Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/15 p. 24-27
  • Ozi Ọma nke Paradaịs na Tahiti

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma nke Paradaịs na Tahiti
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Mmalite Dị Nta
  • Ọrụ ahụ Agaa n’Ihu
  • Tahiti Aghọọ Alaka
  • A Ka Nwere Ihe Dị Ukwuu Ime
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/15 p. 24-27

Ozi Ọma nke Paradaịs na Tahiti

TAHITI! Aha ahụ yiri ka o nwere ụdị ndọrọ pụrụ iche. Ndị nkà na ndị edemede ndị dị ka Paul Gauguin, Robert Louis Stevenson, na Herman Melville, ndị ngosi ha gosipụtara ịma mma ebe okpomọkụ na ịdị jụụ nke Àgwàetiti Ndịda Oké Osimiri ahụ dọọrọ mmasị ọtụtụ ndị mere ka o wuo ewu.

Tahiti bụ àgwàetiti kasị saa mbara n’ime ihe karịrị àgwàetiti 120 na French Polynesia, nke dị na Ndịda Pacific. Ọ bụ ezie na àgwàetiti Ndịda Oké Osimiri a fọrọ nke nta ka ya na paradaịs bụrụ otu ihe n’uche ndị ka n’ọnụ ọgụgụ, ndị bi na Tahiti ka nwere mkpa ịnụ banyere paradaịs ọzọ ga-abịa n’isi nso. (Luk 23:43) Ndịàmà Jehova, ndị ngụkọta ha dị 1,918 na Tahiti taa, na-arụ ọrụ nke ịkọrọ ndị mmadụ 220,000 banyere ozi ọma ahụ bụ́ na Alaeze Chineke ga-eweta ọnọdụ paradaịs ndị bụ ezie n’isi nso ọ bụghị nanị na Tahiti kamakwa n’ụwa nile.—Matiu 24:14; Mkpughe 21:3, 4.

Ruo ọtụtụ afọ alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Fiji haziri ọrụ ime nkwusa ahụ na Tahiti, ihe dị ka kilomita 3,500 site n’ebe ahụ. Oké ịdị anya ya mere ka ihe sie ike, ọganihu adịghịkwa ngwa. N’ihi ya, n’April 1, 1975, e guzobere alaka ụlọ ọrụ na Tahiti, nke ahụ kakwara akara oge oké mgbanwe n’ọrụ ezi ndị Kraịst n’ókèala a. Gịnị dugara n’ihe omume nke a, oleekwa otú ọrụ ime nkwusa ahụ si malite na Tahiti?

Mmalite Dị Nta

A nụrụ ozi ọma Alaeze ahụ na nke mbụ ya na Tahiti n’afọ ndị 1930, ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti ahụ, ndị nwere nkwanye ùgwù dị ukwuu maka Bible, jikwa mmasị dị ukwuu zaghachi. Otú ọ dị, n’ihi mmachibido iwu na ihe mgbochi ndị ọzọ nke gọọmenti, e nwebeghịkwa Ndịàmà n’àgwàetiti ahụ ná ngwụsị afọ ndị 1950. N’oge ahụ, Agnès Schenck, onye Tahiti bi na United States, kpebiri ịlaghachi na Tahiti ya na di ya na nwa ha nwoke. Ọ na-akọ otú o si mee.

“Ná mgbakọ distrikti nke 1957 na Los Angeles, Nwanna Knorr [onye isi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ] kọwara na e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze na Tahiti. O ruwo otu afọ e mere m baptism n’oge ahụ, m tiri mkpu, sị, ‘Ka anyị gazienụ Tahiti!’ Ezinụlọ abụọ, ezinụlọ Neill na ezinụlọ Carano, ezi ndị enyi anyị, nụrụ ihe m kwuru. Ha gwara anyị na ọ ga-amasị ha isoro anyị jee, ma anyị enweghị ego buru ibu. Di m arịawo ọrịa ogologo oge, nwa m nwoke dịkwa obere. Ya mere o siiri anyị ike ịhapụ. Ndị enyi anyị nọ n’ọgbakọ ndị dị anyị nso nụrụ banyere nzube anyị, ha zitekwaara anyị ego na ihe ndị e ji ebi n’ụlọ. Mgbe ahụ na May 1958 anyị ji ụgbọ mmiri jee Tahiti na-eji ákwà mfụchi 36, tinyere ihe ndị ọzọ!

“Mgbe anyị rutere Tahiti, ọ dị m ka m bụ onye ọbịa n’ihi na ahapụwo m àgwàetiti ahụ eri afọ 20. Anyị malitere ime nkwusa, ma anyị na-akpachara anya n’ihi na a machibidoro ọrụ ndị Kraịst anyị iwu. Anyị aghaghị izo magazin anyị, anyị jikwa nanị Bible mee ihe. Na mbụ anyị gbaara nanị ndị ahụ nwewororị ụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta! àmà.

“Clyde Neill na David Carano, tinyere ezinụlọ ha, sonyeere anyị mgbe e mesịrị mgbakọ mba nile ahụ na New York City na 1958. Anyị mekọrọ nkwusa ọnụ ma kpọọ ndị mmadụ òkù ịbịa nụrụ okwu ndị e kwuru n’ụlọ ụmụnna. Nwayọọ nwayọọ a haziri ihe, anyị jikwa mmadụ 15 wee malite ìgwè ọmụmụ Bible. Mgbe ọnwa atọ gasịrị ezinụlọ Neill na ezinụlọ Carano lara n’ihi na visa ime njem nleta ha adịkwaghị irè. Ya mere ụmụnna ahụ kpebiri na tupu ha ahapụ, ha ga-eme ndị nile nwere mmasị bụ́ ndị ruru eru baptism. M nwere ihe ùgwù nke ịbụ onye nsụgharị nke okwu baptism mbụ. N’oge a mmadụ asatọ bụ ụmụ afọ àgwàetiti ahụ gosipụtara nrara ha nye Jehova site na baptism. Mgbe ahụ ezinụlọ Neill na ezinụlọ Carano laghachiri United States.

“Ọrụ nkwusa ahụ gara n’ihu. Anyị haziri onwe anyị n’ìgwè nta dị iche iche ma kpọtụrụ ndị mmadụ n’oge uhuruchi. Mgbe mgbe nkwurịta okwu anyị na ndị nwere mmasị na-eru n’etiti abalị. N’oge ụfọdụ ọbụna ndị ụkọchukwu Protestant sonyeere anyị ná nkwurịta okwu ahụ. Na 1959 e guzobere ọgbakọ mbụ. Mgbe ahụ, na 1960 ndị ọchịchị kwadoro òtù Ndịàmà Jehova, bụ́ nke nyere anyị oké ọṅụ. Afọ ndị mbụ ahụ jupụtara n’ọṅụ na mwuli elu ime mmụọ. Jehova gọziri n’ezie mkpebi anyị ịga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu.” Nwanna Nwanyị Schenck dị afọ 87 ugbu a, ma ọ ka na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’ọgbakọ ya.

Ọrụ ahụ Agaa n’Ihu

Na 1969 e kenyere Ndịama abụọ si France, bụ́ Jacques na Paulette Inaudi, ịga Tahiti dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Jacques na-echeta: “Mgbe anyị rutere na Tahiti, e nwere nanị ndị nkwusa 124, otu ọgbakọ na Papeete, na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ na Vairao, n’ala ahụ dịịrị banye ná mmiri.” Ibe ala dị warara jikọtara ala ahụ dịịrị banye ná mmiri na Tahiti. A gaje inwe Mgbakọ Mba Nile nke “Udo n’Elu Ụwa” n’isi nso. “Nke ahụ bụ ahụmahụ mbụ m n’ịhazi mgbakọ,” ka Jacques gara n’ihu na-ekwu. “Anyị mere atụmatụ nnọkọ nke Bekee maka ndị ọbịa, hiwe ìgwè ndị abụ maka abụ Alaeze, ma mụgharịa ihe nkiri abụọ. Nanị ndị nkwusa 126 rụzuru ọrụ ndị a nile. O doro m anya na Jehova rụrụ akụkụ ya kasị ukwuu.” Ndị bịaranụ bụ́ 488 bụ ihe oké obi ụtọ nye ndị àgwàetiti ahụ. Nye ọtụtụ ha, ọ bụ nke mbụ izute Ndịàmà ibe ha si n’ala ndị ọzọ.

Ngwa ngwa ka e mesịrị, e kenyere Jacques Inaudi ọrụ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ka ọ na-eleta àgwàetiti ahụ dị iche iche, ọ hụrụ na e nwere mmasị dị ukwuu ma nwee ndị nkwusa Alaeze ole na ole ịzụlite ya. “Ọ bụ ya mere m ji gbaa ọtụtụ ezinụlọ ume ịga n’àgwàetiti ndị a ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu,” ka Jacques na-akọwa. “Ya mere nke nta nke nta, ozi ọma ahụ gbasazuru ìgwè àgwàetiti ndị ahụ.” Nwanna Inaudi jere ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị site na 1969 ruo 1974, ma taa ọ bụ okenye n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Tahiti.

N’ime ndị nakweere agbamume Nwanna Inaudi bụ Auguste Temanaha, otu n’ime mmadụ asatọ ahụ e mere baptism na 1958. Ọ na-akọ ihe mere. “Na 1972 onye nlekọta sekit, Jacques Inaudi, gbara anyị ume ịtụle ịga jee ozi na Huahine, otu n’ime Àgwàetiti Leeward nke dị n’ìgwè Society. M lara azụ n’ihi na ọ bụ nanị ọgụgụ Bible ka m gụworo n’ọgbakọ, echeghịkwa m na m ruru eru inye ibu ọrụ dị otú ahụ. Otú o sina dị, Nwanna Inaudi nọgidere na-agwa m sị, ‘Echegbula onwe gị, ị pụrụ ime ya!’ Mgbe nwa oge gasịrị anyị mere mkpebi. Ya mere, na 1973 anyị rere ihe nile ma kpọrọ ụmụntakịrị atọ anyị gaa na Huahine.

“Mgbe anyị rutere, achọpụtara m na m ghaghị ịmalite ihe nile—Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na ihe ndị ọzọ. Ọ dịghị mfe, ma anyị nwetara nchebe na enyemaka Jehova. N’ọtụtụ oge o nyeere anyị aka ịchọta ebe obibi. Mgbe ahụ, mgbe otu ìgwè ndị mmegide nwara ịchụpụ Ndịàmà n’àgwàetiti ahụ, otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ógbè ahụ biliri ikwuchitere anyị. N’ezie, Jehova lekọtara anyị n’oge ndị ahụ nile.” Ugbu a, e nwere ọgbakọ abụọ na Huahine—ọgbakọ French nke nwere ndị nkwusa 23 na otu nke Tahitian nke nwere ndị nkwusa 55.

Na 1969, e kenyere Hélène Mapu ọrụ dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche ịrụ ala ahụ dịịrị banye ná mmiri. “E nwere nnọọ nnukwu mmasị n’ala ahụ dịịrị banye ná mmiri, n’oge na-adịghịkwa anya, amalitere m ọtụtụ ọmụmụ Bible,” ka Hélène na-ekwu. E guzobere otu ọgbakọ nta na Vairao n’oge na-adịghị anya, ma e nwere mkpa maka ndị okenye. Ka oge na-aga, Colson Deane, onye bi na Papara nke dị kilomita 35 site n’ebe ahụ, nyere aka. “A ghaghị ịhazi anyị nke ọma iji nwee ike ije ozi na Vairao,” ka Nwanna Dean na-akọ. “Anọ m na-arụ ọrụ na Faaa, kilomita 70 site na Vairao n’akụkụ nke ọzọ nke àgwàetiti ahụ. Mgbe a gbasara ọrụ, m ga-agbala n’ụlọ, kpọrọ ezinụlọ m, ma mgbe ahụ gawa na Vairao. Ka e mesịrị anyị kwagara na Faaa n’ihi ọrụ m. Ànyị ka ga-enwe ike ịkwado Ọgbakọ Vairao? Anyị chọrọ n’ezie inyere ụmụnna aka n’ebe ahụ, ya mere anyị kpebiri ịga n’ihu. Anyị na-alọtakebe n’ụlọ n’abalị nzukọ n’etiti abalị n’ihi na anyị na-eme ọtụtụ njem iji bulaa ndị na-enweghị ụgbọala. Anyị mere nke a afọ ise. Ọ bụ ihe oké ọṅụ ugbu a ịhụ ọgbakọ anọ n’akụkụ àgwàetiti nke a, anyị nwekwara ncheta ọma nke ụbọchị ndị ahụ.”

Tahiti Aghọọ Alaka

Ka ọ na-erule 1974, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze na Tahiti amụbawo ruo 199. N’afọ na-esochi mgbe N. H. Knorr na F. W. Franz, onye isi oche na osote onye isi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ, gara French Polynesia, ha hụrụ na ọ ga-aka dị irè iduzi ọrụ ime nkwusa ahụ na French Polynesia site na Tahiti, ọ bụghị site na Fiji nke dị ihe karịrị kilomita 3,500 site n’ebe ahụ. Ya mere, n’April 1, 1975, e hiwere alaka Tahiti, a họpụtakwara onye nlekọta sekit, Alain Jamet, dị ka onye nlekọta alaka ahụ.

N’ọtụtụ afọ gara aga, Nwanna Jamet kọrọ ngọzi ndị magburu onwe ha sitere n’aka Jehova. “Kemgbe 1975 e tinyewo mgbalị dị ukwuu iji ozi ọma ahụ gaa n’àgwàetiti na ìgwè àgwàetiti nile n’ókèala anyị, nke na-emetụtazu ógbè hà ka Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe. Ihe ndị ọ rụpụtara anọwo na-enye obi ụtọ. Ka ọ na-erule 1983 ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa amụbawo ruo 538. N’afọ ahụ e wuru ihe owuwu maka alaka ụlọ ọrụ na Ebe Obibi Betel na Paea. Ugbu a, e nwere ihe dị ka ndị nkwusa 1,900 nọgasị n’ime ọgbakọ 30 n’Àgwàetiti Society, otu ọgbakọ na otu ìgwè nọpụrụ anọpụ n’Àgwàetiti Austral, otu ọgbakọ na ìgwè abụọ nọpụrụ anọpụ na Marquesas, na ọtụtụ ìgwè nọpụrụ anọpụ n’Àgwàetiti Tuamotu na Àgwàetiti Gambier. A na-ewukwa ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze—atọ na Marquesas nakwa asaa na Tahiti—ilekọta ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị ọhụrụ na-abịa nzukọ. N’afọ 20 gara aga, Jehova agọziwo n’ezie mgbalị anyị ịrụ ọrụ n’ubi Tahiti.”

A Ka Nwere Ihe Dị Ukwuu Ime

Ohere maka uto na French Polynesia magburu onwe ya. Na March 23, 1997, ihe dị ka mmadụ 5,376 sooro Ndịàmà Jehova na French Polynesia dum zukọta maka Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs Kraịst. Iji gboo mkpa ime mmụọ nke ndị a nwere mmasị, e mere ka e nwee mbipụta anyị ndị dabeere na Bible n’ọtụtụ n’ime asụsụ dị n’ógbè ahụ. Tinyere asụsụ Tahitian, a kwadebewo akwụkwọ dị iche iche na Paumotu, bụ́ nke a na-asụ n’Ìgwè Àgwàetiti Tuamotu na n’Ebe Ugwu na Ndịda Marquesas.

Uto ahụ na-aga n’ihu na ahụmahụ ọma ndị ahụ enyerewo ndị nkwusa Alaeze na Tahiti aka ịghọta ịhụnanya na ndidi Jehova n’ụzọ zuru ezu karị, bụ́ “Onye na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu,” ọbụna n’àgwàetiti dị anya nke Ndịda Oké Osimiri ahụ. (1 Timoti 2:4) Ndịàmà Jehova na Tahiti na n’àgwàetiti ndị ọzọ nke French Polynesia nwere okwukwe zuru ezu ná nkwa Jehova bụ́: “Àgwàetiti nile ga-ele anya m, ọ bụ ogwe aka m ka ha ga-echere.”—Aịsaịa 51:5.

[Map/Foto dị na peeji nke 26]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Alaka Tahiti na-elekọta mkpa nke French Polynesia

AUSTRALIA

[Foto dị na peeji nke 25]

Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Alain Jamet, Mary-Ann Jamet, Agnès Schenck, Paulette Inaudi, na Jacques Inaudi

[Foto dị na peeji nke 27]

Alaka ụlọ ọrụ Tahiti

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya