Alaeze Ukwu Efunahụ Otu Eze Dị Nganga
“BELSHAZA, bụ́ eze,” ka Daniel onye amụma dere, “mere oké oriri nye [otu puku ndị isi ya], ọ bụkwa n’ihu [otu puku] ahụ ka ọ na-aṅụ mmanya vine.” Otú ọ dị, ka oké oriri ahụ nọ na-aga n’ihu, “igbu maramara nke ihu eze gbanwere, echiche ya nile na-emekwa ka ọ maa jijiji; nkwonkwo úkwù ya na-atọpụsịkwa, ikpere ya abụọ na-akụkọrịtakwa onwe ha.” Tupu chi abọọ, “e gburu Belshaza, bụ́ eze Kaldea. Ma Daraịọs, bụ́ onye Midia, natara alaeze ahụ.”—Daniel 5:1, 6, 30, 31.
Ònye bụ Belshaza? Olee otú e sizi kpọwa ya “eze Kaldea”? Gịnị kpọmkwem bụ ọkwá ya n’Alaeze Ukwu Babilọn Ọhụrụ ahụ? Olee otú o si tụfuo alaeze ukwu ahụ?
Onye So Eze Na-achị Ka Ọ̀ Bụ Eze?
Daniel zoro aka n’ebe Nebukadneza nọ dị ka nna Belshaza. (Daniel 5:2, 11, 18, 22) Otú ọ dị, njikọ a abụghị n’ụzọ nkịtị. Akwụkwọ bụ́ Nabonidus and Belshazzar, nke Raymond P. Dougherty dere, na-atụ aro na ikekwe Nebukadneza bụ nna nne ya, bụ́ Nitocris. Ọ pụkwara ịbụ na Nebukadneza, n’ịbụ onye chịburu eze, bụ nanị “nna” Belshaza n’ebe ocheeze dị. (Tụlee Jenesis 28:10, 13.) Otú o sina dị, ihe odide cuneiform ahụ e dekwasịrị n’elu ọtụtụ ájá ụrọ a kpụrụ gburugburu bụ́ ndị a chọpụtara n’ebe ndịda Iraq n’ime narị afọ nke 19 na-akọwa Belshaza dị ka nwa nwoke kasị okenye nke Nabonidus, bụ́ eze Babilọn.
Ebe ọ bụ na ihe ndekọ ahụ dị na Daniel isi nke 5 na-elekwasị anya n’ihe omume ndị mere n’abalị ahụ Babilọn dara na 539 T.O.A., ọ kọwaghị otú Belshaza si bịa nwee ike ọchịchị. Ma ihe mgbe ochie e si n’ala nweta na-enye nkọwa ụfọdụ banyere njikọ dị n’etiti Nabonidus na Belshaza. “Akụkụ ihe odide Babilọn na-ekpughe na Nabonidus bụ onye ọchịchị dị iche,” ka Alan Millard, bụ́ ọkà mmụta ihe mgbe ochie na onye ọnụ na-eru n’okwu n’asụsụ ụmụ Shem oge ochie, na-ekwu. Millard na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụ ezie na o lefurughị chi dị iche iche nke Babilọn anya, o . . . lebaara nnọọ chi ọnwa dị n’obodo abụọ ndị ọzọ, bụ́ Ua na Heran, anya. Ruo ọtụtụ afọ nke ọchịchị ya, Nabonidus ebighịdị na Babilọn; kama nke ahụ, ọ nọrọ n’ala ahịhịa ndụ dị anya nke Teima [ma ọ bụ, Tema] n’ebe ugwu Arebia.” Ihe àmà na-egosi na Nabonidus nọ n’ebe na-abụghị isi obodo, bụ́ Babilọn, chịa ọchịchị ya n’oge dị ukwuu. N’oge ndị ọ na-anọghị ya, e nyere Belshaza ike ọchịchị.
N’ime ka ọkwá bụ́ ezie nke Belshaza pụtakwuo ìhè, akwụkwọ e dere na cuneiform nke a kọwara dị ka “Ihe Ndekọ Amaokwu nke Nabonidus” na-ekwu, sị: “O [Nabonidus] nyefere ‘Usuu Ndị Agha’ ahụ n’aka (nwa ya nwoke) kasị okenye, onye o bu ụzọ mụọ, usuu ndị agha nọ n’ebe ọ bụla ná mba ahụ ka o nyere iwu ịnọ n’okpuru (ịchịisi) ya. Ọ hapụrụ (ihe nile), [o] nyefere ya ọbụbụeze.” N’ihi ya, Belshaza so eze na-achị.
Ma, à pụrụ ile onye so eze na-achị anya dị ka eze? Ihe oyiyi nke onye ọchịchị oge ochie a hụrụ n’ebe ugwu Siria n’afọ ndị 1970 na-egosi na ọ bụghị ihe a na-amaghị ama ịkpọ onye ọchịchị eze mgbe, n’ikwu ya kpọmkwem, o nwere utu aha katụ ala. Ihe oyiyi ahụ bụ nke onye ọchịchị Gozan, e dekwasịkwara ya ihe n’asụsụ Asirian na Aramaic. Ihe odide Asirian ahụ kpọrọ nwoke ahụ gọvanọ Gozan, ma ihe odide Aramaic ya na ya bụ otu ihe kpọrọ ya eze. Ya mere ọ gaghị abụ ihe a na-enwetụbeghị ụdị ya bụ́ ịkpọ Belshaza nwa eze e chiri eze n’ihe odide e ji eme ihe nke Babilọn ebe a na-akpọ ya eze n’ihe odide Aramaic nke Daniel.
Ndokwa nke ịchịisi a gbakọrọ aka na-achị n’etiti Nabonidus na Belshaza dịịrị banye n’ụbọchị ndị ikpeazụ nke Alaeze Ukwu Babilọn Ọhụrụ. Ya mere, kpọmkwem n’abalị ahụ Babilọn dara, Belshaza sịrị na ya ga-eme Daniel onye ọchịchị nke atọ n’alaeze ahụ, ọ bụghị nke abụọ.—Daniel 5:16.
Eze Nwebigara Obi Ike Ókè ma Dị Nganga
Ihe omume ndị ikpeazụ nke ịchịisi Belshaza na-egosi na nwa eze ahụ nwebigara obi ike ókè ma dị nganga. Mgbe ịchịisi ya bịara ná njedebe n’October 5, 539 T.O.A., e zobere Nabonidus n’ime Borsippa, ebe ndị agha Medo-Peasia meriworo ya. A wakporo Babilọn n’onwe ya. Ma Belshaza nwere nnọọ mmetụta nke ịbụ onye nọ ná nchebe n’obodo ukwu ahụ nnukwu mgbidi gbara gburugburu nke na kpọmkwem n’abalị ahụ, o mere “oké oriri nye [otu puku ndị isi ya].” Herodotus, bụ́ onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke ise T.O.A., kwuru na n’ime obodo ukwu ahụ, ndị mmadụ “nọ na-agba egwú n’oge ahụ, na-ekpori ndụ.”
Ma, n’èzí mgbidi Babilọn, usuu ndị agha Medo-Peasia nọ ná nche. N’okpuru nduzi Saịrọs, ha echewo mmiri nke Osimiri Yufretis, nke na-asọfe n’etiti obodo ahụ, ihu n’ebe ọzọ. Ndị dike ya dị njikere irufere osimiri ahụ ozugbo mmiri ahụ talatara nke ọma. Ha ga-arịgopụta ma si n’ibo ọla copper dị ná mgbidi nke dị n’akụkụ ihu osimiri ahụ banye.
Ọ bụrụ na Belshaza maara ihe na-eme n’èzí obodo ahụ, ọ gaara agbachi ibo ọla copper ahụ, debechaa ndị ikom ya siri ike ná mgbidi ahụ dị n’akụkụ ikpere osimiri ahụ, ma nwụdekwa ndị iro ahụ. Kama nke ahụ, n’anya mmanya, Belshaza dị mpako kwuru ka e bubata arịa ndị sitere n’ụlọukwu Jehova. Mgbe ahụ, ya onwe ya, ndị ọbịa ya, ndị nwunye ya, na ndị iko ya nwanyị ji nleda anya ṅụọ mmanya site na ha ka ha na-eto chi Babilọn. Na mberede, otu aka pụtara n’ụzọ ọrụ ebube ma malite ide ihe n’ahụ ájá obí ahụ. N’ịbụ onye ụjọ jidere, Belshaza kpọrọ ndị ikom amamihe ya ka ha kọwaa ozi ahụ. Ma ha “apụghị ịgụ ihe ahụ e dere, ma ọ bụ ime ka eze mara isi ya.” N’ikpeazụ, “e mere ka Daniel baa n’ihu eze.” N’ike mmụọ nsọ Chineke, onye amụma Jehova nwere obi ike kpughere ihe ozi ahụ e ziri n’ụzọ ọrụ ebube pụtara, na-ebu amụma ọdịda Babilọn n’aka ndị Midia na ndị Peasia.—Daniel 5:2-28.
Ndị Midia na ndị Peasia weghaara obodo ahụ n’ụzọ dị mfe, Belshaza adịghịkwa ndụ hụ echi. Ugbu a ọ nwụrụla, nakwa nchịli aka o yiri ka Nabonidus ga-achịliri Saịrọs, Alaeze Ukwu Babilọn Ọhụrụ ahụ bịara ná njedebe.
[Foto dị na peeji nke 8]
Daniel akọwaa ozi mbibi maka Alaeze Ukwu Babilọn