Onye Ọ Bụla Chọrọ Inwere Onwe ya
“Mmadụ nweere onwe ya site n’ọmụmụ, n’ebe nile ọ nọkwa n’agbụ,” ka onye France bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Jean-Jacques Rousseau dere na 1762. Inwere onwe onye site n’ọmụmụ. Lee echiche magburu onwe ya nke ahụ bụ! Ma dị ka Rousseau chọpụtara, ọtụtụ nde mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile enweretụbeghị onwe ha. Kama nke ahụ, ha adịwo ndụ ha “n’agbụ,” na-abụ ndị a tụrụ mkpọrọ n’usoro ihe nke napụworo ha obi ụtọ na afọ ojuju ọ bụla na-adịgide adịgide ná ndụ.
IMERIME mmadụ taa ka na-ahụ na “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ná nchụso ha na-achụso ikike, ndị ikom na ndị inyom nwere oké ọchịchọ anọgidewo na-egosi enweghị mwute banyere ịzọpịa nnwere onwe ndị ọzọ. “Òtù na-akpa aghara bụ́ ndị na-egbu mmadụ egbuo mmadụ 21,” ka otu akụkọ na-ekwu. Ọzọ na-ekwu banyere “mbọkasị,” bụ́ nke ndị agha nchedo mere, bụ́ ndị ‘gburu ndị inyom, ụmụaka na ndị agadi na-adịghị eguzogide ha, ndị na-apụghịkwa ichebe onwe ha, na-egbubi akpịrị, na-agba ndị mkpọrọ bụ́ ndị nkịtị egbe n’isi, na-agbasokwa ụkpụrụ ibibisị ihe nile dị n’obodo nta dị iche iche na ịtụ bọmbụ aghara aghara.’
Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ ji na-achọsi ike, n’ezie, na-alụkwa ọgụ maka nnwere onwe pụọ ná mmegbu! Ma, eziokwu dị mwute bụ na ịlụ ọgụ maka nnwere onwe otu onye na-agụnyekarị ịzọgide ihe ruuru onye ọzọ na nnwere onwe ya ụkwụ. Ọ fọrọ nke nta ka ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka aka ha dị ọcha bụrụ ndị a ga-ejirịrị chụọ àjà ka nke ahụ na-eme, ọnwụ ha ka “a na-eme ka ọ bụrụ nke iwu kwadoro” site n’ikwu na ihe kpatara ya kwesịrị ekwesị ma zie ezi. Dị ka ihe atụ, n’afọ gara aga na Ireland, bọmbụ nke “ndị na-alụ ọgụ maka nnwere onwe” n’obodo ukwu bụ́ Omagh tinyere n’otu obere ụgbọala gburu mmadụ 29 aka ha dị ọcha guzo n’akụkụ, merụọkwa ọtụtụ narị ndị ọzọ ahụ.
Ha Ka Nọ “n’Agbụ”
Mgbe ọgụ kwụsịrị, gịnị ka a na-enweta? Mgbe “ndị na-alụ ọgụ maka nnwere onwe” meriri n’ọgụ ha dị iche iche, a pụrụ inwetatụ nnwere onwe. Ma, mgbe ahụ, hà nweere onwe ha n’ezie? Ọ́ bụghị eziokwu na ọbụna n’ihe ka ọtụtụ ná mba ndị nweere onwe ha dị n’akụkụ ụwa a sị na o nwerewo onwe ya, ndị mmadụ ka nọ “n’agbụ” nye ndị nna ukwu dị obi ọjọọ dị ka ogbenye, ezughị okè, ọrịa, na ọnwụ? Olee otú mmadụ ọ bụla pụrụ isi kwuo na ya nweere onwe ya n’ezie mgbe ihe ndị dị otú ahụ nọgidere na-eme ya ohu ha?
Onye oge ochie so dee Bible bụ́ Mosis kọwara ndụ n’ụzọ ziri ezi dị ka ọ dịwooro ọtụtụ mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile, dịkwa ka ọ ka dị taa. Anyị pụrụ ịdị ndụ afọ 70 ma ọ bụ 80, ka o kwuru, “otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe.” (Abụ Ọma 90:10) Ọ̀ dị mgbe nke a ga-agbanwe? Ọ̀ dị mgbe ọ ga-ekwe anyị nile omume ibi ndụ na-eju nnọọ afọ, nke ihe mgbu na oké ụjọ nke ọtụtụ mmadụ na-enwe taa na-adịghị na ya?
Bible na-asị ee! Ọ na-ekwu banyere “inwe onwe . . . nke ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:21) Ka anyị tụlee nnwere onwe ahụ nke ọma, nke Pọl onyeozi kwuru banyere ya na narị afọ mbụ n’otu akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst nọ na Rom. N’akwụkwọ ozi a Pọl kọwara n’ụzọ doro anya otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi nweta ezi “inwe onwe . . . nke ebube” nke na-adịgide adịgide.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]
Site n’akwụkwọ bụ́ Beacon Lights of History, Vol. XIII