E Too Otu Mgbakọ “Pụrụ Iche”
OTU onye na-ama ọkwa na redio na Lima, Peru, nwere obi abụọ siri ike banyere Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, mgbe ọ gasịrị otu n’ime mgbakọ distrikti ha, omume ya gbanwere n’ụzọ dị ịrịba ama. N’ezie, ọ masịrị ya nke ukwuu nke na ọ gwara ndị na-ege ya ntị na redio okwu ụfọdụ ndị dị mma. Ihe na-esonụ bụ akụkụ sitere n’ihe o kwuru:
“Mgbakọ ahụ pụrụ nnọọ iche. E nweghị otu mpempe akwụkwọ tọgbọrọ n’ala, onye na-ere ihe anọghịkwa. E nweghị agaghị ihu na azụ nke ụgbọala. Puku mmadụ ise na narị abụọ gara n’ámá egwuregwu n’ego akpa ha, onye ọ bụla ji bọket, nkịkara akwa, ihe e ji ehicha ihe, ihe e ji ekponye ihe mkpofu, azịza, brọsh, ihe a na-ekpunye n’aka, na ncha iji saa ma hichaa ebe ahụ. Ebe ágbá dị mkpa, ha tere ya. Olee ndị na-eweta ego? Ha na-eweta ya n’onwe ha! Mgbe a gwara ha banyere ihe a chọrọ ime, ha nile na-etinye aka n’akpa ha ozugbo iji nye. N’eziokwu, Chọọchị Katọlik na-ehi ụra mgbe a bịara n’ụdị okwu ndị dị otú ahụ. Achọrọ m ịja Ndịàmà Jehova na ndị hụrụ maka ihe omume a mma. Achọkwara m isi n’ala ala obi m sị ha, Ka Chineke nyere unu aka ma gọzie unu.”
N’obodo ukwu ndị dị gburugburu ụwa n’afọ a, Ndịàmà Jehova ga-anụ ụtọ Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke.” Ị̀ ga-anọ ya?
[Foto dị na peeji nke 32]
“E nweghị otu mpempe akwụkwọ tọgbọrọ n’ala”