Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba Maka Ije Ozi Dị Nsọ
Dị Ka Harry Bloor Si kọọ
Ihe dị ka otu narị afọ gara aga, nna m ochie bụ ezigbo onye òtù Chọọchị Metọdist. Ọ bụkwa onye okwuchukwu a na-akwanyere ùgwù, nke nyere onyinye dị ukwuu iji kwadoo ọtụtụ ụlọ ekpere dị na Stoke-on-Trent, bụ́ obodo a na-akpụ ihe ọkpụkpụ n’England. E mesịa, ihe siiri ya ike n’ụzọ ego. Iji nyere nna m ochie aka, nna m mere ndokwa ka ọ na-elekọta otu obere ụlọ ahịa ime obodo. Ụlọ ahịa ahụ nwere akwụkwọ ikike ire biya, mgbe ndị Metọdist nụkwara nke a, ha chụpụrụ nna m ochie ozugbo.
NNA m were oké iwe ma ṅụọ iyi na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-ejikọkwa ya na okpukpe ọzọ—o debekwara okwu ya. Ọ bụbu onye uwe ojii, ma mesịa nwee otu ụlọ mmanya. Ya mere a zụlitere m n’etiti ísì na anwụrụ ọkụ nke ebe ahụ. Ọ dịghị ka okpukpe siri metụta ndụ m, ma amụtara m ịzụ ihe ka ọtụtụ n’egwuregwu bọọdụ nke ọma! Otú ọ dị, n’ihi mmetụta nna m ochie nwere n’ahụ m ná mmalite, anọgidere m na-enwe oké nkwanye ùgwù maka Bible, ọ bụ ezie na m maara ihe dị nta banyere ya.
Amụtara M Eziokwu Bible
Na 1923, mgbe m dị afọ 24, akwagara m n’ọwụwa anyanwụ Nottingham ma malite ibedo Mary, bụ́ onye bi ihe dị ka kilomita 40 site n’ebe ahụ n’obodo nta bụ́ Whetstone, n’ọdịda anyanwụ ndịda Leicester. Nna ya, bụ́ Arthur Rest, bụbu onye na-akpọ organ n’ụlọ ekpere dị n’ebe ahụ, ma ka ọ dị mgbe ahụ ọ bụ Onye Mmụta Bible na-anụ ọkụ n’obi, dị ka a matara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Arthur na-adị agwa m okwu mgbe nile banyere okpukpe ọhụrụ ya—n’enwechaghị ihe ịga nke ọma. Otú ọ dị, a kpaliri mmasị m mgbe m sooro ya gaa n’ụlọ ekpere ndị Baptist dị n’ebe ahụ n’ehihie Sunday, July 13, 1924, ịnụrụ okwu onye òtù nke nzukọ ndị isi bụ́ onye Baptist a ma ama, kwuru. Isiokwu ya, bụ́ “E Nyochaa Nkụzi Pastọ Russell n’Ìhè nke Akwụkwọ Nsọ,” kpaliri mmasị m. M ka nwere ihe ndị m deturu mgbe ahụ.
Ndị Baptist jụrụ arịrịọ Ndị Mmụta Bible rịọrọ ka ha zaghachi nkatọ a katọrọ nkwenkwe ha. Nke a were m iwe nke ukwuu, m kpebikwara ịchọta ebe ọzọ a ga-enwe nzukọ dị otú ahụ. Otu ọbá dị nso n’ebe ahụ dabara adaba. Anyị zachara ya, wepụsịa ọnyà ududo, kwaga ígwè ndị e ji eme nzọcha n’otu akụkụ, anyị nile wee dịzie njikere. Anyị chịkọtara oche 70, anyị bikwara mpempe akwụkwọ mkpọsa.
Mgbe Frank Freer si Leicester bịa ikwu okwu ahụ, a nọjuchara oche nile, mmadụ 70 ndị ọzọ guzokwa ọtọ! Ntụgharị uche doro anya Frank mere site n’Akwụkwọ Nsọ masịrị m, dị ka ọ masịkwara ọtụtụ ndị ọzọ bịaranụ. Site n’oge ahụ gaa n’ihu, obere ọgbakọ Ndị Mmụta Bible dị na Blaby na nso Leicester mụbara ngwa ngwa. Ọ bụkwa oge oké mgbanwe ná ndụ m—nakwa na nke Mary. Na 1925 anyị abụọ raara onwe anyị nye Jehova, bụrụ ndị e mere baptism, wee lụọkwa.
Ngọzi Ime Mmụọ
N’afọ sochiri, a họpụtara m ịbụ onye nduzi ije ozi maka Ọgbakọ Blaby. Mụ na nwunye m chọrọ ịgbaso nzọụkwụ ndị colporteur ma ghọọ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile, ma n’oge na-adịghị anya ọ pụtara ìhè na ahụ ike Mary agaghị ekwe ya ịnọgide na-agbaso usoro siri ike otú ahụ. Ọ bụ ezie na ọ rịara ọrịa ruo n’ọnwụ ya na 1987, ọ bụ ezigbo onye ibe na onye ozi magburu onwe ya nke nwere nkà n’ịgba àmà mberede na n’ịmalite ọmụmụ Bible. Kwa abalị, ma ọ́ bụghị na anyị na-aga nzukọ ọ bụrụ na anyị na-esoro ndị agbata obi anyị na-ekerịta eziokwu Bible.
Abụ m injinịa ma rụọkwa ọrụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta ígwè ọrụ e ji awa osisi. Ọrụ m gụnyere ime oké njem gburugburu Britain, tinyekwara na France, Mary na-esokarịkwa m na-aga. Njem ndị a nyere anyị ohere ịgba àmà n’ụzọ sara mbara.
Ntọala Maka Mmụba
Na 1925 anyị wuru otu ụlọ mara mma maka nzukọ anyị na Blaby, sitekwa n’ebe ahụ anyị haziri usoro ịgba àmà dị ire. Kwa ụtụtụ Sunday, anyị na-agbaziri otu bọs nke na-ebuga anyị n’obodo nta na obere obodo ndị dịsasịrị adịsasị. A na-akwụsịgasị ndị nkwusa n’ụzọ ime nkwusa, mgbe ahụkwa bọs ahụ na-eburu ha ná nlọta. N’ọnwa ndị bụ oge okpomọkụ, anyị na-enwe ọmụmụ Bible n’ehihie Sunday, na-eji mbipụta kasị ọhụrụ nke Ụlọ Nche na-eme ihe. E mesịa, n’elekere anya asatọ, anyị na-ezukọ n’ebe ahịa Leicester maka okwu ihu ọha a na-enwe n’ámá. Otu abalị mmadụ 200 gere ntị. Ọrụ a tọrọ ntọala maka ọtụtụ ọgbakọ dị ugbu a n’ime na gburugburu Leicester.
Na 1926 e nwekọrọ otu mgbakọ mere ihe akụkọ ọnụ n’Alexandra Palace na Royal Albert Hall dịcha na London. N’oge ahụ Joseph F. Rutherford, onye isi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, wepụtara akwụkwọ bụ́ Deliverance. E bipụtara nkwupụta ahụ bụ́ “Àmà A Gbaara Ndị Ọchịchị Ụwa” na okwu ihu ọha dị ike nke Nwanna Rutherford kwuru, bụ́ “Ihe Mere Ike Ụwa Ji Ama Jijiji—Ihe Ngwọta Ya,” n’ozuzu ya n’akwụkwọ akụkọ kasị na-ewu ewu n’ụbọchị sochiri nke e wepụtara ha. Ihe karịrị 10,000 nụrụ okwu ihu ọha ahụ, e mesịkwara kesaa mpempe 50,000,000 nke nkwupụta ahụ n’ụwa nile. Mgbakọ ahụ mere ka ọrụ nkwusa ahụ gaa ngwa ngwa na Britain.
Nnukwu Mgbakọ n’Oge Agha
Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na September 1939, ka ọ na-erulekwa 1941 agha ahụ kpụụrụ ọkụ n’ọnụ. Ndị Germany na-atụ bọmbụ na-eme mwakpo ehihie na abalị, a gbanyụkwara ọkụ ná mba ahụ dum. Nri dị ụkọ, a na-ekerikwa nnọọ ihe e nwere nke nta nke nta. O siri ike ime njem, ọbụna site n’ụgbọ okporo ígwè. N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a yiri nke a na-apụghị imeri emeri, anyị nwere mgbakọ mba were ụbọchị ise na September 3-7, 1941.
A họọrọ Ụlọ Nzukọ De Montfort nke Leicester dị ka ebe mgbakọ n’ihi na Leicester dị n’etiti England. Ebe m na-azụ ahịa osisi, enwere m ike inye aka n’imepụta ihe àmà e ji eme mkpọsa. Ahazikwara m usoro ime njem n’ebe ahụ maka ndị bịara mgbakọ. Site n’ịzụrụ tiketi tupu oge eruo na ịkwụ ihe karịrị ọnụ ego a na-akwụ, anyị mere ka ụgbọ ndị e nwere na Leicester nọrọ ọrụ ọbụna na Sunday.
N’ihi na e nwegasịrị ihe mgbochi n’ime njem, olileanya anyị bụ na ikekwe Ndịàmà 3,000 pụrụ ịbịa. Lee ihe mkpali ọ bụ mgbe ihe karịrị mmadụ 10,000 kwuru na ha ga-aga! Ma ebee ka ha ga-ebi? Ụmụ amaala Leicester ji obiọma kpọọ ọtụtụ ndị ka ha nọrọ n’ụlọ ha. Ọzọkwa, e nyere ihe dị ka otu puku mmadụ ebe obibi n’ụlọikwuu ndị a mara na mbara ala dị kilomita atọ site n’ebe mgbakọ ahụ. Ọmụma Ụlọikwuu Gideọn, dị ka anyị kpọrọ ya, kpasuru mmasị dị ukwuu n’ógbè ahụ.
A gbaziiri ụlọikwuu ọcha ndị sara mbara a ga-eji mee ihe maka ngalaba mgbakọ dị iche iche na iji nye oké ìgwè mmadụ ga-afọdụ ebe obibi. Mgbe a chọpụtara na n’oge ọnwa na-achasi ike, ndị Nazi na-atụ bọmbụ pụrụ ilekwasị ụlọikwuu ndị ahụ anya, a gbanwere ọdịdị ha ozugbo. Agha ahụ, na karịsịa òkè Ndịàmà na-ekereghị na ya, bụ okwu ọha na eze kpụ n’ọnụ. Ọtụtụ narị Ndịàmà nọ na mkpọrọ n’oge ahụ maka nguzo nnọpụiche ha nke dabeere na Bible.—Aịsaịa 2:4; Jọn 17:16.
Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Leicester Mercury, nke September 7, 1941, kọrọ, sị: “Ọ bụ ihe na-eju anya ịhụ mmadụ 10,000, nke ihe ka n’ime ha bụ ndị na-eto eto, ka ha ji otu izu na-ekwu banyere okpukpe n’akpọtụghị agha ahụ aha, ma e wezụga dị ka okwu nhota.
“Ajụrụ m ma Ndịàmà hà nwere ndị òtù ọ bụla na Germany. Ee, ka a gwara m, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ha nile, ihe dị ka 6,000, nọ n’ogige ịta ahụhụ.”
Onye nta akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụ ezie na ndị Nazi bụ ndị iro, ma Ndịàmà ahụ na-eme ihe dị nnọọ nta banyere ha, ma e wezụga ire traktị na ige okwu dị iche iche.”
Akwụkwọ akụkọ dị iche iche na-ekwukarị ihe na-adịghị mma banyere anyị, ọbụna na ndị mmegide maliteziri ime ihe ike ná mgbalị ndị na-agaghị nke ọma ha mere ịkpaghasị mgbakọ anyị. Ma, The Daily Mail nke London ji enwechaghị mmasị kweta, sị: “Nhazi ya gara were were, n’apụtaghị ìhè, dịkwa irè.”
E boro anyị ebubo ime ka obodo ahụ ghara inwe siga zuuru ya. Ma The Daily Mail ahụ kọwara, sị: “Ma Leicester ma Onye Nchịkwa Ụtaba adịghị nke pụrụ ime mkpesa na Ndịàmà na-esecha siga Leicester. Ha adịghị ese siga.” Ọzọ, e tisasịkwara mkpesa ndị e mere na Ndịàmà ahụ gbochiri ndị bi n’ebe ahụ inweta ihe oriri mgbe a kọwara na ha ji ihe ka ọtụtụ n’ihe oriri ha bịa. N’ezie, ná ngwụsị nke mgbakọ ahụ, e nyere Royal Infirmary nke Leicester onyinye ógbè bred 150 dịcha kilogram 1.8—bụ́ onyinye buru ibu n’oge ndị ahụ e nwere ụkọ nri.
Mgbakọ ahụ nyere ihe dị ka Ndịàmà 11,000 na Britain oké nkwali ime mmụọ. Ha nwere oké mkpali na ihe dị ka 12,000 gara! Ndị gara ji ọṅụ rụọ ọrụ ịgba àmà okporo ámá na-enweghị atụ na Leicester, ha jikwa okwu e tinyere na phonograph gaa n’obodo nta ndị dịpụrụ adịpụ.
Okwu ndị bụ isi nke mgbakọ ahụ bụ okwu ndị e tinyere na tepụ n’ọnwa bu ya ụzọ bụ́ ndị e kwuru ná mgbakọ ụbọchị ise nke Ndịàmà Jehova na St. Louis, Missouri, U.S.A. Okwu Nwanna Rutherford bụ́ “Ụmụaka nke Eze Ahụ” nke e tinyere na tepụ bụ okwu mgbakọ gbara ọkpụrụkpụ. Ebe ọ bụ na o kweghị omume ibubata akwụkwọ ahụ bụ́ Children nke e wepụtara na St. Louis, e mesịrị mepụta mbipụta pụrụ iche nwere azụ na-esighị ike na Britain. E zigaara ụmụaka nile gaworo mgbakọ ahụ otu otu.
Nzukọ Kwa Afọ Pụrụ Iche nke Leicester
Uto ndị mkpọsa Alaeze na Britain mgbe agha ahụ biri dị egwu! Ka ọ na-erule mbido afọ ndị 1980, ọnụ ọgụgụ ọgbakọ dị na Leicester eruwo iri. Mgbe ahụ a gwara anyị na Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ekpebiwo inwe nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society na Leicester na 1983. Dị ka onye nlekọta obodo Leicester, n’oge na-adịghị anya esonyere m n’ime nkwadebe, gụnyere ịgbaziri Ụlọ Nzukọ De Montfort ahụ ọzọ.
Ndị òtù 13 nke Òtù Na-achị Isi si isi ụlọ ọrụ Society dị na Brooklyn bịa maka ihe omume ahụ. Ngụkọta nke ndị nnọchiteanya 3,671—n’oge a site na gburugburu ụwa, karịsịa ndị jeworo ozi ruo ogologo oge—jupụtara ụlọ mgbakọ ahụ. Otu puku na narị ise ndị ọzọ nụụrụ ihe omume ahụ n’Ụlọ Mgbakọ dị nso n’ebe ahụ.
Albert D. Schroeder, onye bụbu onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na London n’oge mgbakọ oge agha anyị na Leicester bụ onye isi oche ná mgbakọ kwa afọ a. N’ileghachi anya azụ ná mgbakọ 1941 ahụ, Nwanna Schroeder jụrụ, sị: “Ole n’ime unu so anyị nọrọ n’ebe a taa nọ ya mgbe ahụ?” Ihe karịrị ọkara ndị na-ege ntị weliri aka ha. “Ewo! Lee njikọghachi ọ bụ maka unu nile na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị na-eguzosi ike n’ihe!” ka o tiri ná mkpu. N’ezie ọ bụ ahụmahụ a na-apụghị ichefu echefu.
N’afọ ndụ nke 98, m ka na-eje ozi dị ka odeakwụkwọ n’ọgbakọ anyị ma nọgide na-ekwu okwu ihu ọha, ọ bụ ezie na m na-anọdụ ala na-eme nke ahụ ugbu a. Mgbe Mary nwụsịrị na 1987, alụrụ m Bettina, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke mụ na Mary mawooro eri ọtụtụ afọ. Enwere m obi ụtọ ịbụ onye e lekọtara n’ụzọ dị ukwuu, ma n’ụzọ anụ ahụ ma n’ụzọ ime mmụọ. N’agbanyeghị ihe mgbochi ahụ esighị ike Mary wetara na nke ime agadi m na-eweta ugbu a, achọpụtawo m na ịrụbiga ọrụ ókè n’ije ozi dị nsọ abụrụwo mgbe nile ihe na-akwụghachi ụgwọ ọrụ bara ụba.—1 Ndị Kọrint 15:58.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ịdị njikere ikere òkè n’ozi n’afọ ndị 1920
[Foto dị na peeji nke 26]
Ihe ndị e setere ná mgbakọ Leicester ahụ