè anyị, anyị pụrụ ime ezi nhọrọ. Ọzọkwa, Onye Okike anyị nwere obi ike na n’ihu ule na ọnwụnwa ọ bụla, a ga-enwe ndị ga-eme ezi nhọrọ, ọ bụghị nanị n’okwu ọnụ kamakwa n’omume. (1 Pita 5:8-10) Ị̀ ga-eso n’ime ha?

21. Gịnị ka a ga-enyocha n’isiokwu na-esonụ?

21 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-enwe ike ịtụ àgwà na omume anyị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dabere n’ihe atụ ndị gara aga. Ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri ekele zaghachi n’okwu Chineke site n’ọnụ Mosis: “Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị.”—Deuterọnọmi 30:19.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee otú Jehova siworo mee ka o kwe ụmụ mmadụ na-eme mmehie omume inweta ngọzi?

◻ Gịnị bụ nkọcha?

◻ Olee otú ndị Israel gaara esiworị nata ngọzi kama nkọcha?

◻ Ngọzi ndị dị aṅaa ka Israel nwetara maka irubere Chineke isi?

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị Israel zukọrọ n’ihu Ugwu Geraịzim na Ugwu Ibal

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya