Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Iji Eziokwu ahụ Rute Ụdị Ndị Nile
PỌL onyeozi bụ onye mkpọsa na-anụ ọkụ n’obi nke Alaeze Chineke. O kweghị ka mmegide gbochie ọrụ ya nke ikwusa “ozi ọma ahụ.” (1 Ndị Kọrint 9:16; Ọrụ 13:50-52) Pọl gbara ndị ọzọ ume ịgbaso ihe nlereanya ya.—1 Ndị Kọrint 11:1.
A maara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile n’ihi mgbalị siri ike ha n’ime nkwusa. N’ezie, ha na-agwa ndị ọzọ okwu “n’oge kwesịrị” na “n’oge na-ekwesịghị” iji rụzuo ọrụ Chineke nyere ha nke ‘ime ndị na-eso ụzọ.’ (2 Timoti 4:2; Matiu 28:19, 20) Ọbụna n’ala ebe a na-emegide ha, a na-eji ozi ahụ kasị mkpa banyere Alaeze Chineke erute ndị nwere obi eziokwu, dị ka ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi.
◻ N’otu àgwàetiti dị n’ọdịda anyanwụ Pacific, ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu, otu nwa okoro dị afọ 12 chọpụtara na ndị mkpakọrịta ọjọọ gbara ya gburugburu n’ụlọ akwụkwọ. Ọtụtụ n’ime ndị klas ya na-ese siga, na-agụ akwụkwọ ndị na-akpali mmekọahụ, na-amaja ndị nkụzi, na-alụkwa ọgụ mgbe mgbe. Ọnọdụ ahụ jọrọ njọ nke na nwa okoro ahụ jụrụ nna ya ma ya nwere ike ịgafe n’ụlọ akwụkwọ ọzọ. Otú ọ dị, nna ahụ nyere nwa ya nwoke nkọwa na-emegide echiche dị otú ahụ, ebe ọ bụ na o chere na àgwà ụmụ akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ dị nso agaghị adị iche. Ma, olee otú ọ ga-esi nyere nwa ya nwoke aka?
Nna ahụ chetara na ya nwere otu akwụkwọ n’ụlọ maka ndị na-eto eto. Ọ bụ onyinye sitere n’aka otu onye ikwu ya bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ya mere ọ chọrọ akwụkwọ ahụ, mgbe ọ hụkwara ya, o nyere ya nwa ya nwoke. Aha ya bụ Questions Young People Ask—Answers That Work.a Nwa okoro ahụ chọpụtara isiakwụkwọ bụ́ “Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ?” ịbụ nke na-enye aka karịsịa. Ọ bụghị nanị na ọ kụziiri ya ịdị mkpa nke ijigide ùgwù onwe onye kama ọ kụzikwaara ya ụzọ ọ pụrụ isi sị ee e mgbe ndị ọzọ gbalịrị ịrụgide ya ịgbaso ụzọ nke amamihe na-adịghị. Site n’itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’akwụkwọ ahụ n’ọrụ, nwa okorobịa ahụ mụtara ụzọ e si anagide nrụgide ndị ọgbọ n’ụzọ na-aga nke ọma.
N’ịhụ mgbanwe ndị a na ndị ọzọ n’ahụ nwa ya, nna ahụ kpebiri ịgụ akwụkwọ ahụ. N’ịbụ onye aro ndị bara uru dị n’akwụkwọ ahụ masịrị, nna ahụ rịọrọ Ndịàmà Jehova maka ọmụmụ Bible ebe obibi. Ka e mesịrị, ndị òtù ọzọ nke ezinụlọ ya sonyeere ya n’ọmụmụ ihe ahụ. Gịnị si na ya pụta? Nwa okoro ahụ, nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, nna ya, na abụọ n’ime nna nna nke nwa okoro ahụ bụcha Ndịàmà Jehova ugbu a.
◻ N’otu ala ahụ, a tụrụ mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova mkpọrọ n’ihi nrubeisi siri ike ha rubeere ụkpụrụ Bible. Ma, ha ekweghị ka ọnọdụ ha gbochie ha inwe nkwuwa okwu banyere Alaeze Chineke. Ha gakwuuru onye isi ụlọ mkpọrọ ma nara ikike ka ha mee ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ebe ahụ. Lee obi ụtọ ha nwere mgbe ndị mkpọrọ 14 kwupụtara mmasị ha nwere na Bible ma sonyere Ndịàmà ahụ maka ihe omume a dị mkpa! Mgbe a tọhapụsịrị ha, ụfọdụ n’ime ha gara n’ihu n’ịmụ Bible na iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta.
N’ime ihe karịrị mba 25, Ndịàmà Jehova na-ata ahụhụ n’ihi mmachibido iwu ma ọ bụ ụdị dị iche iche nke mmegide ma ọ bụ mkpagbu. Otú ọ dị, dị ka ndị ozi, ha na-aga n’ihu ‘n’adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.’—Ọrụ 5:42.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.