Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
“Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”—1 JỌN 5:3.
1, 2. N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị eju anya na Chineke nwere ihe ọ chọrọ maka ndị chọrọ ife ya ofufe n’ụzọ ọ na-anara?
“OKPUKPE m dị m mma!” Nke ahụ ọ́ bụghị ihe ndị mmadụ na-ekwukarị? Ma, n’ezie, ajụjụ kwesịrị ịbụ, “Okpukpe m ọ̀ na-amasị Chineke?” Ee, Chineke nwere ihe ọ chọrọ n’aka ndị chọrọ ife ya ofufe n’ụzọ ọ na-anara. Nke ahụ ò kwesịrị iju anyị anya? O kwesịghị. Ka e were ya na i nwere otu ụlọ mara mma, nke i jiri ego buru ibu wuzigharịa n’oge na-adịbeghị anya. Ị̀ ga-ekwe ka onye ọ bụla nnọọ biri n’ebe ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Onye ọ bụla ga-ebi na ya aghaghị iru ihe ị chọrọ.
2 N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova Chineke enyewo ezinụlọ ụmụ mmadụ ebe obibi a bụ́ ụwa. N’okpuru ịchịisi Alaeze ya, a ‘ga-ewuzigharị’ ụwa n’oge na-adịghị anya—gbanwee ya ịghọ paradaịs mara mma. Jehova ga-emezu nke a. N’ọnụ ahịa dị ukwuu nye onwe ya, o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya iji mee ka o kwe omume. N’ezie, Chineke aghaghị inwe ihe ọ chọrọ n’aka ndị ga-ebi n’ebe ahụ!—Abụ Ọma 115:16; Matiu 6:9, 10; Jọn 3:16.
3. Olee otú Solomọn si chịkọta ihe Chineke na-atụ anya ya n’aka anyị?
3 Olee otú anyị pụrụ isi chọpụta ihe Chineke chọrọ? Jehova nyere Eze Solomọn maara ihe ike mmụọ nsọ ịchịkọta ihe Ọ na-atụ anya ya n’aka anyị. Mgbe ọ tụgharịsịrị uche n’ihe nile ọ chụsoworo—gụnyere akụ̀ na ụba, ọrụ ihe owuwu, mmasị n’egwú, na ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ—Solomọn bịaruru ná nghọta nke a: ‘Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.’—Eklisiastis 12:13.
“Ihe O Nyere n’Iwu Adịghịkwa Arọ”
4-6. (a) Gịnị ka okwu Grik ahụ a sụgharịrị “arọ” pụtara n’ụzọ nkịtị? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ihe Chineke nyere n’iwu adịghị arọ?
4 “Debekwa ihe nile O nyere n’iwu.” N’ụzọ bụ isi, nke ahụ bụ ihe Chineke na-atụ anya ya n’aka anyị. Nke ahụ ọ̀ karịrị ya ịchọ? Ọ dịghị ma ọlị. Jọn onyeozi na-agwa anyị ihe na-emesi nnọọ obi ike banyere iwu Chineke, ma ọ bụ ihe ọ chọrọ. O dere, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—1 Jọn 5:3.
5 Okwu Grik a sụgharịrị “arọ” pụtara n’ụzọ nkịtị “dị arọ.” Ọ pụkwara izo aka n’ihe siri ike iru ma ọ bụ siri ike imezu. Na Matiu 23:4, e ji ya akọwa ‘ibu dị arọ,’ ụkpụrụ nduzi na ọdịnala ndị mmadụ mere, ndị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bokwasịrị ndị mmadụ. Ị̀ na-aghọta ihe Jọn onyeozi ahụ meworo agadi na-ekwubi? Ihe Chineke nyere n’iwu abụghị ibu arọ, ha esighịkwara anyị oké ike ime. (Tụlee Deuterọnọmi 30:11.) N’ụzọ dị iche, mgbe anyị hụrụ Chineke n’anya, iru ihe ọ chọrọ na-eme anyị obi ụtọ. Ọ na-enye anyị ohere dị oké ọnụ ahịa igosipụta ịhụnanya anyị maka Jehova.
6 Iji gosi ịhụnanya anyị maka Chineke, ọ dị anyị mkpa ịmata kpọmkwem ihe ọ na-atụ anya ya n’aka anyị. Ka anyị tụlee ugbu a ise n’ime ihe Chineke chọrọ. Ka anyị na-eme nke ahụ, buru n’uche ihe Jọn dere: ‘Ihe Chineke nyere n’iwu adịghị arọ.’
Nweta Ihe Ọmụma Chineke
7. Na gịnị ka nzọpụta anyị na-adabere?
7 Ihe mbụ a chọrọ bụ inweta ihe ọmụma Chineke. Tụlee okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Jọn isi nke 17. Ọnọdụ okwu ahụ bụ abalị ikpeazụ nke ndụ Jisọs dị ka mmadụ. Jisọs etinyewo ihe dị ukwuu n’uhuruchi ahụ na-akwadebe ndị ozi ya maka ọpụpụ ya. Ọ na-echegbu onwe ya banyere ọdịnihu ha, ọdịnihu ebighị ebi ha. N’iweli anya ya n’eluigwe, o kpere ekpere maka ha. N’amaokwu nke 3, anyị na-agụ, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara [“ha inweta ihe ọmụma,” NW] Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” Ee, nzọpụta ha dabeere na ha “inweta ihe ọmụma” nke ma Chineke ma Kraịst. Ọ dịkwa otú ahụ nye anyị. Iji nweta nzọpụta, anyị aghaghị inweta ihe ọmụma dị otú ahụ.
8. Gịnị ka “inweta ihe ọmụma” Chineke pụtara?
8 Gịnị ka “inweta ihe ọmụma” Chineke pụtara? Okwu Grik a sụgharịrị “inweta ihe ọmụma” n’ebe a na-egosi “ịbịa mara, ịghọta” ma ọ bụ “ịghọta n’ụzọ zuru ezu.” Rịbakwa ama na ide ya “inweta ihe ọmụma” pụtara na nke a bụ usoro na-aga n’ihu n’ihu. Otú a, inweta ihe ọmụma Chineke pụtara ịbịa mara ya, ọ bụghị elu elu kama n’ụzọ chiri anya, na-azụlite ọbụbụenyi nghọta dị na ya n’ebe ọ nọ. Iso Chineke na-enwe mmekọrịta na-aga n’ihu na-eweta ihe ọmụma na-arịwanye elu banyere ya. Usoro a pụrụ ịdịru mgbe ebighị ebi, n’ihi na ọ dịghị mgbe anyị ga-amata ihe nile a ga-amụta banyere Jehova.—Ndị Rom 11:33.
9. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere Jehova site n’akwụkwọ nke okike?
9 Olee otú anyị si enweta ihe ọmụma Chineke? E nwere akwụkwọ abụọ pụrụ inyere anyị aka. Otu bụ akwụkwọ nke okike. Ihe ndị Jehova keworo—ma ndị dị ndụ ma ndị na-adịghị ndụ—na-enyetụ anyị nghọta banyere ụdị onye ọ bụ. (Ndị Rom 1:20) Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Oké ụda nke nnukwu mmiri si n’elu na-eruda, ọgbụgbọ nke ụfụfụ mmiri n’oge oké mmiri ozuzo, ọdịdị ihu igwe nke jupụtara na kpakpando n’abalị gbachapụrụ agbachapụ—ọ̀ bụ na ihe ndị dị otú ahụ adịghị ezi anyị na Jehova bụ Chineke “nwere ume n’ike”? (Aịsaịa 40:26) Nwata nke na-achị ọchị ka ọ na-ele nwa nkịta na-achụgharị ọdụ ya ma ọ bụ nwa mbà ji ùkwù ogho na-egwugharị egwu—nke ahụ ọ́ dịghị atụ aro na Jehova, bụ́ “Chineke obi ụtọ,” nwere omume ime ihe ọchị? (1 Timoti 1:11, NW) Ụtọ nke nri na-eto akpịrị, ísì ụtọ nke okooko osisi n’ala ahịhịa, àgwà mara mma nke urukurubụba dị peke peke, ụda nke nnụnụ na-abụ abụ n’oge opupu ihe ubi, mmakụ na-ekpo ọkụ nke onye a hụrụ n’anya—ọ̀ bụ na anyị adịghị aghọta site n’ihe ndị dị otú ahụ na Onye Okike anyị bụ Chineke nke ịhụnanya, onye chọrọ ka anyị nụ ụtọ ndụ?—1 Jọn 4:8.
10, 11. (a) Ihe ndị dị aṅaa banyere Jehova na nzube ya ka anyị na-apụghị ịmụta site n’akwụkwọ nke okike? (b) Azịza nye ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-achọta nanị n’ime Bible?
10 Otú ọ dị, e nwere ịkpa ókè n’ihe anyị pụrụ ịmụta banyere Jehova site n’akwụkwọ nke okike. Iji maa atụ: Gịnị bụ aha Chineke? N’ihi gịnị ka o ji kee ụwa ma debe ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ya? N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị? Gịnị ka ọdịnihu ga-abụrụ anyị? Maka azịza nye ajụjụ ndị dị otú ahụ, anyị aghaghị ịga n’akwụkwọ nke ọzọ nke na-enye ihe ọmụma Chineke—Bible. N’ime ya, Jehova na-ekpughe ọtụtụ ihe banyere onwe ya, gụnyere aha ya, ọdịdị ya, na nzube ya—ihe ọmụma anyị na-apụghị inweta site n’ebe ọ bụla ọzọ.—Ọpụpụ 34:6, 7; Abụ Ọma 83:18; Emọs 3:7.
11 N’ime Akwụkwọ Nsọ, Jehova na-enyekwa ihe ọmụma dị mkpa banyere ndị ọzọ dị anyị mkpa ịma banyere ha. Dị ka ihe atụ, ònye bụ Jisọs Kraịst, òkè dịkwa aṅaa ka ọ na-ekere n’imezu nzube Jehova? (Ọrụ 4:12) Ònye bụ Setan Ekwensu? N’ụzọ ndị dị aṅaa ka o si eduhie ndị mmadụ? Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị o duhiere? (1 Pita 5:8) A na-achọta azịza ndị na-azọpụta ndụ nye ajụjụ ndị a nanị n’ime Bible.
12. Olee otú ị ga-esi kọwaa ihe mere ọ na-abụghị ibu arọ inweta ihe ọmụma Chineke na nzube ya?
12 Ọ̀ bụ ibu arọ inweta ihe ọmụma dị otú ahụ banyere Chineke na nzube ya? Ọ dịghị ma ọlị! Ị̀ pụrụ icheta otú ọ dị gị mgbe mbụ ị mụtara na aha Chineke bụ Jehova, na Alaeze ya ga-eweghachi Paradaịs n’elu ala a, na o nyere Ọkpara ọ hụrụ n’anya dị ka ihe mgbapụta maka mmehie anyị, gụnyere eziokwu ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa? Ọ̀ bụ na ọ dịghị ka iwepụ ihe mkpudo nke amaghị ihe na ịhụ ihe nke ọma na nke mbụ ya? Inweta ihe ọmụma Chineke abụghị ibu arọ. Ọ bụ ihe ụtọ!—Abụ Ọma 1:1-3; 119:97.
Ikwekọ n’Ụkpụrụ Chineke
13, 14. (a) Ka anyị na-enweta ihe ọmụma Chineke, mgbanwe ndị dị aṅaa dị mkpa ka anyị mee ná ndụ anyị? (b) Omume ndị dị aṅaa na-adịghị ọcha ka Chineke chọrọ ka anyị zere?
13 Ka anyị na-enweta ihe ọmụma Chineke, anyị na-abịa ghọta na ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe ná ndụ anyị. Nke a na-eweta anyị n’ihe nke abụọ a chọrọ. Anyị aghaghị ikwekọ n’ụkpụrụ Chineke maka ezi àgwà ma nara eziokwu ya. Gịnị bụ eziokwu? Ihe anyị kwere na ya na ihe anyị na-eme, hà gbasara Chineke n’ezie? Ihe àmà na-egosi na ọtụtụ ndị mmadụ adịghị eche otú ahụ. Otu akụkọ nke Chọọchị nke England bipụtara na 1995 tụrụ aro na e kwesịghị ile ibikọta ọnụ n’alụghị di na nwunye anya dị ka mmehie. “Nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ ‘ibi n’ime mmehie’ na-eme ihere, ọ dịghịkwa enye aka,” ka otu bishọp nke chọọchị kwuru.
14 Ya mere, ọ̀ bụ na “ibi n’ime mmehie” abụkwaghị mmehie? Jehova na-agwa anyị n’ụzọ doro nnọọ anya echiche ya banyere àgwà dị otú ahụ. Okwu ya, bụ́ Bible, na-ekwu, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye nwere ike ọ gaghị abụ mmehie n’anya ndị ụkọchukwu na ndị na-aga chọọchị na-anabata ihe nile, ma ọ bụ mmehie dị oké njọ n’anya Chineke! Otú ahụ ka ọ dịkwa ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, idina onye ikwu, na ndina ụdị onwe. (Levitikọs 18:6; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Chineke na-achọ ka anyị zere omume ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị ọ na-ele anya dị ka ihe na-adịghị ọcha.
15. Olee otú ihe Chineke chọrọ si agụnye ma otú anyị si emeso ndị ọzọ ma ihe anyị kwere na ya?
15 Otú ọ dị, o zughị ezu izere omume ndị Chineke na-ele anya dị ka mmehie. Ihe Chineke chọrọ na-agụnyekwa ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ. N’ime ezinụlọ, ọ na-atụ anya n’aka di na nwunye inwe ịhụnanya na nkwanye ùgwù maka ibe ha. Chineke na-achọ ka nne na nna lekọta mkpa anụ ahụ, ime mmụọ, na nke mmetụta uche nke ụmụ ha. Ọ na-agwakwa ụmụ ka ha rubere ndị mụrụ ha isi. (Ilu 22:6; Ndị Kọlọsi 3:18-21) Gịnịkwa banyere nkwenkwe anyị? Jehova Chineke chọrọ ka anyị zere nkwenkwe na omenala ndị sitere n’ofufe ụgha ma ọ bụ ndị na-emegide eziokwu na-enweghị mmerụ a kụziri n’ime Bible.—Deuterọnọmi 18:9-13; 2 Ndị Kọrint 6:14-17.
16. Kọwaa ihe mere na ọ bụghị ibu arọ iru ụkpụrụ Chineke chọrọ maka àgwà ziri ezi na ịnakwere eziokwu ya.
16 Ọ̀ bụ ibu arọ nye anyị iru ụkpụrụ Chineke chọrọ maka ezi àgwà na ịnakwere eziokwu ya? Ọ bụghị mgbe anyị tụlere abamuru ya—alụmdi na nwunye nke di na nwunye na-egosi ịhụnanya ma na-atụkwasị ibe ha obi kama ịbụ alụmdi na nwunye ndị a na-etisasị n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi; ebe obibi bụ́ nke ụmụaka nwere mmetụta nke ịbụ ndị nne na nna ha hụrụ n’anya ma bụrụ ndị a chọrọ kama ịbụ ezinụlọ ebe ụmụaka nwere mmetụta nke ịbụ ndị a na-ahụghị n’anya, ndị e leghaara anya, na ndị a na-achọghị; akọ na uche dị ọcha na ezi ahụ ike kama inwe mmetụta nke obi amamikpe na ahụ nke ọrịa AIDS ma ọ bụ ọrịa ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ mebisịrị. N’ezie, ihe Jehova chọrọ adịghị anapụ anyị ihe ọ bụla dị anyị mkpa iji nụ ụtọ ndụ!—Deuterọnọmi 10:12, 13.
Gosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ na Ọbara
17. Olee otú Jehova si ele ndụ na ọbara anya?
17 Ka ị na-eme ka ndụ gị kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, ị na-aghọta otú ndụ si dị oké ọnụ ahịa n’ezie. Ka anyị tụlee ugbu a ihe nke atọ Chineke na-achọ. Anyị aghaghị igosi nkwanye ùgwù maka ndụ na ọbara. Ndụ dị nsọ nye Jehova. O kwesịrị, n’ihi na ọ bụ Isi Iyi nke ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Leenụ, ọbụna ndụ nke nwa a ka amụghị nọ n’ime nne ya dị oké ọnụ ahịa nye Jehova! (Ọpụpụ 21:22, 23) Ọbara na-anọchite anya ndụ. Ya mere, ọbara kwa dị nsọ n’anya Chineke. (Levitikọs 17:14) Mgbe ahụ, o kwesịghị iju anyị anya na Chineke na-atụ anya n’aka anyị ile ndụ na ọbara anya dị ka o si ele ha.
18. Gịnị ka otú Jehova si ele ndụ na ọbara anya na-achọ n’aka anyị?
18 Gịnị ka ịkwanyere ndụ na ọbara ùgwù na-achọ n’aka anyị? Dị ka ndị Kraịst, anyị adịghị etinye ndụ anyị n’ihe ize ndụ na-enweghị isi nanị maka iji nwee mkpali. Anyị na-eburu nchebe n’uche, n’ihi ya kwa anyị na-ejide n’aka na ụgbọala anyị na ebe obibi anyị adịghị ize ndụ. (Deuterọnọmi 22:8) Anyị adịghị eji ụtaba eme ihe, ata akị osisi betel, ma ọ bụ aṅụ ọgwụ na-eri ahụ ma ọ bụ nke na-akpaghasị uche n’ihi ihe ụtọ. (2 Ndị Kọrint 7:1) N’ihi na anyị na-ege Chineke ntị mgbe ọ na-ekwu ka a ‘hapụ ọbara,’ anyị adịghị ekwe ka a mịnye ọbara n’ime ahụ anyị. (Ọrụ 15:28, 29) Ọ bụ ezie na anyị hụrụ ndụ n’anya, anyị agaghị agbalị ịzọpụta ndụ anyị dị ugbu a site n’imebi iwu Chineke wee si otú a tinye olileanya anyị nke ndụ ebighị ebi n’ihe ize ndụ!—Matiu 16:25.
19. Kọwaa otú anyị si erite uru site n’ịkwanyere ndụ na ọbara ùgwù.
19 Ọ̀ bụ ibu arọ nye anyị imeso ndụ na ọbara dị ka ihe dị nsọ? Ọ dịghị ma ọlị! Chee echiche banyere ya. Ọ̀ bụ ibu arọ inwere onwe pụọ n’ọrịa cancer nke ise ụtaba na-akpata? Ọ̀ bụ ibu arọ ịgbanahụ iri ahụ nke ọgwụ ndị na-emebi uche ma na-emerụ ahụ? Ọ̀ bụ ibu arọ izere ibute ọrịa AIDS, ịba ọcha n’anya, ma ọ bụ ọrịa ndị ọzọ site ná mmịnye ọbara? N’ụzọ doro anya, anyị izere àgwà na omume ndị dị otú ahụ na-emerụ ahụ bụ maka ọdịmma anyị kasịnụ.—Aịsaịa 48:17.
20. Olee otú otu ezinụlọ si rite uru site n’inwe echiche Chineke banyere ndụ?
20 Tụlee ahụmahụ a. Ụfọdụ afọ gara aga, otu nwanyị bụ́ Onyeàmà dị ime ihe dị ka ọnwa atọ na ọkara malitere inwe oruru ọbara n’otu uhuruchi, e wee buga ya ụlọ ọgwụ n’ọkụ ọkụ. Mgbe otu dọkịta lesịrị ya ahụ, nwanyị ahụ nụpeere ka ọ na-agwa otu n’ime ndị nọọsụ na ha aghaghị iwepụ afọ ime ahụ. N’ịmara otú Jehova si ele ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ anya, ọ jụwapụrụ isi isikwopụ afọ ime ahụ, na-agwa dọkịta ahụ, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị ndụ, hapụ ya ebe ahụ!” Ọ nọgidere na-enwe oruru ọbara site n’oge ruo n’oge, ma n’ọnwa ole na ole ka e mesịrị ọ mụkworo nwa nwoke ahụ siri ike, onye dị afọ 17 ugbu a. Ọ kọwara, sị: “A kọọrọ nwa anyị nwoke banyere ihe a nile, ọ sịkwara na obi dị ya ụtọ na a tụnyeghị ya n’ebe mkpofu ahịhịa. Ọ maara na ọ bụ na anyị na-ejere Jehova ozi bụ nanị ihe mere o ji dị ọbụna ndụ taa.” N’ezie, inwe echiche Chineke banyere ndụ abụrụghị ezinụlọ a ibu arọ!
Isoro Ndị Jehova A Haziri Ahazi Na-eje Ozi
21, 22. (a) Ole ndị ka Jehova chọrọ ka anyị soro jeere ya ozi? (b) Olee otú a pụrụ isi mata ndị Chineke a haziri ahazi?
21 Anyị anọghị nanị anyị n’ime mgbanwe ndị dị mkpa iji mee ka ndụ anyị kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke. Jehova nwere otu ndị n’elu ala a, ọ na-atụkwa anya n’aka anyị isoro ha na-ejere ya ozi. Nke a na-eweta anyị n’ihe nke anọ a chọrọ. Anyị aghaghị iso nzukọ Jehova mmụọ nsọ na-eduzi na-ejere ya ozi.
22 Ma, olee otú a pụrụ isi mata ndị Chineke a haziri ahazi? Dị ka ụkpụrụ ndị e setịpụrụ n’Akwụkwọ Nsọ si dị, ha nwere ezi ịhụnanya n’etiti onwe ha, ha nwere nkwanye ùgwù miri emi maka Bible, ha na-asọpụrụ aha Chineke, ha na-ekwusa banyere Alaeze ya, ha abụghịkwa akụkụ nke ụwa ajọ omume a. (Matiu 6:9; 24:14; Jọn 13:34, 35; 17:16, 17) E nwere nanị otu nzukọ okpukpe n’elu ala a nke nwere akara ndị a nile nke ezi Iso Ụzọ Kraịst—Ndịàmà Jehova!
23, 24. Olee otú anyị pụrụ isi maa atụ na ọ bụghị ibu arọ isoro ndị Jehova a haziri ahazi ejere ya ozi?
23 Ọ̀ bụ ibu arọ isoro ndị Jehova a haziri ahazi na-ejere ya ozi? Ọ dịghị ma ọlị! N’ụzọ megidere ya, ọ bụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa inwe ịhụnanya na nkwado nke ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ụmụnna nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst. (1 Pita 2:17) Were ya na ị lanarịrị ụgbọ okpukpu ma na-achọta onwe gị n’ime mmiri, na-agbalị ise n’elu. Mgbe i chere na ị pụkwaghị ịtachikwu obi, otu aka ewee site n’ụgbọ ndụ na-agbatịpụrụ gị. Ee, e nwere ndị ọzọ lanarịrị! N’ime ụgbọ ndụ ahụ, gị na ndị ọzọ na-eme onye nyatụ ibe ya anyatụ n’ịkwọrọ ụgbọ ahụ gaa n’ikperé mmiri, na-agụpụta ndị ọzọ lanarịrị n’ụzọ.
24 Ọ̀ bụ na anyị anọghị n’ọnọdụ yiri nke ahụ? A dọpụtawo anyị site ná “mmiri” dị ize ndụ nke ụwa ajọ omume a banye n’ime “ụgbọ ndụ” nke nzukọ elu ala Jehova. N’ime ya, anyị na-ejekọ ozi ọnụ ka anyị na-eche ihu ‘n’ikperé mmiri’ nke ụwa ọhụrụ ezi omume. Ọ bụrụ na nrụgide nke ndụ emee ka anyị daa mbà n’ụzọ, lee ka anyị si enwe obi ekele n’ihi enyemaka na nkasi obi nke ezi ndị enyi bụ́ ndị Kraịst!—Ilu 17:17.
25. (a) Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere n’ebe ndị ka nọ n’ime “mmiri” nke ụwa ajọ omume a nọ? (b) Ihe dị aṅaa Chineke chọrọ ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
25 Gịnị banyere ndị ọzọ—ndị nwere obi eziokwu ka nọ n’ime “mmiri”? Anyị nwere ibu ọrụ inyere ha aka ịbata ná nzukọ Jehova, ọ́ bụghị ya? (1 Timoti 2:3, 4) Enyemaka dị ha mkpa iji mụta ihe Chineke na-achọ. Nke a na-eweta anyị n’ihe nke ise Chineke na-achọ. Anyị aghaghị ịbụ ndị ji iguzosi ike n’ihe na-akpọsa Alaeze Chineke. A ga-atụle ihe nke a na-agụnye n’isiokwu na-esonụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka ihe Chineke nyere n’iwu ji ghara ịdị arọ?
◻ Olee otú anyị si enweta ihe ọmụma Chineke?
◻ N’ihi gịnị ka iru ụkpụrụ Chineke chọrọ maka àgwà ziri ezi na ịnakwere eziokwu ya ji ghara ịbụ ibu arọ?
◻ Gịnị ka echiche Chineke banyere ndụ na ọbara na-achọ n’aka anyị?
◻ Ole ndị ka Chineke na-atụ anya n’aka anyị iso na-ejere ya ozi, oleekwa otú a pụrụ isi mata ha?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Anyị na-amụta banyere Jehova site n’akwụkwọ nke okike na site na Bible
[Foto dị na peeji nke 18]
Agụ iyi: Site n’ikike Australian International Public Relations; bear: Safari-Zoo of Ramat-Gan, Tel Aviv