Ndịàmà ruo n’Ebe Ụwa Sọtụrụ
ETAH
THULE
GODHAVN
GODTHÅB
JULIANEHÅB
ANGMAGSSALIK
THULE bụ akụkụ nke aha e ji mee ihe kemgbe oge ochie iji kọwaa ebe njedebe, nke ọdịdị mbara ala ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. Taa Thule bụ aha nke ógbè dị n’ime ime ebe ugwu Greenland, bụ́ àgwàetiti kasị nnukwu n’ụwa. A gụrụ obodo nta ahụ aha ahụ na 1910, mgbe onye Denmark na-eme nchọpụta bụ́ Knud Rasmussen jiri ya mee ihe dị ka isi ọnọdụ maka njem nchọpụta ihe n’ebe ugwu ụwa. Ọbụna ugbu a, ije Thule bụ njem nchọpụta ihe karịa ka ọ bụ njem ntụrụndụ.
Ma, e nwere mkpa dị ngwa maka ime njem nchọpụta ihe gaa Thule. Ná nzaghachi nye iwu Jisọs bụ́: “Unu ga-abụkwa ndịàmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ,” ọ dị Ndịàmà Jehova ọkụ n’obi iweta ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe a, bụ́ otu n’ime obodo nta na-adịgide adịgide nke ụmụ mmadụ nke kasị dịrị n’ebe ugwu ụwa.—Ọrụ 1:8; Matiu 24:14.
‘Olee Mgbe Anyị Ga-enwe Ike Ije Thule?’
Na 1955 Ndịàmà abụọ bụ́ ndị Denmark bụ́ ndị chọrọ ikere òkè n’ime nkwusa “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ” bịarutere Greenland. Ndị ọzọ bịara ka e mesịrị, nwayọọ nwayọọ kwa ime nkwusa ha gụnyere ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ ruo na Melville Bay nakwa gatụkwuo n’ebe ụsọ oké osimiri ọwụwa anyanwụ. Ma a na-eru akụkụ ndị dị anya karị dị ka Thule site n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ telifon.
Otu ụbọchị na 1991, Bo na nwunye ya, bụ́ Helen, bụ́ ndị ozi oge nile abụọ, guzo n’elu otu oké nkume na-eleda anya na Melville Bay. N’ilega anya n’ebe ugwu ha chere, sị, ‘Olee mgbe anyị ga-enwe ike ijeru Thule iji wegara ndị nọ n’ebe ahụ ozi ọma Alaeze?’
Na 1993, Werner, bụ́ onye ozi oge nile ọzọ, jisiri ike jiri ụgbọ mmiri ya bụ́ Qaamaneq (Ìhè), nke dị 5.5 mita, wee gafere Melville Bay. O jiriworị ụgbọ mmiri gaa 1,200 kilomita site na Godthåb ruo n’ógbè Upernavik. Ma, ịgafere Melville Bay—bụ́ obosara mmiri Arctic dị 400 kilomita—bụ nnọọ ihe ọzọ dị iche. N’akụkụ ka ukwuu n’ime afọ, ice na-ekpuchi ọnụ mmiri ahụ. Werner nwere ike ịgafere ọnụ mmiri ahụ, ọ bụ ezie na otu injin ya mebiri n’ihi ice. O jisikwara ike rụtụ ọrụ ime nkwusa tupu ọ laghachi.
Ịga Thule
Ka o mesịrị njem ahụ, Werner malitere ime atụmatụ ndị ọhụrụ. O sooro Arne na Karin—ndị nwekwara otu ụgbọ mmiri, nke dị mita asaa n’ogologo ma nwee ebe izuru ike anọ n’ime ya na, nke kasị mkpa, nwee ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji anya ụgbọ mmiri—kwurịta okwu banyere ha nile ijikọ aka jee Thule. Ụgbọ mmiri ndị ahụ ga-abụ ebe obibi, ebe e nwekwara ụgbọ mmiri abụọ na-emekọ njem ọnụ, ịgafe Melville Bay agaghị adịcha ize ndụ. Iji jezuo obodo bụ isi nke nwere 600 mmadụ bi n’ime ya na ógbè isii ndị dị n’akụkụ ahụ, ha chọkwuru enyemaka. Ya mere ha kpọrọ Bo na Helen na Jørgen na Inge—ha nile bụcha ndị ozi nweworo ahụmahụ ndị ime njem ná mba a doro anya—ka ha soro ha gaa. Mmadụ ise n’ime ìgwè a na-asụ Greenlandic.
Ha bu ụzọ zipụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. A kwajukwara akwụkwọ n’ime ụgbọ mmiri ndị ahụ, tinyere ihe ndị dị mkpa bụ́ ihe oriri na mmiri, mmanụ ụgbọ mmiri, na otu injin ọzọ, na otu ụgbọ mmiri dinghy e ji rọba mee. Mgbe ahụ, n’August 5, 1994, mgbe ọtụtụ ọnwa nke ime nkwadebe gasịrị, ìgwè ahụ zukọtara, ụgbọ mmiri abụọ ahụ nọkwa na-echere ma bụrụ ndị a kwajupụtara ihe n’ime ha n’ọdụ ụgbọ mmiri Ilulissat. A malitere njem ịga ebe ugwu ahụ. Werner, Bo, na Helen nọ n’ụgbọ mmiri nke ka nta n’ime ụgbọ mmiri abụọ ahụ. “Nanị ihe ị pụru ime bụ ịnọdụ ala ma ọ bụ dinara n’ebe izuru ike gị ma jide ihe aka,” ka Bo na-ede. Ka anyị soro ihe ndekọ ụgbọ mmiri ahụ maka njem ahụ.
“E nwere osimiri dị jụụ nke gbasapụrụ ruo ebe dị anya. Anyị hụrụ mbara ndị mara mma nke ukwuu—osimiri na-egbuke egbuke, aluluu ndị gbachiri agbachi, anyanwụ na-acha gbaa na eluigwe na-acha anụnụ anụnụ, oké mkpụkọ ice ndị nwere ọdịdị na àgwà ndị mara mma, anụ walrus na-acha nchara nchara nke na-anya anwụ n’elu iberibe ice, ọdịdị ụsọ oké osimiri nke nwere mkpọda ugwu na-eji ojii na ntakịrị mbara ala—ọdịdị mara mma nke ebe ahụ enweghị ọgwụgwụ.
“Otú ọ dị, akụkụ kasị adọrọ mmasị bụ ije leta obodo nta ndị dị n’ụzọ. Ndị mmadụ na-apụta mgbe nile, karịsịa ụmụaka, n’ebe e si abanye n’ụgbọ mmiri ịbịa hụ ndị ọbịa ahụ na ịnabata ha. Anyị kesara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ma gbazinye ndị ahụ ihe nkiri vidio banyere nzukọ anyị. Ọtụtụ ndị kiriri ya tupu anyị alawa. Na Ndịda Upernavik, ọtụtụ ndị jiri ụgbọ mmiri bịa n’ụgbọ mmiri anyị ọbụna tupu anyị abata. Ya mere ná mgbede ahụ nile, ndị ọbịa batara n’ime ụgbọ anyị, anyị zaakwa ọtụtụ ajụjụ Bible.”
Ugbu a, mgbe a gasịrị 700 kilomita ndị mbụ na njem ahụ, ụgbọ mmiri abụọ ahụ dị njikere ịgafere Melville Bay.
Ihe Ịma Aka Tara Akpụ
“Ọtụtụ ndị weere nke a dị ka akụkụ tara akpụ na njem ahụ. Anyị aghaghịkwa ime ngafere ahụ n’akwụsịghị akwụsị n’ihi na ice ka kpuchiri obodo nta bụ́ Savissivik (bụ́ ebe ókèala ahụ malitere nakwa ebe anyị gaara agbaba).
“Ya mere anyị nupụrụ. Ebe ọ bụ na e nwere ice dị ukwuu, anyị bamikwuru n’etiti osimiri. Ọ dabaara anyị na mmiri ahụ dị jụụ. O nweghị ihe ndị na-adọrọ mmasị mere na hour ndị mbụ—ka anyị na-agba ọtụtụ mile nke oké osimiri. Ka ọ na-erule ná mgbede anyị hụrụ Cape York wee jiri nwayọọ nwayọọ chee ihu n’ebe ugwu, ebe ka dịdewe ala karị. Ugbu a ice jupụtakwara ọzọ—iberibe ice ndị ochie, ndị buru ibu, ndị na-agbarisị agbarisị ruo n’ebe anya pụrụ iru. Anyị sooro akụkụ ice ahụ gawa ruo ebe dị anya, mgbe ụfọdụ na-abanyetụ n’oghere ndị dị ntakịrị. Mgbe ahụ aluluu gbachiri, nke yiri ofe rọrọ arọ nke na-acha ntụ ntụ, nke na-amakarịsị mma n’ìhè nke ọdịda anyanwụ. Ebili mmiri ahụkwa! Aluluu, ebili mmiri, na ice ha nile n’otu mgbe ahụ—nke ọ bụla n’ime ihe ndị a na-abụkarị ihe ịma aka zuru ezu.”
Nnabata Anyị
“Anyị banyere ná mmiri ndị dị jụụ karị ka anyị na-abịaru Pituffik. Ihe okike nyere anyị nnabata kpụ ọkụ n’ọnụ: anyanwụ nke dị n’eluigwe na-acha anụnụ anụnụ; n’ihu anyị, warara mmiri nke batara n’agbata ugwu abụọ, nke dị obosara, na-egbuke egbuke, nke mkputamkpu ice sere n’elu mmiri dịsasịrị n’ime ya; n’ihu ihu kwa, onyoonyo nke nkume dị na Dundas—Thule ochie—bụ́ nke e ji mara ebe ahụ!” Ịgatụkwu ihe dị ka 100 kilomita n’ebe ugwu, ndị njem ahụ ruru ebe ha na-eje.
Ugbu a ọ dị ha ọkụ n’obi ịmalite ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Mmadụ abụọ n’ime ha nwetara nzaghachi na-adịghị mma n’ọnụ ụzọ mbụ. “A jụrụ anyị dị nnọọ ka a ga-asị na anyị nọ na Denmark,” ka ha kwuru. “Ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nyere anyị nnabata na-ekpo ọkụ. Ndị ahụ bụ ndị na-eche echiche na ndị ma nke a na-akọ. Ụfọdụ n’ime ha kwuru na ha anụwo banyere anyị na obi dịkwa ha ụtọ na anyị mesịrị bịa. Anyị zutere ụfọdụ ndị bụ́ nnọọ ezigbo mmadụ, dị ka ndị na-achụ nta anụ seal ndị bịaworo ịchụ nta n’Akụkụ Ebe Ugwu Ụwa, na ndị obodo, bụ́ ndị afọ juru na ndị na-akpị ihe, ndị nwekwara obi abụọ ụfọdụ banyere mmepeanya ọgbara ọhụrụ.”
Ụbọchị ole na ole ndị sochirinụ wetaara onye ọ bụla ahụmahụ ndị mara mma. N’ebe nile e jiri ekele nara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. N’ebe obibi ụfọdụ Ndịàmà ahụ malitere ọmụmụ Bible n’egbughị oge. Inge na-akọ banyere otu ebe obibi ebe ọ hụrụ onye nwere mmasị: “Ọ bụ ụlọ e debere ọcha, dịkwa ntụsara ahụ nke nwere otu ọnụ ụlọ. Ruo ụbọchị atọ ná nsochi, anyị jere leta otu nwoke dị nwayọọ nke bi ebe ahụ wee nwee nnọọ mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ bụ onye na-achụ nta anụ seal n’eziokwu, ntakịrị ụgbọ mmiri ya dịkwa n’èzí. Ọ gbagbuwo ọtụtụ anụ bear, walrus, nakwa anụ seal. Mgbe ikpeazụ anyị jere leta ya, anyị soro ya kpee ekpere, anya mmiri jukwara ya anya. Ugbu a anyị aghaghị ịhapụrụ Jehova ihe nile ma na-enwe olileanya inwe oge na ohere iji laghachi.”
Ndị Eskimo nke Canada na-abịa Thule ọtụtụ ugboro. Inge na-akọ, sị: “Mụ na Helen zutere ọtụtụ ndị Eskimo si Canada. Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị na ha pụrụ iso ndị Greenland kwurịta okwu; ndị nọ n’ógbè Arctic ahụ yiri ka ha na-asụ asụsụ yiri ibe ha. Ọ bụ ezie na ndị Eskimo nke Canada nwere asụsụ nke ha a na-ede ede, ha nwere ike ịgụ akwụkwọ anyị n’asụsụ Greenlandic. Nke a pụrụ imeghere ha ohere ndị magburu onwe ha.”
E jekwara leta obodo nta ndị dị 50 ruo 60 kilomita ma e jiri ụgbọ mmiri gawa site n’ebe ahụ. “Mgbe anyị na-aga n’obodo nta bụ́ Qeqertat, anyị nọgidere na-aga n’ụsọ oké osimiri, na-atụ anya ịhụ ndị pụtara ịchụ nta anụ narwhal. Dịkwa ka anyị tụrụ anya ya, n’elu otu oké nkume, anyị hụrụ otu ogige nke ihe mejupụtara ya bụ ezinụlọ atọ ma ọ bụ anọ, ndị yi akpụkpọ anụ, ha na ụlọ ntu ha na ntakịrị ụgbọ mmiri ha. Na-eji ube nke ábụ́bà dị n’ọdụ ya n’aka, ndị ikom ahụ na-anọ n’elu otu oké nkume onye nọsịa ibe ya anọọ maka ichere anụ narwhal ahụ a na-achọsi ike. Ebe ha cherewooro ruo ọtụtụ ụbọchị n’ahụghị ya, obi adịchaghị ha mma ịhụ anyị n’ihi na anyị pụrụ ịchụfusi azụ whale ndị ahụ! O yiri nnọọ ka ha amaghị ihe na-aga n’ebe ndị ọzọ. Ụmụ nwanyị nakweere akwụkwọ ụfọdụ, ma oge ahụ abụghị oge kwesịrị ekwesị maka inwekwu nkwurịta okwu. Anyị mesịrị rute na Qeqertat n’elekere 11 nke abalị ma kpọtụsịara ụlọ ikpeazụ dị n’obodo nta ahụ n’elekere 2 nke ndeeri!”
“N’ikpeazụ anyị ruru Siorapaluk, bụ́ ebe obibi kasị dịrị n’ebe ugwu na Greenland. Ọ dị n’ụsọ mmiri nke bụ́ ájá ájá n’ala ala nke nkume ndị ahịhịa ndụ kpuchiri elu ha na gburugburu ebe kpọrọ nkụ.” Ndịàmà ahụ eruwo ebe ụwa sọtụrụ n’ụzọ nkịtị, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’akụkụ ebe ugwu, n’ọrụ ime nkwusa ha.
E Jezuo Njem Ahụ
Ndịàmà ahụ arụzuwo ọrụ ha. Ha emewo nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na site n’ụlọ ntu ruo n’ụlọ ntu, nyefee akwụkwọ, nata ụtụ, gosi ihe nkiri vidio, gwa ọtụtụ ndị bi na Greenland okwu, duziekwa ọmụmụ Bible. Ugbu a oge eruola ịla. “Mgbe anyị banyere n’ụgbọ dinghy anyị ná mgbede ahụ iji kpara ụgbọ si n’ógbè Moriusaq ahụ pụọ, mmadụ ole na ole nnọọ bịara n’ụsọ mmiri ahụ ịbịa sị anyị ka e mesịa, jiri akwụkwọ ma ọ bụ broshuọ ndị ha nwetaworo na-efere anyị aka.”
Ka e mesịrị, n’akụkụ ụsọ oké osimiri ahụ nke ọ na-enweghị onye bi na ya, ọ tụrụ Ndịàmà ahụ n’anya ịhụ otu nwoke nke nọ n’elu otu nkume wee na-efe aka—n’etiti ebe ahụ dịpụrụ adịpụ! “N’ezie, anyị pụrụ n’elu ala ije zute ya. Ọ dabara na ọ bụ otu nwa okorobịa si Berlin, Germany, bụ́ onye ji ntakịrị ụgbọ mmiri ya na-aga n’ogologo ụsọ oké osimiri ahụ, ọ nọwokwa na-eme njem ruo otu ọnwa. Na Germany, Ndịàmà Jehova na-abịachi anya na nke ya, o nwekwara ụfọdụ n’ime akwụkwọ ha. Anyị na ya nọrọ hour ole na ole, o nwekwara mmasị n’ezie ịhụ Ndịàmà n’ụdị ebe ahụ.”
N’obodo nta bụ́ Savissivik, bụ́ nke a mafere n’ojije, ndị ozi ahụ na-eme njem nwetara nnabata kpụ ọkụ n’ọnụ. Ụfọdụ ndị nọ n’ebe ahụ enwetawo ma gụọ akwụkwọ ụfọdụ n’afọ gara aga, ọ na-agụkwa ha agụụ inwetakwu nri ime mmụọ.
Ịgafere Melville Bay ná nlọta were hour 14. “Anyị hụrụ ọdịda anyanwụ, nke bụ́ ahụmahụ na-adịru ọtụtụ hour n’ebe a, na-enwe ọtụtụ mgbanwe nke àgwà ndị mara oké mma. Ọwụwa anyanwụ, bụ́ nke na-esochi ozugbo, nọtekwara aka. Ka ụzarị ìhè nke yiri akụpe na-acha ọbara ọbara na uhie uhie nke ọdịda anyanwụ ka kpuchiri igwe nke ebe ugwu nke ọwụwa anyanwụ, anyanwụ wara nke nta n’akụkụ ndịda. Ọ bụ ọdịdị a na-apụghị ịkọwa akọwa—ma ọ bụ ọbụna see foto—n’ụzọ zuru ezu.” Ndị so na-eme njem ụgbọ mmiri mụ anya n’abalị nile.
“Mgbe anyị ruru Kullorsuaq, ike gwụsịrị anyị nnọọ. Ma anyị nwere obi ụtọ na afọ ojuju. Anyị ejezuola njem ahụ n’ụzọ gara nke ọma! N’ihe fọdụrụ na njem ahụ, anyị hụrụ ọtụtụ ndị nwere mmasị n’obodo na n’obodo nta ndị dị n’ụsọ oké osimiri ahụ. Ugboro ugboro a jụrụ ajụjụ bụ́, ‘N’ihi gịnị ka ụfọdụ n’ime unu na-apụghị iji soro anyị nọrọ? Ọ dị anyị mwute ịhụ ka unu na-ala ngwa ngwa otú a!’”
Na Qaarsut otu ezinụlọ nwere omume enyi kpọrọ mmadụ ise ná ndị ọbịa ahụ òkù ịbịa soro ha rie nri. “Ezinụlọ ahụ chọrọ ka anyị nọbọọ chi. Ma ebe e nwere ebe ndị ka mma ịkwụsị na 40 kilomita n’ihu, anyị jụrụ wee nyara ụgbọ mmiri anyị gawa. Ka e mesịrị anyị nụrụ na nnukwute mkpụkọ ice kewara n’isi ụtụtụ echi ya, ebili mmiri mekwara ka ntakịrị ụgbọ mmiri 14 kpuo n’ebe ahụ anyị nọburu!”
N’ikpeazụ, ìgwè ahụ lọtara Ilulissat, ebe ha mesịworo njem nchọpụta ihe ha gaa Thule. N’ihe dị ka n’otu oge ahụkwa, ndị nkwusa abụọ ọzọ jere n’akụkụ ndị dịpụrụ adịpụ n’ụsọ oké osimiri ọwụwa anyanwụ nke Greenland. Na njem abụọ ahụ, ndị nkwusa ahụ kesara ngụkọta nke 1,200 akwụkwọ, 2,199 broshuọ, na 4,224 magazin, ha nwetakwara 152 ụtụ. Ugbu a a nọgidere jiri telifon na akwụkwọ ozi na-akpọtụrụ ndị ọhụrụ nwere mmasị.
N’agbanyeghị oge, ike, na ego ọ na-ewe, Ndịàmà Jehova na-enweta ọṅụ dị ukwuu n’imezu iwu Nna ha ukwu nyere ha ‘ịbụ ndịàmà m . . . ruo n’ebe ụwa sọtụrụ.’—Ọrụ 1:8.
[Igbe dị na peeji nke 28]
N’ụsọ Oké Osimiri Ọwụwa Anyanwụ Greenland
N’IHE dị ka n’otu oge ahụ ìgwè ndị nkwusa ahụ ruru Thule, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà, bụ́ Viggo na Sonja, gara n’ókèala ọzọ a na-adịghị arụ ọrụ na ya—Ittoqqortoormiit (Scoresbysund) n’akụkụ ụsọ oké osimiri ọwụwa anyanwụ nke Greenland. Iji garuo ebe ahụ, ha aghaghị ịga Iceland, gbaa ụgbọ elu laghachi Constable Point n’ụsọ osimiri Greenland, wee jirizie helikọpta gawa.
“Nke a bụ nke mbụ Ndịàmà Jehova bịaworo n’ebe a,” ka ndị ọsụ ụzọ abụọ a na-akọ, bụ́ ndị asụsụ ala ha bụ Greenlandic. “N’agbanyeghị nkewapụ e kewapụrụ ha, n’ụzọ na-eju anya, ndị ahụ ma nke a na-akọ. Ma, obi dịkwa ha ụtọ ịmụta ihe ndị ọhụrụ. Dị ka ndị nwere onyinye ịkọ akụkọ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ anyị banyere achụmnta ha nke anụ seal na ahụmahụ ndị ọzọ n’okike.” Hà si aṅaa zaghachi n’ọrụ nkwusa ahụ?
“Ka anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị zutere J——, bụ́ onye katkist. ‘Unu emeela maka ime ka m soro ná ndị unu kpọtụụrụ,’ ka o kwuru. Anyị gosiri ya akwụkwọ anyị na otú e si eji ya eme ihe. N’echi ya ọ bịakwutere anyị ma chọọ ịmụtakwu banyere aha ahụ bụ́ Jehova. Anyị gosiri ya nkọwa nke dị n’ala ala peji nke Bible Greenlandic nke ya. Mgbe anyị pụrụ, ọ kpọrọ ndị enyi anyị nọ na Nuuk na telifon iji kwupụta ekele ya maka ọbịbịa anyị. Anyị aghaghị ịgbalị ịnọgide na-enyere nwoke a aka.
“Anyị zutekwara O——, bụ́ onye nkụzi nke maara banyere Ndịàmà Jehova. O nyere anyị hour abụọ iji gwa klas ya nke ndị nọ n’agbata afọ 14 ruo 16 okwu. Ya mere anyị gosiri ha ihe nkiri vidio anyị ma zaa ajụjụ ha. Akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Worka na akwụkwọ ndị ọzọ gara ọkụ ọkụ. Anyị zutere atọ n’ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ ka e mesịrị. Ha jụrụ ọtụtụ ajụjụ, otu n’ime ha nwere mmasị karịsịa. Ọ jụrụ, sị, ‘Olee otú mmadụ si aghọ Onyeàmà? Ọ ghaghị ịbụ ihe obi ụtọ ịdị ka unu. Papa m nọkwa unu n’akụkụ.’ Anyị kwere nkwa idere ya akwụkwọ ozi.
“N’otu n’ime obodo nta ndị ahụ, anyị zutere onye katkist ọzọ, M——, anyị nwekwara mkparịta ụka mara mma. O kwuru na ya ga-ahụ na ndị ikom ahụ gara ịchụ nta ga-enweta akwụkwọ anyị ozugbo ha lọtara. Ya mere ọ bụ ‘onye nkwusa’ anyị ugbu a n’ebe ahụ dịmiri adịmi.”
Ọ bụ ezie na ọ bụ njem ịga gburugburu, nke tara akpụ, ndị ọsụ ụzọ abụọ ahụ nwere mmetụta na mgbalị ha nwetara ụgwọ ọrụ bara ụba.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.