O Jeere Jehova Ozi n’Obi Umeala
“Ọ BỤCHAGHỊ ebe ị nọ na-eje ozi kama ọ bụ onye ị na-ejere ozi bụ ihe dị mkpa n’ezie.” John Booth na-ekwukarị okwu ndị ahụ, o bikwara ndụ kwekọrọ na ha. Ụzọ ndụ ya n’elu ala, bụ́ nke gwụrụ na Monday, January 8, 1996, gosiri n’ụzọ doro anya onye ọ họọrọ ijere ozi.
Dị ka nwa okorobịa laa azụ na 1921, John Booth nọ na-achọ nzube ná ndụ. Ọ kụziri Sunday school na Chọọchị Dutch Reformed, ma o guzogidere echiche nke inweta ọzụzụ iji ghọọ onye okwuchukwu n’ihi na o chere na ndị ụkọchukwu biri ndụ ịchọ ọdịmma onwe ha nanị. Mgbe ọ hụrụ akwụkwọ na-akpọsa okwu a kpọrọ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị,” ọ tụfughị oge n’izipụ ozi maka akwụkwọ ọ kpọsara. N’ịbụ onye ihe ọ gụworo dọọrọ mmasị ya, n’oge na-adịghị anya o jiri ịnyịnya ígwè na-agba 24 kilomita na-aga ná nzukọ nke Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. E mere ya baptism na 1923, ọ malitekwa ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ógbè Wallkill, New York, bụ́ ebe ezinụlọ ya nwere ugbo mmiri ara ehi.
Nwanna Booth banyere n’ozi oge nile n’April 1928. O mere nkwusa n’ókèala ebe a mụrụ ya nakwa ime ime obodo nke Ebe Ndịda, na-eji akwụkwọ e ji amụ Bible na-agbanwere nri na ebe obibi. Ọ ghaghị iji obi ike nagide ụdị ihe ize ndụ ndị dị ka ndị nwere ụlọ ọrụ na-esi mmanya na-aba n’anya ndị iwu na-akwadoghị bụ́ ndị na-ebugharị égbè, nke otu n’ime ha gbara onye ya na John Booth na-asụkọ ụzọ égbè ma merụọ ya ahụ. Na 1935, a họpụtara Nwanna Booth dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ọ malitekwara ije leta ọgbakọ dị iche iche na ígwè ndị ka nta gburugburu mba ahụ. Ọ haziri mgbakọ dị iche iche ma nyere ụmụnna nwoke na nwanyị aka ịnọgidesi ike n’agbanyeghị mmegide. Izute ìgwè na-eme ihe ike iwe na-ewe, iguzo n’ụlọikpe, na ịbụ onye a tụrụ mkpọrọ ghọrọ ihe na-abịakarịrị Nwanna Booth. “Ọ ga-ewe otu akwụkwọ iji kọọ ihe nile banyere oge ndị ahụ na-akpali akpali,” ka o dere n’otu mgbe.
Na 1941, Joseph F. Rutherford, onye isi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ, kenyere Nwanna Booth ịrụ ọrụ n’Ugbo Alaeze, ná nso Ithaca, New York. N’ebe ahụ o jere ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo 28 afọ. N’ịbụ onye ịhụnanya ya maka ozi ahụ na-ebelataghị, o nwere obi ụtọ kemgbe ọtụtụ afọ isonyere ọtụtụ puku ụmụ akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead maka ọzụzụ ndị ozi ala ọzọ, bụ́ nke dị ebe ahụ n’Ugbo Alaeze ruo 1961. Na 1970, a gwara Nwanna Booth ka o jee ozi n’Ugbo Watchtower dị na Wallkill, New York, wee si otú a hụta onwe ya n’otu ebe ahụ ọ malitere ịsụ ụzọ ihe dị ka 45 afọ tupu mgbe ahụ.
Na 1974, a họpụtara Nwanna Booth dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na Brooklyn, New York. O jere ozi n’ọkwá ahụ n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya n’afọ ndụ nke 93. A hụrụ John Booth n’anya nke ukwuu maka ọdịdị onye Kraịst ya nke obi umeala na obi ọma. Ruo mgbe ahụ ike na ume ya na-ekwekwaghị ya, o ji ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na n’okporo ámá nke obodo ukwu.
Ọ bụ ezie na ndị sooro ya jee ozi na-eru újú ọnwụ ya, ha na-enweta nkasi obi ná nkwa Bible banyere ndị Kraịst e tere mmanụ dị otú ahụ, na a na-akpọlite ha n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe nakwa na “ọrụ nile ha na-eso ha gaa.” (Mkpughe 14:13; 1 Ndị Kọrint 15:51-54) Ọ bụ n’ezie ọnọdụ ọhụrụ, ma ọ bụ nke John Booth ga-enwe ike ịnọ na ya jeere Jehova ozi ruo ebighị ebi!
[Foto dị na peeji nke]
John Booth 1903-1996
[Foto dị na peeji nke]
HERALD-AMERICAN, ANDOVER
76 Jehovites Jailed in Joliet
[Ebe E Si Nweta Foto]
Chicago Herald-American