Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ànyị pụrụ ikwu na ndị ohu Chineke taa bụ́ ndị nwere olileanya elu ala nwere ọ̀tụ̀tụ̀ mmụọ Chineke dị ka ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nwere?
Ajụjụ a abụghị ihe ọhụrụ. A tụlere otu okwu a n’ime “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche (Bekee) nke April 15, 1952. Ọtụtụ aghọwo Ndịàmà kemgbe ahụ, ya mere anyị pụrụ ịtụle ajụjụ ahụ, mgbe a na-emekwa nke a, tụleghachi ihe ihe ahụ e dere na mbụ kwuru.
N’ụzọ bụ isi, azịza ya bụ, ee, ụmụnna nwoke na nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi nke òtù atụrụ ọzọ ahụ pụrụ isoro ndị e tere mmanụ kere òkè hà nhata n’ịnata mmụọ nsọ Chineke.—Jọn 10:16.
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na mmụọ ahụ na-arụ ọrụ n’otu ụzọ ahụ n’ahụ mmadụ nile n’otu n’otu. Cheta ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst, bụ́ ndị natara mmụọ Chineke n’ezie. Site n’ike mmụọ ahụ, ụfọdụ n’ime ha gburu ajọ anụ ọhịa, gwọọ ndị ọrịa, ọbụna mee ka ndị nwụrụ anwụ bilie. Mmụọ ahụ dịkwa ha mkpa iji dee akwụkwọ Bible n’okpuru ike mmụọ nsọ. (Ndị Ikpe 13:24, 25; 14:5, 6; 1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:17-37; 5:1-14) Ụlọ Nche ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ha anọghị n’òtù ndị ahụ e tere mmanụ, ha jupụtara na mmụọ nsọ.”
Isi n’akụkụ ọzọ lee ya anya, tụlee ndị ikom na ndị inyom nọ na narị afọ mbụ bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, na-aghọ ụmụ ime mmụọ nke Chineke ndị nwere olileanya eluigwe. E teworị ha nile mmanụ, ma nke ahụ apụtaghị na mmụọ ahụ site na mgbe ahụ rụrụ ọrụ n’otu ụzọ ahụ n’ahụ ha nile. Nke ahụ doro anya site ná 1 Ndị Kọrint isi nke 12. N’ebe ahụ Pọl onyeozi tụlere onyinye dị iche iche nke mmụọ nsọ. Anyị na-agụ n’amaokwu nke 8, 9, na 11, sị: “A na-esite n’aka Mmụọ Nsọ nye otu onye okwu amamihe; a na-enyekwa onye ọzọ okwu ọmụma, dị ka Mmụọ ahụ na-achọ: nyekwa ibe ya okwukwe, n’ime otu Mmụọ ahụ; nyekwa onye ọzọ onyinye amara nile ime ka ahụ mmadụ dị ike, n’ime otu Mmụọ nke a. . . . Ma ihe ndị a nile ka otu Mmụọ ahụ na-arụsi ike, nanị Ya, na-ekere mmadụ nile n’otu n’otu, ebe onye ọ bụla nọ O keere ya dị ka Ọ na-achọ.”
N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ bụghị ndị nile e tere mmanụ laa azụ n’oge ahụ nwere onyinye mmụọ nsọ nke ịrụ ọrụ ebube. Ná 1 Ndị Kọrint isi nke 14, Pọl kpọrọ aha otu nzukọ ọgbakọ ebe otu onye nwere onyinye asụsụ dị iche iche, ma o nweghị onye nọ ebe ahụ nwere onyinye nsụgharị. Otú o sina dị, n’oge ụfọdụ tupu mgbe ahụ, nke ọ bụla n’ime ha abụrụwo onye e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na nwanna ahụ nwere onyinye nke asụsụ dị iche iche nwere mmụọ ahụ karịa ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ? Ee e. Ndị ọzọ ahụ e tere mmanụ abụghị ndị ihe kọrọ, dị ka a ga-asị na ha enweghị ike ịghọta Bible nke ọma otú ahụ onye ahụ ghọtara ma ọ bụ cheekwa ule ihu. Mmụọ ahụ rụrụ ọrụ n’ụzọ pụrụ iche n’ahụ nwanna ahụ pụrụ ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Ma, ọ dị ya na ha mkpa ịnọ Jehova nso na ịnọgide ‘na-ejupụta na Mmụọ Nsọ,’ dị ka Pọl dere.—Ndị Efesọs 5:18.
Banyere ndị so n’ihe ahụ fọdụrụ taa, ha anatawo mmụọ Chineke n’ezie. N’otu oge ọ rụrụ ọrụ n’ahụ ha n’ụzọ pụrụ iche—n’oge e tere ha mmanụ ma kuchie ha dị ka ụmụ ime mmụọ. Site na mgbe ahụ ha nọgidere ‘na-ejupụta na Mmụọ Nsọ,’ na-enwe enyemaka ya mgbe ha na-achọ ịghọta Bible n’ụzọ doro anya karị, na-ebute ụzọ n’ọrụ nkwusa, ma ọ bụ na-eche ule ihu—nke onwe onye ma ọ bụ nke nzukọ.
Ndị òtù nke “atụrụ ọzọ ahụ,” ọ bụ ezie na ha enwebeghị ahụmahụ nke ịbụ ndị e tere mmanụ, na-anata mmụọ nsọ n’akụkụ ndị ọzọ. Ụlọ Nche (Bekee) nke April 15, 1952, kwuru, sị:
“‘Atụrụ ọzọ’ ahụ taa na-arụ otu ọrụ ime nkwusa ahụ nke ihe fọdụrụ ahụ na-arụ, n’okpuru otu ọnọdụ ndị ahụ na-ele ule, ma gosipụta otu ikwesị ntụkwasị obi na iguzosi ike n’ezi ihe ahụ. Ha na-eri nri site n’otu table ime mmụọ ahụ, na-eri otu nri ahụ, na-amịkọrọ otu eziokwu ahụ. Ịbụ ndị òtù elu ala, na-enwe olileanya elu ala na mmasị siri ike n’ihe ndị dị n’elu ala, ha nwere ike inwe mmasị karị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị metụtara ọnọdụ elu ala n’ime ụwa ọhụrụ ahụ; ebe ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, n’inwe olileanya eluigwe na mmasị onwe onye siri ike n’ihe mmụọ nsọ, nwere ike iji ịdị uchu ka ukwuu na-amụ ihe ndị ahụ dị n’Okwu Chineke. . . . Ma eziokwu dị na ya bụ na otu eziokwu ahụ na otu nghọta ahụ dị nye òtù abụọ ahụ, ọ bụkwa nanị otú ha n’otu n’otu si tinye uche ha n’ịmụ ihe na-ekpebi nghọta nke ihe eluigwe na elu ala ha na-enweta. Mmụọ Onyenwe anyị dị n’ụzọ hà nhata nye òtù abụọ ahụ, a na-enyekwa ha abụọ ihe ọmụma na nghọta n’ọ̀tụ̀tụ̀ hà nhata, nakwa ohere hà nhata maka ịmịkọrọ ya.”