Jerusalem n’Oge Bible—Gịnị Ka Nkà Mmụta Ihe Ochie Na-ekpughe?
ỌRỤ nkà mmụta ihe ochie gbara ọkpụrụkpụ na-adọrọ mmasị ewerewo ọnọdụ na Jerusalem, karịsịa kemgbe 1967. Ọtụtụ n’ime ebe ndị e gwupesịrị ghere oghe ugbu a nye ọha na eze, ya mere ka anyị jee leta ụfọdụ n’ime ha ma hụ otú nkà mmụta ihe ochie si kwekọọ n’akụkọ ihe mere eme nke Bible.
Jerusalem nke Eze Devid
Ebe Bible na-ezo aka dị ka Ugwu Zaịọn, bụ́ ebe e wukwasịrị Obodo Devid oge ochie, yiri nnọọ ebe dị nta n’obodo ukwu nke Jerusalem oge a. Ngwupesị ala nke Obodo Devid, nke prọfesọ Yigal Shiloh nwụworo anwụ butere ụzọ na ya n’agbata 1978-1985, kpughere nnukwu ihe owuwu steepụ nkume, ma ọ bụ mgbidi nkwado, n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ.
Prọfesọ Shiloh zọọrọ na ọ ghaghị ịbụ ihe fọrọ afọ na nnukwu ihe owuwu dị n’okpuru nke ékpè bụ́ ebe ndị Jebus (ndị biri n’ime ya tupu mmeri Devid) wukwasịrị ebe e wusiri ike. Ọ kọwara ná nnukwu ihe owuwu steepụ nkume ahụ ọ hụrụ n’elu ékpè ndị a bụ ndị nke ebe e wusiri ike ọhụrụ nke Devid wuru n’ebe ahụ ebe e wusiri ike ndị Jebus dịbu. Na 2 Samuel 5:9, anyị na-agụ, sị: “Devid wee biri n’ebe ahụ e wusiri ike, o wee kpọọ ya obodo Devid. Devid wee wuo obodo gburugburu site na Milo wee ruo n’ime ya.”
N’ebe dị ihe owuwu a nso e nwegasịrị ụzọ mbata nke usoro mmiri oge ochie nke obodo ahụ, akụkụ ndị yiri ka ọ bụ site n’oge Devid. Okwu ụfọdụ dị n’ime Bible banyere usoro ọwa mmiri Jerusalem ewelitewo ajụjụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Devid gwara ndị ikom ya na “onye ọ bụla nke na-etigbu ndị Jebus, ya jeruo ebe mmiri si aga wee tigbuo” onye iro ahụ. (2 Samuel 5:8) Ọchịagha Devid bụ́ Joab mere nke a. Gịnị kpọmkwem ka okwu ahụ bụ́ “ebe mmiri si aga” pụtara?
E welitewo ajụjụ ndị ọzọ banyere Ọwa Mmiri Saịloam na-ede ude, nke ndị injinịa Eze Hezekaịa gwuru ma eleghị anya na narị afọ nke asatọ T.O.A., nke e zokwara aka na ya ná 2 Ndị Eze 20:20 na 2 Ihe Emere 32:30. Olee otú ìgwè abụọ ahụ na-egwu ọwa mmiri, site n’isi abụọ na-egwu, ga-esi nwee ike izute? Gịnị mere ha ji họrọ ụzọ gbagọrọ agbagọ, na-eme ka ọwa mmiri ahụ dị nnọọ ogologo karịa nke guzo kwem? Olee otú ha si nweta ikuku zuru ezu ikuru, karịsịa ebe o yiri ka ha jiri oriọna mmanụ mee ihe?
Magazin bụ Biblical Archaeology Review enyewo ihe ndị pụrụ ịbụ azịza nye ajụjụ ndị dị otú ahụ. E hotara Dan Gill, onye ọkà mmụta ọdịdị ala nke ngwupe ala ahụ, dị ka onye na-asị: “N’okpuru Obodo Devid e nwere usoro karst si n’okike a rụziri nke ọma. Karst bụ okwu nkà mmụta ọdịdị ala nke na-akọwa ógbè na-adịghị larịị nke okokoro, ọ́gbà na ụzọ mmiri ndị mmiri si n’ala kpatara ka ọ na-eruda, na-asọfekwa na nkume ndị dị n’okpuru ala. . . . Nnyocha nkà mmụta ọdịdị ala anyị banyere usoro inweta mmiri gara n’okpuru ala n’Obodo Devid na-egosi na e mere ha n’ụzọ bụ isi site n’ọrụ mmadụ jiri nkà rụọ ịgbasawanye ụzọ mmiri na olulu mere mbuze (nke karst) si n’okike bụ́ ndị a rụziri ịbụ usoro inweta mmiri na-arụ ọrụ.”
Nke a pụrụ inye aka ịkọwa otú e siri gwuo Ọwa Mmiri Saịloam. Ọ pụrụ isowo ụzọ gbagọrọ agbagọ nke ụzọ mmiri si n’okike dị n’okpuru ugwu ahụ. Ìgwè ndị na-arụ ọrụ site n’isi nke ọ bụla pụrụ igwuworị ọwa mmiri dịrị obere oge site n’ịgbanwe ọ́gbà ndị dị adị. Mgbe ahụ e gwuru ụzọ mmiri kpọdara akpọda maka mmiri isi n’isi iyi Gaịhọn sọba n’Ọdọ Mmiri Nta Saịloam, bụ́ nke dịrị ma eleghị anya n’ime mgbidi obodo ahụ. Nke a bụ nnọọ nkà injinịa ebe ọdịiche dị n’etiti isi abụọ ahụ n’ịdị elu ha bụ nanị sentimita 32, n’agbanyeghị ogologo ya nke dị mita 533.
Ọ dịwo anya ndị ọkà mmụta matara na ebe bụ́ isi obodo ochie ahụ si enweta mmiri bụ isi iyi Gaịhọn. Ọ dị n’azụ mgbidi obodo ahụ ma dịrị nnọọ nso nke inye ohere maka igwu ọwa mmiri na olulu dị mita 11, nke ga-eme ka ndị bi n’obodo ahụ nwee ike isere mmiri n’agaghị n’azụ mgbidi ahụ na-enye nchebe. A maara nke a dị ka Olulu Warren, nke e jiri aha Charles Warren kpọọ, bụ́ onye chọpụtara usoro ahụ na 1867. Ma olee mgbe e gwuru ọwa mmiri na olulu ahụ? Hà dịrị n’oge Devid? Nke a ọ̀ bụ ọwa mmiri ahụ Joab jiri mee ihe? Dan Gill na-aza, sị: “Iji nwapụta ma Olulu Warren ọ̀ bụ n’ezie okokoro si n’okike, anyị nyochara iberibe ájá kpụkọrọ akpụkọ nwere calcium site ná mgbidi ájá ya na-adịghị larịị ma ò nwere carbon-14. Ọ dịghị nke o nwere, na-egosi na ájá ahụ kpụkọrọ akpụkọ adịwo ihe karịrị afọ 40,000: Nke a na-enye ihe àmà doro anya na olulu ahụ apụghị ịbụworị mmadụ gwuru ya.”
Ihe Ndị Fọrọ Afọ Site n’Oge Hezekaịa
Eze Hezekaịa biri mgbe mba Asiria nọ na-azapụsị ihe nile nọchiri ya ụzọ. N’afọ nke isii nke ọchịchị ya, ndị Asiria weghaara Sameria, isi obodo nke alaeze ebo iri ahụ. Afọ asatọ mgbe e mesịrị (732 T.O.A.) ndị Asiria bịaghachiri ọzọ, na-eyi Juda na Jerusalem egwu. Ihe Emere nke Abụọ 32:1-8 na-akọwa atụmatụ nchebe Hezekaịa. È nwere ihe àmà ndị a na-ahụ anya site n’oge a?
Ee, na 1969, Prọfesọ Nahman Avigad chọpụtara ihe ndị fọrọ afọ site n’oge a. Ngwupesị ala ndị e mere kpughere otu nkebi nke mgbidi buru ibu, akụkụ nke mbụ dị mita 40 n’ogologo, mita asaa n’obosara, na dị ka atụmatụ e mere si dị, mita asatọ n’ịdị elu. Mgbidi ahụ guzotụ n’elu nkume, guzotụkwa n’elu ụlọ e wuru mgbe na-adịbeghị. Ònye wuru mgbidi ahụ, olee mgbekwa? “Akụkụ ebe abụọ na Bible nyeere Avigad aka ikwu kpọmkwem ụbọchị na nzube nke ụlọ ahụ,” ka magazin nkà mmụta ihe ochie na-akọ. Akụkụ ndị a na-agụ, sị: “O wee mee onwe ya ka ọ dị ike, wee wuzie mgbidi nile nke e tipuru etipu, o wee wulie ya ruo ụlọ elu ya nile, wuokwa mgbidi ọzọ n’azụ.” (2 Ihe Emere 32:5) “Unu wee kwatuo ụlọ nile ịrụsi mgbidi ike.” (Aịsaịa 22:10) Taa ndị nleta pụrụ ịhụ akụkụ nke ihe a a kpọrọ Mgbidi Sara Mbara n’Ógbè Ndị Juu nke Obodo Ochie ahụ.
Ngwupesị ala dị iche iche na-ekpughekwa na Jerusalem n’oge a buru nnọọ ibu karịa ka e cheworo n’echiche na-eru ugbu a, ikekwe n’ihi nnubata nke ndị gbara ọsọ ndụ site n’alaeze ebe ugwu mgbe ndị Asiria merisịrị ya. Prọfesọ Shiloh mere atụmatụ na obodo ndị Jebus gbasara ruo ebe hà ka hekta isii. N’oge Solomọn ọ fọrọ nke nta ka o ruo ebe hà ka hekta 16. Ka ọ na-erule n’oge Eze Hezekaịa, afọ 300 mgbe e mesịrị, ebe e wusiri ike nke obodo ahụ agbasawo ruo ihe hà ka hekta 60.
Ebe Ili Ozu Dịrị n’Oge Ụlọ Nsọ Mbụ
Ebe ili ozu dịrị site n’oge Ụlọ Nsọ Mbụ ahụ, ya bụ, tupu ndị Babilọn ebibie Jerusalem na 607 T.O.A., abụrụwo ebe ọzọ e si nweta ihe ọmụma. E mere nchọpụta ndị na-akpali akpali mgbe e gwupere ọtụtụ ọ́gbà ili ozu ná mkpọda Ndagwurugwu Hinọm na 1979/1980. “N’akụkọ ihe mere eme nile nke nchọpụta nkà mmụta ihe ochie na Jerusalem, nke a bụ otu n’ime ebe ndebe ihe dị nnọọ ole na ole nke Ụlọ Nsọ Mbụ bụ nke a hụrụ ya na ihe nile dị n’ime ya. Ihe ndị dị n’ime ya karịrị otu puku,” ka ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Gabriel Barkay na-ekwu. Ọ gara n’ihu, sị: “Nrọ kasị atọ onye ọkà mmụta ọ bụla nke ihe ochie na-arụ ọrụ n’Israel ụtọ, na karịsịa na Jerusalem, bụ ịchọta ihe e dere ede.” A hụrụ obere akwụkwọ mpịakọta ọlaọcha abụọ, ndị gịnị dị na ha?
Barkay na-akọwa, sị: “Mgbe m hụrụ ibe ọlaọcha a na-apịakọghị apịakọ ma dokwasị ya n’okpuru enyo na-eme ka ihe buwanye ibu, apụrụ m ịhụ na ihe kpuchiri elu ya bụ akara edemede e dere nke ọma, nke e jiri ihe pịrị ọnụ dee n’elu ibe ọlaọcha ahụ dị peke peke, na-esighịkwa ike. . . . Ihe mejupụtara Aha Chineke nke pụtara nke ọma n’ihe odide ahụ bụ akara edemede Hibru anọ e dere n’aka edemede Hibru oge ochie, bụ́ yod-he-waw-he.” Ná mbipụta e mesịrị nwee, Barkay na-agbakwụnye, sị: “Dị ka ihe ijuanya nye anyị e dekwasịrị n’ígwè ọlaọcha abụọ ahụ usoro ngọzi nke fọrọ nke nta ka ha na nke Ngọzi Ndị Nchụàjà nke Bible bụrụ otu.” (Ọnụ Ọgụgụ 6:24-26) Nke a bụ nke mbụ ya a ga-achọta aha Jehova n’ihe odide a chọtara na Jerusalem.
Olee otú ndị ọkà mmụta si mata oge akwụkwọ mpịakọta ọlaọcha ndị a malitere ịdị? N’ụzọ bụ isi site n’ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala dị gburugburu ebe a chọpụtara ha. N’ebe ndebe ahụ a hụrụ ihe karịrị iberibe 300 nke ihe ndị a kpụrụ akpụ a pụrụ ịmata oge ha, ndị na-atụ aka na narị afọ nke asaa na nke isii T.O.A. Mgbe e jiri ihe odide ahụ tụnyere ihe odide ndị ọzọ e dere oge ha, ha na-atụ aka n’otu oge. A kpọsara akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie Israel dị na Jerusalem.
Mbibi Jerusalem na 607 T.O.A.
Bible na-akọ banyere mbibi Jerusalem na 607 T.O.A. ná 2 Ndị Eze isi nke 25, 2 Ihe Emere isi nke 36, na Jeremaịa isi nke 39, na-akọ na ndị agha Nebukadneza suru obodo ahụ ọkụ. Ngwupesị ala ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya ò gosiwo na ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme a bụ eziokwu? Dị ka Prọfesọ Yigal Shiloh si kwuo, “ihe àmà [nke mbibi Babilọn wetara] dị na Bible . . . bụ nke ihe àmà doro anya nke nkà mmụta ihe ochie na-akwado; mbibikpọsị nke ihe owuwu dị iche iche, na ọkụ nke repịara ọtụtụ akụkụ e ji osisi wuo nke ụlọ ndị ahụ.” Ọ gara n’ihu kwuo, sị: “A chọtawo ihe àmà nke mbibi a ná nke ọ bụla ná ngwupesị ala ndị e mere na Jerusalem.”
Ndị nleta pụrụ ịhụ ihe ndị fọrọ afọ sitere ná mbibi a nke were ọnọdụ n’ihe karịrị afọ 2,500 gara aga. Ụlọ Elu Ndị Israel, Ọnụ Ụlọ A Gbara Ọkụ, na Ụlọ Bulla bụ aha ebe ndị a ma ama nke nkà mmụta ihe ochie bụ́ ndị e chekwara ma megheere ọha na eze. Ndị ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Jane M. Cahill na David Tarler na-achịkọta n’akwụkwọ bụ́ Ancient Jerusalem Revealed, sị: “Mbibi dị ukwuu nke ndị Babilọn bibiri Jerusalem na-apụta ìhè ọ bụghị nanị n’ikpó nke ihe ndị fọrọ afọ ọkụ gbara e gwupụtara n’ihe owuwu ndị dị ka Ọnụ Ụlọ A Gbara Ọkụ na Ụlọ Bulla, kamakwa n’ikpó nkume gbarisịrị agbari sitere n’ụlọ ndị dara ada bụ́ ndị a hụrụ na ha kpuchiri mkpọda ebe ọwụwa anyanwụ. Nkọwa Bible nke mbibi obodo ahụ . . . na-akwado ihe àmà nke nkà mmụta ihe ochie.”
Ya mere, nkọwa Bible nyere banyere Jerusalem site n’oge Devid ruo ná mbibi ya na 607 T.O.A. abụwo nke ngwupụta ihe ochie ndị e mere n’afọ 25 gara aga nwapụtaworo n’ọtụtụ ụzọ. Ma gịnị banyere Jerusalem nke narị afọ mbụ O.A.?
Jerusalem n’Ụbọchị Jisọs
Ngwupesị ala, Bible, onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ bụ́ Josephus, na ihe ndị ọzọ na-enyere ndị ọkà mmụta aka ise onyinyo Jerusalem nke ụbọchị Jisọs, tupu ndị Rom ebibie ya na 70 O.A. A na-emezi ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a kpọsara n’azụ nnukwu ụlọ oriri dị na Jerusalem mgbe mgbe iji kwekọọ n’ihe ngwupesị ala ndị ọhụrụ na-ekpughe. Akụkụ bụ isi nke obodo ahụ bụ Ugwu Ụlọ Nsọ, nke Herọd mere ka ọ dị okpukpu abụọ n’ibu ma e were ya tụnyere nke oge Solomọn. Ọ bụ ebe e wuliri elu kasị ibu mmadụ wuru n’oge gboo, ihe dị ka mita 480 n’ịdị ogologo na mita 280 n’obosara. Ụfọdụ nkume iwu ihe dị tọn 50 n’ịdị arọ, ọbụnadị na otu fọrọ nke nta ka o ruo tọn 400, “e nweghịkwa nke hà ka ya n’ebe ọ bụla n’oge gboo,” dị ka otu ọkà mmụta siri kwuo.
Ka a sịkwa ihe mere akpata oyi jiri wụọ ụfọdụ mgbe ha nụrụ ka Jisọs kwuru sị: “Kwatuonụ ụlọ nsọ a, n’ụbọchị atọ M ga-ewelikwa ya elu.” Ha chere na ọ na-ekwu banyere akatamkpo ihe owuwu ụlọ nsọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ na-ekwu banyere “ụlọ nsọ nke bụ ahụ Ya.” Ya mere, ha sịrị: “Afọ [iri anọ na isii] ka e ji wuo ụlọ nsọ a, Gị onwe gị ga-ewulikwa ya n’ụbọchị atọ?” (Jọn 2:19-21) N’ihi ngwupesị ala na gburugburu Ugwu Ụlọ Nsọ ahụ, ndị ọbịa pụrụ ugbu a ịhụ akụkụ dị iche iche nke mgbidi na ụkpụrụ ihe owuwu ndị ọzọ dị site n’oge Jisọs, ha pụkwara ọbụna ịga ije na steepụ ndị o yiri ka ọ gara ije na ha ruo n’ọnụ ụzọ ámá ebe ndịda ụlọ nsọ ahụ.
N’ebe na-adịghị anya site ná mgbidi ebe ọdịda anyanwụ nke Ugwu Ụlọ Nsọ ahụ, n’Ógbè ndị Juu nke Obodo Ochie ahụ, e nwere ebe e gwupere egwupe abụọ e dozighachiri nke ọma ndị sitere na narị afọ mbụ O.A., bụ́ ndị a maara dị ka Ụlọ A Gbara Ọkụ na Ógbè Herọd. Mgbe a chọpụtasịrị Ụlọ A Gbara Ọkụ ahụ, ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Nahman Avigad dere, sị: “O doro nnọọ anya ugbu a na ndị Rom gbara ihe owuwu a ọkụ na 70 A.D., n’oge mbibi Jerusalem. Na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme nke ngwupesị ala n’obodo a, ihe àmà nke nkà mmụta ihe ochie pụtara ìhè ma doo anya nke ịgba obodo ahụ ọkụ agbawo n’anwụ.”—Lee foto ndị dị na peji nke 12.
Ụfọdụ ihe nchọpụta ndị a na-eme ka ihe omume ụfọdụ n’oge ndụ Jisọs doo anya. Ihe owuwu ndị ahụ dị n’Obodo Ka Elu, ebe ndị ọgaranya nke Jerusalem biri, tinyere ndị isi nchụàjà. A hụrụ ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ebe isa ahụ ememe okpukpe n’ụlọ ndị ahụ. Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ebe ịsa ahụ na-agba akaebe nye idebe iwu nke ịdị ọcha okpukpe nke ndị biri n’Obodo Ka Elu ahụ debere n’ụzọ chiri anya n’oge Ụlọ Nsọ nke Abụọ ahụ. (E dekọrọ iwu ndị a na Mishnah, bụ́ nke wepụtara isiakwụkwọ iri maka nkọwa zuru ezu nke mikveh.)” Ihe ọmụma a na-enyere anyị aka ịghọta okwu Jisọs gwara ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ banyere ememe okpukpe ndị a.—Matiu 15:1-20; Mak 7:1-15.
A chọtawokwa ọnụ ọgụgụ buru ibu na-atụ n’anya nke arịa e ji nkume kpụọ na Jerusalem. Nahman Avigad na-ekwu, sị: “Gịnị meziri ha ji pụta nnọọ na mberede na n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị otú ahụ n’ezinụlọ Jerusalem? Azịza ya dị na halakhah, bụ́ iwu ndị Juu banyere ịdị ọcha okpukpe. Mishnah na-agwa anyị na arịa ndị e ji nkume kpụọ so n’ihe ndị ahụ adịghị ọcha na-adịghị emetụtakarị . . . Ịrụ arụ okpukpe adịghị nnọọ emetụta nkume.” A na-ekwu na nke a bụ ihe mere e jiri gbanye mmiri ahụ Jisọs mere ka ọ ghọọ mmanya n’arịa ndị e ji nkume kpụọ kama ịbụ n’arịa ndị e ji ájá kpụọ.—Levitikọs 11:33; Jọn 2:6.
Ileta Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie Israel ga-egosi ebe abụọ na-eju anya nke ndebe ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ. Biblical Archaeology Review na-akọwa, sị: “E jiri ebe ndebe ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ mee ihe n’ụzọ bụ isi n’ihe dị ka otu narị afọ tupu ndị Rom ebibie Jerusalem na 70 O.A. . . . A na-edebe onye nwụrụ anwụ n’ebe nzuzo a wara n’ahụ mgbidi nke ọgba ili ozu; mgbe anụ ahụ ahụ resịrị, a na-achịkọrọ ọkpụkpụ ya ma tinye ha n’ebe ndebe ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ—ebe ntinye ihe na-abụkarị nke e jiri nkume limestone chọọ mma.” A hụrụ abụọ ahụ e debere maka nkiri na November 1990 n’ọgba ili ozu. Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Zvi Greenhut na-akọ, sị: “Okwu ahụ bụ́ . . . ‘Caiapha’ [Kaịafa] dị n’abụọ n’ebe ndebe ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ dị n’ili na-apụta ebe a na nke mbụ ya n’ihe metụtara nkà mmụta ihe ochie. Ikekwe ọ bụ aha ezinụlọ nke Onyeisi Nchụàjà Kaịafas, a kpọrọ aha . . . n’Agba Ọhụrụ . . . Ọ bụ site n’ụlọ ya na Jerusalem ka e nyefere Jisọs n’aka onye ọchịchị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet.” Ọkpụkpụ nke otu nwoke dị ihe dị ka afọ 60 dị n’otu ebe ndebe ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ. Ndị ọkà mmụta na-akọ nkọ na ndị a bụ n’ezie ọkpụkpụ Kaịafas. Otu onye ọkà mmụta na-ezo aka ná nchọpụta ndị ahụ dị ka nke oge Jisọs, sị: “Ọ bụ Herọd Agrịpa (37-44 A.O.) kpụrụ otu mkpụrụ ego a hụrụ n’otu n’ime ebe ndebe ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ ndị ọzọ. Ebe abụọ e debere ọkpụkpụ Kaịafas pụrụ ịdịworị laa azụ ná mmalite nke narị afọ ahụ.”
William G. Dever, prọfesọ nke nkà mmụta ihe ochie nke Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Mahadum nke Arizona, kwuru banyere Jerusalem, sị: “Ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ịsị na anyị amụtakwuwo banyere akụkọ ihe mere eme nke nkà mmụta ihe ochie nke ebe a dị mkpa n’afọ 15 gara aga karịa n’afọ 150 nile bu ya ụzọ.” Ọtụtụ n’ime ọrụ nkà mmụta ihe ochie gbara ọkpụrụkpụ na Jerusalem n’afọ iri ndị na-adịbeghị anya ewepụtawo ihe ndị na-eme ka akụkọ ihe mere eme nke Bible doo anya.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]
Nsepụtaghachi nke Obodo Jerusalem n’oge Ụlọ Nsọ nke Abụọ ahụ – nke dị n’ala Holyland Hotel, Jerusalem
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
N’elu: Akụkụ ndịda ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Ụlọ Nsọ Jerusalem
N’aka nri: Ịgbada n’Olulu Warren