Obi Ekele Maka Ihe Nketa Siri Ike nke Ndị Kraịst
DỊ KA GWEN GOOCH SI KỌỌ
N’ụlọ akwụkwọ agụrụ m otu ukwe nke nwere okwu ndị bụ́, ‘Jehova Ukwu, onye na-anọkwasị n’ocheeze n’ebube ya.’ Ana m ajụkarị onwe m, ‘Ònye bụ Jehova a?’
NNE na nna m ochie bụ ndị na-atụ egwu Chineke. Ná mmalite narị afọ a, ha sonyeere Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Nna m mere nke ọma n’achụmnta ego ma ná mmalite o nyefeghị ụmụ ya atọ ihe nketa ndị Kraịst e nyeworo ya.
Ọ bụ nanị mgbe nna m nyere mụ na nwanne m nwoke, bụ́ Douglas, na nwanne m nwanyị, bụ́ Anne akwụkwọ nta ndị isiokwu ha bụ His Works na Who Is God? ka m mụtara na Jehova bụ aha nke ezi Chineke ahụ. (Abụ Ọma 83:18) Obi tọrọ m nnọọ ụtọ! Ma gịnị kpalighachiworo mmasị nna m?
Na 1938, mgbe ọ hụrụ ka mba dị iche iche jikeere maka agha, nna m ghọtara na ọ ga-ewe ihe karịrị mgbalị mmadụ iji gwọta nsogbu ụwa. Nne m ochie nyere ya akwụkwọ bụ́ Enemies, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Site n’ịgụ ya, ọ mụtara na onye iro nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie bụ Setan bụ́ Ekwensu nakwa na nanị Alaeze Chineke pụrụ iweta udo ụwa.a—Daniel 2:44; 2 Ndị Kọrint 4:4.
Ka agha na-achọ ịda, ezinụlọ anyị malitere ije nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị na Wood Green, n’Ebe Ugwu London. Na June 1939 anyị jere Alexandra Palace nke dị anyị nso ịnụrụ okwu ihu ọha, bụ́ “Ọchịchị na Udo,” nke Joseph F. Rutherford, onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ kwuru. E jiri redio gbasaara London na obodo ukwu ndị ọzọ bụ isi okwu Rutherford kwuru n’Ubi Ámá Madison nke New York City. Anyị nwere ike ịnụ okwu ahụ nke ọma nke na mgbe otu ìgwè na-eme mkpọtụ na New York kpatara ọgba aghara, elegharịrị m anya ịhụ ma ọ na-ewere ọnọdụ n’ime ụlọ mgbakọ anyị!
Ịnụ Ọkụ n’Obi Nna M Maka Eziokwu Bible
Nna m siri ọnwụ na ezinụlọ anyị nile ga na-amụkọrịta Bible ọnụ ná mgbede Saturday ọ bụla. Ọmụmụ ihe anyị dabeere n’isiokwu Bible dị n’Ụlọ Nche e dokwara ịtụle n’ụbọchị na-esochi. Iji gosi mmetụta nke ọmụmụ ihe ndị a nwere, ruo taa ihe ndekọ banyere Joshua na ịgba obodo Ai gburugburu bụ́ nke a tụlere n’Ụlọ Nche nke May 1, 1939 (Bekee), ka dị m nnọọ n’uche. Ihe ndekọ ahụ kpaliri nnọọ mmasị m nke na m nyochara izo aka nile e zoro na ya na Bible m. Nnyocha dị otú ahụ tọrọ m ụtọ—ọ ka na-atọkwa m.
Isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe anyị na-amụta kụmiri ozizi Bible n’obi m. Otu ụbọchị nna m nyere m ígwè phonograph tinyere okwu Bible a kpọnyere na tepụ, otu akwụkwọ nta anyị ji eduzi ọmụmụ Bible, nakwa adres nke otu agadi nwanyị. Mgbe ahụ ọ gwara m ka m kpọtụrụ ya.
“Gịnị ka m gaje ikwu, gịnịkwa ka m ga-eme?” ka m jụrụ.
“Ha nile dị ebe ahụ,” ka nna m zara. “Nanị kpọọ rekọd ahụ, gụọ ajụjụ ndị ahụ, mee ka onye nwe ụlọ gụọ azịza ha, mgbe ahụkwa gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ.”
Emere m dị ka ọ gwara m, n’ụzọ dị otú a amụtakwara m iduzi ọmụmụ Bible. Site n’isi otú a jiri Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe n’ozi m, abịara m ghọta ha nke ọma karị.
Ihe Ịma Aka nke Afọ Ndị A Lụrụ Agha
Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na 1939, n’afọ sochikwaranụ e mere m baptism ná ngosipụta nke nraranye m ijere Jehova ozi. Adị m nanị afọ 13. Ekpebiri m mgbe ahụ ịghọ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile. Ahapụrụ m ụlọ akwụkwọ na 1941 ma sonye Douglas n’ọrụ ime nkwusa oge nile ná mgbakọ e nwere na Leicester.
N’afọ sochirinụ, a tụrụ nna m mkpọrọ maka ịjụ ije agha n’ihi akọ na uche ya. Anyị bụ ụmụaka gbara nne anyị gburugburu, na-enyere ya aka ilekọta ụlọ anyị n’oge ahụ siri ike nke agha. Mgbe ahụ, o teghị aka a tọhapụrụ nna m site n’ụlọ mkpọrọ, a kpọrọ Douglas maka ọrụ soja. Isiakụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ ógbè ahụ gụrụ, sị, “Ihe Mere Nwa Ji Họrọ Ịga Mkpọrọ Dị Ka Nna Ya.” Ezi ịgba àmà si na ya pụta, ebe e nwetara ohere iji kọwaa ihe mere ezi ndị Kraịst na-adịghị ekere òkè n’igbu mmadụ ibe ha.—Jọn 13:35; 1 Jọn 3:10-12.
N’afọ ndị ahụ a lụrụ agha, ọtụtụ Ndịàmà nọ n’ozi oge nile na-abịa n’ụlọ anyị mgbe nile, nkwurịta okwu ha ndị na-ewuli elu, dabekwaara na Bible nwere mmetụta na-adịgide adịgide. John Barr na Albert Schroeder, ndị so ugbu a n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, so n’ime ụmụnna ndị Kraịst a kwesịrị ntụkwasị obi. Nne na nna m bụ n’eziokwu ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, ha kụzikwaara anyị ịbụ ndị na-eme otu ihe ahụ.—Ndị Hibru 13:2.
Njikere Inye Azịza
N’oge na-adịghị anya m malitesịrị ịsụ ụzọ, ezutere m Hilda n’ozi ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. O kwupụtara n’iwe, sị: “Di m nọ na-alụ agha maka ndị dị ka gị! N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị ihe ị na-eme iji nye aka n’agha ahụ?”
“Ókè hà aṅaa ka ị maara banyere ihe m na-eme?” ka m jụrụ. “Ị̀ maara ihe mere m ji bịakwute gị?”
“Eeem,” ka ọ zara, “ọ ka mma na ị batara kọọrọ m.”
Akọwara m na anyị na-ewetara ụmụ mmadụ ndị na-ahụju anya n’ihi ihe ndị dị egwu a na-eme—mgbe mgbe n’aha Chineke—ezi olileanya. Hilda jiri mmasị gee ntị, ọ ghọkwara onye mbụ m duziiri ọmụmụ Bible n’ụzọ chiri anya. Ọ bụwo Onyeàmà siri ike ruo ihe karịrị afọ 55 ugbu a.
Mgbe agha ahụ bịara ná njedebe, e kenyere m ebe ọhụrụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ na Dorchester, otu obodo dị na ndịda ebe ọdịda anyanwụ England. Nke a bụ oge mbụ m na-ebighị n’ụlọ anyị. Obere ọgbakọ anyị na-ezukọ n’otu ụlọ nri, ihe owuwu narị afọ nke 16 a na-akpọ “Ụlọ Tii Meworo Ochie.” Anyị aghaghị ibuzigharị oche na table maka nzukọ anyị nke ọ bụla. Ọ dị nnọọ iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke mawooro m ahụ. Ka o sina dị, e nwere otu nri ime mmụọ ahụ na mkpakọrịta ịhụnanya nke ụmụnna nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst.
Ka ọ dịgodị mgbe ahụ, nne na nna m kwagara Tunbridge Wells, n’ebe ndịda London. Alaghachiri m ụlọ ka mụ na nna m na Anne nwee ike ịrụkọ ọsụ ụzọ ọnụ. N’oge na-adịghị anya ọgbakọ anyị toro site ná Ndịàmà 12 ruo 70, n’ihi ya a gwara ezinụlọ anyị ka anyị kwaga Brighton n’ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda, ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị mkpọsa Alaeze. Ọtụtụ jiri ịnụ ọkụ n’obi sonyere ezinụlọ anyị na-asụ ụzọ n’ime nkwusa, anyị hụkwara ka Jehova gọziri ọrụ anyị n’ụba. N’oge na-adịghị anya otu ọgbakọ ahụ ghọrọ atọ!
Ọkpụkpọ Òkù A Na-atụghị Anya Ya
N’oge okpomọkụ nke 1950, ezinụlọ anyị so na mmadụ 850 si Britain bụ́ ndị jere Mgbakọ Mba Nile nke Ịba Ụba Ọchịchị Chineke n’Ámá Egwuregwu Yankee nke New York City. E zijeere ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ gaje ịbịa mgbakọ ahụ site n’ofesi akwụkwọ ndejupụta iji gaa Watchtower Bible School of Gilead, nke dị nso na South Lansing, New York. Mụ na Douglas na Anne so n’ime ha! Ana m echeta iche n’echiche mgbe m tụnyere akwụkwọ ahụ m dejupụtaworo n’ime igbe akwụkwọ ozi, sị, ‘Ugbu a emewo m ya n’ezie! Olee ebe ndụ m ga-eche ihu?’ Otú ọ dị mkpebisi ike m bụ: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Obi tọrọ m nnọọ ụtọ mgbe m natara akwụkwọ ịkpọ òkù ịnọgide mgbe mgbakọ ahụ gasịrị iji gaa klas nke 16 nke Gilead, tinyere Douglas na Anne. O doro anyị nile nnọọ anya na a pụrụ izipụ anyị dị ka ndị ozi ala ọzọ n’akụkụ ọ bụla nke ụwa.
Mgbe anyị gakọsịrị mgbakọ ahụ ọnụ dị ka otu ezinụlọ, oge ruru ka nne na nna anyị laghachi England—nanị ha. Anyị bụ́ ụmụ ha atọ feere ha aka gaa nke ọma ka ha jiri ụgbọ mmiri Mauritania lawa. Lee nkewa na-emetụ n’uche nke ahụ bụ!
Ọrụ Ozi Ala Ọzọ
Ụmụ akwụkwọ 120 sitere n’akụkụ nile nke ụwa mejupụtara klas nke 16 nke Gilead, tinyere ụfọdụ taworo ahụhụ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. Ebe a kụziiri klas anyị asụsụ Spanish, anyị tụrụ anya na a ga-ekenye anyị ọrụ ná mba na-asụ Spanish na Ndịda America. Chetụdị ịtụnanya anyị nwere n’ụbọchị ngụsị akwụkwọ ịmata na e kenyere Douglas ọrụ na Japan ma kenye mụ na Anne na Siria. N’ihi ya anyị bụ ụmụ agbọghọ aghaghị ịmụ Arabic, nke a nọgidekwara bụrụ eziokwu ọbụna mgbe a gbanwere ọrụ anyị gaa Lebanọn. Ka anyị na-eche visa anyị, anyị naara ihe ọmụmụ Arabic ugbo abụọ kwa izu site n’aka George Shakashiri, onye na-ahaziri Watch Tower Society akara edemede maka Ụlọ Nche Arabic.
Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ ịga n’ala Bible bụ́ nke anyị mụworo banyere ya na klas! Keith na Joyce Chew, Edna Stackhouse, Olive Turner, Doreen Warburton, na Doris Wood sonyeere anyị ebe ahụ. Lee ezinụlọ ndị ozi ala ọzọ nwere obi ụtọ anyị ghọrọ! Otu Onyeàmà si n’ógbè ahụ letara ebe obibi ndị ozi ala ọzọ anyị iji nyekwuoro anyị aka n’asụsụ ahụ. N’oge ihe ọmụmụ anyị kwa ụbọchị, anyị ga-amụgharị ụzọ dị mkpirikpi nke iche ihe n’ihu mmadụ, mgbe nke ahụ gasịrị anyị ga-apụ ma jiri ya mee ihe n’ọrụ nkwusa anyị.
Anyị nọrọ afọ ndị mbụ anyị na Tripoli, ebe e nwere ọgbakọ e guzobeworo. Mụ na Joyce, Edna, Olive, Doreen, Doris, na Anne nyeere ndị nwunye na ụmụaka ndị nwanyị nke Ndịàmà sitere n’ógbè ahụ aka ikere òkè ná nzukọ tinyekwara n’ozi ihu ọha. Ruo mgbe ahụ, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst, n’ịgbaso omenala ógbè, adịghị anọkọta ọnụ ná nzukọ, ọ na-esikwa ike ụmụ nwanyị ndị a bụ́ ndị Kraịst ikere òkè n’ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Enyemaka ha n’asụsụ ahụ dị anyị mkpa n’ozi ihu ọha anyị, anyị gbakwara ha ume ikere òkè n’ọrụ a n’onwe ha.
E kenyere mụ na Anne ọrụ inyere obere ìgwè Ndịàmà nọ n’obodo ochie bụ́ Saịdọn aka. N’oge na-adịchaghị anya ka e mesịrị, a gwara anyị ka anyị laghachi n’isi obodo ahụ, bụ́ Beirut. A kụwo mkpụrụ nke eziokwu Bible n’etiti ndị na-asụ Armenian bi n’ebe ahụ, n’ihi ya anyị mụrụ asụsụ ahụ iji nyere ha aka.
Mgbanwe nke Ọrụ
Ezutewo m Wilfred Gooch tupu m na-ahapụ England. Ọ bụ nwanna nwoke na-anụ ọkụ n’obi, nke nwere ọmịiko bụ́ onye jeworo ozi na Betel dị na London. Wilf bụ onye òtù klas nke 15 nke Gilead, bụ́ nke gụsịrị akwụkwọ n’oge mgbakọ 1950 ahụ e mere n’Ámá Egwuregwu Yankee. Ọrụ ozi ala ọzọ ya bụ alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị na Nigeria, ruokwa oge ụfọdụ anyị derịtara akwụkwọ ozi. Na 1955 anyị abụọ gara mgbakọ “Alaeze nke Na-enwe Mmeri” na London, nwa oge nke ahụ gasịkwara, anyị banyere ná nkwa ọlụlụ. N’afọ sochirinụ, anyị lụrụ di na nwunye na Ghana, esonyekwara m Wilf n’ọrụ ozi ala ọzọ ya na Lagos, Nigeria.
Mgbe m hapụsịrị Anne na Lebanọn, ọ lụrụ ezigbo nwanna nwoke bụ́ onye Kraịst nke mụtaworo eziokwu Bible na Jerusalem. Nne na nna m enweghị ike ịbịa agbamakwụkwọ anyị, ebe mụ na Douglas na Anne lụrụ di na nwunye n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ma, ha nwere afọ ojuju ịmara na anyị nile ji obi ụtọ na-ejere Chineke anyị, bụ́ Jehova ozi.
Ọrụ na Nigeria
N’alaka ụlọ ọrụ dị na Lagos, e kenyere m ọrụ idebe ọnụ ụlọ nke ndị òtù ezinụlọ alaka anyị dị asatọ ọcha tinyere ịkwadebe nri ha na ịsa ákwà ha. O yiri m ka mụ enwetawo ọ bụghị nanị di kamakwa otu ezinụlọ ozugbo!
Mụ na Wilf mụtara ụzọ dị mkpirikpi isi chee Bible n’ihu mmadụ n’asụsụ Yoruba, e nyekwara anyị ụgwọ ọrụ maka mgbalị anyị. Otu nwa akwụkwọ na-eto eto anyị kpọtụụrụ nwere otu nwa nwoke na otu nwa nwanyị na-eje ozi ugbu a n’ezinụlọ Betel buru ibu dị na Nigeria nke ihe dị ka ndị òtù 400.
Na 1963, Wilf natara ọkpụkpọ òkù ịga ihe ọmụmụ ọnwa iri nke ntụziaka pụrụ iche na Brooklyn, New York. Mgbe ọ gasịrị, e kenyeghachiri ya ọrụ n’ụzọ a na-atụghị anya ya n’England. Anọgidewo m na Nigeria, e nyekwara m nanị ụbọchị 14 iji jekwuru Wilf na London. Ejiri m obi abụọ gawa, ebe Nigeria bụworo nnọọ ebe ọrụ obi ụtọ. Ka m jesịrị ozi afọ 14 n’ofesi, o were oge ịgbanwekwa ọzọ gaa ná ndụ a na-ebi n’England. Otú ọ dị, anyị nwere obi ekele ịnọ nne na nna anyị meworo agadi nso ọzọ nakwa inwe ike inye aka lekọta ha.
Olileanya Anyị Kwagidere Anyị
Malite na 1980, enwere m ihe ùgwù isoro Wilf ka ọ na-eme njem gaa n’ọtụtụ mba dị ka onye nlekọta zoonu. Elepụrụ m anya karịsịa maka nletaghachi ndị anyị mere na Nigeria. Mgbe e mesịrị anyị gakwara Scandinavia, West Indies, na Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa—gụnyere Lebanọn. Ọ bụ ihe mkpali pụrụ iche ichetaghachi ihe ndị na-eme obi ụtọ na ịhụ ndị m mawooro dị ka ndị na-eto eto nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye.
N’ụzọ dị oké mwute, ezigbo di m nwụrụ n’oge opupu ihe ubi nke 1992. Ọ dị nanị afọ 69. Ọ bụ ajọ ọdachi karịsịa ebe o mere nnọọ na mberede. Mgbe afọ 35 nke alụmdi na nwunye gasịrị, o wewo oge ime mgbanwe. Ma enwetawo m enyemaka na ịhụnanya dị ukwuu site n’aka ezinụlọ m zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst. Enwewo m ọtụtụ ahụmahụ obi ụtọ ndị m ga-atụgharị uche na ha.
Ma nne ma nna m setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke iguzosi ike n’ezi ihe ndị Kraịst. Nne m nwụrụ na 1981, nna m nwụkwara na 1986. Douglas na Anne nọgidere na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Douglas na nwunye ya bụ́ Kam alaghachiwo London, bụ́ ebe ha nọgideworo mgbe ha lekọtasịrị nna anyị anya. Anne na ezinụlọ ya bi na United States. Anyị nile nwere nnukwu ekele maka olileanya na ihe nketa nke Chineke nyeworo anyị. Anyị na-anọgide ‘na-echere Ya,’ na-elepụ anya maka mgbe ndị dị ndụ, tinyere ndị ha hụrụ n’anya e si n’ọnwụ kpọlite, ga-ejekọ ozi ọnụ ruo mgbe ebighị ebi dị ka ndị òtù nke ezinụlọ elu ala Jehova.—Abụ Ákwá 3:24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akụkọ ndụ nna m, bụ́ Ernest Beavor, pụtara n’Ụlọ Nche nke September 15, 1980.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Malite n’elu elu aka ekpe gaa n’aka nri:
Mgbe Gwen dị afọ 13 ka ọ na-eme ihe ngosi ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Enfield
Ezinụlọ ndị ozi ala ọzọ na Tripoli, Lebanon, 1951
Gwen na di ya nwụrụ anwụ, bụ́ Wilf