N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Na-apụ n’Okpukpe?
N’ETITI narị afọ nke 19, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-adịghị anụ anụ onye bi na Prussia (ugbu a ebe ugwu Germany) ịsị na ya enweghị okpukpe ọ bụla ya nọ na ya. N’ezie, nanị ichegharị site n’okpukpe bụ́ isi gaa na chọọchị na-adịghị ekwenyere ndị ọzọ pụrụ ime ka ọ bụrụ onye ndị uwe ojii na-esogharị. Lee nnọọ otú ihe siworo gbanwee!
Taa, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị Germany na-apụ na chọọchị dị iche iche. Dị ka a kọrọ, 1 n’ime 4 enweghị okpukpe ọ bụla ha nọ na ya ma ọlị. A na-ahụ ihe yiri nke ahụ n’Austria na Switzerland. Ọ bụrụ na ịbụ onye òtù bụ ihe ji okpukpe ndụ, mgbe ahụ, dị ka onye edemede bụ́ onye Germany bụ́ Reimer Gronemeyer siri tinye ya, “ihe ji chọọchị dị iche iche nke Europe ndụ na-apụsị.”
Ihe Mere Ha Ji Jụ Okpukpe
N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji jụ okpukpe a haziri ahazi? Ọtụtụ mgbe, n’ihi ego, karịsịa na mba ebe a chọrọ ka ndị òtù na-atụ ụtụ isi chọọchị. Ọtụtụ na-ajụ, sị, ‘Gịnị mere ego m tara ahụhụ nweta ga-eji gaa na chọọchị?’ Ụfọdụ bụ ndị akụ̀ na ụba na ike dị ukwuu nke chọọchị na-adịghị amasị. O yikarịrị ka ha kwenyere nnọọ n’okwu Kadinal Joachim Meisner nke Cologne, Germany, bụ́ onye sịrị na akụ̀ na ụba nke chọọchị pụrụ idugawo ya n’itinye uche nke ukwuu n’ihe onwunwe ma “ghara iji okwukwe n’ime Kraịst kpọrọ ihe n’ụzọ zuru ezu.”
Ụfọdụ na-apụ na chọọchị ha n’ihi na ha hụtara ya dị ka ihe na-agwụ ike, ihe na-adịghị adọrọ mmasị, ihe na-apụghị igbo agụụ ime mmụọ ha. Ha na-enwe oké ụnwụ ahụ onye amụma bụ́ Emọs buru n’amụma, “ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) N’ihi na ha na-enweta obere ihe na-akwagide ndụ site n’okpukpe ha, ha na-esi na ya pụọ.
Ọ bụ ezie na nsogbu ndị ahụ e nwetara bụ ihe mere eme, ịjụ okpukpe nile ọ̀ bụ mmeghachi omume ziri ezi? Cheedị banyere nwoke agụụ na-agụ nke hụrụ ihe yiri ogbe achịcha. Otú ọ dị, mgbe ọ na-anwa ka o rie ya, ọ chọpụtara na ihe e ji mee ya bụ ntụ osisi. Ọ̀ ga-ajụ echiche nke iri ihe na igbo agụụ na-agụ ya? Ee e, ọ ga-achọ ezigbo nri. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na okpukpe egboghị agụụ ime mmụọ nke ndị òtù ya, hà kwesịrị ịjụ okpukpe? Ka hà ga-abụ ndị nwere amamihe karị ịchọ ụzọ isi gboo agụụ ime mmụọ ha? Nke ahụ bụ ihe ọtụtụ meworo, dị ka isiokwu na-esonụ na-egosi.