Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 7/15 p. 25-29
  • “Ikpe Ime Nnyocha”—Ọ̀ Bụ Nkwenkwe Dabeere na Bible?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ikpe Ime Nnyocha”—Ọ̀ Bụ Nkwenkwe Dabeere na Bible?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ọ Bụ?
  • Njikọ Asụsụ nke Na-adịghị Ya
  • Gịnị Ka Okwu Ndị Gbara Ya Gburugburu Na-ekpughe?
  • Ụfọdụ Nzaghachi Ndị Dị Ịrịba Ama
  • È Nwere Enyemaka Sitere ná Ndị Hibru?
  • Nsogbu na Agada Gbachiri Ụzọ
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Gị na Akwụkwọ Daniel
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ịmata Ndị Na-efe Ezi Ofufe na Mgbe Ọgwụgwụ
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Onye E Mere Ka Ọ Dị Ike Site n’Aka Onye Ozi Chineke Zitere
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 7/15 p. 25-29

“Ikpe Ime Nnyocha”—Ọ̀ Bụ Nkwenkwe Dabeere na Bible?

OCTOBER 22, 1844, bụ ụbọchị atụmanya dị ukwuu nye ihe dị ka mmadụ 50,000 nọ n’Ụsọ Oké Osimiri Ebe Ọwụwa Anyanwụ nke United States. Onye ndú ime mmụọ ha, bụ́ William Miller, ekwuwo na Jisọs Kraịst ga-alọghachi n’ụbọchị ahụ. Ndị òtù Miller, dị ka a na-akpọ ha, cheere n’ebe ndị ha na-enwe nzukọ ruo mgbe chi jiri. Mgbe ahụ chi ụbọchị na-esonụ bọrọ, Onyenwenụ ahụ abịabeghị. N’ịbụ ndị nwere ndakpọ olileanya, ha laghachiri ebe obibi ha ma mesịa na-echeta ụbọchị ahụ dị ka “Oké Ndakpọ Olileanya.”

Ma, n’oge na-adịghị anya olileanya nọchiri ndakpọ olileanya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ellen Harmon mere ka otu ìgwè nke ndị òtù Miller kwenye na Chineke ekpughewo n’ọhụụ na ngụkọ oge ha mere ziri ezi. O kwenyere na ihe omume dị ịrịba ama emewo n’ụbọchị ahụ—Kraịst abanyewo “ebe kasị nsọ nke ebe nsọ eluigwe” mgbe ahụ.

Ihe karịrị afọ iri n’ihu, onye nkwusa Adventist bụ́ James White (onye lụworo Ellen Harmon) chepụtara otu nkebi ahịrịokwu iji kọwaa ọdịdị nke ọrụ Kraịst eri October 1844. Na magazin bụ́ Review and Herald nke January 29, 1857, White sịrị na Jisọs amaliteworị “ikpe ime nnyocha.” Nke a abụrụwokwa nkwenkwe bụ isi n’etiti ihe dị ka nde asaa ndị na-akpọ onwe ha ndị Seventh-Day Adventist.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọkà mmụta a na-akwanyere ùgwù na Chọọchị Seventh-Day Adventist (SDA) anọwo na-enwe obi abụọ ma “ikpe ime nnyocha” ahụ ọ̀ bụ nkwenkwe dabeere na Bible. N’ihi gịnị ka ha ji echegharị echiche banyere ya? Ọ bụrụ na ị bụ onye Seventh-Day Adventist, ajụjụ a ga-agbasa gị. Otú ọ dị, nke mbụ, gịnị bụ “ikpe ime nnyocha”?

Gịnị Ka Ọ Bụ?

Akụkụ akwụkwọ nsọ bụ isi e zoro aka iji kwadoo nkwenkwe a bụ Daniel 8:14. Ọ na-agụ, sị: “O wee gwa m sị, Ruo puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ; mgbe ahụ ka a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dị ọcha.” (King James Version) N’ihi nkebi ahịrịokwu bụ́ “mgbe ahụ ka a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dị ọcha,” ọtụtụ ndị Adventist na-ejikọta amaokwu a na Levitikọs isi nke 16. Ọ na-akọwa onyeisi nchụàjà ndị Juu ime ka ebe nsọ ahụ dị ọcha n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ha na-ejikọkwa okwu Daniel na Ndị Hibru isi nke 9, bụ́ nke na-akọwa Jisọs dị ka Onyeisi Nchụàjà Ka Ukwuu n’eluigwe. Otu ọkà mmụta SDA na-ekwu na echiche a na-adabere n’ụkpụrụ “akụkụ akwụkwọ nsọ nnwapụta.” Mmadụ na-achọta “okwu dị ka ebe nsọ na Dan. 8:14, otu okwu ahụ dị na Lev. 16, otu okwu ahụ dị na Hib. 7, 8, 9,” na-ekwubikwa na “ha nile na-ekwu banyere otu ihe ahụ.”

Ndị Adventist na-eche echiche otú a: Onye nchụàjà Israel oge ochie jere ozi kwa ụbọchị ná nkebi ụlọ nsọ a na-akpọ Ebe Nsọ, na-arụpụta mgbaghara mmehie. N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, onyeisi nchụàjà jere ozi otu ugbo n’afọ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile (ọnụ ụlọ kasị dịrị n’ime n’ụlọ nsọ ahụ) nke na-arụpụta nhichapụ nke mmehie. Ha na-ekwubi na ije ozi Kraịst dị ka onye nchụàjà n’eluigwe nwere akụkụ abụọ. Nke mbụ malitere ná nrịgo ya na narị afọ mbụ, jedebe na 1844, rụpụtakwa mgbaghara mmehie. Nke abụọ, ma ọ bụ “akụkụ nke ikpe,” malitere n’October 22, 1844, nke ka na-aga n’ihu, bụ́ nke ga-arụpụtakwa nhichapụ mmehie. Olee otú e si emezu nke a?

Kemgbe 1844, a na-ekwu na Jisọs na-enyocha ihe ndekọ ndụ nke ndị nile na-ekwu na ha kwere ekwe (na mbụ nke ndị nwụrụ anwụ, e mesịakwa nke ndị dị ndụ) iji chọpụta ma hà kwesịrị ịdị ndụ ebighị ebi. Ule nke a bụ “ikpe ime nnyocha” ahụ. Mgbe e si otú a kpesịa ndị mmadụ ikpe, a na-ehichapụ mmehie nke ndị gafere ule a n’akwụkwọ ihe ndekọ. Ma, ka Ellen White kọwara, ndị na-agafeghị ka a ‘ga-ehichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndụ.’ N’ụzọ dị otú a, “a ga-ekpebiworị ọdịnihu a kara aka nke mmadụ nile maka ndụ ma ọ bụ ọnwụ.” Mgbe nke ahụ mere, e debewo ebe nsọ eluigwe ọcha, Daniel 8:14 ewee mezuo. Nke ahụ bụ ihe ndị Seventh-Day Adventist na-akụzi. Ma mbipụta SDA bụ́ Adventist Review na-ekwenye, sị: “Okwu ahụ bụ́ ikpe ime nnyocha adịghị na Bible.”

Njikọ Asụsụ nke Na-adịghị Ya

Nkụzi a enyewo ụfọdụ ndị Adventist nsogbu. “Akụkọ ihe mere eme na-egosi,” ka otu onye na-ahụ ihe na-eme na-ekwu, “na ndị ndú na-eguzosi ike n’ihe n’òtù anyị enwewo obi ezughị ike ka ha na-echebara nkụzi e ji mara anyị n’ihe banyere ikpe ime nnyocha ahụ echiche.” N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ka ọ na-agbakwụnye, obi ezughị ike ghọrọ obi abụọ ka ndị ọkà mmụta malitere “inwe obi abụọ n’ọtụtụ n’ime idé nke nkọwa anyị na-enye ebe nsọ ahụ.” Ka anyị nyochaa abụọ n’ime ha ugbu a.

Idé mbụ: A na-ejikọta Daniel isi nke 8 na Levitikọs isi nke 16. A na-ebelata ịdị irè nke echiche a site ná nsogbu abụọ bụ isi—asụsụ na okwu gbara ya gburugburu. Nke mbụ, tụlee asụsụ. Ndị Adventist kwere na ‘ebe nsọ ahụ e mere ka ọ dị ọcha’ na Daniel isi nke 8 bụ ihe atụ nke ‘ụlọ nsọ ahụ e debere ọcha’ nke Levitikọs isi nke 16. Myirịta nke a yiri ihe a pụrụ ịnakwere ruo mgbe ndị nsụgharị mụtara na “e debere ọcha” dị na King James Version bụ nsụgharị hiere ụzọ nke otu ụdị ngwaa Hibru bụ́ tsa·dhaqʹ (pụtara “ịbụ onye ezi omume”) e ji mee ihe na Daniel 8:14. Prọfesọ nkà mmụta okpukpe bụ́ Anthony A. Hoekema na-arịba ama: “Ọ dị mwute na a sụgharịrị okwu ahụ ịbụ e debere ọcha, ebe ọ bụ na e jighị ngwaa Hibru a na-asụgharịkarị e debere ọcha [ta·herʹ] mee ihe n’ebe a ma ọlị.”a E ji ya mee ihe na Levitikọs isi nke 16 ebe King James Version sụgharịrị ụdị dị iche iche nke ta·herʹ dị ka “debe ọcha” na “dị ọcha.” (Levitikọs 16:19, 30) N’ihi ya, Dr. Hoekema na-ekwubi n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ọ bụrụ na Daniel bu n’obi izo aka n’ụdị idebe ọcha nke e mere n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, ọ gaara eji taheer [ta·herʹ] mee ihe kama iji tsadaq [tsa·dhaqʹ].” Ma, tsa·dhaqʹ adịghị na Levitikọs, ta·herʹ adịghịkwa na Daniel. Njikọ asụsụ nke a na-efu efu.

Gịnị Ka Okwu Ndị Gbara Ya Gburugburu Na-ekpughe?

Ugbu a tụlee okwu ndị gbara ya gburugburu. Ndị Adventist kwenyere na Daniel 8:14 bụ “okwu kwụụrụ onwe ya,” n’enweghị ihe ya na amaokwu ndị bu ya ụzọ nwekọrọ. Ma ị̀ na-enwe echiche ahụ mgbe ị gụrụ Daniel 8:9-14 n’igbe ya na isiokwu a so nke isiokwu ya bụ “Daniel 8:14 n’Okwu Ndị Gbara Ya Gburugburu”? Amaokwu nke 9 na-eme ka a mata otu onye mwakpo, mpi nta. Amaokwu nke 10-12 na-ekpughe na onye mwakpo a ga-awakwasị ebe nsọ ahụ. Amaokwu nke 13 na-ajụ, sị, ‘Ruo ole mgbe ka mwakwasị a ga-adịru?’ Amaokwu nke 14 na-aza, sị: “Ruo [anyasị na ụtụtụ puku abụọ na narị atọ]; a ga-emerịrị ka ebe nsọ ahụ bịaghachi n’ezi ọnọdụ ya.” N’ụzọ doro anya, amaokwu nke 13 na-ewelite ajụjụ a na-aza n’amaokwu nke 14. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Desmond Ford na-asị: “Ikewapụ Dan. 8:14 n’ebe mkpu a [“Ruo ole mgbe?” amaokwu nke 13] dị bụ ịgba aka n’etiti ogbu mmiri n’ejighị arịlịka n’ụzọ nkọwa okwu.”b

Gịnị mere ndị Adventist ji ekewapụ amaokwu nke 14 site n’okwu ndị gbara ya gburugburu? Iji zere nkwubi okwu na-emenye ihere. Okwu ndị gbara ya gburugburu na-ekwu na ọ bụ mpi nta ahụ merụrụ ebe nsọ ahụ e kwuru n’amaokwu nke 14. Otú ọ dị, nkwenkwe “ikpe ime nnyocha” ahụ na-ekwu na ọ bụ ọrụ Kraịst merụrụ ebe nsọ ahụ. A na-ekwu na o bugara mmehie ndị kwere ekwe n’ebe nsọ dị n’eluigwe. N’ihi ya, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị Adventist anakwere ma nkwenkwe ahụ ma okwu ndị gbara ya gburugburu? Dr. Raymond F. Cottrell, onye Seventh-Day Adventist na onye sobu bụrụ editọ nke akwụkwọ bụ́ SDA Bible Commentary, na-ede, sị: “Ịghọgbu onwe anyị na nkọwa SDA na-atụle Daniel 8:14 n’ikwekọ n’okwu ndị gbara ya gburugburu ga-esizi otú ahụ bụrụ ịkọwa mpi nta ahụ dị ka Kraịst.” Dr. Cottrell kwenyere n’ezoghị ọnụ, sị: “Anyị apụghị inwe ma okwu ndị gbara ya gburugburu ma nkọwa ndị Adventist.” Ya mere, n’ihe banyere “ikpe ime nnyocha” ahụ, Chọọchị Adventist aghaghị ime nhọrọ—ịnakwere nkwenkwe ahụ ka ọ bụ okwu gbara Daniel 8:14 gburugburu. N’ụzọ dị mwute, ọ nakweere nke bu ụzọ ma jụ nke kpe azụ. Ọ bụghị ihe ijuanya, ka Dr. Cottrell na-ekwu, na ndị mmụta Bible ma nke a na-akọ na-ata ndị Adventist ụta maka “ịgụnye n’Akwụkwọ Nsọ” ihe a na-apụghị “inweta site n’Akwụkwọ Nsọ”!

Na 1967, Dr. Cottrell kwadebere ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ sabat na Daniel, bụ́ nke e zigaara chọọchị SDA n’ụwa nile. Ọ kụziri na Daniel 8:14 kwekọrọ n’okwu ndị gbara ya gburugburu, nakwa na ‘idebe ọcha’ adịghị ezo aka n’ebe ndị kwere ekwe nọ. N’ụzọ dị ịrịba ama, ihe ọmụmụ ahụ ekwughị banyere “ikpe ime nnyocha.”

Ụfọdụ Nzaghachi Ndị Dị Ịrịba Ama

Olee otú nghọta Adventist hà nke na idé a enweghị ike ịkwado nkwenkwe “ikpe ime nnyocha” ahụ? Dr. Cottrell jụrụ ndị ọkà mmụta okpukpe 27 a ma ama nke Adventist sị, ‘Ihe ndị dị aṅaa metụtara asụsụ ma ọ bụ okwu ndị gbara ha gburugburu ka unu pụrụ ikwu mere e ji ejikọ Daniel isi nke 8 na Levitikọs isi nke 16?’ Gịnị bụ nzaghachi ha?

“Ha iri abụọ na asaa kwenyere na e nweghị ihe metụtara asụsụ ma ọ bụ okwu ndị gbara ha gburugburu mere ha ji ejikọ Dan. 8:14 n’ụbọchị mkpuchi mmehie ihe atụ ahụ na ikpe ime nnyocha ahụ.” Ọ jụrụ ha sị, ‘Ùnu nwere ihe ọzọ mere unu ji eme njikọ a?’ Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta Adventist ahụ sịrị na ha enweghị ihe ọzọ kpatara ya, ise zaghachiri na ha mere njikọ a n’ihi na Ellen White mere otú ahụ, abụọ sịkwara na ha hiwere nkwenkwe ahụ isi ‘n’ihe ndabara ọma’ mere ná nsụgharị. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Ford na-ekwu, sị: “Nkwubi okwu ndị dị otú ahụ nke ndị bụ ọ kasị mma na nkà mmụta anyị na-enye na-emezi ka o doo anya na nkụzi e ji mara anyị dabeere na Dan. 8:14 enweghị nkwado.”

È Nwere Enyemaka Sitere ná Ndị Hibru?

Idé nke abụọ: A na-ejikọ Daniel 8:14 na Ndị Hibru isi nke 9. “Akwụkwọ mbụ anyị nile ji Hib. 9 mee ihe nke ukwuu n’ịkọwa Dan. 8:14,” ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Ford na-ekwu. A malitere njikọ a mgbe “Oké Ndakpọ Olileanya” ahụ gasịrị na 1844. N’ịchọ nduzi, onye òtù Miller bụ́ Hiram Edson tụdara Bible ya n’elu otu table ka o wee daa ma sapee. Gịnị si na ya pụta? Ndị Hibru isi nke 8 na 9 meghere n’ihu ya. Ford na-ekwu, sị: “Gịnị pụrụ ikwesị ekwesị karị, bụrụkwa ihe nnọchianya nke nzọrọ ndị Adventist na isiakwụkwọ ndị a bụ nkọwa nke ihe 1844 na Dan. 8:14 pụtara!”

“Nzọrọ ahụ dị oké mkpa nye ndị Seventh-day Adventist,” ka Dr. Ford na-agbakwụnye n’akwụkwọ ya bụ́ Daniel 8:14, the Day of Atonement, and the Investigative Judgment. “Nanị na Hib. 9 . . . ka a pụrụ ịhụ nkọwa zuru ezu banyere ihe . . . nkwenkwe ebe nsọ ahụ bụ́ nke dị oké mkpa nye anyị pụtara.” Ee, Ndị Hibru isi nke 9 bụ isiakwụkwọ ahụ dị ‘n’Agba Ọhụrụ’ iji kọwaa ihe Levitikọs isi nke 16 pụtara n’ụzọ amụma. Ma ndị Adventist na-ekwukwa na Daniel 8:14 bụ amaokwu ahụ dị ‘n’Agba Ochie’ nke na-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na okwu abụọ ahụ bụ eziokwu, a ghaghị inwe njikọ n’agbata Ndị Hibru isi nke 9 and Daniel isi nke 8 n’otu aka ahụ.

Desmond Ford na-ekwu, sị: “Ihe ụfọdụ na-apụta ìhè ozugbo mmadụ gụrụ Hib. 9. E nweghị aka pụtara ìhè e zoro n’akwụkwọ Daniel, o dokwara anya na ọ dịghị nke e zoro na Dan. 8:14. . . . Isiakwụkwọ ahụ n’ozuzu ya bụ nkọwa nke Lev. 16.” Ọ na-ekwu, sị: “A pụghị ịchọta nkụzi ebe nsọ anyị n’ime nanị akwụkwọ nke Agba Ọhụrụ nke na-atụle ịdị mkpa nke ije ozi ebe nsọ. Ndị edemede Adventist a maara nke ọma gburugburu ụwa ekwenyewo nke a.” Ya mere, idé nke abụọ enwetụghị nnọọ ike ịkwado nkwenkwe a nwere nsogbu.

Otú ọ dị, nkwubi okwu a adịghị ọhụrụ. Ruo ọtụtụ afọ, ka Dr. Cottrell na-ekwu, “ndị ọkà mmụta Bible nke chọọchị anyị amawo nke ọma banyere nsogbu asụsụ anyị nwere banyere nkọwa anyị nọworo na-enye Daniel 8:14 na Ndị Hibru 9.” Ihe dị ka afọ 80 gara aga, onye Seventh-Day Adventist nwere agba bụ́ E. J. Waggoner dere, sị: “Nkụzi ndị Adventist banyere ebe nsọ ahụ, ya na ‘Ikpe Ime Nnyocha’ ya . . . , bụ nnọọ ịgọnarị mkpuchi mmehie ahụ.” (Confession of Faith) Ihe karịrị afọ 30 gara aga, e chere nsogbu ndị dị otú ahụ n’ihu Nnọkọ Ezumezu Nkwurịta Okwu, bụ́ ndị ndú nke Chọọchị SDA.

Nsogbu na Agada Gbachiri Ụzọ

Nnọkọ Ezumezu Nkwurịta Okwu ahụ họpụtara otu “Kọmitii ná Nsogbu Ndị Dị n’Akwụkwọ Daniel.” Ọ gaje ịkwadebe akụkọ n’ụzọ a ga-esi dozie ihe isi ike ndị e nwere na Daniel 8:14. Ndị òtù kọmitii mmadụ 14 ahụ ji afọ ise nyochaa ajụjụ ahụ ma ghara ịtụpụta azịza ha kwekọrịtara na ya. Na 1980, onye so na kọmitii ahụ bụ́ Cottrel sịrị na ihe ka ọtụtụ ná ndị òtù kọmitii ahụ chere na a pụrụ iji ọtụtụ “nchepụta” “hiwe n’ụzọ na-eju afọ” nkọwa ndị Adventist na-enye Daniel 8:14, nakwa na nsogbu ndị ahụ “kwesịrị nchefu.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Cheta, aha kọmitii ahụ bụ Kọmitii ná Nsogbu Ndị Dị n’Akwụkwọ Daniel, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-atụkwa aro ka anyị chefuo nsogbu ndị ahụ ma ghara ikwu ihe ọ bụla banyere ha.” Nke ahụ gaara apụta “ikwenye na anyị enweghị azịza ọ bụla.” N’ihi ya ọnụ ọgụgụ ka nta jụrụ ịkwado echiche ndị ka n’ọnụ ọgụgụ, e nweghịkwa akụkọ sitere n’aka kọmitii ahụ. E nwetabeghị azịza nye nsogbu ndị ahụ metụtara nkwenkwe.

N’ikwu okwu banyere agada nke a gbachiri ụzọ, Dr. Cottrell na-asị: “Okwu banyere Daniel 8:14 ka dịkwa n’ihi na, ruo ugbu a, anyị adịbeghị njikere iche eziokwu ahụ bụ na e nwere nsogbu asụsụ n’ezie ihu. Okwu ahụ agaghị ebi ruo ogologo oge anyị nọgidere na-eme ka à ga-asị na nsogbu adịghị, ruo ogologo oge anyị, n’otu n’otu na n’ìgwè, nọgidere n’echiche ndị anyị nweburu.”—Spectrum, magazin nke Òtù Ezumezu Ndị Adventist na-ebipụta.

Dr. Cottrell gbara ndị Adventist ume ime “nnyochagharị e ji nlezianya mee banyere nchepụta ndị bụ isi na ụkpụrụ nke asụsụ ndị anyị meworo ka nkọwa anyị banyere nke a dabere na ha—nye okpukpe ndị Adventist—bụ́ akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị oké mkpa.” Anyị ga-agba ndị Adventist ume inyocha nkwenkwe nke “ikpe ime nnyocha” iji hụ ma idé ha hà dabeere na Bible ka hà dabeere n’ájá na-achị achị nke ọdịnala.c Pọl onyeozi gbara ume n’ụzọ amamihe, sị: “Na-anwanụ ihe nile; jidesienụ ihe ọma ike.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:21.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akwụkwọ bụ́ Wilson’s Old Testament Word Studies na-akọwa tsadaq (ma ọ bụ, tsa·dhaqʹ) dị ka “ịbụ onye ezi omume, ịbụ onye ziri ezi,” na taheer (ma ọ bụ, ta·herʹ) dị ka “inwu ọcha, inwupụ enwupụ, igbuke egbuke; enweghị ntụpọ, ịdị ọcha, enweghị unyi; ịdị ọcha pụọ ná mmetọ ma ọ bụ ná mmerụ.”

b Dr. Ford bụ prọfesọ okpukpe na Pacific Union College dị na U.S.A., nke chọọchị na-ahụ maka ya. Na 1980 ndị ndú SDA nyere ya ezumike ọnwa isii ka o wee mụọ nkwenkwe ahụ, ma ha jụrụ ihe ndị ọ chọpụtara. O bipụtara ndị a n’akwụkwọ bụ́ Daniel 8:14, the Day of Atonement, and the Investigative Judgment.

c Maka nkọwa a tụlere atụle nke Daniel isi nke 8, lee peji nke 188-219 n’akwụkwọ bụ́ “Ka Eme Ihe I Nachọ N’uwa,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Daniel 8:14 n’Okwu Ndị Gbara Ya Gburugburu

DANIEL 8:9 “Ma otu n’ime ha ka otu mpi nta siri pụta, o wee dịkarịsịrị ukwuu, n’ụzọ Ndịda, na n’ụzọ Ọwụwa anyanwụ, na n’ụzọ ala ahụ mara mma. 10 O wee dị ukwuu ruo usuu ihe nile nke eluigwe; o wee mee ka ụfọdụ n’ime usuu ihe nile nke eluigwe na n’ime kpakpando daa n’ala, o wee zọda ha ụkwụ. 11 Ọbụna ruo Onyeisi nke usuu ahụ ka o mere onwe ya ukwuu; ọ bụkwa n’aka Ya ka ọ napụrụ àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum, a tụdakwara ọnọdụ nke ebe nsọ Ya. 12 A na-enyekwa ya usuu ndị agha imegide àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum n’ihi mmehie; o wee tụda eziokwu n’ala, mee ihe, ihe gakwaara ya.

“13 M wee nụ onye nsọ ka ọ na-ekwu okwu, otu onye nsọ wee sị onye ahụ nke na-ekwu okwu, Ruo ole mgbe ka ọhụụ a ga-adị, bụ́ nke àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum, na njehie ahụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, inye ma ebe nsọ ma usuu ndị agha ka a zọda ha ụkwụ? 14 O wee sị m, Ruo [anyasị na ụtụtụ puku abụọ na narị atọ]; e wee gụọ ebe nsọ n’ebe ezi omume.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Bible Nsọ nke Union Version.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya