Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/1 p. 4-7
  • Ndị Eziokwu Mere Ka Ha Pụọ n’Ohu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Eziokwu Mere Ka Ha Pụọ n’Ohu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu Ndị Nwụrụ Anwụ
  • Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu Banyere Ọdịnihu
  • Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu Mmadụ
  • Eziokwu Pụrụ Ime Ka Ị Pụọ n’Ohu
  • Olee Otú Eziokwu Ga-esi Eme Ka I Nwere Onwe Gị?
    Teta!—2012
  • Eziokwu Banyere Mkpụrụ Obi Nwere Ihe O Mere
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • “E Lodawo Ọnwụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ—Ị̀ Ga-ahụ Ha Ọzọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/1 p. 4-7

Ndị Eziokwu Mere Ka Ha Pụọ n’Ohu

N’IME United States, a kpọchiri ihe karịrị otu nde mmadụ n’ụlọ mkpọrọ. N’ime ndị a, a mawo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku atọ ikpe ọnwụ. Were ya na ị nọ n’ọnọdụ ahụ. Mmetụta dị aṅaa ka ị ga-enwe? Echiche nke ụdị atụmanya dị otú ahụ adịghị enye obi ụtọ n’ezie. Ma, n’otu echiche, mmadụ nile nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ. Bible na-asị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ee, dị ka ụmụ Adam, anyị bụ ndị ọnọdụ mmehie “tụworo mkpọrọ.” (Ndị Rom 5:12) Anyị na-enwe mmetụta nke mkpọchi anyị kwa ụbọchị, dị ka Pọl onyeozi bụ́ onye Kraịst, onye dere, sị: “Ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.”—Ndị Rom 7:23.

Dị ka ihe si n’ọdịdị mmehie anyị pụta, onye ọ bụla n’ime anyị nọ n’okpuru ikpe ọnwụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ọbụ abụ bụ́ Mosis kọwara ọnọdụ anyị nke ọma: “Afọ iri asaa agwụla ihe anyị nwere—afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na anyị siri ike; ma ihe nile ha na-ewetara anyị bụ nsogbu na mwute; ndụ agwụsịa ọsọ ọsọ, anyị ewee laa.”—Abụ Ọma 90:10, Today’s English Version; tụlee Jemes 4:14.

Ọ bụ ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ohu mmehie na ọnwụ ka Jisọs bu n’uche wee gwa ụmụazụ ya, sị: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) Site n’okwu ndị ahụ, Jisọs na-agbasapụrụ ụmụazụ ya olileanya nke ihe ka ukwuu karịa nnwere onwe pụọ n’ịchịisi ndị Rom—ọ na-enye ha mgbaghara pụọ ná mmehie na ntọhapụ pụọ n’ọnwụ! Olee otú a ga-esi nye ha nke a? “Ọ bụrụ na Ọkpara ga-eme ka unu pụọ n’ohu,” ka Jisọs gwara ha, “unu ga-abụ ndị pụworo n’ohu n’ezie.” (Jọn 8:36) Ee, site n’ịtọgbọ ndụ ya, “Ọkpara” ahụ, bụ́ Jisọs, jere ozi dị ka àjà njụrụ obi ịzụtaghachi ihe Adam tụfuru. (1 Jọn 4:10) Nke a meghere ụzọ ka a tọhapụ ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi pụọ n’agbụ mmehie na ọnwụ. Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya nwụrụ “ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Ya mere eziokwu nke pụrụ ime ka anyị pụọ n’ohu dabeere na Jisọs Kraịst. Ndị ga-aghọ ụmụazụ na-eso nzọụkwụ ya nwere olileanya nke ịbụ ndị a tọhapụrụ pụọ ná mmehie na ọnwụ mgbe Alaeze Chineke weghaara nchịkwa zuru ezu nke ihe omume ụwa. Ọbụna ugbu a, ndị ahụ na-anabata eziokwu nke Okwu Chineke na-enwe ezigbo nnwere onwe. N’ụzọ dịgasị aṅaa?

Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu Ndị Nwụrụ Anwụ

Ọtụtụ nde taa bi n’egwu nke ndị nwụrụ anwụ. N’ihi gịnị? N’ihi na okpukpe ha akụziworo ha na mkpụrụ obi na-ahapụ anụ ahụ n’ọnwụ ma gafee n’ógbè ndị bụ mmụọ. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ omenala n’ala ụfọdụ ndị ikwu onye nwụrụ anwụ idebe ọmụmụ anya ruo ọtụtụ ụbọchị na abalị. Nke a na-agụnyekarị ịbụ abụ n’olu dị elu na iti ịgba. Ndị na-eru újú kwere na nke a ga-atọ onye nwụrụ anwụ ụtọ, gbochiekwa mmụọ ya ịbịaghachi ịnọnyere ndị dị ndụ. Ozizi ụgha Krisendọm banyere ndị nwụrụ anwụ ejewo ozi nanị ime ka ọdịnala a dịgide.

Otú ọ dị, Bible na-ekpughe eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ọ na-ekwu n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi gị bụ gị, ọ bụghị akụkụ gị dị omimi nke na-adịrị ndụ gaa n’ihu mgbe a nwụsịrị. (Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4) Ọzọkwa, a dịghị emekpa ndị nwụrụ anwụ ahụ na hel dị ọkụ, ha abụghịkwa akụkụ ógbè ndị bụ mmụọ pụrụ imetụta ndị dị ndụ. “Ma ndị nwụrụ anwụ,” ka Bible na-ekwu, “adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW, (ili)], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:5, 10.

Eziokwu Bible ndị a emewo ka ọtụtụ mmadụ pụọ n’ohu nke ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu. Ha adịghịzi achụ àjà ndị dị oké ọnụ iji medaa ndị nna ochie ha obi, ha adịghịkwa enwe ahụ mgbakasị na e ji obi ọjọọ emekpa ndị ha hụrụ n’anya ahụ maka njọ ha. Ha amụtawo na Bible na-esetịpụ olileanya dị ebube maka ndị nwụworo anwụ, n’ihi na ọ na-agwa anyị na n’oge Chineke kara aka, a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15; Jọn 5:28, 29) N’ihi ya, ndị nwụrụ anwụ bụ nanị ike ka ha na-ezu, dị ka ha nọ n’ụra miri emi.—Tụlee Jọn 11:11-14.

Eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na olileanya nke mbilite n’ọnwụ pụrụ ịtọhapụ anyị pụọ ná ndakpọ olileanya nke ọnwụ pụrụ iji bịa. Olileanya dị otú ahụ kwagidere otu di na nwunye na United States mgbe e gburu nwa ha nwoke dị afọ anọ n’ihe ọghọm. “E nwere oghere ná ndụ anyị nke a na-apụghị imechi emechi ruo mgbe anyị hụrụ nwa anyị ọzọ site ná mbilite n’ọnwụ,” ka nne ya kwetara. “Ma anyị maara na ihe ụfụ anyị bụ nanị na nwa oge, ebe Jehova na-ekwe nkwa ihichapụ anya mmiri anyị nke iru újú.”—Mkpughe 21:3, 4.

Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu Banyere Ọdịnihu

Gịnị ka ọdịnihu ga-eweta? À ga-erechapụ ụwa anyị n’ọkụ ná mgbukpọ nuklia? Mbibi nke gburugburu mbara ụwa ọ̀ ga-eme ka mbara ụwa anyị ghọọ ebe a na-apụghị ibi ebi? Ọdịda nke omume ọ̀ ga-eduje n’ọnọdụ nke enweghị nchịkwa na ọgba aghara? Ihe ndị a bụ egwu na-atụ ọtụtụ mmadụ taa n’ezie.

Otú ọ dị, Bible na-enye nnwere onwe pụọ n’ụdị egwu ndị ahụ na-akụnwụ ahụ. Ọ na-emesi anyị obi ike na “ụwa na-eguzoru mgbe ebighị ebi.” (Eklisiastis 1:4) Jehova ekeghị mbara ụwa anyị nanị ịhụ ka ndị mmadụ na-ejighị ihe akpọrọ ihe bibiri ya. (Aịsaịa 45:18) Kama nke ahụ, Jehova kere ụwa ka ọ bụrụ ebe obibi paradaịs maka ezinụlọ mmadụ dị n’otu. (Jenesis 1:27, 28) Nzube ya agbanwebeghị. Bible na-agwa anyị na Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Mgbe nke ahụ gasịrị, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala,” ka Bible na-ekwu, “ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.

Nkwa a bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, n’ihi na Chineke adịghị ekwu okwu ụgha. Jehova kwuru site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịsaịa, sị: ‘Okwu m nke na-esi n’ọnụ m pụta agaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.’ (Aịsaịa 55:11; Taịtọs 1:2) Ya mere, anyị pụrụ iji obi ike lepụ anya n’ihu ná mmezu nke nkwa Chineke e dekọrọ n’ime Bible na 2 Pita 3:13: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.”

Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu Mmadụ

Bible na-enye anyị ihe nlereanya magburu onwe ha nke ndị ikom na ndị inyom gosipụtara atụghị egwu ná nrubeisi ha nye Chineke. N’ime ndị a e nwere Gideọn, Berak, Debora, Daniel, Esta, Jeremaịa, Abigail, na Jael—ịkpọ nanị ole na ole. Ndị ikom na ndị inyom a nwere okwukwe gosipụtara àgwà nke ọbụ abụ ahụ, onye dere, sị: “Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịworo obi, m gaghị atụ egwu; gịnị ka anụ ahụ, bụ́ mmadụ, ga-eme m?”—Abụ Ọma 56:11.

Na narị afọ mbụ, ndị ozi bụ́ Pita na Jọn gosipụtara nkwuwa okwu yiri nke ahụ mgbe ndị isi okpukpe nyere ha iwu ịkwụsị ime nkwusa. “Anyị onwe anyị,” ka ha zaghachiri, “apụghị ịghara ikwu ihe nile anyị hụrụ nụkwa.” N’ihi nguzosi ike ha, e mesịrị tụọ Pita na Jọn mkpọrọ. Mgbe a tọhapụsịrị ha n’ụzọ ọrụ ebube, ha gaghachiri ozugbo ma gaa n’ihu “were nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke.” N’oge na-adịghị anya a kpụtara Pita na ndị ozi ndị ọzọ n’ihu òtù Sanhedrin ndị Juu. “Anyị nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izi ihe n’aha nke a,” ka onye isi nchụàjà gwara ha, “ma lee, unu ewerewo ozizi unu mejuo Jerusalem.” Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 4:16, 17, 19, 20, 31; 5:18-20, 27-29.

N’ọrụ ha nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, Ndịàmà Jehova taa na-agbalị iṅomi ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Kraịst narị afọ mbụ. Ọbụna ndị ntorobịa n’etiti ha na-egosipụtakarị onwe ha ịbụ ndị na-adịghị atụ egwu site n’ịgwa ndị ọzọ hoo haa banyere okwukwe ha. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Stacie, onye nọ n’afọ iri na ụma, na-eme ihere site n’ọmụmụ. N’ihi nke a, ịgwa ndị ọzọ okwu banyere okwukwe ya bụ ihe ịma aka na mbụ. Gịnị ka o mere iji merie ime ihere ya? “Amụrụ m Bible ma jide n’aka na m ghọtara ihe m na-ekwu,” ka ọ na-ekwu. “Ọ na-eme ka ọ ka mfe, m nwekwara obi ike n’ime onwe m karị.” A kọrọ akụkọ ezigbo aha ọma Stacie n’akwụkwọ akụkọ obodo. Isiokwu ahụ, nke otu onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ya dere, kwuru, sị: “Okwukwe [Stacie] yiri ka o nyewo ya ume ịlụso ọtụtụ nrụgide nke ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nọ n’afọ iri na ụma na-enwe. . . . Ọ na-eche na ijere Chineke ozi kwesịrị ịbụ ihe kasị mkpa n’uche ya.”

Tommy bidoro ịmụ banyere Bible site n’aka nne na nna ya mgbe ọ dị nanị afọ ise. Ọbụna n’oge ọ bụ nwata, o weere nguzo anyaike maka ezi ofufe. Mgbe ụmụ klas ya bụ́ ndị ka na-eto eto na-ese ihe osise ụbọchị ezumike, Tommy na-ese ọnọdụ nke Paradaịs Chineke kwere ná nkwa. Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, Tommy hụrụ na ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ nwere mgbagwoju anya banyere nkwenkwe Ndịàmà Jehova. Kama ịdaghachi azụ n’ụjọ, ọ jụrụ otu n’ime ndị nkụzi ya ma ọ pụrụ iduzi mkparịta ụka ajụjụ na azịza nke ndị klas ya ka ya wee nwee ike ịza ajụjụ ha nile otu ugbo. A nabatara nke a, a gbakwara ezi àmà.

Mgbe ọ dị afọ 17, Markietta chọtara ohere magburu onwe ya ịgwa ndị ọzọ na klas ya banyere okwukwe ya. “E nyere anyị ihe omume ikwu okwu,” ka ọ na-ekwu. “Ahọọrọ m isiokwu m ka ọ bụrụ n’akwụkwọ Questions Young People Ask—Answers That Work.a Eweere m isiakwụkwọ ise n’akwụkwọ ahụ ma dee isiokwu ha na bọọdụ. Agwara m ndị klas ka ha debe ha n’ọkwá kwesịrịnụ otú ha chere na ha dị mkpa.” Mkparịta ụka nke ndị klas na-etinye ọnụ sochiri. “Egosiri m ndị klas akwụkwọ ahụ,” ka Markietta kwubiri, “ọtụtụ n’ụmụ akwụkwọ ahụ kwukwara ka e wetara ha otu. Ọbụna onye nkụzi m kwuru na ya chọrọ otu.”

Eziokwu Pụrụ Ime Ka Ị Pụọ n’Ohu

Dị ka anyị hụworo, eziokwu dị n’ime Bible na-enwe mmetụta nke ntọhapụ n’ahụ ndị nọ n’afọ ndụ nile na-amụ ya ma na-etinye ozi ya n’obi. Ọ na-atọhapụ ha pụọ n’egwu ndị nwụrụ anwụ, egwu banyere ọdịnihu, na egwu mmadụ. N’ikpeazụ, ihe mgbapụta Jisọs ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi pụọ n’ohu nke mmehie na ọnwụ. Lee ọṅụ ọ ga-abụ ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs, n’abụkwaghị ndị ọnọdụ mmehie e ketara eketa tụrụ mkpọrọ!—Abụ Ọma 37:29.

Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu banyere ngọzi ndị Chineke kweworo ná nkwa? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka i kwesịrị ime? Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ya mere ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ahụmahụ nnwere onwe ahụ nke Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya ná nkwa, ị ghaghị ịmụta banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya. Ọ dị gị mkpa ịmata ihe uche Chineke bụ ma na-eme ya, n’ihi na Bible na-asị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 7]

N’okpuru Alaeze Chineke, a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ pụọ n’ohu mmehie na ọnwụ n’ikpeazụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya