Ihe Omume A Na-agaghị Echefu Echefu na France
“ANYỊ ACHỌGHỊ OBODO JEHOVA!” ka akwụkwọ ndị a mapawara n’obodo ahụ nile kwuru. “Ka Anyị Nile Gbakọta Aka Megide Ihe Owuwu Jehova” ka otu ìgwè ndị mmegide gbara ume. Ọtụtụ narị isiokwu e biri ebi mere ka ọha na eze mara banyere okwu ahụ. A bịanyere aka n’akwụkwọ mkpesa dị iche iche, ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke traktị karịrị ọkara nde na-ekwu banyere ihe owuwu ahụ jupụtakwara n’igbe akwụkwọ ozi obodo ahụ. Gịnị bụ ihe owuwu a nke mebiri ịdị juu obodo Louviers, n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke France, nke na-adịbu jụụ. Ọ bụ atụmatụ e mere iwu alaka ụlọ ọrụ na ebe obibi ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova.
Jehova Na-eme Ka O Too
Ọrụ Ndịàmà Jehova na France malitere laa azụ ná ngwụsị narị afọ nke 19. E meghere ebe nkwasa akwụkwọ Bible mbụ na 1905 na Beauvène, n’ebe ndịda France, malitekwa na 1919, otu ụlọ ọrụ nta nọ na-arụ ọrụ na Paris. E meghere alaka ụlọ ọrụ n’obodo ahụ na 1930, n’afọ na-esokwanụ ndị na-arụ ọrụ n’ọfịs malitere ibi n’ebe obibi Betel dị na Enghien-les-Bains, n’ebe ugwu Paris. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ezinụlọ Betel kwagaghachiri na Paris, na 1959 kwa e bufere alaka ahụ n’otu ụlọ elu dị okpukpu ise dị na Boulogne-Billancourt, ná mpụga ebe ọdịda anyanwụ nke isi obodo ahụ.
N’ihi mmụba nke ọrụ nkwusa Alaeze, na 1973 e bufere ihe ndị e ji ebi akwụkwọ na nke mbupụ akwụkwọ na Louviers, nke dị kilomita 100 n’ebe ọdịda anyanwụ Paris, ebe ọfịs dịgidere na Boulogne-Billancourt. Otú ọ dị, mmụba nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa na France mere ka ihe owuwu ahụ dị na Louviers ghara izu ezu, n’agbanyeghị mgbakwụnye ndị e mere na 1978 nakwa na 1985. Ya mere, e kpebiri iwusawanye ya ma jikọta ezinụlọ Betel dum ọnụ n’otu ebe. Ihe owuwu a amasịghị mmadụ nile, dị ka e kwuru ná mmalite. N’agbanyeghị mmegide dị otú ahụ, a chọtara ala ebe a ga-ewu ihe owuwu ahụ nanị otu kilomita na ọkara site n’ebe obibi akwụkwọ ahụ. Afọ isii nke ịrụsi ọrụ ike malitere, n’ikpeazụkwa, ka afọ 23 nke anọkọtaghị ọnụ gasịrị, e jikọtara ezinụlọ Betel dum ọnụ na Louviers n’August 1996.
N’ihi ya, ọ bụ n’oké ọṅụ ka ìgwè mmadụ 1,187 nwere obi ụtọ, gụnyere ndị òtù ezinụlọ Betel nke France dị 300, na mmadụ 329 sitere n’alaka 42 ndị ọzọ, jiri gbakọta na Saturday, November 15, 1997, ịṅa ntị n’okwu nraranye nke Nwanna Lloyd Barry, so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru. Otú ọ dị, n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na nraranye a na-ewere ọnọdụ n’agbanyeghị ibu iro na nkwutọ ndị a kpọsara site n’usoro mgbasa ozi ruo ogologo oge megide Ndịàmà Jehova gburugburu France, e chere na Ndịàmà Jehova nile nọ na France kwesịrị ikere òkè n’ime ememe mmeri a. N’ihi ya, na Sunday, November 16, a haziri nzukọ pụrụ iche nwere isiokwu bụ́ “Nọgide n’Ịhụnanya Kraịst” n’Ogige Ngosi Ngwa Ahịa nke Villepinte, dị nnọọ n’ebe ugwu Paris. A kpọrọ Ndịàmà Jehova nile nọ na France gụnyere Ndịàmà na-asụ French nọ na Belgium na Switzerland òkù ịbịa, tinyekwara ọgbakọ ndị dị na Britain, Germany, Luxembourg, na Netherlands.
Mgbakọta Dị Ịrịba Ama
A malitere nkwadebe maka mgbakọta ahụ ọnwa isii tupu oge eruo. Mgbe ahụ, nanị izu abụọ tupu nraranye ahụ, ndị ọkwọ ụgbọala gwongworo na France gbara abụbọ ọrụ, na-emechi ụzọ ndị bụ́ isi na mbubata mmanụ ụgbọ. Oche na akọrọ ngwá ndị ọzọ hà ga-erute n’oge? Mmechi ụzọ ndị ahụ ọ̀ ga-egbochi ụmụnna ịbịa? N’ịbara mmadụ nile uru, n’ime otu izu ịgba abụbọ ọrụ ahụ kwụsịrị, e meghekwara ụzọ ọzọ maka ụgbọala. N’uhuruchi Friday tupu ngwụsị izu nke nraranye ahụ, gwongworo 38 butere oche 84,000 n’ụlọ ezumezu abụọ sara mbara a kwụrụ ụgwọ ya maka ememe ahụ. Ihe karịrị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị 800 rụrụ ọrụ n’abalị nile ruo mgbe o ji ọkara gafee elekere itoolu n’ụtụtụ Saturday iji rụnye oche, ikpo okwu, ígwè okwu, na telivishọn vidio itoolu buru ibu nke ukwuu.
N’elekere isii nke ụtụtụ Sunday, e meghere ibo ụzọ ahụ, ìgwè mmadụ malitekwara ikwobanye. Ngụkọta nke ụgbọ okporo ígwè 17 ndị a kwụrụ ụgwọ ha n’ụzọ pụrụ iche burutere ihe karịrị Ndịàmà 13,000 n’isi obodo ahụ. Ihe karịrị narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị abụọ ndị obodo ahụ bịara n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ikele ndị njem ahụ na isonyere ha n’ìgwè gaa n’ebe mgbakọ ahụ. Otu nwanna nwanyị sịrị na ndokwa ịhụnanya a nyere ha “mmetụta nke ịnọ ná nchebe na obi ụtọ.”
Ndị ọzọ ji ụgbọelu ma ọ bụ ụgbọala bịa Paris. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ jiri bọs dị 953 bịa, ebe Ndịàmà si n’ógbè Paris jiri ụgbọ njem ọha na eze gaa n’Ogige Ngosi Ngwa Ahịa ahụ. Ọtụtụ emewo njem ogologo abalị nile ma ọ bụ ahapụwo ebe obibi ha n’isi ụtụtụ, ma a pụrụ ịhụ nnọọ mkpali ha nwere n’ịbịa nzukọ a. Ákwá ọṅụ na mmakụ na-ekpo ọkụ kara njikọghachi nke ndị enyi na-ahụbeghị onwe ha anya ruo ọtụtụ afọ akara. Ejiji ndị tụrụ àgwà nke mba dị iche iche mere ka ìgwè ahụ nwere ihu ọchị dị ka ndị sitere n’akụkụ nile nke ụwa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe pụrụ nnọọ iche gaje ime.
Ka ọ na-erule oge usoro ihe omume malitere, n’elekere iri nke ụtụtụ, a nọjuwo oche nile, ma ọtụtụ narị ndị mmadụ na-abịarute na minit ọ bụla. Ebe ọ bụla mmadụ legara anya, ọ na-ahụ ọtụtụ ihu ọchị. Ọtụtụ puku na-eguzo ọtọ ma ọ bụ nọdụ n’ala siment. N’igosipụta mmụọ nke isiokwu mgbakọ ahụ, ọtụtụ ndị na-eto eto jiri ịhụnanya guzoro ọtọ ka ndị agadi nwee ike ịnọdụ ala. “Lee obi ụtọ anyị nwere inyefe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị anyị na-amabughị, ma bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya nke ukwuu oche anyị!” ka otu di na nwunye dere. Ọtụtụ gosipụtara ezi àgwà nke ịchụ onwe onye n’àjà: “Anyị guzoro ọtọ ụbọchị ahụ nile n’akụkụ oche ndị anyị nyere aka tinye n’abalị Friday nile. Ma nanị ịnọ n’ebe ahụ mere ka anyị jupụta n’ekele nye Jehova.”
N’agbanyeghị ike ọgwụgwụ ma ọ bụ ahụ erughị ala, ndị bịaranụ ṅara ntị nke ọma n’akụkọ ndị sitere na mba ndị ọzọ na n’okwu ndị Lloyd Barry na Daniel Sydlik, bụ́ onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi, kwuru. Nwanna Barry kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Jehova Na-enye Ume n’Ụba,” o mekwara ka ụzọ Jehova siworo jiri mmụba gọzie ndị ya n’agbanyeghị ọnwụnwa dị iche iche pụta ìhè n’ụzọ doro anya. Isiokwu nke okwu Nwanna Sydlik bụ “Ndị Ihe Na-agara Nke Ọma Ka Ndị Jehova Bụ Chineke Ha Bụ!” Okwu abụọ ahụ bịara n’oge ya kpọmkwem n’ihi mmegide Ndịàmà Jehova na-eche ihu ugbu a na France. Nwanna Sydlik gosiri na ezi obi ụtọ adabereghị n’ihe ndị a na-ahụ anya kama ná mmekọrịta anyị na Jehova na n’àgwà anyị n’ebe ndụ dị. E ji ịkụ aka dara oké ụda zaghachi ajụjụ ọ jụrụ ndị na-ege ntị, bụ́ “Obi ọ̀ dị unu ụtọ?”
Otu nwanna nwanyị onye “tụfuworo ọṅụ ya” mesịrị dee, sị: “Na mberede ahụrụ m na obi ụtọ nọ m nso. Anọwo m na-etinye mgbalị m n’ụzọ na-ezighị ezi, ma site n’okwu a, Jehova gosiri m otú mgbanwe si dị m mkpa.” Nwanna nwoke ọzọ kwupụtara, sị: “Ugbu a, achọrọ m ịgba mgba iji mee ka obi Jehova ṅụrịa. Achọghị m ka ihe ọ bụla wepụ ọṅụ ahụ m maliteworo inwe nnọọ n’ime.”
Ka nzukọ ahụ bịara ná mmechi, ọ bụ n’ikpo ọkụ dị ukwuu ka onyeisi oche ji kwupụta ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ: 95,888—mgbakọta kasị ukwuu nke Ndịàmà Jehova nwetụrụla na France!
Mgbe a bụsịrị abụ mmechi, nke ọtụtụ ji anya mmiri nke ọṅụ bụọ, na ekpere ikpeazụ, ụmụnna malitere njem ụla na-abụ ndị ọ dị ka nzukọ ahụ gakwuo n’ihu. Ọnọdụ na-ekpo ọkụ, nke enyi nke dị ná mgbakọta ahụ pụtara ìhè. Ndị ọkwọ ụgbọala kwuru ọtụtụ ihe dị mma banyere àgwà ndị bịara mgbakọ ahụ. Ha nwekwara mmasị ná nhazi e mere nke mere ka o kwe omume bọs 953 nile ahụ isi n’Ogige Ngosi Ngwa Ahịa ahụ pụọ n’ime hour abụọ n’enweghị agaghị ihu ma ọ bụ azụ nke ụgbọala ọ bụla! Àgwà nke ndị bịara mgbakọ ahụ masịkwara ndị ọrụ ụgbọ okporo ìgwè na ụgbọ njem ọha nke ukwuu. Ọtụtụ nkwurịta okwu ndị dị mma malitere, a gbakwara ezi àmà.
“Ala Mmiri nke Dị n’Ọzara”
Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; . . . na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ezie, nzukọ a pụrụ iche bụ ihe agbamume dị ukwuu nye ndị nile, “ala mmiri nke dị n’ọzara” dị ka otu nwanna nwanyị si kọwaa ya. “Anyị lara bụrụ ndị e nyere ume, a gbara ume, e wusiri ike, na ndị kpebisiri ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịnụrị ọṅụ n’ozi Jehova,” ka ụmụnna si n’alaka Togo dere. “Ndị nweburu obi ịda mbà ji obi ụtọ laghachi n’ebe obibi ha,” ka otu onye nlekọta sekit kwuru. “A kpaliri ma wusie ụmụnna ike,” ka onye ọzọ kwuru. “Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla anyị nwere mmetụta nke ịnọ nzukọ Jehova nso otú a,” ka a kpaliri otu di na nwunye ide.
“Ụkwụ m eguzowo n’ala dị larịị: n’ime mkpọkọta mmadụ nile ka m ga-agọzi Jehova,” ka ọbụ abụ ahụ kwupụtara. (Abụ Ọma 26:12) Mgbakọta ndị Kraịst dị otú ahụ na-eme ka mmadụ nile nwee ike inwetaghachi ezi ọnọdụ ime mmụọ n’agbanyeghị ihe mgbochi. “Mkpagbu ọ bụla ọ masịrị ya ya bụrụ,” ka otu nwanna nwanyị kwuru, “a kanyewo oge ndị a pụrụ iche n’ime obi anyị, ọ ga-adịgidekwa ebe ahụ ịkasi anyị obi.” N’ụzọ yiri nke ahụ, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị dere, sị: “Mgbe ihe isi ike bilitere, ncheta nke ihe atụ a nke Paradaịs ga-enyere anyị aka ịnagide ha.”
“Nyenụ Jehova, unu agbụrụ nke ndị nile dị iche iche, nyenụ Jehova nsọpụrụ na ike,” ka Abụ Ọma 96:7 na-agba ume ya. N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, nraranye nke alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ dị na France bụ oké mmeri nye Jehova. Ọ bụ nanị ya pụrụ imewo ka e wuzuo ihe owuwu ahụ n’agbanyeghị mmegide e kpebisiri ike, gbasakwara ebe nile dị otú ahụ. Ndịàmà Jehova nọ na France ekpebisikwuola ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ‘ịnọgide n’ime ihụnanya Kraịst’ ma ‘mee ka ìhè ha na-enwu.’ (Jọn 15:9; Matiu 5:16) Ndị nile bịara usoro ihe omume nraranye ahụ nwere mmetụta nke ọbụ abụ ahụ n’ụzọ zuru ezu: “Ọ bụ n’aka Jehova ka nke a sitere; nke ahụ bụ oké ọrụ n’anya anyị.”—Abụ Ọma 118:23.
[Foto dị na peeji nke 26]
Daniel Sydlik
[Foto dị na peeji nke 26]
Lloyd Barry
[Foto dị na peeji nke 26]
95,888 bịara usoro ihe omume ahụ pụrụ iche n’Ogige Ngosi Ngwa Ahịa nke Villepinte
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Ọtụtụ puku ndị bịaranụ guzoro ọtọ ma ọ bụ nọdụ n’ala nkịtị iji gee ntị