Soro Ụmụ Gị Na-agụ Ihe
Dị ka magazin Brazil bụ́ Veja si kwuo, ụmụ nke ndị dị uchu n’ịgụ ihe yikarịrị ka ha ga-azụlite mmasị n’akwụkwọ karịa ụmụaka ndị na-enweghị ihe nlereanya dị otú ahụ nke ịgụ ihe n’ụlọ. “Ịgụkọ ihe ọnụ na-eme ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-akpachikwu anya ma nye nwata ahụ ohere ịghọta ihe dị n’akwụkwọ ahụ nke ọma karị,” ka Martha Hoppe, bụ́ ọkachamara n’ihe metụtara ntolite ụmụaka na-ekwu.
Ịgụpụtara ụmụ gị ihe n’olu dara ụda na-enyekwa gị ohere ịza ajụjụ dị iche iche. Unu pụrụ ịtụle foto ọ bụla so akụkụ ihe odide ahụ. “Ka nwata na-aghọtakwu ihe ndị dị n’akwụkwọ,” ka Hoppe na-ekwu, “otú ahụ ka ọ ga-abụ onye a kpalikwuru ịchọ ha mgbe ọ chọrọ ịmata ihe.”
Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ n’etiti Ndịàmà Jehova na-enwe ọṅụ isoro ụmụ ha na-agụ ihe. Ha pụrụ ịgụ mbipụta ndị dị ka Akwukwọm nke Akukọ Bible, Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, na Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.a Akwụkwọ ndị dị ka ndị a abụghị nanị na ha na-enyere ụmụaka aka ịghọ ndị na-agụ ihe nke ọma kamakwa ha na-eme ka mmasị ha nwere n’akwụkwọ a kasị ere n’ụwa—Bible Nsọ—sakwuo mbara. Ya mere, ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, setịpụrụ ụmụ gị ihe nlereanya site n’ịbụ onye dị uchu n’ịgụ Okwu Chineke. (Joshua 1:7, 8) N’ụzọ nile o kwere mee, wepụta oge iji gụọrọ ha ihe!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.