“Apụrụ M Ịhụ Udo Dị Ebe Ahụ”
OTU NWOKE na-asụ German gara mgbakọ Ndịàmà Jehova haziri iji “lepuo” Ndịàmà. N’ihi gịnị? Nzube ya bụ “ikpughe ịrọ òtù a ma chebe ndị enyi ya ịkpafu.” Mgbe ọ gasịrị mgbakọ ahụ, o degaara ndị enyi ya akwụkwọ ozi a na-esonụ:
“Mgbe m na-erute nso ebe a na-enwe mgbakọ ahụ, o juru m anya ma ọ̀ bụkwa ebe a ka m na-aga. Ọ dịghị onye ọ bụla m hụrụ, ọ dịghịkwa ihe ndị a tụfuru aghara aghara ma ọ bụ kom kom biya ndị tọgbọ n’ala. Ka m na-erutekwu nso, ahụrụ m ndị amadị abụọ n’ebe e si abanye n’ámá egwuregwu ahụ. Ha kelere m ma kpọbata m.
“Atụrụ m anya ịnụ ụzụ nke ọtụtụ puku mmadụ kwesịrị ịnọ n’ebe ahụ, ma ọ dị nnọọ jụụ. ‘Ikekwe ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nọsasịrị n’ebe ahụ dum,’ ka m chere.
“Mgbe m banyere, ihe nkiri a nọ na-eme n’elu ikpo okwu dọọrọ uche m ozugbo. Nanị mgbe e mesịrị ka m chọpụtara na ámá egwuregwu ahụ jupụtara nnọọ n’ọtụtụ puku ndị na-ege ntị nke ọma. Apụrụ m ịhụ udo dị ebe ahụ. Ihe m nụrụ, hụ, ma nwee mmetụta ya n’oge fọdụrụ ná mgbakọ ahụ nwere mmetụta miri emi n’ahụ m.
“Ebe m sooworo Ndịàmà ahụ kpakọrịta, ahụrụ m ihu obi ụtọ na okwu ịhụnanya ha. Na mberede, apụghị m ịkpachi echiche ahụ bụ́, ‘Ndị a bụ ndị Chineke n’ezie!’”
Kama ‘ichebe ndị enyi ya ịkpafu,’ nwa okorobịa ahụ gwara ha ka ha soro ya na-amụ Bible. Gịnị si na ya pụta? Taa, ọ bụ onye Kraịst bụ́ okenye. Ya na ezinụlọ ya na-eje ozi n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Zug, Switzerland.