Ha Mere Uche Jehova
Jisọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ 70
ỌBỤ n’oge opupu ihe ubi nke 32 O.A. Nanị ọnwa isii ka ọ fọrọ tupu ọnwụ Jisọs. N’ihi ya, iji mee ka ọrụ nkwusa ahụ gaa ọsọ ọsọ karị na inyekwu ụfọdụ n’ime ụmụazụ ya ọzụzụ, ọ họpụtara ndị na-eso ụzọ 70 wee “zipụ ha abụọ abụọ ka ha gaa n’ihu Ya baa n’obodo na ebe ọ bụla, ebe Ya onwe ya gaje ịbịa.”—Luk 10:1.a
Jisọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya “ka ha gaa n’ihu Ya” ka ndị mmadụ wee nwee ike ikpebi ngwa ngwa karị ma ha dịnyeere ma ọ bụ na-emegide Mesaịa ahụ mgbe Jisọs n’onwe ya mesịrị bịarute. Ma n’ihi gịnị ka o ji zipụ ha “abụọ abụọ”? Ihe àmà na-egosi na ọ bụ ka ha wee nwee ike ịgbarịta ibe ha ume mgbe ha zutere mmegide.
N’imesi ịdị ngwa nke ọrụ nkwusa ha ike, Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole: ya mere, na-arịọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Luk 10:2) Iji ya tụnyere owuwe ihe ubi kwesịrị ekwesị, n’ihi na oge ọ bụla e gburu n’oge owuwe ihe ubi pụrụ ịkpata ofufu nke ihe ọkụkụ ndị bara uru. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ ya eleghara ọrụ nkwusa ha anya, ndụ ndị dị oké ọnụ ahịa pụrụ ịla n’iyi!—Ezikiel 33:6.
Ndị Ozi A Na-adọpụghị Uche Ha
Jisọs nyekwuru ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, sị: “Unu ewela akpa ego, ma ọ bụ akpa ije, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ: unu ekelekwala onye ọ bụla n’ụzọ.” (Luk 10:4) Ọ bụ omenala onye njem iwere ọ bụghị nanị akpa ije na ihe oriri kamakwa akpụkpọ ụkwụ ọzọ, n’ihi na ike akpụkpọ ụkwụ pụrụ iricha, eriri ha pụkwara ịdọbi. Ma ndị na-eso ụzọ Jisọs agajeghị ichegbuwa onwe ha banyere ihe ndị dị otú ahụ. Kama nke ahụ, ha gaje ịtụkwasị obi na Jehova ga-elekọta ha site n’aka ndị Israel ibe ha, bụ́ ndị ile ọbịa bụ omenala ha.
Ma n’ihi gịnị ka Jisọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ikele onye ọ bụla? Hà gaje ịbụ ndị na-adịghị emesapụ ihu, ọbụna ghara igosi àgwà ọma? Ọ dịghị ma ọlị! Okwu Grik bụ́ a·spaʹzo·mai, nke pụtara ibi ọma ekele, pụrụ ịpụta ihe karịrị ịsị “ndewo” ma ọ bụ “daalụ” nke omume ọma. Ọ pụkwara ịgụnye omenala nke isusu ọnụ, ibi ọma, na ogologo mkparịta ụka nke ga-ebilite mgbe mmadụ abụọ maara onwe ha zutere. Otu onye na-enye nkọwa na-ekwu, sị: “Ikele ekele n’etiti ndị Ọwụwa Anyanwụ abụghị, dị ka anyị na-eme, ihulatatụ isi, ma ọ bụ ikwe n’aka, kama e mere ya site n’ọtụtụ ibi ọma, na ihuru ehuru, na ọbụna ịkpọ isi ala. Ihe a nile chọrọ oge dị ukwuu.” (Tụlee 2 Ndị Eze 4:29.) Jisọs si otú a nyere ụmụazụ ya aka izere ndọpụ uche ndị na-adịghị mkpa, ọ bụ ezie na ha bụ omenala.
N’ikpeazụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na mgbe ha banyere n’ụlọ, a nabatakwa ha, na ha kwesịrị ‘ịnọgide n’ụlọ ahụ, na-eri na-aṅụkwa ihe ha na-enye.’ Ma ọ bụrụ na ha banyere n’obodo, a naraghịkwa ha nke ọma, ha kwesịrị ‘ịpụ n’ámá ya, sị, Ọbụna ájá si n’obodo unu, nke rakụụrụ n’ụkwụ anyị, ka anyị na-ehichapụ imegide unu.’ (Luk 10:7, 10, 11) Ihichapụ ma ọ bụ ịkụchasị ájá dị mmadụ n’ụkwụ ga-egosi na ndị na-eso ụzọ ahụ ji udo na-ahapụrụ ụlọ ma ọ bụ obodo nke na-anabataghị ha ihe ndị ga-esi na ya pụta nke ga-esi n’aka Chineke bịa n’ikpeazụ. Ma ndị ji obiọma nabata ndị na-eso ụzọ Jisọs tinyere onwe ha n’ọnọdụ nke ịnata ngọzi. Jisọs gwara ndị ozi ya n’oge ọzọ, sị: “Onye na-anara unu nke ọma, ọ bụ Mụ ka ọ na-anara nke ọma, onye na-anarakwa Mụ onwe m nke ọma na-anara Onye zitere m nke ọma. Onye ọ bụla nke ga-ekuru nanị iko mmiri oyi nye otu onye n’ime ndị nta ndị a ṅụọ n’aha onye na-eso ụzọ m, n’ezie asị m unu, ọ gaghị atụfu ụgwọ ọrụ ya ma ọlị.”—Matiu 10:40, 42.
Ihe Mmụta Nye Anyị
Ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ndị na-eso ụzọ bụ nke ihe karịrị nnọọ Ndịàmà Jehova 5,000,000 na-arụzu ugbu a gburugburu ụwa. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ha na-aghọta na ozi ha dị ngwa. Ya mere, ha na-eji oge ha eme ihe n’ụzọ kasị mma, na-ezere ndọpụ uche ndị ga-egbochi ha inye ọrụ ha dị mkpa ntụkwasị uche zuru ezu.
Ndịàmà Jehova na-agba mbọ igosi ndị nile ha na-ezute omume enyi. Otú o sina dị, ha adịghị nnọọ etinye ọnụ ná nkata na-enweghị isi, ha adịghịkwa ekere òkè n’arụmụka banyere okwu ọha na eze ma ọ bụ mgbalị ndị na-akụ afọ n’ala nke ụwa a ịgwọta ikpe na-ezighị ezi. (Jọn 17:16) Kama nke ahụ, nkwurịta okwu ha na-elekwasị anya na nanị ihe ngwọta na-adịte aka nke nsogbu mmadụ—Alaeze Chineke.
Dị ka ọ na-adịkarị, a na-ahụ Ndịàmà Jehova ka ha dị abụọ abụọ na-arụ ọrụ. Á pụghị ịrụzu ihe ka ukwuu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ha na-arụ nanị ya? Ma eleghị anya. Ma, ndị Kraịst taa na-aghọta abamuru dị n’isoro onye kwere ekwe ibe ha na-arụkọ ọrụ. Ọ na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe mgbe a na-agba àmà n’ógbè ndị dị ize ndụ. Inwe onye ha so na-arụkọ na-enyekwara ndị ọhụrụ aka irite uru site na nkà nke ndị nkwusa ka nwee ahụmahụ n’ozi ọma ahụ. N’ezie, ha abụọ pụrụ ịgbarịta onwe ha ume.—Ilu 27:17.
N’arụghị ụka ọ bụla, ọrụ ime nkwusa bụ ọrụ kasị dị ngwa a na-arụ na “mgbe ikpeazụ” a. (2 Timoti 3:1) Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ inwe nkwado nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ha nọ na ya ‘na-alụkọrọ okwukwe nke ozi ọma ọgụ sie ike.’—Ndị Filipaị 1:27.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ụfọdụ Bible na ihe odide Grik oge ochie na-ekwu na Jisọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ “iri asaa na abụọ.” Otú ọ dị, e nwere ihe odide bara ụba na-akwado ọgụgụ bụ́ “iri asaa.” Ịdị iche a n’ọnụ ọgụgụ ekwesịghị ịdọpụ uche n’ihe bụ isi, na Jisọs zipụrụ ìgwè buru ibu nke ndị na-eso ụzọ ya ime nkwusa.