Gịnị Bụ NANỊ Ihe Ndabere Akwụkwọ Nsọ Maka Ịgba Alụkwaghịm n’Etiti Ndị Kraịst?
JISỌS KRAỊST kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “E kwukwara, sị, Nwoke ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ya nye ya akwụkwọ nkewa: ma Mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ahapụ nwunye ya, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, ọ na-eme nwanyị ahụ ka ọ nọrọ n’ọnọdụ onye a kwara iko megide: onye ọ bụla nke ga-alụkwa ya mgbe a hapụsịrị ya, ọ na-akwa iko.” (Matiu 5:31, 32) Ọzọkwa, mgbe ọ gwasịrị ndị Farisii na nkwere Mosis kweere ka ha na-agba nwunye ha alụkwaghịm abụghị ndokwa dịworo “site ná mmalite,” Jisọs sịrị: “Ma asị m unu, Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.” (Matiu 19:8, 9) Taa, n’ozuzu ya, a na-egosi ọdịiche dị n’etiti “ndị na-akwa iko” na “ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” Otú ọ dị, okwu ahụ bụ́ “ịkwa iko” bụ nsụgharị nke okwu Grik bụ́ por·neiʹa, ọ na-agụnyekwa ụdị nile nke mmekọahụ rụrụ arụ na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye Akwụkwọ Nsọ kwadoro. N’ihi ya, okwu Jisọs ndị dị na Matiu 5:32 na Matiu 19:9 pụtara na nanị ihe ndabere e nwere maka ịgba alụkwaghịm bụ́ nke na-atọsa nkekọ alụmdi na nwunye n’ezie bụ por·neiʹa n’akụkụ nke di ma ọ bụ nwunye mmadụ. Onye na-eso ụzọ Kraịst pụrụ iji ndokwa ahụ e mere maka ịgba alụkwaghịm mee ihe ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ ọchịchọ ya, ịgba alụkwaghịm dị otú ahụ ga-emekwa ka o nwere onwe ya ịlụrụ onye Kraịst ruru eru.—1 Ndị Kọrint 7:39.
Omume mmekọahụ rụrụ arụ nke onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye so nwoke ibe ya ma ọ bụ nwanyị ibe ya mee (ndina ụdị onwe) dị njọ, bụrụkwa nke a na-asọ oyi. Ndị dị otú a na-enweghị nchegharị agaghị eketa Alaeze Chineke. N’eziekwa, Akwụkwọ Nsọ na-akatọ idina anụmanụ. (Levitikọs 18:22, 23; Ndị Rom 1:24-27; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Omume ndị a dị oké njọ bụcha por·neiʹa. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ịrịba ama na, n’Iwu Mosis, ndina ụdị onwe na ndina anụmanụ nwechara ntaramahụhụ ọnwụ, na-eme ka onye òtù ọlụlụ nke aka ya dị ọcha nwere onwe ya ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye.—Levitikọs 20:13, 15, 16.
Jisọs Kraịst kwuru na “nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) Ma Jisọs asịghị na ihe e bu n’uche, ma e meghị ya eme, bụ ihe ndabere maka ịgba alụkwaghịm. Okwu Kraịst na-egosi na e kwesịrị idebe obi ọcha nakwa na mmadụ ekwesịghị ibu echiche na ọchịchọ ndị na-ezighị ezi n’obi.—Ndị Filipaị 4:8; Jemes 1:14, 15.
Iwu ndị rabaị nke ndị Juu kwusiri okwu ike banyere ọrụ dịịrị onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye inwe mmekọahụ ma nye di ohere ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịmụta ụmụ. Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ enyeghị ndị Kraịst ikike ịgba di ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm n’ihi ihe dị otú ahụ. Ịbụ nwanyị àgà ruo ọtụtụ afọ emeghị ka Abraham gbaa Sera alụkwaghịm, ka Aịsak gbaa Rebeka alụkwaghịm, ka Jekọb gbaa Rechel alụkwaghịm, ma ọ bụ ka onye nchụàjà bụ́ Zekaraịa gbaa Elizabet alụkwaghịm.—Jenesis 11:30; 17:17; 25:19-26; 29:31; 30:1, 2, 22-25; Luk 1:5-7, 18, 24, 57.
Ọ dịghị ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ nke ga-enye onye Kraịst ikike ịgba di ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm n’ihi na onye ahụ enweghị ike inwe mmekọahụ, ma ọ bụ na ọ gbawo ara ma ọ bụ bute ọrịa a na-apụghị ịgwọta agwọta ma ọ bụ nke a na-asọ oyi. Ịhụnanya nke ndị Kraịst ga-egosi agaghị eme ka a gbaa alụkwaghịm kama ka e mesoo di ma ọ bụ nwunye dị otú ahụ n’ụzọ obi ebere. (Ndị Efesọs 5:28-31) Bible enyeghịkwa ndị Kraịst ikike ịgba di ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm n’ihi ndịrịta iche nke okpukpe; kama nke ahụ ọ na-egosi na site n’isoro di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe na-ebi, onye Kraịst ahụ pụrụ ime ka onye ahụ gafeta n’ezi okpukpe ahụ.—1 Ndị Kọrint 7:12-16; 1 Pita 3:1-7.
N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru na “nwoke ọ bụla nke na-ahapụ nwunye ya, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, ọ na-eme nwanyị ahụ ka ọ nọrọ n’ọnọdụ onye a kwara iko megide: onye ọ bụla nke ga-alụkwa ya mgbe a hapụsịrị ya, ọ na-akwa iko.” (Matiu 5:32) Site n’ikwu nke a, Kraịst gosiri na ọ bụrụ na di agbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ihe ndị ọzọ na-abụghị “ịkwa iko” (por·neiʹa), ọ na-ekpughe ya nye ịkwa iko n’ọdịnihu. Nke a dị otú ahụ n’ihi na ịgba alụkwaghịm dị otú ahụ ekewapụghị nwunye ahụ na-adịghị akwa iko n’ebe di ya nọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, o nwereghịkwa onwe ya ịlụrụ nwoke ọzọ ma soro di ọzọ nwee mmekọahụ. Mgbe Kraịst sịrị na onye ọ bụla “ga-alụkwa [nwanyị ahụ] mgbe a hapụsịrị ya, ọ na-akwa iko,” ọ na-ezo aka n’ebe nwanyị a gbara alụkwaghịm na-abụghị “n’ihi ịkwa iko” (por·neiʹa) nọ. A gaghị agba nwanyị dị otú ahụ alụkwaghịm n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ, ọ bụ ezie na a gbara ya alụkwaghịm n’ụzọ iwu kwadoro.
Mak, dị ka Matiu, dekọrọ okwu Jisọs gwara ndị Farisii banyere ịgba alụkwaghịm, hotakwa na Kraịst kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko megide ya: ọ bụrụkwa na nwanyị onwe ya ahapụ di ya, lụrụkwa di ọzọ, ọ na-akwa iko.” (Mak 10:11, 12; Matiu 19:3-9) E kwuru okwu yiri nke ahụ na Luk 16:18, nke na-agụ, sị: “Nwoke ọ bụla nke na-ahapụ nwunye ya, nke lụrụkwa nwanyị ọzọ, ọ na-akwa iko: onye na-alụ nwanyị nke di ya hapụworo na-akwakwa iko.” N’atụleghị akụkụ ndị ọzọ, amaokwu ndị a yiri ka ha na-amachibido ụmụazụ Kraịst ịgba alụkwaghịm kpam kpam, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ na-egosi na onye a gbara alụkwaghịm agaghị enwe ikike ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye ma e wezụga mgbe di ma ọ bụ nwunye ya nwụsịrị. Otú ọ dị, a ghaghị ịghọta okwu Jisọs dị ka Mak na Luk si dekọọ ha n’ikwekọ n’okwu ahụ ka zuo ezu nke Matiu dekọrọ. O tinyere nkebi okwu, bụ́ “ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko,” na-egosi na ihe Mak na Luk dere n’ihota ihe Jisọs kwuru banyere ịgba alụkwaghịm dabara ma ọ bụrụ na ihe ndabere e ji gbaa alụkwaghịm ahụ bụ ihe ọzọ na-abụghị “ịkwa iko” (por·neiʹa) nke di ma ọ bụ nwunye na-ekwesịghị ntụkwasị obi kwara.—Matiu 19:9; leekwa Matiu 5:32.
Otú ọ dị, iwu ejighị mmadụ n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ ịgba di ma ọ bụ nwunye ya kwara iko nke nwere nchegharị alụkwaghịm. Di ma ọ bụ nwunye bụ́ onye Kraịst pụrụ ime ebere n’ọnọdụ dị otú ahụ, ọbụna dị ka o yiri ka Hosea ọ kpọrọghachiiri nwunye ya kwara iko bụ́ Goma na dị ka Jehova meere Israel ikpe ịkwa iko ime mmụọ maworo ebere.—Hosea isi nke 3.
E Weghachi Ụkpụrụ Mbụ nke Chineke
O doro anya na okwu Jisọs Kraịst rụtụrụ aka ná nlaghachi gaa n’ụkpụrụ dị elu maka alụmdi na nwunye bụ́ nke Jehova Chineke setịpụrụ na mbụ, o gosikwara na ndị ga-aghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị ịgbaso ụkpụrụ ahụ dị elu. Ọ bụ ezie na ohere ahụ Iwu Mosis nyere ka dị irè, ndị ga-abụ ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs, ndị ga na-eme uche Nna ya, ‘na-emekwa’ ma ọ bụ na-etinye okwu Jisọs n’ọrụ, agaghịzi eji ohere dị otú ahụ na-eme ihe iji mesoo di ma ọ bụ nwunye ha ihe n’ụzọ “obi [ịkpọ nkụ, NW].” (Matiu 7:21-29; 19:8) Dị ka ezi ndị na-eso ụzọ, ha agaghị emebi ụkpụrụ mbụ nke Chineke ndị na-achịkwa alụmdi na nwunye site n’ịgba di ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm n’ihe ndabere ọ bụla ọzọ na-abụghị nke ahụ Jisọs kapịrị ọnụ, ya bụ “ịkwa iko” (por·neiʹa).
Onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nke so onye akwụna kwaa iko na-eme onwe ya ka ya na onye ahụ bụrụ “otu ahụ.” N’otu aka ahụ, di ma ọ bụ nwunye kwara iko na-eme onwe ya ka ya na onye ahụ nwere omume rụrụ arụ o so nwee mmekọahụ bụrụ “otu ahụ,” ọ bụghị nwunye ya. Di ma ọ bụ nwunye ahụ kwara iko na-emehie megide ọ bụghị nanị ahụ onwe ya kamakwa megide nwunye ya bụ́ onye ya na ya bụworo “otu ahụ” ruo mgbe ahụ. (1 Ndị Kọrint 6:16-18) N’ihi nke ahụ ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye na-enye ezi ihe ndabere maka ịtọsa nkekọ alụmdi na nwunye ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, ebe e nwekwara ihe ndabere dị otú ahụ, ịgba alụkwaghịm e nwetara na-eweta ntọsa ikpeazụ nke njikọ alụmdi na nwunye ahụ iwu kwadoro, n’ụzọ ga-edo mmadụ nile anya, na-eme ka di ma ọ bụ nwunye nke aka ya dị ọcha nwere onwe ya ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye n’ụzọ nwere ùgwù.—Ndị Hibru 13:4.