Mgbe Obi Ndị Dị Ka Nkume Ṅawara Ntị
NA 1989, E NYERE NDỊÀMÀ JEHOVA NỌ NA POLAND nnakwere iwu dị ka òtù okpukpe. E ji nwayọọ nwayọọ tọhapụ Ndịàmà a tụrụ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ndị Kraịst ha, na-ahapụ ọtụtụ ndị mkpọrọ ọ na-agụsi agụụ ike ịmụtakwu banyere Bible n’aka ha n’ụlọ mkpọrọ. Nke a bụ akụkọ banyere otú Ndịàmà Jehova si agbalị inyere ndị nweburu obi ndị dị ka nkume aka imeghachi omume n’ihi ike nke Okwu Chineke n’otu ụlọ mkpọrọ dị otú ahụ.
NA WOŁÓW, bụ́ obodo nwere mmadụ 12,000 na ndịda ebe ọdịda anyanwụ Poland, ka e nwere otu ụlọ mkpọrọ dị afọ 200 bụ́ ebe a na-edebe ụfọdụ ndị omekome kasị njọ nke Poland. Kemgbe e nyere ọrụ ha nnabata nke ọchịchị, Ndịàmà Jehova agbalịwo iwetara ndị mkpọrọ nọ n’ebe ahụ ozi ọma Alaeze ahụ, ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu na-eme otú ahụ.
Ihe meghere ụzọ bụ akwụkwọ ozi nke Ministrị Okwu Ikpe nyere ndị isi ụlọ mkpọrọ nile nọ na Poland na February 1990. Akwụkwọ ozi ahụ gwara ha na ha ekwesịghị “ịkpata ihe isi ike” nye onye mkpọrọ ọ bụla nke chọrọ ịnata mbipụta dị iche iche nke Watch Tower ma ọ bụ izute Ndịàmà Jehova. Ndịàmà ahụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha nọworo ogologo afọ n’ụlọ mkpọrọ Wołów, maara ọtụtụ ndị mkpọrọ obi tara mmiri nọ n’ebe ahụ nke ọma. Otú ọ dị, ha legaara Jehova anya ịgọzi mgbalị ha ime ka eziokwu Bible mee ka obi ndị dị ka nkume nke ndị mkpọrọ ndị ọzọ dị nro.
Ịmalite Ọrụ Ahụ
“O siri ike ịmalite usoro ihe omume ahụ,” ka Nwanna Czesław nke si Wrocław, ihe dị ka kilomita 40 site n’ebe ahụ, bụ́ onye e nyeworo ikike ileta ụlọ mkpọrọ dị na Wołów, na-ekwu. “O were nkwurịta okwu ndị dị ogologo nke e so ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ nwee iji mee ka ha kweta na ‘ije ozi okpukpe’ anyị baara ndị mkpọrọ ahụ uru.”
Iji mee ka okwu sie ike, ka onye ibe Czesław bụ́ Paweł na-echeta, “otu onyeisi nwere ọkwá dị elu kwusiri ike na ndị mkpọrọ ahụ ji ije ozi okpukpe ahụ eme ihe dị ka ihe ngọpụ iji nweta uru ihe onwunwe.” Ma mgbe mmadụ atọ bụbu ndị omekome dị ize ndụ wepụtara onwe ha maka baptism na 1991, ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ gbanwere omume ha, nkwado ha kawanyere mma.
“Anyị malitere site n’ịgbara ndị mkpọrọ, ezinụlọ ha bụ́ ndị bịara ileta ha n’ụlọ mkpọrọ, nakwa ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ, àmà,” ka Czesław na-akọwa. “A hapụziri anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma site n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ gaa n’ọzọ, bụ́ ihe a na-adịghị ekwekarị ka e mee. N’ikpeazụ, mgbe anyị chọtara ndị mbụ nwere mmasị, e nyere anyị ohere iji otu ụlọ ezumezu nta mee ihe iduzi ọmụmụ Bible na inwe nzukọ ndị Kraịst.” Ee, Jehova meghere ụzọ gaa n’obi ndị dị ka nkume nke ndị mkpọrọ.
Usoro Izi Ihe Dị Irè
N’oge na-adịghị anya obere ụlọ ezumezu ahụ abatakwaghị ha. Ebe ọ bụ na ma ndị mkpọrọ ahụ e mere baptism ma ụmụnna ndị na-esi esi abịa na-ekerecha ókè n’ọrụ nkwusa ahụ, ihe ruru ndị mkpọrọ 50 malitere ịbịa nzukọ. “Ruo ihe karịrị afọ atọ, anyị nọ ebe ahụ nwee nzukọ nile, ndị mkpọrọ ahụ bịachikwara nzukọ kwa izu ndị ahụ anya,” ka otu n’ime ndị okenye nọ n’ógbè ahụ na-akọwa. Ya mere na May 1995 e nyere ha ụlọ ezumezu katụ ukwuu iji na-eme ihe.
Olee otú ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ si ekpebi onye pụrụ ịbịa nzukọ ndị ahụ a na-enwe n’ụlọ mkpọrọ? “Anyị nwere ndepụta nke ndị mkpọrọ na-egosi ezi mmasị n’eziokwu ahụ,” ka Nwanna Czesław na Nwanna Zdzisław na-akọwa. “Ọ bụrụ na onye mkpọrọ adịghị enwe ọganihu ma ọ bụ na-ahapụ nzukọ n’enweghị ezi ihe kpatara ya, si otú a na-egosi enweghị ekele maka ndokwa ndị dị otú ahụ, anyị na-ehichapụ aha ya ná ndepụta ahụ ma gwa onyeisi ụlọ mkpọrọ.”
N’oge ọmụmụ Bible ha, ụmụnna ahụ na-akụzikwara ndị mkpọrọ ahụ otú e si akwadebe nke ọma maka nzukọ na otú e si eji akwụkwọ anyị eme ihe n’ụzọ dị irè. N’ihi ya, mgbe ndị mkpọrọ bịara nzukọ, ha na-akwadebe nke ọma ma na-ekere òkè n’enweghị ihe mgbochi. Ha na-aza ajụjụ ndị na-ewuli elu, na-eji nkà eji Bible ha eme ihe, na-emekwa ka ndụmọdụ ya metụta ha, na-etinye nchọpụta ndị dị ka, ‘Ahụrụ m na aghaghị m ime nke a ma ọ bụ nke ọzọ,’ mgbe mgbe n’azịza ha.
“N’ozuzu ya, a na-eduzi ọmụmụ Bible 20 n’ụlọ mkpọrọ Wołów. Asatọ n’ime ha bụ ndị ndị mkpọrọ atọ bụ́ ndị nkwusa na-eduzi,” ka odeakwụkwọ ọgbakọ ahụ na-ekwu. Ha arụpụtawokwa ihe ndị dị mma ka ha na-ekwusa site n’ọnụ ụlọ mkpọrọ gaa n’ọzọ nakwa n’oge ha na-eme njegharị n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ. Dị ka ihe atụ, n’ime ọnwa iri, site na September 1993 ruo June 1994, ha kesara akwụkwọ 235, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ broshuọ 300, na magazin 1,700. Na nso nso a, abụọ n’ime ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ ahụ rịọrọ maka ọmụmụ Bible.
Mgbakọ Ndị Pụrụ Iche Eweta Ọṅụ
Ka oge na-aga, e tinyere akụkụ ọzọ n’usoro izi ihe e nwere n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ya bụ, mgbakọ ndị pụrụ iche. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ụmụnna ndị ọzọ ruru eru ga-eme akụkụ ndị bụ́ isi nke usoro ihe omume mgbakọ sekit na mgbakọ pụrụ iche nke otu ụbọchị n’ụlọ egwuregwu nke ụlọ mkpọrọ ahụ. E nwere mgbakọ pụrụ iche mbụ n’October 1993. Ndị mkpọrọ 50 bịara, “ezinụlọ dum, gụnyere ndị inyom na ụmụntakịrị, esiwokwa na Wrocław bịa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Słowo Polskie kọrọ, na-enwe ngụkọta nke 139 ndị bịaranụ. Nkwụsịtụ nwa oge nke mgbakọ ahụ nyere ohere maka iri nri nke ụmụnna nwanyị kwadebere, nakwa oge maka mkpakọrịta dị mma nke ndị Kraịst.
E nwewo mgbakọ pụrụ iche asaa ọzọ kemgbe ahụ, abamuru ya eruwokwa ọ bụghị nanị ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ kamakwa ndị nọ n’èzí. Mgbe otu Onyeàmà bụ́ nwanna nwanyị kpọtụụrụ otu onye a tụburu mkpọrọ na Wołów nke bi n’obodo ukwu ugbu a, o nwere obi abụọ na mbụ. Ma mgbe a gwara ya na otu onye mkpọrọ aghọwo Onyeàmà, nwoke ahụ tiwapụrụ mkpu n’ijuanya: “Ogbu mmadụ ahụ ọ̀ bụzi Onyeàmà?” N’ihi ya, nwoke ahụ nakweere ọmụmụ Bible.
E Mee Nnwogha Dị Egwu
Usoro izi ihe a sara mbara ò mewo ka obi ndị dị ka nkume nke ndị mkpọrọ ahụ dị nro? Ka ha were ọnụ ha kọọ.
“Amabeghị m nne na nna m n’ihi na ha hapụrụ m mgbe m dị obere, mmetụta nke ịbụ onye a hụrụ n’anya gụsikwara m agụụ ike n’ụzọ dị mwute,” ka Zdzisław, nwoke nwere àgwà nke iche echiche na-ekwupụta. “N’oge m bụ nwata, etinyere m aka n’ime mpụ, mesịa gbuo mmadụ. Obi amamikpe dugara m ịtụle igbu onwe m, anọ m na-achọsikwa ezi olileanya ike. E mesịa, na 1987, ahụrụ m magazin Ụlọ Nche. Site na ya amụtara m banyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ na nke ndụ ebighị ebi. N’ịghọta na olileanya ka dị, ewepụrụ m echiche nke igbu onwe m ma malite ịmụ Bible. Ugbu a amụtawo m ihe ịhụnanya pụtara site n’aka Jehova nakwa n’aka ụmụnna.” Kemgbe 1993, onye a bụbu ogbu mmadụ abụwo ohu na-eje ozi na ọsụ ụzọ inyeaka, n’afọ gara aga ọ ghọkwara ọsụ ụzọ oge nile.
Tomasz, n’aka nke ọzọ, nabatara ọmụmụ Bible ozugbo. “Otú ọ dị, nke ahụ abụghị nzọụkwụ e mere n’ezi obi,” ka ọ na-ekwupụta. “Anọ m na-amụ ihe nanị n’ihi na ọ na-amasị m ịkpa nganga mgbe m na-akọwara ndị ọzọ nkwenkwe Ndịàmà Jehova. Ma anọghị m na-eme ihe dị ukwuu banyere eziokwu Bible. Otu ụbọchị, emere m mkpebi ma jee nzukọ ndị Kraịst. Ndị mkpọrọ e mere baptism nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Aghọtara m na kama ịgbalị iji ihe ọmụma na-akpa nganga, aghaghị m ime ka obi m nke dị ka nkume dị nro ma nwoghaa uche m.” Tomasz malitere iyikwasị mmadụ ọhụrụ nke ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 4:22-24) Taa, ọ bụ Onyeàmà raara onwe ya nye, e mekwara baptism, ọ na-enwekwa obi ụtọ n’ime nkwusa site n’ọnụ ụlọ mkpọrọ gaa n’ọzọ.
Nrụgide Site n’Aka Ndị Ha na Ha Bụbu Enyi
Ndị ahụ mụtara eziokwu Bible n’ụlọ mkpọrọ nwetara nrụgide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka ndị ha na ha bụbu enyi n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ahụ nakwa site n’aka ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ. Otu n’ime ha na-echeta, sị: “Mgbe nile a nọ na-akwa m emo, na-achịkwa m ọchị. Ma ebu m okwu agbamume nke ụmụnna n’uche. ‘Nọgide na-ekpegara Jehova ekpere,’ ka ha gwara m. ‘Na-agụ Bible gị, ị ga-enwekwa udo n’ime.’ Nke ahụ nyere nnọọ aka.”
“Ndị mkpọrọ ibe m nọgidere na-agwa m okwu ndị na-agbakasị ahụ,” ka Ryszard na-ekwu, bụ́ nwanna e mere baptism onye nwere ahụ dị poko poko. “‘Ị pụrụ ije nzukọ unu, ma anwala ime ka ị pụta ìhè ma na-eme ka a ga-asị na ị ka mma, Ị̀ NỤRỤ YA?’ ka ha ga-adọ m aka ná ntị. Mgbe m mere mgbanwe ná ndụ m n’ihi itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, atara m ahụhụ maka ya. Ha kpuru ihe ndina m ihu, tụsasịa akwụkwọ m ji amụ Bible, metọsịakwa akụkụ nke m n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ahụ. Ekpegaara m Jehova ekpere maka ikike ijide onwe m ma jiri nwayọọ na-edozicha ihe nile. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, mwakpo ahụ kwụsịrị.”
“Mgbe ndị mkpọrọ ibe anyị na-ahụ na anyị emewo mkpebi siri ike ijere Jehova ozi,” ka ụfọdụ ndị mkpọrọ ndị ọzọ e mere baptism na-akọ, “nrụgide ndị ahụ na-agbanwe. O yikarịrị ka ha ga-asị, ‘Cheta, i kwesịghị ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ise siga, ma ọ bụ ịgha ụgha ọzọ.’ Nrụgide dị otú ahụ na-enyere mmadụ aka ijide onwe ya, na-ewepụsị omume rụrụ arụ ma ọ bụ iri ahụ ọ bụla ngwa ngwa. Ọ na-enyekwara mmadụ aka ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ.”—Ndị Galetia 5:22, 23.
Ịghọ Ndị Ohu Chineke Raara Onwe Ha Nye
Site n’ikike nke ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ, baptism mbụ weere ọnọdụ n’ụlọ egwuregwu ahụ n’oge opupu ihe ubi nke 1991. Ọ bụ Zdzisław bụ onye ahụ nwere obi ụtọ chọrọ ka e mee ya baptism. Ndị mkpọrọ 12 bịara, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị 21 sikwa esi bịa maka ihe omume ahụ. Nzukọ ahụ nwere mmetụta na-agba ume n’ebe ndị mkpọrọ ahụ nọ. Ọtụtụ n’ime ha nwere ọganihu dị ịrịba ama nke na e mere ndị mkpọrọ abụọ ọzọ baptism mgbe oge ụfọdụ gasịrị n’afọ ahụ. Afọ abụọ mgbe e mesịrị, na 1993, e mere baptism ugboro abụọ, ndị mkpọrọ asaa ọzọ gosipụtakwara nrara ha raara onwe ha nye Jehova!
N’ịkọ banyere baptism e mere na December, akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị nke ógbè ahụ, bụ́ Wieczór Wrocławia, kwuru, sị: “Ndị mmadụ nọgidere na-enubata n’ụlọ egwuregwu ahụ, na-ekele mmadụ nile ma na-ekwe ha n’aka. Ọ dịghị onye bụ́ ọbịa n’ebe a. Ha mejupụtara otu ezinụlọ ukwu, ndị dị n’otu n’echiche, n’ụzọ ndụ ha, nakwa n’ijere otu Chineke, bụ́ Jehova ozi.” “Otu ezinụlọ ukwu” ahụ nwere mmadụ 135 mgbe ahụ, gụnyere ndị mkpọrọ 50. Ka anyị zute ụfọdụ n’ime ha.
Jerzy, bụ́ onye e mere baptism na June, na-akọ, sị: “Ọ bụ ezie na m nụtụrụ eziokwu Bible ọtụtụ afọ gara aga, ihe dị n’ime m bụ n’ezie obi dị ka nkume. Wayo, ịgba alụkwaghịm nwunye mbụ m gbara m, mmekọrịta rụrụ arụ nke mụ na Krystyna, ịmụta nwa n’alụghị nwunye, na ịgaghachi mkpọrọ ugboro ugboro—nke ahụ bụ ihe ndụ m dị ka ya.” N’ịhụ otú ndị omekome ndị ọzọ obi tara mmiri si ghọọ Ndịàmà ka ha nọ na mkpọrọ, ọ malitere ịjụ onwe ya, sị, ‘Ọ̀ bụ na mụ apụghịkwa ịghọ mmadụ ka mma?’ Ọ rịọrọ maka ọmụmụ Bible ma malite ịbịa nzukọ. Otú ọ dị, oge oké mgbanwe bụ́ ezie bịara mgbe ọ nụrụ n’ọnụ ọkà iwu obodo ahụ na Krystyna aghọwo otu n’ime Ndịàmà Jehova afọ atọ tupu mgbe ahụ. “O juru m nnọọ anya!” ka Jerzy na-ekwu. “Echere m, sị, ‘Gịnị banyere m? Gịnị ka m na-eme?’ Aghọtara m na iji bụrụ onye nwere ihu ọma Jehova, aghaghị m imezi ndụ m.” N’ihi ya, njikọghachi obi ụtọ weere ọnọdụ n’ụlọ mkpọrọ—ya na Krystyna na nwa ha nwanyị dị afọ 11, bụ́ Marzena. N’oge na-adịghị anya, ha debara alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ iwu. Ọ bụ ezie na ọ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ, na-enwekwa ihe ndị dị mma na ndị siri ike, Jerzy kụziiri onwe ya asụsụ ogbi na nso nso a, o nwekwara ike inyere ndị mkpọrọ ntị chiri aka.
Mirosław etinyeworị aka n’ime mpụ dị iche iche mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị. O nwere mmasị nke ukwuu n’ihe ndị enyi ya na-eme, n’oge na-adịghịkwa anya ọ malitere ime otu ihe ahụ. Ndị o zuru ohi ma ọ bụ tie ihe dị ọtụtụ. E mesịa ọ gara mkpọrọ. “Mgbe m chọtara onwe m n’ụlọ mkpọrọ, echigharịkwuuru m onye ụkọchukwu maka enyemaka,” ka Mirosław na-ekwupụta. “Ma enwetara m ndakpọ olileanya dị ilu. Ya mere ekpebiri m na m ga-egbu onwe m site n’iri nsí.” Kpọmkwem n’ụbọchị o mere atụmatụ igbu onwe ya, a kpọgara ya n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ọzọ. N’ebe ahụ ka ọ hụrụ otu Ụlọ Nche nke kwuru banyere nzube nke ndụ. “Ihe ọmụma ahụ dị mfe ma doo anya ghọrọ nnọọ ihe dị m mkpa,” ka ọ na-agbakwụnye. “Ugbu a achọrọ m ịdị ndụ! Ya mere ekpegaara m Jehova ekpere ma rịọ Ndịàmà maka ọmụmụ Bible.” O nwere ọganihu dị ngwa n’ọmụmụ Bible ya, e mekwara ya baptism na 1991. Ugbu a ọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka n’ụlọ mkpọrọ, na-enwe ihe ùgwù nke ikwusa site n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ gaa n’ọzọ.
Ka ọ dị ugbu a, e mewo ngụkọta nke ndị mkpọrọ 15 baptism. Ngụkọta ikpe a mara ha dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 260. A tọhapụrụ ụfọdụ tupu ha anọzuo oge ha. E webilatara ikpe otu onye mkpọrọ site n’afọ 25 gaa n’afọ 10. Ụfọdụ ndị gosiri mmasị mgbe ha nọ mkpọrọ ghọkwara Ndịàmà e mere baptism mgbe a tọhapụsịrị ha. Tụkwasị ná nke ahụ, e nwekwuru ndị mkpọrọ anọ bụ́ ndị na-ejikere maka baptism.
Nkwupụta Ndị Isi Ụlọ Mkpọrọ Mere
“Mgbanwe n’àgwà ndị mkpọrọ ahụ apụtawo ìhè karịsịa,” ka akụkọ si n’ụlọ mkpọrọ na-ekwu. “Ọtụtụ na-akwụsị ise siga, ha na-edebekwa ọnụ ụlọ mkpọrọ ha ọcha. Ụdị mgbanwe n’àgwà ahụ na-apụta ìhè n’ebe ọtụtụ ndị mkpọrọ nọ.”
Akwụkwọ akụkọ bụ́ Życie Warszawy na-akọ na ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụlọ mkpọrọ dị na Wołów kwupụtara na “a na-enye ndị ahụ chegharịrịnụ ọzụzụ; ha adịghị ewetara ndị nche ụlọ mkpọrọ nsogbu.” Isiokwu ahụ kwukwara na ndị ahụ a tọhapụrụ tupu ha anọzuo mkpọrọ ha esonyewo Ndịàmà Jehova nke ọma, ha adịghịkwa alaghachi n’ụzọ nke ime mpụ.
Gịnịkwanụ bụ echiche nke onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ? “Ọrụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ mkpọrọ a bụ nke a na-achọsi ike, na-enyekwa aka,” ka ọ na-ekwu. Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ na-ekwupụta na “n’oge ọmụmụ Bible ha [so Ndịàmà enwe], àgwà na ụkpụrụ nke ndị mkpọrọ ahụ na-agbanwe, na-enye ha ike nduzi ọhụrụ ná ndụ ha. Àgwà ha bụ nnọọ nke nwere izu na nke nwere nsọpụrụ. Ha na-arụsi ọrụ ike, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha adịghị akpata nsogbu ọ bụla.” Okwu ọma ndị dị otú ahụ sitere n’ọnụ ndị isi bụ, n’ezie, nke na-enye Ndịàmà ahụ so ndị mkpọrọ nọ n’ụlọ mkpọrọ Wołów arụ ọrụ, obi ụtọ.
Ndịàmà ahụ na-esi esi abịa na-aghọtazu okwu Jisọs ndị bụ́: “Amakwaara m atụrụ nke m, atụrụ nke m makwaara m. . . . Ha ga-anụkwa olu m; otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa, otu Onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:14, 16) Ọbụna mgbidi ụlọ mkpọrọ apụghị igbochi Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ịchịkọta ndị yiri atụrụ. Ndịàmà nọ na Wołów nwere ekele na ha nwere ihe ùgwù nke ikere òkè n’ozi a na-enye ọṅụ. Ha na-elegakwara Jehova anya maka ngọzi ya na-adịgide adịgide n’inyere ọtụtụ obi ndị ọzọ dị ka nkume aka ịzaghachi n’ozi Alaeze ahụ tupu ọgwụgwụ eruo.—Matiu 24:14.
[Igbe dị na peeji nke 27]
Nsogbu nke “Okenye Na-agwọ Ofe”
“Mgbe ọ nọsịrị mkpọrọ ruo oge ụfọdụ, onye mkpọrọ adịghị amakarịkwa ihe ọ pụtara bụ́ ịdị ndụ nnwere onwe, ma ọ bụ ibi ndụ n’onwe ya,” ka Ndịàmà na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ dị na Wołów na-ekwu. “Ihe anyị nwere bụ n’ụzọ bụ́ isi nsogbu nke ‘okenye na-agwọ ofe,’ onye na-amaghị otú ọ ga-esi lekọta onwe ya anya mgbe a tọhapụsịrị ya site na mkpọrọ. Ọ bụ n’ihi ya ka ọrụ ọgbakọ ji karịa ịkụziri ya eziokwu Bible nanị. Anyị aghaghị ịkwadebe ya ịghọ akụkụ nke obodo, na-adọ ya aka ná ntị banyere ihe ize ndụ na ọnwụwa ndị ọhụrụ ọ pụrụ iche ihu. Ọ bụ ezie na anyị na-akpachara anya ka anyị ghara ịbụ ndị na-echebebiga mmadụ ókè, anyị aghaghị inyere ya aka ịmalite ndụ ọhụrụ.”